Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Emewo M Agadi, Afọ Ndụ M Jukwara M Afọ

Emewo M Agadi, Afọ Ndụ M Jukwara M Afọ

Akụkọ Ndụ

Emewo M Agadi, Afọ Ndụ M Jukwara M Afọ

DỊ KA MURIEL SMITH SI KỌỌ

Aka a kụsiri ike n’ọnụ ụzọ dị n’ihu ụlọ m fọrọ nke nta ka ọ kwatuo ibo ụzọ m. M ka lọtara maka iri nri ehihie ka m mesịrị nnọọ nkwusa n’ụtụtụ. Dị ka m na-emekarị, esinyere m mmiri n’ọkụ iji mere otu iko tii ma ka na-achọ idina ala iji zurutụ ike ruo minit iri atọ dị ka m na-eme. A nọgidere nnọọ na-akụ aka ahụ, ka m na-agakwa imeghe ụzọ, anọ m na-eche onye ọ ga-abụkwa n’oge a. Achọpụtara m n’oge na-adịghị anya. Ndị ikom abụọ guzo n’ọnụ ụzọ m kọwara onwe ha dị ka ndị uwe ojii. Ha kwuru na ha bịara inyocha ụlọ m maka akwụkwọ Ndịàmà Jehova—òtù a machibidoro iwu—bipụtara.

N’ihi gịnị ka e ji machibido Ndịàmà Jehova iwu n’Australia, oleekwa otú m si ghọọ otu n’ime ha? Ha nile malitere site n’otu onyinye nne m nyere m n’afọ 1910, mgbe m dị afọ iri.

EZINỤLỌ m bi n’otu ụlọ e ji osisi wuo nke dị n’ógbè dịpụrụ adịpụ bụ́ Crows Nest nke dị n’Ebe Ugwu Sydney. Esi m ụlọ akwụkwọ lọta otu ụbọchị ma hụ nne m ka ya na otu nwoke na-ekwurịta okwu n’ọnụ ụzọ dị n’ihu ụlọ. Achọsiri m ike ịmata onye nwoke a m na-amaghị ihu ya nke yi kootu ma buru akpa akwụkwọ juru bụ. Eji m ihere sị ha ka m bịakwa ma banye n’ime ụlọ. Otú ọ dị, nanị n’ime minit ole na ole ka e mesịrị, mama m kpọrọ m òkù. Ọ sịrị: “Nwoke a nwere akwụkwọ ndị mara nnọọ mma, ha nile na-ekwukwa banyere Akwụkwọ Nsọ. Ugbu a, ebe ọ bụ na a na-aga ime ememe ncheta ọmụmụ gị n’oge na-adịghị anya, ị ga-ahọrọ n’etiti uwe ọhụrụ na akwụkwọ ndị a. Olee nke ga-amasị gị?”

“Oo, mama, m ga-achọ inweta akwụkwọ ndị ahụ, i meela,” ka m zaghachiri.

Ya mere, mgbe m dị afọ iri, enwetara m mpịakọta atọ mbụ nke Studies in the Scriptures, bụ́ nke Charles Taze Russell bipụtara. Nwoke ahụ nọ n’ọnụ ụzọ kọwaara mama m na ọ ga-adị mkpa ka ọ na-enyere m aka ịghọta ihe ndị dị n’akwụkwọ ndị ahụ, ebe ọ bụ na ma eleghị anya ha ga-esiri m nnọọ ike ịghọta. Mama m kwuru na obi ga-adị ya ụtọ ime otú ahụ. N’ụzọ dị mwute, n’oge na-adịghị anya ka nke a gasịrị, mama m nwụrụ. Papa m ji ịdị uchu lekọta mụ na nwanne m nwoke na nwanne m nwanyị, ma ugbu a enwekwuru m ibu ọrụ ndị ọzọ ibu, o yikwara ka ha na-anyịgbu m. N’agbanyeghị nke ahụ, ọdachi ọzọ na-akwadebe ime.

Agha Ụwa Mbụ tiwapụrụ na 1914, nanị otu afọ ka e mesịrị, e gburu nna anyị anyị hụrụ n’anya. Ebe anyị bụzi ndị na-enweghị nne na nna, a kpọgara nwanne m nwoke na nwanne m nwanyị na nke ndị ikwu anyị iso ha biri, e zigakwara m na kọleji a na-ebi ebi nke ndị Katọlik nwe. Mgbe ụfọdụ, owu ọmụma na-eme ka obi ghara iru m ala. Otú ọ dị, enwere m ekele maka ohere e nyere m ịmụ egwú bụ́ ihe m nwere mmasị na ya, karịsịa ịpị piano. Ọtụtụ afọ gafere, agụchakwara m akwụkwọ na kọleji ahụ a na-ebi ebi. Na 1919, alụrụ m Roy Smith, bụ́ nwoke na-ere ngwá egwu. Na 1920, anyị mụrụ nwa, amalitekwara m ọzọ inwe nchegbu ndị a na-enwe ná ndụ kwa ụbọchị. Ma gịnị banyere akwụkwọ ndị ahụ?

Otu Onye Agbata Obi Anyị Ekenye M Eziokwu Ime Mmụọ

N’ime afọ ndị ahụ nile, ebu m “akwụkwọ Bible” ndị ahụ na-aga ebe ọ bụla m na-aga. Ọ bụ ezie na agụbeghị m ha n’ezie, n’ime obi m, amaara m na ozi ndị dị na ha dị mkpa. E mesịa, otu ụbọchị ná ngwụsị afọ ndị 1920, Lil Bimson, bụ́ otu n’ime ndị agbata obi anyị, bịara leta anyị. Anyị bara na palọ, nọdụ ala, ma na-aṅụrụtụ tii.

“Oo, i nwetala akwụkwọ ndị a!” ka o kwuru na mberede.

“Olee akwụkwọ ndị ị na-ekwu?” ka m jụrụ ná mgbagwoju anya.

Ọ tụrụ akwụkwọ Studies in the Scriptures bụ́ ndị dị n’ebe ndebe akwụkwọ aka. Lil gbaziiri ha ma were ha laa n’ụbọchị ahụ ma jiri oké mmasị gụọ ha. Obi ụtọ o nwere n’ihi ihe ndị ọ gụtara pụtara ìhè n’oge na-adịghị anya. Lil nwetakwuru akwụkwọ site n’aka Ndị Mmụta Bible, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova mgbe ahụ. Ọzọkwa, ọ pụghị ịla azụ n’ịkọrọ anyị ihe nile ọ na-amụta. Otu n’ime akwụkwọ ndị o nwetara bụ The Harp of God, n’oge na-adịghịkwa anya, e webatara ya n’ụlọ anyị. Emesịrị m malite ijere Jehova ozi mgbe m wepụtara oge gụọ akwụkwọ a dabeere na Bible. N’ikpeazụ, achọtara m azịza nye ajụjụ ndị bụ́ isi bụ́ ndị chọọchị m na-enwebeghị ike inye m.

N’ụzọ nyere m obi ụtọ, Roy gere nnọọ ntị nke ọma n’ozi Bible, anyị abụọ ghọkwara ndị na-amụchi Bible anya. Na mbụ, Roy so n’òtù Freemason. Ugbu a, e jikọtara ezinụlọ anyị n’otu n’ezi ofufe, ugboro abụọ kwa n’izu, otu onye n’ime ụmụnna anyị na-eduziri ezinụlọ anyị dum ọmụmụ Bible. Anyị nwetakwuru agbamume mgbe anyị malitere ịga nzukọ nke Ndị Mmụta Bible. Ebe ha na-anọ enwe ya na Sydney bụ otu ntakịrị ụlọ a gbazitere agbazite nke dị n’ógbè Newtown nke dịpụrụ adịpụ. N’oge ahụ, e nwere ihe na-erughị Ndịàmà 400 ná mba a nile, ya mere, nye ọtụtụ n’ime ụmụnna, ịga nzukọ pụtara ime njem dịtụ anya.

Nye ezinụlọ anyị, ịga nzukọ pụtara ịgafe Ọdụ Ụgbọ Mmiri Sydney mgbe nile. Tupu a rụọ Àkwà Mmiri nke Ọdụ Ụgbọ Mmiri Sydney na 1932, onye ọ bụla na-agafenụ aghaghị iji ụgbọ epeepe gafee. N’agbanyeghị oge na ego njem a na-efu, anyị gbalịsiri ike ịhụ na nri ime mmụọ ọ bụla Jehova na-enye akwaghị anyị. Mgbalị ndị anyị mere ịkwụsi ike n’eziokwu ahụ ruru ihe e mefuru maka ya, ebe ọ bụ na Agha Ụwa nke Abụọ nọ na-akwadebe itiwapụ, okwu banyere ịnọpụ iche gajekwa imetụta ezinụlọ anyị kpọmkwem.

Oge Ule na Ụgwọ Ọrụ

Mmalite afọ ndị 1930 bụụrụ mụ na ezinụlọ m oge ndị na-enye obi ụtọ. E mere m baptizim na 1930, na 1931 kwa, anọ m ná mgbakọ ahụ kwesịrị ncheta bụ́ mgbe anyị nile guzooro ọtọ ma kwere ịnakwere ọmarịcha aha ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova. Mụ na Roy gbalịsiri ike ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’aha ahụ site n’ikere òkè n’ụzọ nile e si eme nkwusa na mkpọsa bụ́ ndị nzukọ a gbara ume ka a gbasoo. Dị ka ihe atụ, na 1932, anyị keere òkè ná nkesa pụrụ iche nke akwụkwọ nta bụ́ nke a haziri iji ruo ìgwè mmadụ bịara ịhụ mmepe nke Àkwà Mmiri nke Ọdụ Ụgbọ Mmiri Sydney. Ihe pụrụ iche nye anyị bụ ojiji e ji ụgbọala ndị a kwụnyere ígwè okwu na ha mee ihe, anyị nwekwara ihe ùgwù nke ịbụ ndị a kwụnyere ígwè okwu n’ụgbọala anyị. Site n’iji ụzọ nkà na ụzụ a mee ihe, anyị mere ka a nụ okwu ndị dabeere na Bible e kwunyere na teepu bụ́ ndị Nwanna Rutherford kwuru, n’okporo ámá dị iche iche nke Sydney.

Otú ọ dị, ọnọdụ malitere ịgbanwe ọzọ ma na-esiwanye ike. Ka ọ na-erule 1932, Oké Ndakpọ Akụ̀ na Ụba kpara Australia aka ọjọọ, n’ihi ya, mụ na Roy kpebiri ime ka ndụ anyị dị mfe. Otu ụzọ anyị si mee nke a bụ ịkwaga n’ebe dị nso n’ọgbakọ anyị, n’ụzọ dịkwa otú ahụ, anyị belatara nnọọ ihe anyị na-emefu n’ime njem. Otú ọ dị, nsogbu akụ̀ na ụba ghọrọ obere okwu mgbe egwu nke Agha Ụwa nke Abụọ bịara jide ụwa nile.

N’ihi irube isi n’iwu Jizọs nyere ka anyị ghara ịbụ akụkụ nke ụwa, a kpagburu Ndịàmà Jehova n’ụwa nile, a gụpụghịkwa Australia. N’ịbụ ndị oké egwu nke oge agha kpasuru iwe, ụfọdụ kpọrọ anyị ndị òtù ọchịchị Kọmụnist. Ndị mmegide a boro Ndịàmà Jehova ebubo ụgha na ha ji ụlọ ọrụ redio anọ ha nwere n’Australia na-ezigara ndị agha Japan ozi.

Ụmụnna nwoke na-eto eto bụ́ ndị a kpọrọ ije ozi agha chere nrụgide dị ukwuu nke ịgọnahụ okwukwe ha ihu. Obi dị m ụtọ ikwu na ụmụ anyị ndị nwoke atọ nile guzosiri ike n’ihe ha kweere ma nọgide na-anọpụ iche. A mara nwa anyị nwoke nke kasị okenye, bụ́ Richard, ikpe ịga mkpọrọ ọnwa 18. Nwa anyị nke abụọ, bụ́ Kevin, denyeliri aha ya dị ka onye jụrụ ije ozi agha n’ihi akọ na uche ya. Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, nwa anyị nke kasị nta, bụ́ Stuart, nwụrụ n’ihe ọghọm ọgba tum tum mgbe ọ na-aga n’ụlọikpe maka ịzara ọnụ ya na nke ikpeazụ ya n’okwu banyere nnọpụiche. Ọdachi a kpataara anyị oké nchegbu n’ezie. Otú ọ dị, ilegide anya n’Alaeze ahụ nakwa ná nkwa Jehova kwere banyere mbilite n’ọnwụ nyeere anyị aka ịtachi obi.

Ha Ahụghị Kpọmkwem Ihe Ndị Dị Ha Oké Mkpa

Na January 1941, a machibidoro Ndịàmà Jehova iwu n’Australia. Ma, dị ka ndịozi Jizọs mere, mụ na Roy rubeere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ, ruokwa afọ abụọ na ọkara, anyị nọgidere na-arụ ọrụ na nzuzo. Ọ bụ n’oge a ka ndị uwe ojii ahụ yi uwe nkịtị bụ́ ndị m kpọtụrụ uche ná mmalite, kụrụ aka n’ọnụ ụzọ m. Gịnị mere?

Otú o sina dị, akpọbatara m ha n’ime ụlọ. Ozugbo ha batara, ajụrụ m ha, sị, “Biko ùnu ga-echetụ ka m ṅụchaa tii m tupu unu enyochawa ụlọ m?” N’ụzọ dị ịtụnanya, ha kweere, abakwara m na kichin ikpegara Jehova ekpere ma chee ihe m ga-eme. Mgbe m bịaghachiri, otu onye uwe ojii banyere n’ebe anyị na-anọ amụ ihe ma were ihe ọ bụla ọ hụrụ akara Watchtower n’elu ya, gụnyere akwụkwọ ndị dị n’akpa ozi ọma m na Bible m.

“Ì ji n’aka na i nweghị akwụkwọ ọzọ ndị dị na katọn e zoro ezo?” ka ọ jụziri. “A gwara anyị na ị na-aga nzukọ kwa izu n’otu ụlọ dị ná ngwụsị okporo ámá a nakwa na ị na-eji ọtụtụ akwụkwọ aga ebe ahụ.”

“Nke ahụ bụ eziokwu,” ka m zara, “ma ọ dịghị ebe ahụ ugbu a.”

“Ee, anyị maara nke ahụ, Odozi Akụ Smith,” ka o kwuru. “Anyị makwaara na e debere akwụkwọ ndị ahụ n’ụlọ ndị mmadụ n’ógbè a.”

Ha hụrụ katọn ise nke akwụkwọ bụ́ Freedom or Romanism dị n’ime ha n’ụlọ ihi ụra nke nwa anyị nwoke.

“Ì ji n’aka na ọ dịghị ihe ọzọ dị n’ebe ndọba ụgbọala?” ka ọ jụrụ.

“Ee, ọ dịghị ihe ọzọ dị n’ebe ahụ,” ka m kwuru.

Mgbe ahụ, o meghere otu kọbọd dị n’ọnụ ụlọ iri nri. Ọ hụrụ fọm ndị ọ na-adịghị ihe e denyere n’ime ha, bụ́ ndị e ji edejupụta akụkọ ozi ọgbakọ. O weere ha ma sie ọnwụ inyocha ebe ndọba ụgbọala.

“Ọ bụrụ otú ahụ, sonụ m,” ka m kwuru.

Ha sooro m gawa n’ebe ndọba ụgbọala, mgbe ha nyochasịkwara ya, ha pụrụ n’ikpeazụ.

Ndị uwe ojii ahụ chere na ha bu ihe ndị dị oké mkpa ha na-achọ n’ime katọn ise ndị ahụ! Otú ọ dị, ha hapụrụ kpọmkwem ihe ndị dị oké mkpa ha kwesịrị iwere. N’oge ahụ, ana m eje ozi dị ka odeakwụkwọ ọgbakọ, enwekwara m ihe ndekọ nke aha ndị nkwusa na ihe ọmụma ndị ọzọ dị mkpa n’ụlọ m. Enwere m ekele na ụmụnna ebuwo ụzọ dọọ anyị aka ná ntị ka anyị dịrị njikere maka nnyocha dị otú ahụ, ejiwokwa m nlezianya zoo akwụkwọ ndị ahụ. Etinyere m ha n’ime envelopu ma debe ha n’ala ala nke ihe ndị m wụnyere tii, shuga, na ụtụ ọka m na ha. E debekwara ụfọdụ n’ebe a na-edebe ụmụ nnụnụ bụ́ nke dị nso n’ebe ndọba ụgbọala. Ya mere, ndị uwe ojii ahụ gafere kpọmkwem ihe ọmụma ha na-achọ.

Ịbanye n’Ozi Oge Nile

Ka ọ na-erule 1947, ụmụ anyị ndị okenye enweela ezinụlọ nke ha. N’oge ahụ, mụ na Roy kpebiri na anyị ga-ejeli ozi oge nile. E nwere mkpa n’ubi dị n’Ebe Ndịda Australia, n’ihi ya, anyị rere ụlọ anyị ma zụrụ ụlọ ụgbọala na-adọkpụ, bụ́ nke anyị kpọrọ Mizpa, nke pụtara “Ụlọ Nche.” Ụzọ ibi ndụ a mere ka o kwe anyị omume ime nkwusa n’ógbè ndị dịpụrụ adịpụ. Ọtụtụ mgbe, anyị rụrụ ọrụ n’ókèala na-emepeghị emepe nke a na-eketaghị ọrụ na ya. E nwere ọtụtụ ihe ndị m ji mmasị echeta banyere oge ahụ. Otu n’ime ndị m duziiri ọmụmụ ihe bụ otu nwa agbọghọ aha ya bụ́ Beverly. Tupu ya enwee ọganihu ruo n’ịbụ onye e mere baptizim, o si n’ógbè ahụ pụọ. Cheedị ọṅụ m nwere mgbe ọtụtụ afọ gasịrị otu nwanna nwanyị abịakwute m n’otu mgbakọ ma kwuo na ya bụ Beverly! Lee ụdị obi ụtọ o wetaara m ka ọtụtụ afọ ndị ahụ gasịrị ịhụ ka ya na di ya na ụmụ ya na-ejere Jehova ozi.

Na 1979, enwere m ihe ùgwù nke ịga Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ. Otu n’ime ihe ndị e mesiri ike n’ụlọ akwụkwọ ahụ bụ na ka mmadụ wee nwee ike ịtachi obi n’ozi ọsụ ụzọ, ọ ghaghị inwe usoro ọmụmụ ihe onwe onye dị mma. N’ezie, achọpụtara m na nke ahụ bụ eziokwu. Ọmụmụ ihe, nzukọ, na ozi ahụ aghọwo akụkụ nke ndụ m. Ana m agụ ya dị ka ihe ùgwù ijewo ozi dị ka ọsụ ụzọ oge nile ruo ihe karịrị afọ 50.

Ịnagide Nsogbu Ahụ́ Ike

Otú ọ dị, echewo m ụfọdụ ihe ịma aka ndị pụrụ iche ihu n’ime ọtụtụ iri afọ ndị ikpeazụ nke ndụ m. Na 1962, a chọpụtara na m na-arịa ọrịa anya bụ́ glaucoma. N’oge ahụ, e nwechaghị ọgwụ ya, ọhụhụ ụzọ m kakwara njọ ngwa ngwa. Ahụ́ ike Roy dịkwara njọ, na 1983 kwa, ọ rịara ọrịa strok nke kpọnwụrụ akụkụ ahụ́ ya ụfọdụ ma mee ka ọ ghara ikwuli okwu. Ọ nwụrụ na 1986. O nyewo m nkwado dị ukwuu n’oge m na-eje ozi oge nile, agụụ ya na-agụkwa m n’ezie.

N’agbanyeghị ihe ndọla azụ ndị ahụ, agbalịrị m ịnọgide na-enwe usoro ihe omume ime mmụọ dị mma. Azụtara m ụgbọala siri ike, nke kwesịrị ekwesị maka iji na-aga ozi ubi n’ógbè anyị nke na-emepechaghị emepe, ma nọgide n’ozi ọsụ ụzọ m site n’enyemaka nke nwa m nwanyị bụ́ Joyce. Ọhụhụ ụzọ m nọgidere na-aka njọ ruo mgbe m kwụsịrị kpam kpam iji otu anya m ahụ ụzọ. Ndị dọkịta ji anya e ji ugegbe mee dochie ya. Otú ọ dị, site n’iji ugegbe na-eme ka ihe buo ibu na akwụkwọ ndị e ji mkpụrụ akwụkwọ gbara okpotokpo dee na-eme ihe, ana m eji awa atọ ruo ise na-amụ ihe kwa ụbọchị site n’iji otu anya nke na-ahụtụ ụzọ na-eme ihe.

Oge ọmụmụ ihe abụwo oge dị oké ọnụ ahịa nye m mgbe nile. Ya mere ị pụrụ iche echiche ụdị oké akpata oyi wụrụ m n’ahụ́ mgbe m kwụsịrị ịhụ ihe ọ bụla na mberede n’otu ehihie mgbe m na-amụ ihe. Ọ dị m nnọọ ka a ga-asị na mmadụ gbanyụrụ ọkụ. Ekpuola m ìsì ugbu a kpam kpam. Olee otú m siworo nwee ike ịnọgide na-amụ ihe? Ọ bụ ezie na ntị chitụrụ m ugbu a, m na-eji kaseti a na-ege ege na-eme ihe ma na-adabere ná nkwado ịhụnanya nke ezinụlọ m iji nọgide na-agbasi ike n’ụzọ ime mmụọ.

Ịtachi Obi Ruo Ọgwụgwụ

Ugbu a, dị ka onye gafeworo otu narị afọ, enwewo m nsogbu ahụ́ ike ndị ọzọ, aghaghịkwa m ijiri nnọọ nwayọọ na-eme ihe. Mgbe ụfọdụ, m na-enwetụ mgbagwoju anya. N’ezie, ugbu a m na-adịghị ahụ ụzọ ma ọlị, mgbe ụfọdụ anaghị m ama ebe m nọ n’ezie! Ọ gaara amasị m inwe ndị m ga na-eduziri ọmụmụ Bible ọzọ, ma otú ahụ́ ike m dị ugbu a, apụghịzi m ịpụ apụ iji chọta ha. Na mbụ, nke a mere ka m nwee nkụda mmụọ. Aghaghị m ịmụta ịnakwere erughị eru m ma na-eme ihe ndị m nwere ike ime. Nke a adịbeghịrị m mfe. Otú ọ dị, lee ihe ùgwù ọ bụ na kwa ọnwa, ana m enwe ike inye akụkọ ozi nke oge ụfọdụ m ji kwuo banyere Chineke ukwu anyị, bụ́ Jehova. Mgbe ọ bụla m nwere ohere ikwu banyere Bible, dị ka mgbe ndị nọọsụ, ndị ahịa, na ndị ọzọ bịara ileta m, m na-eji ya eme ihe ozugbo—ọ bụ ezie na m na-eji akọ eme ya.

Otu n’ime ngọzi ndị kasị enye m afọ ojuju bụ ịhụ ka ọgbọ anọ nke ezinụlọ m ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi. Ụfọdụ n’ime ha arụsiwo ọrụ ike iji ruo eruo ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ n’ebe ndị e nwere mkpa dị ukwuu, dị ka ndị okenye ma ọ bụ ndị ohu na-eje ozi, nakwa na Betel. N’ezie, dị ka ọtụtụ n’ime ndị ọgbọ m, atụrụ m anya na ọgwụgwụ nke usoro ihe a ga-abịa ọsọ ọsọ karị. Ma lee mmụba m hụworo n’ime afọ iri asaa m jeworo ozi! Ọ na-enye m afọ ojuju dị ukwuu ịbụ onye kereworo òkè n’ihe dị nnọọ ukwuu otú a.

Ndị nọọsụ na-eleta m na-ekwu na ọ ghaghị ịbụ okwukwe m ka ji m ndụ. Ana m ekwere n’ihe ha kwuru. Ịdị na-arụsi ọrụ ike n’ozi Jehova na-eme ka mmadụ bie ndụ kasị mma. Dị ka Eze Devid, apụrụ m ikwu n’ezie na emewo m agadi, afọ ndụ m jukwara m afọ.—1 Ihe E Mere 29:28.

(Nwanna Nwanyị Muriel Smith nwụrụ n’April 1, 2002, mgbe ọ fọrọ obere ka a kwadebechaa isiokwu a. N’ịbụ onye ọ fọrọ nanị otu ọnwa ka ọ gbaa afọ 102, ọ bụ n’ezie ezi ihe nlereanya n’ikwesị ntụkwasị obi na ịtachi obi.)

[Foto ndị dị na peeji nke 24]

Mgbe m dị ihe dị ka afọ ise nakwa mgbe m dị afọ 19, bụ́ mgbe m zutere di m, bụ́ Roy

[Foto dị na peeji nke 26]

Ụgbọala anyị na ụlọ ahụ ụgbọala na-adọkpụ nke anyị kpọrọ Mizpah

[Foto dị na peeji nke 27]

Mụ na di m, bụ́ Roy, na 1971