Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jiri Iguzosi Ike n’Ihe Na-edo Onwe Gị n’Okpuru Ịbụisi Chineke

Jiri Iguzosi Ike n’Ihe Na-edo Onwe Gị n’Okpuru Ịbụisi Chineke

Jiri Iguzosi Ike n’Ihe Na-edo Onwe Gị n’Okpuru Ịbụisi Chineke

“Jehova bụ onyeikpe anyị, Jehova bụ onye na-enye anyị iwu, Jehova bụ eze anyị.”—AỊSAỊA 33:22.

1. Olee ihe ndị mere ka Izrel oge ochie pụọ iche n’etiti mba nile?

NA 1513 T.O.A., e guzobere mba Izrel. N’oge ahụ, o nweghị isi obodo, ala, na eze a na-ahụ anya. Ụmụ amaala ya bụbu ndị ohu. Otú ọ dị, mba ọhụrụ ahụ pụrụ iche n’ụzọ ọzọkwa. Jehova Chineke bụ Onyeikpe ya, Onye na-enye ya iwu, na Eze ya a na-adịghị ahụ anya. (Ọpụpụ 19:5, 6; Aịsaịa 33:22) Ọ dịghị mba ọ bụla ọzọ pụrụ ikwu nke ahụ!

2. Ajụjụ dị aṅaa na-ebilite banyere ụzọ e si hazie Izrel, n’ihi gịnịkwa ka azịza ya ji dị anyị mkpa?

2 Ebe Jehova bụ Chineke na-eme ihe n’usoro, nakwa Chineke nke udo, anyị ga-atụ anya na mba ọ bụla ọ na-achị ga-abụ nke a haziri nke ọma. (1 Ndị Kọrint 14:33) Nke ahụ bụ nnọọ eziokwu banyere Izrel. Ma olee otú Chineke a na-adịghị ahụ anya pụrụ isi na-eduzi nzukọ a na-ahụ anya dị n’ụwa? Ọ ga-adị mma ka anyị tụlee ụzọ Jehova si chịkwaa mba oge ochie ahụ, na-arịba ama karịsịa otú ụzọ o si mesoo Izrel ihe si mee ka mkpa ọ dị iji iguzosi ike n’ihe na-edo onwe onye n’okpuru ịbụisi Chineke pụta ìhè.

Ụzọ E Si Chịkwaa Izrel Oge Ochie

3. Ndokwa dị aṅaa dị irè ka Jehova mere maka iduzi ndị ya?

3 Ọ bụ ezie na Jehova bụ Eze a na-adịghị ahụ anya nke Izrel, ọ họpụtara ndị ikom kwesịrị ntụkwasị obi dị ka ndị nnọchianya ya a na-ahụ anya. E nwere ndị isi, ndị isi ezinụlọ, na ndị okenye bụ́ ndị jeere ndị ahụ ozi dị ka ndị ndụmọdụ na ndị ikpe. (Ọpụpụ 18:25, 26; Deuterọnọmi 1:15) Otú ọ dị, anyị agatụghị ekwubi na ndị ikom ahụ nwere ibu ọrụ pụrụ iji nnọọ ezi nghọta kpee ikpe n’ụzọ ụfọdụ n’enweghị nduzi Chineke. Ha ezughị okè, ha apụghịkwa ịma ihe dị n’obi ndị ha na ha na-efekọ ofufe. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị ikpe na-atụ egwu Chineke pụrụ inye ndị kwere ekwe ibe ha ndụmọdụ ga-enyere ha aka n’ihi na ọ dabeere n’Iwu Jehova.—Deuterọnọmi 19:15; Abụ Ọma 119:97-100.

4. Ọchịchọ ndị dị aṅaa ka ndị ikpe kwesịrị ntụkwasị obi nke Izrel gbalịsiri ike izere, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

4 Otú ọ dị, ịbụ onye ikpe chọrọ ihe karịrị nanị ịmara Iwu ahụ. Ebe ọ bụ na ndị okenye ahụ ezughị okè, ha aghaghị ịnọ na nche iji zere ọchịchọ ha ọ bụla na-ezighị ezi—dị ka ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, ile mmadụ anya n’ihu, na anyaukwu—nke pụrụ ime ka ha kpee ikpe mkpegbu. Mozis gwara ha, sị: “Unu amatala ihu mmadụ n’ikpe; unu ga-anụ ikpe onye nta na ikpe onye ukwu n’otu ụzọ ahụ; unu atụla ihu mmadụ ụjọ; n’ihi na ikpe ahụ, ọ bụ Chineke nwe ya.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Ee, ọ bụ Chineke ka ndị ikpe Izrel na-ekpere ikpe. Lee ihe ùgwù dị egwu nke ahụ bụ!—Deuterọnọmi 1:16, 17.

5. Tụkwasị n’iguzobe ndị ikpe, olee ndokwa ndị ọzọ Jehova mere iji lekọta ndị ya?

5 Jehova mere ndokwa ndị ọzọ iji lekọta mkpa ime mmụọ nke ndị ya. Ọbụna tupu ha abanye n’Ala Nkwa ahụ, o nyere ha iwu ka ha wuo ụlọikwuu, bụ́ ebe ezi ofufe hiwere isi. O guzobekwara òtù ndị nchụàjà ịkụzi Iwu ahụ, ịchụ àjà ụmụ anụmanụ, na isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ụtụtụ na n’uhuruchi. Chineke mere nwanne Mozis nke tọrọ ya, bụ́ Erọn, onyeisi nchụàjà mbụ nke Izrel ma họpụta ụmụ Erọn inyere nna ha aka n’ọrụ ya.—Ọpụpụ 28:1; Ọnụ Ọgụgụ 3:10; 2 Ihe E Mere 13:10, 11.

6, 7. (a) Olee mmekọrịta dị n’etiti ndị nchụàjà na ndị Livaị na-abụghị ndị nchụàjà? (b) Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’eziokwu ahụ bụ́ na ndị Livaị rụrụ ọrụ dịgasị iche iche? (Ndị Kọlọsi 3:23)

6 Ilekọta mkpa ime mmụọ nke ọtụtụ nde mmadụ bụ ọrụ buru oké ibu, ndị nchụàjà ahụ dịkwa nnọọ ole na ole n’ọnụ ọgụgụ. N’ihi ya, e mere ndokwa ka ndị ọzọ sitere n’ebo Livaị nyere ha aka. Jehova gwara Mozis, sị: “Ị ga-ewerekwa ndị Livaị nye Erọn, nyekwa ụmụ ya ndị ikom: ndị e nyesịworo ya ha nile site n’etiti ụmụ [Izrel] ka ha bụ.”—Ọnụ Ọgụgụ 3:9, 39.

7 A haziri ndị Livaị nke ọma. E kewara ha gaa n’ezinụlọ atọ—ndị Giashọn, ndị Kohat, ndị Merari—nke ọ bụla nwere ọrụ ha na-arụ. (Ọnụ Ọgụgụ 3:14-17, 23-37) Ọ pụrụ ịbụ na ọrụ ụfọdụ dị mkpa karịa ndị ọzọ, ma ha nile dịcha oké mkpa. Ọrụ ndị Livaị sitere n’ezinụlọ Kohat chọrọ ka ha na-anọ igbe ọgbụgba ndụ ahụ dị nsọ na arịa ndị dị n’ụlọikwuu ahụ nso. Otú ọ dị, onye Livaị ọ bụla, ma ọ bụ onye Kohat ma ọ bụ na ọ bụghị, nwere ihe ùgwù magburu onwe ya. (Ọnụ Ọgụgụ 1:51, 53) N’ụzọ dị mwute, ụfọdụ ejighị ihe ùgwù ha kpọrọ ihe. Kama iji iguzosi ike n’ihe na-edo onwe ha n’okpuru ịbụisi Chineke, ha gosipụtara enweghị afọ ojuju ma malite ịdị mpako, inwe oké ọchịchọ, na ikwo ekworo. Onye Livaị aha ya bụ́ Kora bụ otu onye n’ime ha.

“Ùnu Na-achọkwa Ọrụ Nchụàjà?”

8. (a) Ònye bụ Kora? (b) Gịnị pụrụ imewo ka Kora malite ile ndị nchụàjà anya nanị dị ka mmadụ si ele ihe anya?

8 Kora abụghị onyeisi nke ezinụlọ Livaị, ọ bụghịkwa onyeisi ezinụlọ nke ndị Kohat. (Ọnụ Ọgụgụ 3:30, 32) Otú o sina dị, ọ bụ onyeisi a na-akwanyere ùgwù n’Izrel. Ọ pụrụ ịbụ na ọrụ Kora mere ka ya na Erọn na ụmụ ya na-akpachi anya. (Ọnụ Ọgụgụ 4:18, 19) N’ihi iji anya ya na-ahụ ezughị okè nke ndị ikom ndị a, Kora pụrụ ichewo, sị: ‘O doro anya na ndị nchụàjà a ezughị okè, n’agbanyeghị nke ahụ, a na-atụ anya ka m na-edo onwe m n’okpuru ha! N’oge na-adịbeghị anya gara aga, Erọn mere nwa ehi ọlaedo. Ife nwa ehi ahụ ofufe mere ka ndị obodo anyị daba n’ikpere arụsị. Ugbu a, Erọn, bụ́ nwanne Mozis, na-eje ozi dị ka onyeisi nchụàjà! Lee ka nke ahụ si bụrụ imelara mmadụ ihe! Gịnịkwanụ banyere ụmụ Erọn, bụ́ Nedab na Abaịhu? N’ezie, ha gosiri na ha enwetụghị nkwanye ùgwù maka ihe ùgwù ije ozi ha nke na Jehova gburu ha!’ * (Ọpụpụ 32:1-5; Levitikọs 10:1, 2) N’agbanyeghị ihe ọ bụla Kora pụrụ ichewo n’echiche, o doro anya na ọ malitere ile ọkwá onye nchụàjà anya dị ka mmadụ si ele ihe anya. Nke ahụ dugara ya n’inupụ isi megide Mozis na Erọn nakwa, n’ikpeazụ, megide Jehova.—1 Samuel 15:23; Jems 1:14, 15.

9, 10. Ebubo dị aṅaa ka Kora na ndị nnupụisi ibe ya boro Mozis, gịnịkwa mere ha ekwesịghị ime otú ahụ?

9 Ebe Kora bụ onye a na-akwanyere ùgwù, o sighịrị ya ike inweta nkwado nke ndị obi ha na ya bụ otu. Ya na Detan na Abaịram chọtara mmadụ 250 na-akwado ha—ha nile bụcha ndị isi nke nzukọ ahụ. Ha nile bịakwutere Mozis na Erọn ma kwuo, sị: “Nzukọ [Izrel] nile, ha nile n’otu n’otu, dị nsọ, ọ bụkwa n’etiti ha ka Jehova nọ: ọ̀ bụkwa gịnị mere unu na-ebuli onwe unu karịa mkpọkọta nke Jehova?”—Ọnụ Ọgụgụ 16:1-3.

10 Ndị nnupụisi ahụ gaara ama na ha ekwesịghị ịma ịbụisi Mozis aka. N’oge na-adịghị anya tupu mgbe ahụ, Erọn na Miriam emewo otu ihe ahụ. N’ezie, ha nwere ọbụna echiche yiri nke Kora! Dị ka Ọnụ Ọgụgụ 12:1, 2 si kwuo, ha jụrụ, sị: “Ọ̀ bụ ezie na nanị [Mozis] ka Jehova werewooro kwuo okwu? Ọ́ bụghịkwa anyị ka O werewooro kwuo okwu?” Jehova nọ na-ege ntị. O nyere Mozis, Erọn, na Miriam iwu ka ha zukọta n’ọnụ ụzọ nke ụlọikwuu nzute ka O wee nwee ike igosi ha onye ndú ọ họọrọ. Mgbe ahụ, n’ụzọ doro anya, Jehova sịrị: “Ọ bụrụ na onye amụma dị n’etiti unu, n’ọhụụ ka Mụ, bụ́ Jehova, ga-eme ka ọ mara m, na nrọ ka M ga-agwa ya okwu. Ọ bụghị otú a ka ohu m [Mozis] dị; n’ụlọ m nile onye kwesịrị ntụkwasị obi ka ọ bụ.” Mgbe Jehova kwusịrị nke ahụ, o jiri ekpenta nọrọ nwa oge tie Miriam ihe otiti.—Ọnụ Ọgụgụ 12:4-7, 10.

11. Olee otú Mozis si hụ banyere ọnọdụ metụtara Kora?

11 Ọ ghaghị ịbụ na Kora na ndị dụnyeere ya úkwù maara banyere ihe ahụ merenụ. Ha enweghị ihe ngọpụ maka nnupụisi ha. N’agbanyeghị nke ahụ, Mozis ji ndidi gbalịa isoro ha tụgharịa uche. Ọ gbara ha ume ka ha nwekwuo ekele maka ihe ùgwù ha, na-asị: “Ọ̀ bụ unu ihe nta na Chineke nke [Izrel] akpawo ókè n’etiti unu na nzukọ [Izrel], ime ka unu bịaruo nso Ya?” Ee e, ọ bụghị “ihe nta”! Ndị Livaị nwererịị ọrụ dị ukwuu ịrụ. Gịnị ọzọ ka ha pụrụ ịchọ? Ihe ọzọ Mozis kwuru kpughere ihe dị ha n’obi: “Ùnu na-achọkwa ọrụ nchụàjà?” * (Ọnụ Ọgụgụ 12:3; 16:9, 10) Otú ọ dị, olee otú Jehova si meghachi omume n’isi a e nupụrụ megide ịbụisi ya?

Onyeikpe Izrel Emee Ihe

12. Na gịnị ka Izrel ịnọgide soro Chineke na-enwe ezi mmekọrịta dabeere?

12 Mgbe Jehova nyere Izrel Iwu ahụ, ọ gwara ha na ọ bụrụ na ha erube isi, ha ga-aghọ “mba dị nsọ” nakwa na mba ahụ pụrụ ịnọgide na-adị nsọ ma ọ bụrụhaala na ha anọgide na-anakwere ndokwa Jehova. (Ọpụpụ 19:5, 6) Ugbu a, ebe a nọ na-enupụ isi n’ihu ọha, oge ruru ka Onyeikpe Izrel na Onye na-enye ya iwu mee ihe! Mozis gwara Kora, sị: “Gị onwe gị na nzukọ gị nile nọọ n’ihu Jehova, gị, na ha, na Erọn echi: chịrịkwanụ, nwoke ọ bụla ihe ịgụ ọkụ ya, tinyekwa ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’elu ha, wetakwanụ ha nso n’ihu Jehova, nwoke ọ bụla ihe ịgụ ọkụ ya, [narị ihe ịgụ ọkụ abụọ na iri ise]; gị onwe gị kwa, na Erọn, nwoke ọ bụla ihe ịgụ ọkụ ya.”—Ọnụ Ọgụgụ 16:16, 17.

13. (a) Gịnị mere o ji bụrụ mpako n’akụkụ nke ndị nnupụisi ahụ isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ihu Jehova? (b) Olee otú Jehova si mesoo ndị nnupụisi ahụ ihe?

13 Dị ka Iwu Chineke si kwuo, ọ bụ nanị ndị nchụàjà pụrụ isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. Ọbụna echiche ahụ bụ́ onye Livaị na-abụghị onye nchụàjà isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ihu Jehova kwesịrị imewo ka ndị nnupụisi ahụ chebara onwe ha echiche. (Ọpụpụ 30:7; Ọnụ Ọgụgụ 4:16) O meghị ka Kora na ndị na-akwado ya mee otú ahụ! N’echi ya, o “wee kpọkọta nzukọ [Izrel] nile megide [Mozis na Erọn] ruo ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.” Ihe ndekọ ahụ na-agwa anyị, sị: “Jehova wee gwa [Mozis] na Erọn okwu, sị, Kewapụnụ onwe unu n’etiti nzukọ nke a, ka M wee mee ka ha gwụsịa dị ka n’otu ntabi anya.” Ma Mozis na Erọn rịọrọ ka e chebe ndụ ndị ahụ. Jehova nabatara arịrịọ ha. Ma banyere Kora na ndị na-akwado ya, ‘ọkụ si n’ebe Jehova nọ pụta, ripịa narị ndị ikom abụọ na iri ise ahụ na-eweta nso ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ.’—Ọnụ Ọgụgụ 16:19-22, 35. *

14. N’ihi gịnị ka Jehova ji mee nnọọ ihe megide mkpọkọta Izrel?

14 N’ụzọ na-eju anya, ụmụ Izrel ndị hụrụ otú Jehova si mesoo ndị nnupụisi ahụ ihe amụtaghịkwa ihe. “Nzukọ nile nke ụmụ [Izrel] tamuru ntamu n’echi ya megide [Mozis] megidekwa Erọn, sị, Unu onwe unu emewo ka ndị nke Jehova nwụọ.” Ụmụ Izrel ahụ nọ na-adụnyere ndị ahụ gbara izu mmegide úkwù! N’ikpeazụ, ndidi Jehova bịara ná njedebe. Ọ dịghị onye ọ bụla—ọbụna Mozis ma ọ bụ Erọn—nke pụrụ ịrịọchitere ndị ahụ arịrịọ na nke ugbu a. Jehova mere ka ihe otiti dakwasị ndị nnupụisi ahụ, “ma ndị nwụrụ anwụ n’ihe otiti ahụ dị [puku iri na anọ na narị asaa], n’agụghị ndị nwụrụ anwụ n’okwu Kora.”—Ọnụ Ọgụgụ 16:41-49.

15. (a) N’ihi gịnị ka ụmụ Izrel ji kwesị ịdịwo njikere ịnakwere idu ndú Mozis na Erọn? (b) Gịnị ka ihe ndekọ a kụziwooro gị banyere Jehova?

15 Ndị ahụ gaara ezerewo nnọọ ịnwụ. A sị nnọọ na ha chebaara ihe ndị ahụ echiche. Ha gaara ajụwo onwe ha ajụjụ ndị dị ka: ‘Olee ndị gara n’ihu Fero, na-etinye ndụ ha n’ihe ize ndụ? Olee ndị kwuru ka a tọhapụ ụmụ Izrel? Mgbe a gbapụtasịrị Izrel, ònye ka a kpọrọ nanị ya òkù ịrịgota n’Ugwu Horeb iji soro mmụọ ozi Chineke kwurịta okwu ihu na ihu?’ N’ezie, ihe ndekọ dị ịrịba ama e nwere banyere Mozis na Erọn nyere ihe àmà nke iguzosi ike n’ezi ihe ha nye Jehova na ịhụnanya ha nwere n’ebe ndị ahụ nọ. (Ọpụpụ 10:28; 19:24; 24:12-15) Ọ masịghị Jehova igbu ndị nnupụisi ahụ. Otú ọ dị, mgbe o doro anya na ndị ahụ ga-anọgide na-enupụ isi, o mere ihe doro anya. (Ezikiel 33:11) Ihe a nile baara anyị uru nke ukwuu taa. N’ihi gịnị?

Ịmata Ndị E Ji Eme Ihe Taa

16. (a) Ihe àmà dị aṅaa kwesịrị imewo ka ndị Juu narị afọ mbụ kwenye na Jizọs bụ onye nnọchianya nke Jehova? (b) N’ihi gịnị ka Jehova ji dochie anya usoro ndị nchụàjà Livaị, gịnịkwa ka o ji dochie anya ya?

16 Taa, e nwere “mba” ọhụrụ nke nwere Jehova dị ka Onyeikpe, Onye na-enye iwu, na Eze ya a na-adịghị ahụ anya. (Matiu 21:43) E guzobere “mba” ahụ na narị afọ mbụ nke O.A. Ka ọ na-erule n’oge ahụ, e jiwo ọmarịcha ụlọ nsọ dị na Jeruselem, bụ́ ebe ndị Livaị ka na-eje ozi, dochie anya ụlọikwuu nke oge Mozis. (Luk 1:5, 8, 9) Otú ọ dị, n’afọ 29 O.A., e guzobere ụlọ nsọ ọzọ, bụ́ nke ime mmụọ, nke nwere Jizọs Kraịst dị ka Nnukwu Onye Nchụàjà ya. (Ndị Hibru 9:9, 11) Okwu banyere ịbụisi Chineke bilitekwara ọzọ. Ònye ka Jehova gaje iji duo “mba” ọhụrụ a? Jizọs gosipụtara na ya guzosiri ike n’ihe nye Chineke n’ụzọ zuru ezu. Ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya. O mekwara ọtụtụ ihe ịrịba ama dị egwu. Otú ọ dị, dị ka ndị nna nna ha kpọrọ ekwo nkụ, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị Livaị jụrụ ịnakwere Jizọs. (Matiu 26:63-68; Ọrụ 4:5, 6, 18; 5:17) N’ikpeazụ, Jehova jiri usoro ndị nchụàjà dị nnọọ iche dochie anya nke ndị Livaị—òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze. Òtù ndị nchụàjà ahụ bụ́ ndị eze nọgidere ruo n’oge a.

17. (a) Olee ìgwè mejupụtara òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze taa? (b) Olee otú Jehova si eji òtù ndị nchụàjà a bụ́ ndị eze eme ihe?

17 Olee ndị mejupụtara òtù ndị nchụàjà a bụ́ ndị eze taa? Pita onyeozi zara ajụjụ ahụ n’akwụkwọ ozi mbụ o dere n’ike mmụọ nsọ. Nye ndị e tere mmanụ so n’ahụ́ nke Kraịst, Pita dere, sị: “Unu bụ ‘agbụrụ a họọrọ, òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze, mba dị nsọ, otu ndị bụ́ maka ihe onwunwe pụrụ iche, ka unu wee kpọsaa n’ebe nile ịdị mma’ nke onye ahụ kpọpụtara unu n’ọchịchịrị gaa n’ìhè ya dị ebube.” (1 Pita 2:9) Site n’okwu ndị a, o doro anya na, dị ka otu ìgwè, ụmụazụ e tere mmanụ nke Jizọs mejupụtara “òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze” bụ́ nke Pita kpọkwara “mba dị nsọ.” Ọ bụ ha mejupụtara òtù Jehova si n’aka ha enye ndị ya ntụziaka na nduzi ime mmụọ.—Matiu 24:45-47.

18. Njikọ dị aṅaa dị n’etiti ndị okenye a họpụtara ahọpụta na òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze?

18 Ndị na-anọchite anya òtù ndị nchụàjà a bụ́ ndị eze bụ ndị okenye a họpụtara ahọpụta, bụ́ ndị na-ebu ibu ọrụ n’ọgbakọ dị iche iche nke ndị Jehova gburugburu ụwa. Ndị ikom a kwesịrị ka anyị na-akwanyere ha ùgwù ma jiri obi dum na-akwado ha, ma ha so ná ndị e tere mmanụ ma ọ bụ na ha esoghị. N’ihi gịnị? N’ihi na, site na mmụọ nsọ ya, Jehova ahọpụtawo ndị okenye ahụ ịnọ n’ọnọdụ ha. (Ndị Hibru 13:7, 17) Olee otú nke ahụ pụrụ isi bụrụ eziokwu?

19. N’ụzọ dị aṅaa ka mmụọ nsọ si ahọpụta ndị okenye?

19 Ndị okenye a ruru ihe ndị a chọrọ bụ́ ndị e depụtara n’Okwu Chineke, bụ́ nke e dere site n’ike mmụọ Chineke. (1 Timoti 3:1-7; Taịtọs 1:5-9) N’ihi ya, a pụrụ ịsị na ọ bụ mmụọ nsọ họpụtara ha. (Ọrụ 20:28) Ndị okenye aghaghị ịmara Okwu Chineke nke ọma. Dị ka Onyeikpe ahụ Kasị Elu nke họpụtara ha, ndị okenye aghaghị ịkpọ ihe ọ bụla yiri ile mmadụ anya n’ihu n’ikpe asị.—Deuterọnọmi 10:17, 18.

20. Gịnị na-amasị gị banyere ndị okenye na-arụsi ọrụ ike?

20 Kama ịma ịbụisi ha aka, anyị na-enwe ekele n’ezie maka ndị okenye anyị na-arụsi ọrụ ike! Ozi ha jiworo ikwesị ntụkwasị obi na-eje, mgbe mgbe, kemgbe ọtụtụ iri afọ, na-akpali anyị ịtụkwasị ha obi. Ha na-eji ikwesị ntụkwasị obi akwadebe maka nzukọ dị iche iche nke ọgbakọ ma na-eduzi ha, soro anyị na-arụkọ ọrụ n’ikwusa ‘ozi ọma nke Alaeze ahụ,’ ma na-enye anyị ndụmọdụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ mgbe ọ dị anyị mkpa. (Matiu 24:14; Ndị Hibru 10:23, 25; 1 Pita 5:2) Ha na-eleta anyị mgbe anyị na-arịa ọrịa ma na-akasi anyị obi mgbe anyị na-eru újú. Ha na-eji iguzosi ike n’ihe na achọghị ọdịmma onwe onye nanị na-akwado ihe ndị metụtara Alaeze ahụ. Mmụọ Jehova dị n’ahụ́ ha; ha nwere nnwapụta ya.—Ndị Galeshia 5:22, 23.

21. Gịnị ka ndị okenye na-aghaghị ịmara, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

21 N’ezie, ndị okenye ezughị okè. N’ịmara erughị eru ha, ha adịghị anwa ime ka ha bụ ndị nwe ìgwè atụrụ ahụ, bụ́ “ihe nketa nke Chineke.” Kama nke ahụ, ha na-ewere onwe ha dị ka ‘ndị ọrụ ibe ha maka ọṅụ nke ụmụnna ha.’ (1 Pita 5:3; 2 Ndị Kọrint 1:24) Ndị okenye dị obi umeala ma na-arụsi ọrụ ike hụrụ Jehova n’anya, ha makwaara na ka ha na-eṅomikwu ya, otú ahụ ka ha ga-enwekwu ike ime ihe ga-abara ọgbakọ uru. N’iburu nke a n’uche, ha na-agbalịsi ike mgbe nile ịzụlite àgwà Chineke ndị dị ka ịhụnanya, ọmịiko, na ndidi.

22. Olee otú ịtụle ihe ndekọ banyere Kora siworo wusie okwukwe i nwere ná nzukọ a na-ahụ anya nke Jehova ike?

22 Lee ka obi si dị anyị ụtọ inwe Jehova dị ka Onye Ọchịchị anyị a na-adịghị ahụ anya, Jizọs Kraịst dị ka Nnukwu Onye Nchụàjà anyị, ndị so n’òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze dị ka ndị na-ezi anyị ihe, na Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-ekwesị ntụkwasị obi dị ka ndị na-enye anyị ndụmọdụ! Ọ bụ ezie na ọ dịghị nzukọ mmadụ na-eduzi nke pụrụ izu okè, obi dị anyị ụtọ inwe ike isoro ndị kwere ekwe ibe anyị na-ekwesị ntụkwasị obi, bụ́ ndị ji ọṅụ na-edo onwe ha n’okpuru ịchịisi Chineke, na-ejere Chineke ozi!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Ụmụ ndị nwoke abụọ ọzọ nke Erọn, bụ́ Eleeza na Itama, bụ ezi ihe nlereanya n’ozi ha jeere Jehova.—Levitikọs 10:6.

^ par. 11 Ndị ha na Kora so na-agba izu mmegide ahụ, bụ́ Detan na Abaịram, bụ ndị Reuben. N’ihi ya, o doro anya na ọ bụghị ọkwá onye nchụàjà ka ha chọrọ. Na nke ha, idu ndú Mozis nakwa eziokwu ahụ bụ́ na ruo mgbe ahụ e mezubeghị atụmanya ha nke ịbanye n’Ala Nkwa ahụ, na-ewe ha iwe.—Ọnụ Ọgụgụ 16:12-14.

^ par. 13 N’oge ndị nna ochie, onyeisi ezinụlọ ọ bụla na-anọchite anya nwunye ya na ụmụ ya n’ihu Chineke, ọbụna na-achụ àjà n’aha ha. (Jenesis 8:20; 46:1; Job 1:5) Otú ọ dị, mgbe e guzobere Iwu ahụ, Jehova họpụtara ndị ikom sitere n’ezinụlọ Erọn dị ka ndị nchụàjà bụ́ ndị e kwesịrị isi n’aka ha na-achụ àjà. O doro anya na ndị nnupụisi 250 ahụ adịghị njikere ịkwado mgbanwe a e mere n’usoro e ji eme ihe.

Gịnị Ka Ị Mụtaworo?

• Ndokwa ndị dị aṅaa ka Jehova ji ịhụnanya mee iji lekọta ụmụ Izrel?

• Gịnị mere na Kora enweghị ihe ngọpụ maka isi o nupụrụ megide Mozis na Erọn?

• Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ụzọ Jehova si mesoo ndị nnupụisi ahụ ihe?

• Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị na-enwe ekele maka ndokwa ndị Jehova mere taa?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 9]

Ị̀ na-ele ọrụ ọ bụla e kenyere gị n’ozi Jehova anya dị ka ihe ùgwù?

[Foto dị na peeji nke 10]

“Ọ̀ bụkwa gịnị mere unu na-ebuli onwe unu karịa mkpọkọta nke Jehova?”

[Foto dị na peeji nke 13]

Ndị okenye a họpụtara ahọpụta na-anọchi anya òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze