Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbalị Siri Ike—Olee Mgbe Jehova Na-agọzi Ya?

Mgbalị Siri Ike—Olee Mgbe Jehova Na-agọzi Ya?

Mgbalị Siri Ike—Olee Mgbe Jehova Na-agọzi Ya?

“HAA m ka m laa, n’ihi na chi na-abọ.”

“M gaghị aha gị ka ị laa, ma ọ bụrụ na ị gọzighị m.”

“Gịnị bụ aha gị?”

“Jekọb.”

“Ọ bụghị Jekọb ka a ga-akpọ aha gị ọzọ, kama [Izrel]: n’ihi na i jisiwo ike n’ebe Chineke nọ na n’ebe mmadụ nọ, i wee nwee ike.”—Jenesis 32:26-28.

Ihe kpatara mkparịta ụka ahụ na-akpali mmasị bụ ike mgba dị ịrịba ama nke Jekọb dị afọ 97 gosipụtara. Ọ bụ ezie na Bible adịghị akọwa ya dị ka onye na-eme egwuregwu, ya na otu mmụọ ozi ji abalị dum gbaa mgba. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jekọb nwere nchegbu miri emi banyere nkwa Jehova kwere nna nna ya—ihe nketa ya.

Ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ, nwanne Jekọb bụ́ Ịsọ resịrị ya ọnọdụ diọkpara ya n’ihi otu efere ofe. Ugbu a, okwu ruru Jekọb ntị na Ịsọ kpọ ndị ikom 400 na-abịakwute ya. N’ịbụ onye o kwere nghọta na o nwere nchegbu, Jekọb achọọ ka Jehova mesie ya obi ike na ọ ga-emezu nkwa o kwere ya bụ́ na ezinụlọ ya ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ala dị n’ofe nke ọzọ nke Osimiri Jọdan. N’ikwekọ n’ekpere ya, Jekọb emee ihe kwesịrị ekwesị. Ya ejiri mmesapụ aka zigara Ịsọ ahụ na-abịanụ onyinye. Ya emeekwa ihe iji chebe onwe ya, na-ekewa ìgwè ndị ya na ha so ụzọ abụọ ma kpọrọ ndị nwunye ya na ụmụ ya si ná ngabiga mmiri Jabọk gawa. Ya ejirizie mgbalị siri ike na oké anya mmiri dọgbukwuo onwe ya n’ọrụ site n’ịgbaso mmụọ ozi mgba n’abalị dum ka o wee “rịọtara onwe ya ihu ọma.”—Hosea 12:4, NW; Jenesis 32:1-32.

Tụlee otu ihe atụ bu nke ahụ ụzọ bụ́ nke metụtara Rechel, bụ́ nwunye nke abụọ Jekọb na onye nke ọ ka hụ n’anya. Rechel maara nke ọma banyere nkwa Jehova kwere ịgọzi Jekọb. E ji ụmụ anọ gọzie nwanne ya nwanyị bụ́ Lia, bụ́ nwunye nke mbụ Jekọb, ebe Rechel ka bụ nwanyị aga. (Jenesis 29:31-35) Kama imetewere onwe ya ebere, ọ nọgidere na-arịọ Jehova n’ekpere ma na-eme ihe kwekọrọ n’ekpere ya. Dị ka nne ya ochie bụ́ Sera mere n’ebe Hega nọ, Rechel akpọta ohu ya nwanyị bụ́ Bilha ma kpọnye ya Jekọb dị ka iko nwanyị ka, dị ka Rechel si kwuo, “e wee sitekwa na ya [mụtara ọbụna mụ onwe m ụmụ, NW].” * Bilha amụtara Jekọb ụmụ abụọ—Dan na Naftalaị. Mgbe a mụrụ Naftalaị, Rechel ekwupụta ókè mgbalị o ji mmetụta uche mee ruru, sị: “Mgba Chineke ka mụ na nwanne m nwanyị gbaworo, enwewokwa m ike.” E jikwa ụmụ nwoke abụọ ọ mụrụ n’onwe ya, bụ́ Josef na Benjamin, gọzie Rechel.—Jenesis 30:1-8; 35:24.

N’ihi gịnị ka Jehova ji gọzie mgbalị Jekọb na Rechel ji ike ọkpụkpụ aka na mmetụta uche mee? Ha butere uche Jehova ụzọ ma jiri ihe nketa ha kpọrọ ihe. Ha kpesiri ekpere ike maka ngọzi ya ná ndụ ha ma mee ihe n’ụzọ kwekọrọ n’uche Chineke nakwa n’ihe ha rịọrọ.

Dị ka Jekọb na Rechel, ọtụtụ ndị taa pụrụ ịgba akaebe na a chọrọ mgbalị siri ike iji nweta ngọzi Jehova. Mgbe mgbe, anya mmiri, nkụda mmụọ, na obi nkoropụ na-esokarị mgbalị ha. Otu nne bụ́ Onye Kraịst, bụ́ Elizabeth, na-echeta mgbalị siri ike o mere iji maliteghachi ịgachi nzukọ Ndị Kraịst anya mgbe ọ hapụsịrị ya ruo ogologo oge. N’ịbụ onye nwere ụmụ okoro nta ise, di na-ekweghị ekwe, bụrụkwa onye na-eji ụgbọala aga kilomita 30 iji ruo n’Ụlọ Nzukọ Alaeze kasị nso, ọ bụụrụ ya ihe ịma aka. “Ịgbalị ịgachi nzukọ anya chọrọ ọzụzụ onwe onye dị ukwuu, bụ́ nke m maara na ọ baara mụ na ụmụ m uru. O nyeere ha aka ịhụ na nke a bụ ụzọ kwesịrị mgbaso.” Jehova gọziri mgbalị ya. N’ime ụmụ ya atọ ndị na-eje ozi n’ọgbakọ Ndị Kraịst, abụọ bụ ndị ozi oge nile. N’ịbụ onye na-enwe ọṅụ n’ọganihu ime mmụọ ha, ọ na-asị: “Ha etokarịala m n’ụzọ ime mmụọ.” Lee ngọzi o nwetara maka mgbalị siri ike o mere!

Mgbalị Siri Ike nke Jehova Na-agọzi

Itinye mgbalị siri ike na ịrụsi ọrụ ike na-akwụghachi ụgwọ n’ezie. Ka anyị na-etinyekwu mgbalị n’ọrụ ma ọ bụ n’ihe omume e kenyere anyị, otú ahụ ka anyị na-enwetakwu afọ ojuju na ya. Ọ bụ otú Jehova si kee anyị. “Mmadụ ọ bụla nke na-eri ihe, nke na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, nke na-ahụkwa ezi ihe ná ndọgbu nile ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ, onyinye Chineke ka nke ahụ bụ,” ka Eze Solomọn dere. (Eklisiastis 3:13; 5:18, 19) Otú ọ dị, iji nweta ngọzi n’aka Chineke, anyị aghaghị ijide n’aka na anyị chere mgbalị anyị ihu n’ebe kwesịrị ekwesị. Dị ka ihe atụ, ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya ịtụ anya ka Jehova gọzie ụzọ ndụ nke na-eme ka ihe ime mmụọ nọrọ n’ọnọdụ nke abụọ? Onye Kraịst raara onwe ya nye ọ̀ pụrụ ịtụ anya nkwado Jehova ma ọ bụrụ na ọ na-anakwere ọrụ ma ọ bụ ọkwá ga-eme ka mkpakọrịta na ndụmọdụ na-ewusi okwukwe ike a na-enwe ná nzukọ Ndị Kraịst na-efunahụ ya?—Ndị Hibru 10:23-25.

Oge ndụ e ji rụsie ọrụ ike n’ịchụso ọrụ ego ma ọ bụ ihe onwunwe agaghị apụtacha na mmadụ ‘ga-ahụ ezi ihe’ ma ọ bụrụ na o wezụgara ihe ime mmụọ n’ụsọ wee na-eme ya. Jizọs kọwara ihe na-esi ná mgbalị a na-echeghị ihu n’ebe kwesịrị ekwesị apụta n’ihe atụ ya banyere ọgha mkpụrụ. Banyere mkpụrụ ndị “a ghara n’etiti ogwu,” Jizọs kọwara na “nke a bụ onye nke na-anụ okwu ahụ, ma nchegbu nke usoro ihe a na ike dị aghụghọ nke akụ̀ na ụba na-akpagbu okwu ahụ, o wee ghọọ onye na-adịghị amị mkpụrụ.” (Matiu 13:22) Pọl dọkwara aka ná ntị banyere otu ọnyà ahụ ma kwuokwa na ndị na-agbaso ụzọ ndụ nke ịhụ ihe onwunwe n’anya “na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ ọchịchọ amaghị ihe nke na-emerụkwa ahụ́, bụ́ ndị na-akwakpu mmadụ ná mbibi na ịla n’iyi.” Gịnị bụ ihe ngwọta nye ụzọ ndụ dị otú ahụ na-ebibi ihe n’ụzọ ime mmụọ? Pọl gara n’ihu, sị: ‘Gbanahụ ihe ndị a ma tụkwasị olileanya unu, ọ bụghị n’akụ̀ na ụba ndị a na-ejighị n’aka, kama na Chineke, onye na-enye anyị ihe nile n’ụba ka anyị wee nwee ọṅụ.’—1 Timoti 6:9, 11, 17.

N’agbanyeghị afọ ole anyị dị ma ọ bụ afọ ole anyị jewooro Jehova ozi, anyị nile pụrụ irite uru site n’iṅomi mgbalị siri ike Jekọb na Rechel mere. N’ọchịchọ ha na-achọ ihu ọma Chineke, ọ dịghị mgbe ha chefuru ihe nketa ha, n’agbanyeghị otú ọnọdụ ha pụrụ isiwo yie ihe na-eyi egwu ma ọ bụ na-akụda mmụọ. Taa, nrụgide na ihe isi ike ndị anyị na-enwe pụrụ ịbụ nnọọ ndị na-eyi egwu, na-akụda mmụọ, ma ọ bụ ọbụna na-akpata ịda mbà n’obi otú ahụ. Ọnwụnwa dị na ya bụ ịda mbà ná mgbalị anyị ma ghọọ onye ọzọ Setan ga-anwata. Ọ pụrụ iji ihe ọ bụla o nwere ike iji mee ihe, ọ sọ ya ya bụrụ ntụrụndụ, egwuregwu ma ọ bụ ihe omume ntụrụndụ, ọrụ ma ọ bụ ọganihu ihe onwunwe, mezuo nzube ya. A na-atụkarị anya inweta ihe ndị dị mma ma a dịghị enwetakebe ha. Ndị e duhiere ma ọ bụ raba n’itinye aka ná nchụso ndị dị otú ahụ na-achọpụtakarị nnọọ na, ruo n’ókè ka ukwuu, ha na-abụ ndị a na-emezughị olileanya ha. Dị ka Jekọb na Rechel oge ochie, ka anyị zụlite mmụọ nke onye na-agbasi mgba ike ma merie atụmatụ aghụghọ Setan.

Ọ dịghị ihe ga-amasị Ekwensu karịa anyị ịchịli aka elu, na-eche na ‘ọnọdụ anyị nọ na ya bụ nke olileanya na-adịghị na ya. Ọ dịghị ihe anyị pụrụ ime banyere ya. Ọ baghị uru ịgbalịwa.’ N’ihi ya, lee ka o si dị oké mkpa ka anyị nile nọrọ na nche megide ịzụlite àgwà ịda mbà n’obi, na-eche, sị, ‘Ọ dịghị onye hụrụ m n’anya’ na ‘Jehova echefuola m.’ Inwe echiche dị otú ahụ dị ize ndụ. Ọ̀ pụrụ igosi na anyị adawo mbà ma kwụsị ịnọgide na-eme mgbalị ruo mgbe anyị ga-enweta ngọzi? Cheta, Jehova na-agọzi mgbalị siri ike anyị na-eme.

Nọgide Na-eme Mgbalị Iji Nweta Ngọzi Jehova

Ọdịmma ime mmụọ anyị dabeere n’ụzọ dị ukwuu n’anyị ịghọta eziokwu abụọ bụ́ isi banyere ndụ anyị dị ka ndị ohu Jehova. (1) Ọ dịghị onye ọ bụ nanị ya nwere nsogbu, ọrịa, ma ọ bụ ọnọdụ ndị tara akpụ ná ndụ, na (2) Jehova na-ege ntị ná mkpu ákwá nke ndị na-arịọsi ya arịrịọ ike maka enyemaka na ngọzi.—Ọpụpụ 3:7-10; Jems 4:8, 10; 1 Pita 5:8, 9.

N’agbanyeghị otú ọnọdụ gị si taa akpụ ma ọ bụ otú ọ pụrụ isi dị gị ka i rughị eru, adabala ná “mmehie ahụ nke na-ekegide anyị n’ụzọ dị mfe”—enweghị okwukwe. (Ndị Hibru 12:1) Nọgide na-agbalị ruo mgbe i nwetara ngọzi. Nwee ndidi, na-echeta Jekọb merela agadi, bụ́ onye ji abalị dum gbaa mgba iji nweta ngọzi. Dị ka onye ọrụ ubi nke ghara mkpụrụ n’oge opupu ihe ubi ma chere maka owuwe ihe ubi, jiri ndidi na-atụ anya ngọzi Jehova n’ọrụ ime mmụọ gị, n’agbanyeghị otú ọ pụrụ isi dị gị ka ọrụ gị erughị eru. (Jems 5:7, 8) Na-eburukwa okwu ọbụ abụ ahụ n’uche mgbe nile: “Ndị ji anya mmiri agha mkpụrụ ga-eji iti mkpu ọṅụ wee ihe ubi.” (Abụ Ọma 126:5; Ndị Galeshia 6:9) Guzosie ike, ma nọgide na-eso ná ndị na-eme mgbalị.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Ime iko nwanyị dị adị tupu ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, Iwu ahụ kwadokwara ma chịkwaa ya. Chineke ahụtaghị ya dị ka ihe kwesịrị ekwesị ime ka e nweghachi ụkpụrụ nke ịlụ nanị otu nwanyị bụ́ nke o guzobere ná mmalite n’ogige Iden ruo mgbe Jizọs Kraịst pụtara, ma o chebere ndị iko nwanyị site n’iti iwu ndị ga-echebe ha. N’ụzọ ezi uche dị na ya, ndị iko nwanyị rụrụ ọrụ n’ime ka ọnụ ọgụgụ ụmụ Izrel mụbaa ngwa ngwa.