Ndị “Ihe Ndị Dị Ebube nke Chineke” Na-akpali
Ndị “Ihe Ndị Dị Ebube nke Chineke” Na-akpali
“Anyị na-anụ ka ha na-ekwu okwu n’asụsụ anyị banyere ihe ndị dị ebube nke Chineke.”—ỌRỤ 2:11.
1, 2. Olee ihe ịtụnanya mere na Jeruselem na Pentikọst 33 O.A.?
N’OTU ụtụtụ ná ngwụsị oge opupu ihe ubi n’afọ 33 O.A., otu ihe dị ịtụnanya mere otu ìgwè ndị ikom na ndị inyom, bụ́ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst, ndị gbakọtara n’ebe obibi mmadụ nke dị na Jeruselem. “Na mberede e nwekwara ụzụ sitere n’eluigwe dị nnọọ ka oké ifufe nke na-efesi ike, o wee ju ụlọ ahụ dum bụ́ ebe ha nile nọ ala. Ha na-ahụkwa ire ndị dị ka nke ọkụ, . . . ha nile jupụtakwara na mmụọ nsọ wee malite ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche.”—Ọrụ 2:2-4, 15.
2 Ìgwè mmadụ buru ibu gbakọtara n’ihu ụlọ ahụ. Ndị so gbakọta bụ ndị Juu a mụrụ ná mba ọzọ, bụ́ ndị “na-asọpụrụ Chineke,” ndị bịara Jeruselem ime ememe Pentikọst. O juru ha anya n’ihi na onye nke ọ bụla na-anụ ka ndị ahụ na-eso ụzọ na-ekwu okwu n’asụsụ ala ya “banyere ihe ndị dị ebube nke Chineke.” Olee otú nke ahụ pụrụ isi kwe omume ebe ndị nile ahụ na-ekwu okwu bụcha ndị Galili?—Ọrụ 2:5-8, 11.
3. Ozi dị aṅaa ka Pita onyeozi ziri ìgwè ndị ahụ nọ ya na Pentikọst?
3 Otu n’ime ndị Galili ahụ bụ Pita onyeozi. Ọ kọwara na izu ole na ole tupu mgbe ahụ, ndị ajọ omume egbuwo Jizọs Kraịst. Otú Ọrụ 2:22-24, 32, 33, 38) Ya mere, olee otú ndị ahụ na-ekiri ihe na-emenụ si meghachi omume banyere “ihe ndị dị ebube nke Chineke” ndị ha nụrụ? Oleekwa otú ihe ndekọ a pụrụ isi nyere anyị aka ịtụ ozi anyị na-ejere Jehova n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀?
ọ dị, Chineke esiwo ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite Ọkpara ya. Ka e mesịrị, Jizọs mere ka ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya, gụnyere Pita na ndị ọzọ nọ n’ebe ahụ mgbe Pita na-ekwu okwu, hụ ya anya. Nanị ụbọchị iri tupu mgbe ahụ, Jizọs rịgoro n’eluigwe. Ọ bụ ya wụsara ndị na-eso ụzọ ya mmụọ nsọ. Ọ̀ dị ihe nke a pụtaara ndị ahụ na-eme ememe Pentikọst? Ee, ọ dị. Ọnwụ Jizọs meghere ụzọ maka ha ịbụ ndị a gbaghaara mmehie ha nakwa ịnata “mmụọ nsọ ahụ a na-enye n’efu” ma ọ bụrụ na ha egosipụta okwukwe n’ebe ọ nọ. (Ndị A Kpaliri Ime Ihe!
4. Amụma dị aṅaa nke Joel ka e mezuru n’ụbọchị Pentikọst 33 O.A.?
4 Mgbe ndị na-eso ụzọ ahụ nọ na Jeruselem natasịrị mmụọ nsọ, ha egbughị oge ọ bụla n’izisara ndị ọzọ ozi ọma nke nzọpụta ahụ, na-amalite n’ebe ìgwè mmadụ ahụ gbakọtara n’ebe ahụ n’ụtụtụ ahụ nọ. Nkwusa ha mere mezuru otu amụma dị ịrịba ama nke Joel, bụ́ nwa Petuel, dekọrọ narị afọ asatọ tupu mgbe ahụ, sị: “M ga-awụsa Mmụọ m n’ahụ́ anụ ahụ́ nile, bụ́ mmadụ; ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebukwa amụma, ndị okenye unu ga-arọ nrọ, ụmụ okorobịa unu ga-ahụ ọhụụ: ee, ọbụna n’ahụ́ ndị ohu ndị ikom na n’ahụ́ ndị inyom na-eje ozi ka M ga-awụsa Mmụọ m na mgbe ahụ . . . tupu ụbọchị Jehova abịa, bụ́ ụbọchị ahụ dị ukwuu dịkwa egwu.”—Joel 1:1; 2:28, 29, 31; Ọrụ 2:17, 18, 20.
5. N’echiche dị aṅaa ka Ndị Kraịst narị afọ mbụ buru amụma? (Lee ihe odide ala ala peeji.)
5 Nke a ọ̀ pụtara na Chineke gaje ime ka e nwee otu ọgbọ nke ndị amụma, ma ndị ikom ma ndị inyom, ndị ga-eyi Devid, Joel, na Debọra, ma jiri ha buo amụma banyere ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu? Ee e. ‘Ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom, ndị ohu ndị ikom na ndị inyom na-eje ozi’ bụ́ Ndị Kraịst, ga-ebu amụma n’ụdị na mmụọ Jehova ga-akpali ha ikwusa “ihe ndị dị ebube” Jehova meworo na ndị ọ ka ga-eme. Ya mere, ha ga-eje ozi dị ka ọnụ na-ekwuru Onye Kasị Ihe Nile Elu. * Otú ọ dị, olee otú ìgwè mmadụ ahụ si meghachi omume?—Ndị Hibru 1:1, 2.
6. Gịnị ka a kpaliri ọtụtụ n’ime ìgwè mmadụ ahụ ime mgbe ha nụsịrị okwu Pita?
6 Mgbe ìgwè mmadụ ahụ nụchara nkọwa Pita nyere, a kpaliri ọtụtụ n’ime ha ime ihe. Ha “ji obi ha nile nakwere okwu ya,” e wee ‘mee ha baptizim, a tụkwasịkwara ihe dị ka puku mkpụrụ obi atọ n’ụbọchị ahụ.’ (Ọrụ 2:41) Ebe ha bụ ndị Juu anụ ahụ́ na ndị na-eso ụzọ ndị Juu, ha nwererịị ihe ọmụma bụ́ isi nke Akwụkwọ Nsọ. Nke ahụ, tinyere okwukwe ha nwere n’ihe ha mụtara n’ọnụ Pita, mere ka e nwee ihe ndabere maka ime ha baptizim “n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ.” (Matiu 28:19) Mgbe e mesịrị ha baptizim, “ha nọgidesikwara ike n’ozizi nke ndịozi.” N’otu oge ahụ, ha malitere ịgwa ndị ọzọ nkwenkwe ọhụrụ ha. N’ezie, “kwa ụbọchị kwa, ha ji otu obi na-anọ mgbe nile n’ụlọ nsọ, . . . na-enye Chineke otuto ma na-ahụta ihu ọma n’ebe mmadụ nile nọ.” N’ihi ọrụ ịgba àmà ha, “Jehova nọgidere kwa ụbọchị na-atụkwasịrị ha ndị a na-azọpụta.” (Ọrụ 2:42, 46, 47) E guzobere ọgbakọ Ndị Kraịst n’ọtụtụ ala ebe ndị ọhụrụ a kwere ekwe bi. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na, ma ọ dịghị ihe ọzọ n’otu akụkụ, mmụba a bụ n’ihi mgbalị ha ji ịnụ ọkụ n’obi mee n’ikwusa “ozi ọma” ahụ mgbe ha laghachiri n’obodo ha.—Ndị Kọlọsi 1:23.
Okwu Chineke Na-akpa Ike
7. (a) Gịnị na-adọta ndị sitere ná mba nile ná nzukọ Jehova taa? (b) Ihe ndị dị aṅaa na-egosi na a pụrụ inwekwu mmụba ka ị na-ahụ n’ubi zuru ụwa ọnụ na n’ógbè gị? (Lee ihe odide ala ala peeji.)
7 Gịnị banyere ndị na-achọ ịghọ ndị ohu Chineke taa? Ọ dịkwa ha onwe ha mkpa iji nlezianya na-amụ Okwu Chineke. Ka ha na-eme otú ahụ, ha na-abịa mara Jehova dị ka Chineke nke “nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu.” (Ọpụpụ 34:6; Ọrụ 13:48) Ha na-amụta banyere ihe mgbapụta Jehova ji obiọma nye site n’aka Jizọs Kraịst, bụ́ onye ọbara ya a wụsịrị pụrụ ime ka ha dị ọcha pụọ ná mmehie nile. (1 Jọn 1:7) Ha na-abịakwa nwee ekele maka nzube Chineke ime ka e nwee “mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” (Ọrụ 24:15) Obi ha na-ejupụta n’ịhụnanya maka Isi Iyi nke ‘ihe ndị a dị ebube,’ a na-akpalikwa ha ikwusa eziokwu ndị a dị oké ọnụ ahịa. Ha na-aghọzi ndị ohu Chineke raara onwe ha nye e mere baptizim ma nọgide “na-aba ụba n’ezi ihe ọmụma nke Chineke.” *—Ndị Kọlọsi 1:10b; 2 Ndị Kọrint 5:14.
8-10. (a) Olee otú ahụmahụ nke otu nwanyị bụ́ Onye Kraịst si gosi na Okwu Chineke “na-akpa ike”? (b) Gịnị ka ahụmahụ a kụziwooro gị banyere Jehova na otú o si emeso ndị ohu ya ihe? (Ọpụpụ 4:12)
8 Ihe ọmụma nke ndị ohu Chineke na-enweta site n’ọmụmụ Bible ha abụghị nke elu ọnụ. Ihe ọmụma dị otú ahụ na-akpali obi ha, na-agbanwe ụzọ ha si eche echiche, ma na-anọgide n’ime ha. (Ndị Hibru 4:12) Dị ka ihe atụ, e were otu nwanyị aha ya bụ Camille n’ọrụ dị ka onye na-elekọta ndị agadi. Otu n’ime ndị ọ na-elekọta bụ Martha, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ebe ọ bụ na Martha nwere isi mgbaka, ọ dị mkpa ka a na-elekọta ya mgbe nile. A ghaghị ichetara ya ka o rie nri—ọbụna ilo nri ya. Otú ọ dị, ọ dị otu ihe nke na-adịghị apụ apụ n’uche Martha, dị ka anyị ga-ahụ.
9 Otu ụbọchị, Martha hụrụ ka Camille na-ebe ákwá n’ihi obi erughị ala nke nsogbu ọ na-enwe kpatara. Martha konyere Camille aka ma gwa ya ka o soro ya mụọ Bible. Ma onye nọ n’ọnọdụ Martha ọ̀ pụrụ iduzi ọmụmụ Bible? Ee, ọ pụrụ! Ọ bụ ezie na Martha echefuola ọtụtụ ihe, o chefubeghị Chineke ya dị ebube; o chefubeghịkwa eziokwu ndị dị oké ọnụ ahịa ọ mụtara na Bible. N’oge ọmụmụ ihe ahụ, Martha na-agwa Camille ka ọ gụọ paragraf nke ọ bụla, sapeta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha, gụpụta ajụjụ dị n’ala ala peeji ahụ, ma zaa ya. Nke a gara n’ihu ruo oge ụfọdụ, n’agbanyeghịkwa erughị eru nke Martha, Camille nwere ọganihu n’ihe ọmụma Bible. Martha chọpụtara na ọ dị Camille mkpa isoro ndị ọzọ nwere mmasị ijere Chineke ozi na-akpakọrịta. N’iburu nke ahụ n’uche, o nyere onye a ọ na-amụrụ ihe uwe na akpụkpọ ụkwụ, ka Camille wee nwee ike inwe ihe kwesịrị ekwesị ọ ga-eyi mgbe ọ ga-aga nzukọ mbụ ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.
10 Mmasị ịhụnanya, ihe nlereanya, na nkwenye siri ike nke Martha kpaliri Camille. O kpebiri na ihe Martha na-agbalị ịkụziri ya site na Bible dị oké mkpa, ebe ọ bụ na ọ fọrọ nke nta ka Martha chefuo ihe nile ma e wezụga
ihe ọ mụtara n’Akwụkwọ Nsọ. Mgbe e mesịrị, mgbe a kpọfere Camille n’ebe ọzọ, ọ ghọtara na oge eruwo ka ya mee ihe. N’ohere mbụ o nwere, ọ gara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, na-eyi uwe na akpụkpọ ụkwụ ahụ Martha nyere ya, ma rịọ ka a mụọrọ ya Bible. Camille nwere ọganihu dị mma, e mekwara ya baptizim.Ndị A Kpaliri Igosipụta Ụkpụrụ Jehova
11. Tụkwasị n’ịbụ ndị na-anụ ọkụ n’obi n’ọrụ nkwusa ahụ, olee otú anyị pụrụ isi gosi na ozi Alaeze ahụ akpaliwo anyị?
11 Taa, e nwere ihe karịrị nde Ndịàmà Jehova isii na-ekwusa ‘ozi ọma nke Alaeze ahụ’ n’ụwa nile, dị ka Martha, nakwa Camille ka ọ dị ugbu a, na-eme. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Dị ka Ndị Kraịst narị afọ mbụ, “ihe ndị dị ebube nke Chineke” kpaliri ha n’ụzọ dị ukwuu. Ha nwere ekele na ha nwere ihe ùgwù nke ịza aha Jehova nakwa na ọ wụsawo ha mmụọ ya. N’ihi ya, ha na-eme mgbalị nile iji “na-eje ije n’ụzọ kwesịrị Jehova iji bụrụ ndị na-eme ihe na-amasị ya n’ụzọ zuru ezu,” na-etinye ụkpụrụ ya n’ọrụ n’akụkụ nile nke ndụ ha. Tinyere ihe ndị ọzọ, nke a na-agụnye ịkwanyere ụkpụrụ Chineke banyere uwe na ejiji ùgwù.—Ndị Kọlọsi 1:10a; Taịtọs 2:10.
12. Ndụmọdụ dị aṅaa a kapịrị ọnụ banyere uwe na ejiji ka anyị na-achọta na 1 Timoti 2:9, 10?
12 Ee, Jehova esetịpụwo ụkpụrụ n’ihe banyere ọdịdị onwe onye anyị. Pọl onyeozi gosiri ụfọdụ ihe ndị Chineke chọrọ na nke a. “Achọrọ m ka ụmụ nwanyị jiri uwe a haziri nke ọma na-achọ onwe ha mma n’imeru ihe n’ókè na uche zuru okè, ọ bụghị n’ụdị dị iche iche nke ịkpa isi na ọlaedo ma ọ bụ nkume pel ma ọ bụ ejiji dị nnọọ oké ọnụ, kama n’ụzọ kwesịrị ụmụ nwanyị ndị na-ekwupụta na ha na-asọpụrụ Chineke, ya bụ, site n’ezi ọrụ.” * Gịnị ka anyị na-amụta site n’okwu ndị a?—1 Timoti 2:9, 10.
13. (a) Gịnị ka “uwe a haziri nke ọma” pụtara? (b) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na ụkpụrụ Jehova bụ ndị ezi uche dị na ha?
13 Okwu Pọl na-egosi na Ndị Kraịst kwesịrị ‘iji uwe a haziri nke ọma na-achọ onwe ha mma.’ Ha ekwesịghị ịdị nkịrịka ma ọ bụ ruo unyi. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile, ọbụna ndị ihe ha na-akpata dị ala, pụrụ itinye ụkpụrụ ahụ ezi uche dị na ya n’ọrụ site n’ịhụ na uwe ha na-adị ọcha ma na-adị mma ile anya. Dị ka ihe atụ, kwa afọ, Ndịàmà bi n’otu mba dị n’Ebe Ndịda America na-eji ụkwụ eje ije ruo ọtụtụ kilomita site n’oké ọhịa, e mesịakwa, ha na-eji ụgbọ epeepe mee njem ruo ọtụtụ awa iji gaa mgbakọ distrikti ha. Mmadụ ịdanye ná mmiri ma ọ bụ ihe ikowara mmadụ ákwà ya n’ọhịa mgbe ha na-eme njem ahụ abụghị ihe ọhụrụ. Ya mere, mgbe ndị ahụ na-aga mgbakọ ruru n’ebe a ga-enwe mgbakọ ahụ, ha na-adịtụ nkịrịka. N’ihi ya, ha na-ewepụta oge dụnye bọtin uwe ha, mezie zip ha, ma saa uwe ndị ha ga-eyi gaa mgbakọ ahụ ma dee ha. Ha ji òkù a kpọrọ ha ịbịa rie ihe na tebụl Jehova kpọrọ ihe, ha chọkwara iji ejiji kwesịrị ekwesị.
14. (a) Gịnị ka iji ‘imeru ihe n’ókè na uche zuru okè’ na-eji ejiji pụtara? (b) Gịnị ka anyị iji ejiji ‘dị ka ndị na-ekwupụta nsọpụrụ Chineke’ chọrọ anyị n’aka?
14 Pọl kwukwara na anyị kwesịrị iji ‘imeru ihe n’ókè na uche zuru okè’ na-eji ejiji. Nke a na-apụta na ejiji anyị ekwesịghị ịbụ nke a na-agba nkiri, nke mara mma gabiga ókè, nke na-akpali agụụ mmekọahụ, ma ọ bụ nke na-ewu ewu. Tụkwasị na nke ahụ, anyị kwesịrị iji ejiji n’ụzọ ga-egosipụta ‘nsọpụrụ nye Chineke.’ Nke ahụ na-akpali anyị iche echiche, ọ́ bụghị ya? Ọ bụghị nanị okwu banyere iji ejiji kwesịrị ekwesị mgbe anyị na-aga nzukọ ọgbakọ dị iche iche, ma na-eji ejiji otú masịziri anyị n’oge ndị ọzọ. Ọdịdị onwe onye anyị kwesịrị ịdị na-egosipụta nsọpụrụ ofufe mgbe nile, n’ihi na anyị bụ Ndị Kraịst na ndị ozi n’oge nile. O kwere ghọta na uwe anyị ji arụ ọrụ na nke anyị ji aga ụlọ akwụkwọ ga-ekwesị ekwesị maka ihe ndị anyị ji ha na-eme. Otú o sina dị, anyị kwesịrị iji ejiji n’ụzọ kwesịrị ekwesị ma dị ùgwù. Ọ bụrụ na ejiji anyị na-egosi mgbe nile na anyị kwere na Chineke, ọ dịghị mgbe anyị ga-ala azụ ịgba àmà mberede n’ihi na ejiji anyị na-eme anyị ihere.—1 Pita 3:15.
‘Ahụla Ụwa n’Anya’
15, 16. (a) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị zere iṅomi ụwa n’ihe banyere uwe na ejiji? (1 John 5:19) (b) N’ihi ihe dị aṅaa kwesịrị ekwesị ka anyị ji kwesị izere uwe na ejiji ndị na-ewu ewu?
15 Ndụmọdụ ahụ e dekọrọ na 1 John 2:15, 16 na-enyekwa nduzi banyere uwe na ejiji ndị anyị na-ahọrọ. Anyị na-agụ, sị: “Ahụla ụwa ma ọ bụ ihe ndị dị n’ụwa n’anya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ahụ ụwa n’anya, ịhụnanya maka Nna ahụ adịghị n’ime ya; n’ihi na ihe ọ bụla dị n’ụwa—ọchịchọ nke anụ ahụ́ na ọchịchọ nke anya na oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ—adịghị esite ná Nna ahụ, kama ọ na-esite n’ụwa.”
16 Lee ka ndụmọdụ ahụ si bụrụ ihe bịara n’ezi oge! N’ọgbọ a nrụgide ndị ọgbọ siri nnọọ ike na ya karịa mgbe ọ bụla ọzọ, anyị agatụghị ekwe ka ụwa na-agwa anyị ụdị uwe anyị ga na-eyi. Otú e si akwa uwe na otú e si eji ejiji akawo njọ n’afọ ndị na-adịbeghị anya. Ọbụna otú ndị ọchụnta ego na ndị ọkachamara kwuru a ga-esi na-eji ejiji adịghị esetịpụ ụkpụrụ a pụrụ ịdabere na ya mgbe nile banyere ihe kwesịịrị Ndị Kraịst. Nke a bụ ihe ọzọ mere anyị ji kwesị ịmara mgbe nile mkpa ọ dị ‘ịkwụsị ịbụ ndị a na-eme ka ha yie usoro ihe nke a,’ ma ọ bụrụ na anyị ga-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke ma si otú ahụ ‘na-achọ ozizi nke Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Chineke, mma n’ihe nile.’—17. (a) Ajụjụ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ ịtụle mgbe anyị na-azụ uwe ma ọ bụ na-ahọrọ otú anyị ga-esi kwaa ya? (b) N’ihi gịnị ka ndị isi ezinụlọ ji kwesị ilebara ejiji nke ndị ezinụlọ ha anya?
17 Tupu ị na-ekpebi ma ị ga-azụ otu uwe, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịjụ onwe gị, sị: ‘Olee ihe mere ụdị uwe a ji amasị m? Ọ̀ bụ nke e ji mara otu onye a ma ama na-eme egwuregwu—onye m nwere mmasị n’ebe ọ nọ? Ndị òtù okporo ámá ma ọ bụ òtù na-akwalite mmụọ onye mere otú masịrị ya hà ejirila ya mere ejiji ha?’ Anyị kwesịkwara ileru uwe ahụ anya nke ọma. Ọ bụrụ na ọ bụ uwe mwụda ma ọ bụ sket, olee otú ogologo ya ha? Olee otú e si kwaa ya? Uwe ahụ ọ̀ dị mma, kwesị ekwesị, ma dị ùgwù, ka ọ̀ na-arapara n’ahụ́, na-akpali agụụ mmekọahụ, ma ọ bụ dị nkịrịka? Jụọ onwe gị, sị, ‘Mụ iyi uwe a ọ̀ ga-akpata ihe ịsụ ngọngọ?’ (2 Ndị Kọrint 6:3, 4) N’ihi gịnị ka nke ahụ ji kwesị ịdị na-echegbu anyị? Ọ bụ n’ihi na Bible na-asị: “Ọbụna Kraịst ahụ emeghị ihe masịrị ya onwe ya.” (Ndị Rom 15:3) Ndị isi ezinụlọ bụ́ Ndị Kraịst aghaghị ịdị na-elebara ejiji nke ndị ezinụlọ ha anya. N’ihi nkwanye ùgwù maka Chineke dị ebube bụ́ onye ha na-efe ofufe, ndị isi ezinụlọ ekwesịghị ịla azụ n’iji ịhụnanya nye ndụmọdụ siri ike ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa.—Jems 3:13.
18. Gịnị na-akpali gị ịdị na-elebara uwe na ejiji gị anya nke ọma?
18 Ozi anyị na-ezi sitere n’aka Jehova, bụ́ onye kwesịrị nsọpụrụ ma dị nsọ. (Aịsaịa 6:3) Bible na-agba anyị ume iṅomi ya “dị ka ụmụ a hụrụ n’anya.” (Ndị Efesọs 5:1) Uwe na ejiji anyị pụrụ ime ka e kwuo okwu ọma ma ọ bụ nke ọjọọ banyere Nna anyị nke eluigwe. N’ezie anyị na-achọ ime ka obi ya ṅụrịa!—Ilu 27:11.
19. Uru ndị dị aṅaa ka a na-erite site n’ime ka ndị ọzọ mara “ihe ndị dị ebube nke Chineke”?
19 Olee otú “ihe ndị dị ebube nke Chineke” ndị ị mụtaworo dị gị? N’ezie, lee ka anyị si bụrụ ndị nwere ihe ùgwù ịmụtawo eziokwu ahụ! Ebe ọ bụ na anyị na-egosipụta okwukwe n’ọbara Jizọs Kraịst a wụsịrị, a na-agbaghara anyị mmehie anyị. (Ọrụ 2:38) N’ihi ya, anyị nwere nkwuwa okwu n’ihu Chineke. Anyị adịghị atụ ọnwụ egwu dị ka ndị na-enweghị olileanya na-atụ ya. Kama nke ahụ, anyị nwere mmesi obi ike nke Jizọs nyere na otu ụbọchị “ndị nile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya wee pụta.” (Jọn 5:28, 29) Jehova abụwo onye amara n’ikpughere anyị ihe a nile. Tụkwasị na nke ahụ, ọ wụsawo anyị mmụọ ya. N’ihi ya, inwe ekele maka ezi onyinye a nile kwesịrị ịkpali anyị ịkwanyere ụkpụrụ ya ndị dị elu ùgwù nakwa iji ịnụ ọkụ n’obi na-eto ya, na-akpọsara ndị ọzọ ‘ihe ndị a dị ebube.’
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 5 Mgbe Jehova họpụtara Mozis na Erọn ịgwa Fero okwu n’aha ndị ya, Ọ gwara Mozis, sị: “Emewo m ka ị ghọọrọ Fero chi: Erọn, bụ́ nwanne gị, ga-abụkwa onye amụma gị.” (Ọpụpụ 7:1, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Erọn jere ozi dị ka onye amụma, ọ bụghị n’echiche nke ibu amụma banyere ihe ga-eme n’ọdịnihu, kama site n’ịghọ ọnụ na-ekwuru Mozis.
^ par. 7 N’ime ìgwè mmadụ buru ibu bịara ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị a na-eme kwa afọ bụ́ nke e mere na March 28, 2002, ọtụtụ nde amalitebeghị ijere Jehova ozi. Ekpere anyị bụ ka a kpalie obi ndị a nwere mmasị ịgbalịsi ike inweta ihe ùgwù nke ịbụ ndị nkwusa nke ozi ọma ahụ.
^ par. 12 Ọ bụ ezie na ọ bụ ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst ka Pọl na-agwa okwu, otu ụkpụrụ ahụ metụtakwara ndị ikom na ndị na-eto eto bụ́ Ndị Kraịst.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
• ‘Ihe ndị dị aṅaa dị ebube’ ka ndị mmadụ nụrụ banyere ha na Pentikọst 33 O.A., oleekwa otú ndị ahụ si meghachi omume?
• Olee otú mmadụ si aghọ onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst, gịnịkwa ka ịbụ onye na-eso ụzọ na-agụnye?
• Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị lebara uwe na ejiji anyị anya?
• Olee ihe ndị e kwesịrị ịtụle mgbe a na-ekpebi ma uwe ma ọ bụ otú e si kwaa ya ò kwesịrị ekwesị?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 15]
Pita kwupụtara na e siwo ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite Jizọs
[Foto ndị dị na peeji nke 17]
Ọdịdị gị ọ̀ na-ekwu ihe ọma banyere Chineke ị na-efe ofufe?
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst aghaghị ịdị na-elebara ejiji nke ndị ezinụlọ ha anya