Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndụ Nkwenkwe Ụgha Na-achịkwa

Ndụ Nkwenkwe Ụgha Na-achịkwa

Ndụ Nkwenkwe Ụgha Na-achịkwa

I ZUKWUURU mmadụ n’ike mgbe i si n’ụlọ gị na-apụ. Ị kpọrọ ụkwụ na nkume. Otu ụdị nnụnụ bere n’abalị. Ị rọrọ otu ụdị nrọ ugboro ugboro. Ihe ndị a bụ ihe ndị na-adịghị ihe ha bụ nye ọtụtụ ndị. Ma nye ụfọdụ ndị bi n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa, a pụrụ ile ihe ndị a anya dị ka ihe ịrịba ama, ihe àmà ọdịnihu, ma ọ bụ ozi sitere n’ógbè ndị bụ́ mmụọ. A na-atụ anya na ma ọ́ bụghị ihe ọma na-aga ime ọ bụrụ ihe ọjọọ, na-adabere n’ụdị ihe àmà ọ bụ na otú e si kọwaa ya.

N’ezie, e nwekwara nkwenkwe ụgha n’ebe ndị ọzọ na-abụghị Africa. N’agbanyeghị na ha ebiwo ọtụtụ afọ dị ka ndị na-ekweghị na Chineke dị, ọnụ ọgụgụ na-atụ n’anya nke ndị bi na China nakwa na rịpọblik ndị dị n’ebe bụbu Soviet Union ka kwenyesiri ike na nkwenkwe ụgha. N’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, ọtụtụ ndị ka na-enyocha nkọwa akara eluigwe ha, na-atụ Friday ọ bụla manyere n’ụbọchị 13 n’ọnwa egwu, ma na-ezere nwamba ojii. Ụfọdụ ndị bi n’Ime Ime Ebe Ugwu na-ele ìhè nke ebe ugwu anya dị ka ihe àmà nke agha na ọrịa na-efe efe. N’India, ndị na-anya gwongworo bụ́ ndị kweere na ọ dị ha mkpa inwe mmekọahụ ka ahụ́ wee jụọ ha oyi n’ụbọchị anwụ na-achasi ike anọwo na-ebunye ndị mmadụ ọrịa AIDS. Na Japan, ndị na-arụ ọwa mmiri kweere na nwanyị ịbanye n’ọwa mmiri tupu a rụchaa ya na-eweta chi ọjọọ. Nkwenkwe ụgha jupụtakwara n’egwuregwu ndị e ji mere aka ọrụ. Ọbụna otu onye na-akụ volleyball kwuru na ihe mere ya ji nwee mmeri ugboro ugboro bụ n’ihi na ya na-eyi sọks ojii kama iyi nke ọcha. Ihe ndị e nwere nkwenkwe ụgha na ha enweghị nsọtụ.

Gịnị banyere gị? Ị̀ na-atụ ụjọ nzuzo ị na-apụghị ịkọwa isi ya? “Nkwenkwe, nkwenkwe na-ezughị ezu, ma ọ bụ ihe omume ndị o yiri ka a pụghị ịkọwa isi ha” hà na-emetụta gị? Azịza gị pụrụ igosi ma ọ̀ na-emetụta gị, n’ihi na nke ahụ bụ otú otu akwụkwọ si kọwaa okwu ahụ bụ́ “nkwenkwe ụgha.”

Onye kwere ka nkwenkwe ụgha na-emetụta mkpebi na ihe ndị ọ na-eme n’ụbọchị na-ekwe ka ihe ọ na-aghọtaghị n’ezie na-achịkwa ndụ ya. Amamihe ọ̀ dị na ya? Ò kwesịrị ka anyị nọrọ n’okpuru mmetụta dị otú ahụ na-edoghị anya na nke dị njọ ma eleghị anya? Nkwenkwe ụgha ọ̀ bụ ntụpọ na-adịghị ihe o mere ka ọ bụ ihe iyi egwu dị ize ndụ?