Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nkwenkwe Ụgha Ọ̀ Na-achịkwa Ndụ Gị?

Nkwenkwe Ụgha Ọ̀ Na-achịkwa Ndụ Gị?

Nkwenkwe Ụgha Ọ̀ Na-achịkwa Ndụ Gị?

E NWERE nkwenkwe ụgha n’ebe nile n’ụwa. Mgbe ụfọdụ, a na-eji ha akpọrọ ihe dị ka akụkụ nke ihe nketa ọdịbendị. Ma ọ bụ, a pụrụ iwere ha dị ka ihe ndị na-akpalitụ mmasị—na-eme ka ndụ dị ụtọ. N’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, a dịghị ejikebe nkwenkwe ụgha akpọrọ ihe. N’ebe ndị ọzọ—dị ka ihe atụ, n’Africa—nkwenkwe ụgha pụrụ imetụta ndụ ndị mmadụ n’ụzọ siri ike.

Ihe ka ukwuu n’ọdịbendị ndị Africa dabeere na nkwenkwe ụgha. Ihe nkiri sịnịma, ihe omume redio, na akwụkwọ ndị a na-ebipụta n’Africa na-egosikarị nkwenkwe ụgha na ihe omimi ndị dị ka majik, ife ndị nna ochie ofufe, na ọtụmọkpọ. N’ihi gịnị ka nkwenkwe ụgha ji emetụta ndị mmadụ otú ahụ, ebeekwa ka nkwenkwe ụgha sitere?

Gịnị Mere E Ji Enwe Nkwenkwe Ụgha?

Ọtụtụ nkwenkwe ụgha malitere n’ụzọ bụ́ isi n’ihi egwu a na-atụ mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ ma ọ bụ ụdị mmụọ ọ bụla ọzọ. A na-akọwa ihe omume ụfọdụ dị ka mgbalị mmụọ ndị a na-eme iji yie ndị dị ndụ egwu, dọọ ha aka ná ntị, ma ọ bụ gọzie ha.

Nkwenkwe ụgha na ọgwụgwọ na ọgwụ nwekwara njikọ chiri anya. Nye ihe ka ọtụtụ ná ndị bi ná mba ndị ka na-emepe emepe, ọgwụ ọgbara ọhụrụ dara oké ọnụ, mgbe mgbekwa, ha na-abụ ndị a na-adịghị enweta enweta. N’ihi ya, ọtụtụ ndị na-achọ ọgwụgwọ ma ọ bụ na-anwa igbochi ọrịa site n’ịgbaso omenala ndị nna nna ha, itinye aka ná mgbaasị, na nkwenkwe ụgha. Ahụ́ na-akakwa eru ha ala ịgakwuru dibịa afa bụ́ onye maara omenala ha ma na-asụ olu mba ha karịa ịgakwuru dibịa Bekee. N’ụzọ dị otú a, a nọgidere na-enwe nkwenkwe ụgha.

Ọdịnala ndị dabeere na nkwenkwe ụgha na-egosi na ọrịa na ihe mberede abụghị nanị ihe ndabara, kama na ha bụ ihe ikike ndị sitere n’ógbè ndị bụ́ mmụọ kpatara. Ndị dibịa afa pụrụ ikwu na obi adịghị otu nna nna nwụrụ anwụ mma n’ihi otu ihe. Ma ọ bụ, ndị na-ajụ ndị mmụọ ase pụrụ inye echiche na ọ dị onye si n’aka dibịa afa ọzọ kọọ onye ahụ ọgwụ, nakwa na ọ bụ ya mere ọrịa ma ọ bụ ihe mberede ji dakwasị onye ahụ.

Nkwenkwe ụgha dịgasị nnọọ iche iche n’ebe nile n’ụwa, otú e si akwalite ha na-adaberekwa n’akụkọ ọdịnala, akụkọ mgbe ochie, na ọnọdụ ndị e nwere n’ógbè ahụ. Ma otu ihe e nwekọrọ ọnụ bụ nkwenkwe bụ́ na ọ dị mkpa ime ka obi jụrụ onye, ma ọ bụ ihe, sitere n’ógbè ndị bụ́ mmụọ a na-adịghị ahụ anya.

Ọ̀ Bụ Ihe Na-adịghị Emerụ Ahụ́ Ka Ọ̀ Bụ Ihe Dị Ize Ndụ?

Nye ọtụtụ ezinụlọ, ịmụ ejima bụ ihe a na-adịghị ahụkebe na nke na-akpali akpali. Otú ọ dị, nye ndị nwere nkwenkwe ụgha, a pụrụ ịkọwa ya dị ka ihe ama. N’ógbè ụfọdụ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa, ọtụtụ ndị na-ele ya anya na ọ bụ chi ka a mụrụ, a na-efekwa ejima ofufe. Ọ bụrụ na otu n’ime ụmụ ejima ahụ ma ọ bụ ha abụọ anwụọ, a na-eme ihe oyiyi ndị na-anọchite anya ụmụ ejima ahụ, ezinụlọ ahụ aghaghịkwa ịdị na-enye arụsị ndị a nri. N’ebe ndị ọzọ, ndị mmadụ na-ele ịmụ ejima anya dị ka ọbụbụ ọnụ, nke na ụfọdụ ndị mụrụ ha na-egbu ma ọ dịkarịa ala otu n’ime ha. N’ihi gịnị? Ha kweere na ọ bụrụ na ụmụ ejima ahụ dịrị ndụ, ha ga-egbu ndị mụrụ ha otu ụbọchị.

Ihe atụ ndị yiri ndị a na-egosi na ọ bụ ezie na ụfọdụ nkwenkwe ụgha pụrụ iyi ihe na-atụ n’anya na ihe na-adịghị ihe o mere, ndị ọzọ pụrụ ịdị ize ndụ—ọbụna na-akpata ọnwụ. Site n’ịkọwa ya n’ụzọ ọjọọ, a pụrụ ịgbanwe ihe na-adịghị emerụ ahụ́ ịghọ ihe dị ize ndụ.

Ee, n’ezie, nkwenkwe ụgha bụ nkwenkwe, otu ụdị nke okpukpe. N’iburu akụkụ dị ize ndụ nke nkwenkwe ụgha n’uche, ọ dị mma ịjụ, sị: Ònye n’ezie ka nkwenkwe na omume ndị dabeere na nkwenkwe ụgha na-abara uru?

Ebe Nkwenkwe Ụgha Sitere

N’agbanyeghị ihe àmà ndị na-egosi na Setan dị adị, ụfọdụ ndị taa adịghị achọ ikweta na Setan ma ọ bụ ndị ajọ mmụọ dị adị. Otú ọ dị, n’oge agha, ịjụ ikweta na e nwere onye iro dị ize ndụ pụrụ nanị ịkpata ọdachi. Otu ihe ahụ pụrụ ime n’ọgụ a na-alụso ndị mmụọ e kere eke karịrị ike mmadụ n’ihi na Pọl onyeozi dere, sị: “Anyị nwere mgba . . . megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ.”—Ndị Efesọs 6:12.

Ọ bụ ezie na anyị apụghị ịhụ ha, ndị ajọ mmụọ e kere eke dị adị. Bible na-akọ na, dị nnọọ ka ọkà n’ịtụgharị ụda olu na-eji nwa bebi ekwu okwu, otu onye bụ́ mmụọ a na-adịghị ahụ anya ji agwọ gwa nwanyị mbụ bụ́ Iv okwu, ma duga ya n’inupụrụ Chineke isi. (Jenesis 3:1-5) Bible na-akọwa onye a bụ́ mmụọ dị ka “agwọ mbụ ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa dum mmadụ bi.” (Mkpughe 12:9) Onye ahụ, bụ́ Setan, nwere ihe ịga nke ọma n’ịraba ndị mmụọ ozi ndị ọzọ n’inupụ isi. (Jud 6) Ndị ajọ mmụọ a ghọrọ ndị mmụọ ọjọọ, ndị iro Chineke.

Jizọs chụpụrụ ndị mmụọ ọjọọ n’ahụ́ ndị mmadụ, dịkwa ka ndị na-eso ụzọ ya mere. (Mak 1:34; Ọrụ 16:18) Ndị mmụọ a abụghị ndị nna nna nwụrụ anwụ, n’ihi na ndị nwụrụ anwụ “adịghị ama ihe ọ bụla.” (Eklisiastis 9:5) Kama nke ahụ, ha bụ ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi bụ́ ndị Setan duhiere. Ịgakwuru ha ma ọ bụ ido onwe anyị n’okpuru ha abụghị ihe a ga-eji gwurie egwu, n’ihi na ha, dị nnọọ ka onye ndú ha, bụ́ Setan Ekwensu, ga-achọ iripịa anyị. (1 Pita 5:8) Ihe mgbaru ọsọ ha bụ ichigharị anyị ihu pụọ na nanị olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ—Alaeze Chineke.

Bible na-ekpughe otu n’ime ụzọ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya si eme ihe: “Setan n’onwe ya anọgidewo na-enwogha onwe ya ịbụ mmụọ ozi nke ìhè.” (2 Ndị Kọrint 11:14) Ọ ga-amasị Setan iduhie anyị ikwere na ọ pụrụ igosi anyị ụzọ ndụ ka mma. N’ihi ya, ọ pụrụ iyi ka a ga-erite uru ụfọdụ na-adịru nwa oge ma ndị ajọ mmụọ tinye aka. Ma ha apụghị inye ihe ngwọta na-adịgide adịgide. (2 Pita 2:4) Ọ pụghị ikwe ha omume inye mmadụ ọ bụla ndụ ebighị ebi, a ga-ebibikwa ha n’isi nso. (Ndị Rom 16:20) Onye Okike anyị bụ nanị onye pụrụ inye ndụ ebighị ebi na ezi obi ụtọ na nchebe ọ bụla pụrụ ikwe omume pụọ n’ebe ndị ajọ mmụọ nọ.—Jems 4:7.

Chineke na-akatọ ịchọ enyemaka site n’ime mgbaasị. (Deuterọnọmi 18:10-12; 2 Ndị Eze 21:6) Nke ahụ bụ iso onye iro na-akpakọ, iso ndị na-emebi aha Chineke na-ejikọ aka! Inyocha nkọwa akara eluigwe, ịjụ dibịa afa ase, ma ọ bụ ime ụdị mgbaasị ọ bụla ga-apụta ikwe ka ndị mmụọ ọjọọ na-achịkwa mkpebi ndị ị na-eme ná ndụ gị. Ya na isonyere ha ná nnupụisi ha megide Chineke bụ otu ihe ahụ.

Nchebe Pụọ n’Ihe Ọjọọ—Ò Kwere Omume?

Ade, * bụ́ otu nwoke bi na Niger, so otu onye nkwusa oge nile nke Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Ade kọwara ihe mere o ji nwee ọtụmọkpọ n’ụlọ ahịa ya: “Ndị iro dị ọtụtụ.” Onye na-amụrụ Ade Bible gosiri ya na ọ bụ nanị Jehova ka a pụrụ ịtụkwasị obi maka ezi nchebe. Ọ gụọrọ Ade Abụ Ọma 34:7, bụ́ nke na-asị: “Mmụọ ozi nke Jehova na-ama ụlọikwuu ya gburugburu ndị na-atụ egwu Ya, O wee dọpụta ha.” Ade kpebiri, sị: “Ọ bụrụ na Jehova pụrụ ichebe m n’ezie, aga m ewepụzi ọtụmọkpọ a.” Ugbu a, mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, ọ na-eje ozi dị ka okenye na onye ozi oge nile. Ọ dịbeghị otu n’ime ndị iro ya merụrụ ya ahụ́.

Bible na-egosi na mgbe na ihe ndapụta na-adabara anyị nile, ma ànyị nwere nkwenkwe ụgha ma ọ bụ na anyị enweghị. (Eklisiastis 9:11) Ma ọ dịghị mgbe Jehova na-eji ihe ọjọọ ele anyị ule. (Jems 1:13) Ọnwụ na ezughị okè bụ n’ihi mmehie anyị ketara n’aka Adam. (Ndị Rom 5:12) N’ihi nke a, onye ọ bụla na-ada ọrịa site n’oge ruo n’oge ma na-ehie ụzọ ndị pụrụ ịkpata ọdachi. Ya mere, ọ ga-abụ ihe na-ezighị ezi ikwu na ọ bụ ndị ajọ mmụọ na-akpata ọrịa nile ma ọ bụ nsogbu nile nke ndụ. Nanị ihe nkwenkwe dị otú ahụ ga-eme bụ ịnwa anyị ime ka obi jụrụ ndị mmụọ n’ụzọ ụfọdụ. * Mgbe anyị dara ọrịa, anyị kwesịrị ịchọ nlekọta ahụ́ ike kwesịrị ekwesị, ọ bụghị ndụmọdụ sitere n’aka ‘onye ụgha, na nna nke ụgha,’ bụ́ Setan Ekwensu. (Jọn 8:44) Ndekọ ọnụ ọgụgụ na-egosi na ndị bi ná mba ebe ọtụtụ mmadụ nwere nkwenkwe ụgha sitere n’aka ndị nna nna adịghị adị ogologo ndụ ma ọ bụ ndụ ka mma karịa ndị bi ná mba ndị ọzọ. Mgbe ahụ, o doro anya na nkwenkwe ụgha adịghị aba uru ọ bụla n’ụzọ ahụ́ ike.

Chineke dị ike karịa ajọ mmụọ ọ bụla, O nwekwara mmasị n’ọdịmma anyị. “Anya Jehova na-elekwasị ndị ezi omume, ntị ya dịkwa n’arịrịọ ha na-arịọsi ike.” (1 Pita 3:12) Kpekuo ya ekpere maka nchebe na amamihe. (Ilu 15:29; 18:10) Mee mgbalị iji ghọta Okwu Nsọ ya, bụ́ Bible. Ezi ihe ọmụma nke Bible bụ ihe nchebe kasịnụ anyị pụrụ inwe. Ọ ga-enyere anyị aka ịghọta ihe mere ihe ọjọọ ji eme na otú anyị pụrụ isi nweta ihu ọma nke Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile.

Abamuru nke Inwe Ihe Ọmụma Banyere Chineke

Inwe ezi ihe ọmụma banyere Jehova na nzube ya—ihe na-emegide amaghị ihe na nkwenkwe ụgha—bụ isi ihe na-eduga n’inweta ezi nchebe. Nke a pụtara ìhè n’ebe Jean, bụ́ nwoke si Benin, nọ. Nkwenkwe ụgha gbanyesiri mkpọrọgwụ ike n’ezinụlọ Jean. Dị ka omenala agbụrụ ha bụ́ nke dabeere na nkwenkwe ụgha si dị, nwanyị mụrụ nwa nwoke ọhụrụ aghaghị ịnọ ụbọchị itoolu n’ụlọ akịrịka a rụrụ n’ụzọ pụrụ iche. Ọ bụrụ na ọ mụrụ nwanyị, ọ ga-anọ ụbọchị asaa n’ụlọ akịrịka ahụ.

Na 1975, nwunye Jean mụrụ nwatakịrị nwoke mara mma ile anya, bụ́ onye ha gụrụ Marc. N’ihi ihe ọmụma Bible ha nwere, Jean na nwunye ya achọghị itinye aka n’ihe ọ bụla metụtara ndị ajọ mmụọ. Ma hà ga-eji n’ihi egwu na nrụgide nke ịgbaso nkwenkwe ụgha kwere ka nne nwa ahụ nọrọ n’ụlọ akịrịka? Ee e—ha jụrụ nkwenkwe ụgha a ndị agbụrụ ha nwere.—Ndị Rom 6:16; 2 Ndị Kọrint 6:14, 15.

Ọ̀ dị ihe ọjọọ ọ bụla mere ezinụlọ Jean? Ọtụtụ afọ agafewo, Marc na-ejekwa ozi ugbu a dị ka ohu na-eje ozi n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova nke dị n’ógbè ha. Obi dị ezinụlọ ahụ dum ụtọ na ha ekweghị ka nkwenkwe ụgha metụta ndụ ha ma tinye ọdịmma ime mmụọ ha n’ihe ize ndụ.—1 Ndị Kọrint 10:21, 22.

Ezi Ndị Kraịst aghaghị izere omume dị iche iche metụtara nkwenkwe ụgha ma nakwere ìhè ime mmụọ nke Onye Okike, bụ́ Jehova, na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, na-enye. N’ụzọ dị otú a, ha pụrụ inwe udo nke uche bụ́ nke ha ga-enwe n’ihi ịmara na ha na-eme ihe ziri ezi n’anya Chineke.—Jọn 8:32.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 20 A gbanwewo aha ndị ahụ.

^ par. 21 Lee isiokwu bụ́ “Ekwensu Ọ̀ Na-eme Ka Anyị Daa Ọrịa?” n’Ụlọ Nche nke September 1, 1999.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 5]

Ụfọdụ Nkwenkwe Ụgha Ndị E Nwegasịrị Gburugburu Ụwa

• Mkpịsị osisi e ji eri nri nke kwụ ọtọ n’efere osikapa bụ ihe àmà nke ọnwụ

• Ịhụ ikwiikwii mgbe anwụ na-acha na-eweta chi ọjọọ

• Ọkụ kandụl ịnyụ mgbe a na-eme ememe pụtara na ndị ajọ mmụọ nọ nso

• Ịtọgbọ nche anwụ n’ala ụlọ pụtara na a ga-egbu mmadụ n’ụlọ ahụ

• Idebe okpu n’elu ihe ndina na-eweta chi ọjọọ

• Ụda mgbịrịgba na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ

• Ịfụnyụ ọkụ kandụl nile dị n’elu achịcha keki e ji eme ememe ncheta ọmụmụ n’otu mgbe na-eme ka e nweta ihe a rịọrọ

• Ázị́zà a tụkwasịrị n’ahụ́ ihe ndina na-eme ka ndị ajọ mmụọ nọ n’ázị́zà ahụ nwee ike ịkọ ihe ndina ahụ ọgwụ

• Nwamba ojii isi n’ụzọ gị gafee na-eweta chi ọjọọ

• Ngaji eze ịdapụnahụ gị pụtara na nwoke na-abịa na nke gị

• Foto enyí na-eweta chi ọma ma ọ bụrụ na o chere ihu n’ọnụ ụzọ

• Ihe a na-ekpunye n’ụkwụ ịnyịnya bụ́ nke e kokwasịrị n’elu ọnụ ụzọ na-eweta chi ọma

• Osisi ivy nke na-eto n’ụlọ na-enye nchebe pụọ n’ihe ọjọọ

• Ije ije n’okpuru ubube na-eweta chi ọjọọ

• Itiwa enyo pụtara na a ga-enwe chi ọjọọ ruo afọ asaa

• Ịkwafu ose pụtara na gị na ezigbo enyi gị ga-arụrịta ụka

• Ịkwafu nnú na-eweta chi ọjọọ ọ gwụla ma a wụsara onye ahụ obere nnú n’ubu aka ekpe ya

• Ịhapụ oche ndagharị ka ọ na-adagharị n’adịghị onye nọ na ya na-akpọ ndị mmụọ ọjọọ òkù ịbịa nọrọ na ya

• Ikpu akpụkpọ ụkwụ ihu n’ala na-eweta chi ọjọọ

• Mgbe mmadụ nwụrụ, a ghaghị ighewe windo oghe ka mkpụrụ obi ya wee pụọ

[Igbe dị na peeji nke 6]

E Mere Ka O Nwere Onwe Ya Pụọ n’Agbụ nke Nkwenkwe Ụgha

Ndịàmà Jehova nọ na-eme nkwusa n’otu ógbè dị na South Africa. Mgbe otu ọnụ ụzọ mepere ka ha kụsịrị aka na ya, Ndịàmà ahụ hụrụ otu nwanyị jiri nnọọ ejiji Sangoma (dibịa afa). Ha chọrọ ịpụ, ma nwanyị ahụ siri ọnwụ ka ha zie ozi ha ji bịa. Otu n’ime Ndịàmà ahụ gụrụ Deuterọnọmi 18:10-12 iji gosi ya ihe bụ́ echiche Bible banyere mgbaasị. Dibịa afa ahụ nabatara ozi ahụ ma kwere ka e duziere ya ọmụmụ Bible. O kwuru na ọ bụrụ na e mere ka ya kwenye, site n’ọmụmụ Bible ya, na ịbụ Sangoma megidere uche Jehova, na ya ga-akwụsị ya.

Mgbe o jisịrị Bible mụọ isi nke 10 n’akwụkwọ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala, o suru ihe nile o ji agba afa ọkụ ma malite ịga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọzọkwa, o mere ka alụmdi na nwunye ya dịghachi mma, n’agbanyeghị na ya na di ya kewara ruo afọ 17. Ugbu a, ha abụọ bụ Ndịàmà Jehova raara onwe ha nye, e mere baptizim.

[Foto dị na peeji nke 6]

Onye “Sangoma” na-atụpụ ọkpụkpụ iji chọpụta ihe kpatara nsogbu onye ọrịa

[Foto dị na peeji nke 7]

Inwe ezi ihe ọmụma banyere Chineke na-eweta ezi nchebe na obi ụtọ