Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Okwu Chineke Na-akpa Ike’

‘Okwu Chineke Na-akpa Ike’

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

‘Okwu Chineke Na-akpa Ike’

N’ÀGWÀETITI Caribbean nke anwụ na-achasi ike na ya bụ́ Jamaica, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ maara Bible. N’ezie, a pụrụ ịhụ nsụgharị Bible King James Version n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ebe obibi nile, ụfọdụ ndị ahụwokwa na “okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.” (Ndị Hibru 4:12) Ike a pụrụ ịgbanwe ndụ, dị ka ahụmahụ na-esonụ na-egosi.

Otu nwoke aha ya bụ Cleveland ka si nnọọ ọrụ lọta mgbe otu n’ime Ndịàmà Jehova bịara na nke ya. Mgbe Onyeàmà ahụ sosịrị ya kerịta isi ihe ụfọdụ sitere n’Akwụkwọ Nsọ, o nyefere ya akwụkwọ ahụ e ji amụ Bible bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Cleveland amaghị otú Okwu Chineke gaje ịkparu ike ná ndụ ya.

Cleveland na-adị ekpe ekpere ugboro atọ n’ụbọchị, na-arịọ Chineke ka o nyere ya aka ịchọta ụzọ ziri ezi isi fee Ya ofufe. Cleveland kwenyesiri ike na ụzọ ndị mụrụ ya si efe ofufe ezighị ezi, ma mgbe ọ tụlesịrị okpukpe ndị ọzọ, ọ bịara nwee nkụda mmụọ. Ọ bụ ezie na ọ nụwo banyere Ndịàmà Jehova, obi esighị ya ike na ha nwere eziokwu ahụ. N’agbanyeghị obi abụọ o nwere, Cleveland kweere iso Onyeàmà ahụ bịara na nke ya mụọ Bible. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ chọrọ igosi na ihe Ndịàmà na-ekwu abụghị eziokwu!

N’oge na-adịghị anya, Cleveland mụtara na mmekọrịta rụrụ arụ o so ndị inyom abụọ na-enwe adịghị amasị Chineke. (1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Mgbe ọ mụsịrị ihe nanị ugboro abụọ, ọ bịara nwee obi ike ịkwụsị mmekọrịta ya na ndị inyom ahụ. Ọ malitekwara ịga nzukọ Ndị Kraịst n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ma nke a bụụrụ ya ule ọzọ.

Cleveland bụ onye a ma ama n’òtù egwuregwu bọl e nwere n’ógbè ya, egwuregwu ha na-egbochikwa ya ịga nzukọ. Gịnị ka ọ ga-eme? N’agbanyeghị nrụgide kpụ ọkụ n’ọnụ sitere n’aka ndị òtù egwuregwu ya, onye na-enye ya ọzụzụ, na ndị enyi ya, Cleveland kpebiri ịpụ n’òtù egwuregwu bọl ahụ. Ee, Okwu Chineke nọ na-amalite ịkpa ike, na-akpali ya ime ihe dị mma!

Ike nke Okwu Chineke pụtakwara ìhè ọzọ mgbe Cleveland malitere iso ndị ọzọ na-ekerịta ihe ọmụma Bible. (Ọrụ 1:8) N’ihi ya, mmadụ abụọ n’ime ndị ya na ha nọbu n’òtù egwuregwu bọl malitere ịga nzukọ nke Ndịàmà Jehova. Mgbe Cleveland rusịrị eru ịghọ onye na-ekwusa ozi ọma, o nwetara ọṅụ dị ukwuu n’ozi ahụ, na-eji Okwu Chineke enyere ndị ọzọ aka.

N’ịbụ onye ike nke Okwu Chineke nọgidere na-akpali, Cleveland mesịrị gosipụta nrara ọ raara onwe ya nye Jehova site na baptizim ime mmiri, o nwekwara ihe ùgwù nke ije ozi dị ka onye ozi oge nile nakwa dị ka ohu na-eje ozi n’ọgbakọ.

Na Jamaica nakwa gburugburu ụwa, ọtụtụ puku mmadụ abịawo mụta na, n’ezie, Okwu Chineke “dị ndụ ma na-akpa ike.”

[Map/Foto dị na peeji nke 8]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

JAMAICA

[Ebe E Si Nweta Foto]

Map na ụwa: Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.