Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otu Ihe A Na-amụta Site n’Aka Ụgbala

Otu Ihe A Na-amụta Site n’Aka Ụgbala

Otu Ihe A Na-amụta Site n’Aka Ụgbala

“ỌBỤNA ụgbala n’eluigwe maara mgbe ya nile a kara aka; . . . ma ndị m amaghị ikpe Jehova.” (Jeremaịa 8:7) Jeremaịa onye amụma ji okwu ndị ahụ kpọsaa ikpe Jehova megide ndị Juda si n’ezi ofufe dapụ, bụ́ ndị hapụworo Jehova bụ́ Chineke ha ma na-efezi chi dị iche iche nke ala ọzọ. (Jeremaịa 7:18, 31) Gịnị mere Jeremaịa ji họrọ ụgbala dị ka ihe ọ ga-eji kụziere ndị Juu na-ekwesịghị ntụkwasị obi ihe gbara ọkpụrụkpụ?

Ndị Izrel na-ahụkarị ụgbala, karịsịa ụgbala ọcha, ka ha na-esi n’otu ebe efega n’ebe ọzọ n’ala ndị a kpọtụrụ aha na Bible. Aha Hibru e ji eme ihe maka nnụnụ a buru ibu nke nwere ụkwụ ogologo ma na-anọkarị n’akụkụ mmiri bụ ụdị okwu e ji eme ihe n’ebe onye bụ́ nwanyị nọ, nke pụtara “onye na-eguzosi ike n’ihe; onye nwere obiọma sitere n’ịhụnanya.” Nke a dabara adaba, n’ihi na n’adịghị ka ihe ka ọtụtụ ná nnụnụ ndị ọzọ, oké ụgbala ọcha na nne ụgbala ọcha na-akpakọ ruo ogologo ndụ ha nile. Mgbe ha nọsịrị n’ógbè okpomọkụ iji zere oge oyi, ihe ka ọtụtụ n’ụgbala na-alaghachi site n’afọ ruo n’afọ n’otu akwụ́ ahụ ha nọrọ n’oge gara aga.

Akparamàgwà ụgbala bu pụta ụwa na-egosipụta àgwà iguzosi ike n’ihe n’ụzọ ndị ọzọ dị ịrịba ama. Ma nnụnụ nke oké ma nke nne na-agbakọ aka ekpukọ àkwá ma na-azụ ụmụ ha. Akwụkwọ bụ́ Our Magnificent Wildlife na-akọwa, sị: “Nne ụgbala na oké ụgbala na-ekwesị ntụkwasị obi n’ụzọ na-enweghị atụ. Otu oké ụgbala na Germany fegoro n’elu waya eletrik, ọkụ adọgbuo ya. Nke nne nọgidere na-ekpukọ àkwá ya nanị ya ruo ụbọchị 3, bụ́ mgbe o si n’akwụ́ pụọ nanị otu ugboro ruo nwa oge ịchọ ihe oriri. . . . N’ọnọdụ ọzọ, mgbe a gbagburu otu nne ụgbala, nke oké zụrụ ụmụ ya.”

N’ezie, site n’ikwesị ntụkwasị obi o bu pụta ụwa nye nke ya na ya na-akpakọrịta n’ogologo ndụ ya na iji ọmịiko na-elekọta ụmụ ya, ụgbala na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ihe aha ya pụtara—“onye na-eguzosi ike n’ihe.” N’ụzọ dị otú a, ụgbala kụziiri ụmụ Izrel ahụ na-adịghị ekwesị ntụkwasị obi ma dị isi ike ihe gbara ọkpụrụkpụ.

Nye ọtụtụ ndị taa, iguzosi ike n’ihe na ikwesị ntụkwasị obi bụ echiche mgbe ochie—ndị e nwere mmasị na ha ma a dịghị eme ha eme. Ịrị elu nke ịgba alụkwaghịm, mgbahapụ, iri ego, na ụdị aghụghọ ndị ọzọ na-egosi na a dịghịzi eji iguzosi ike n’ihe akpọrọ ihe. N’ụzọ dị iche, Bible na-eji iguzosi ike n’ihe nke ịhụnanya na obiọma kpaliri akpọrọ ihe nke ukwuu. Ọ na-agba Ndị Kraịst ume “[iyikwasị] ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ bụ́ nke e kere dị ka uche Chineke si dị n’ezi omume na iguzosi ike n’ihe.” (Ndị Efesọs 4:24) Ee, ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ na-enyere anyị aka iguzosi ike n’ihe, ma anyị pụkwara ịmụta banyere iguzosi ike n’ihe site n’aka ụgbala.