Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Yoga—Ọ̀ Bụ Nanị Usoro Mmega Ahụ́ Ka Ọ̀ Dị Ihe Ọzọ Ọ Bụ?

Yoga—Ọ̀ Bụ Nanị Usoro Mmega Ahụ́ Ka Ọ̀ Dị Ihe Ọzọ Ọ Bụ?

Yoga—Ọ̀ Bụ Nanị Usoro Mmega Ahụ́ Ka Ọ̀ Dị Ihe Ọzọ Ọ Bụ?

INWE ahụ́ gịrịgịrị na nke gbasiri ike dị ndị mmadụ n’obi nke ukwuu taa. Nke a emewo ka ọtụtụ mmadụ na-aga n’ụlọ egwuregwu nakwa n’òtù ndị na-ahụ maka ahụ́ ike iji nweta enyemaka. N’ihi otu nzube ahụ, ọtụtụ puku ndị bi n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa emewela yoga bụ́ nkà malitere n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa.

Ndị na-enwe oké nchekasị, ịda mba n’obi, na nkụda mmụọ na-emezi yoga iji nweta nkasị obi na iji gwọọ nsogbu ha. Karịsịa, ọ bụ kemgbe afọ ndị 1960, bụ́ iri afọ nke ụmụ agamevu na nke ụmụ agarachaa, ka mmasị e nwere n’okpukpe nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa nakwa n’ihe ndị dị omimi ha na-eme gbasaruru ebe nile n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa. Ndị a ma ama n’ime ihe nkiri sịnịma nakwa n’iti egwu rock emewo ka ụdị ntụgharị uche nke na-eme ka uche mmadụ kpapụ, bụ́ nke ya na yoga kwụ aga, bụrụ ihe na-ewu ewu. N’ihi oké mmasị e nwere na yoga, anyị pụrụ ịjụ: ‘Yoga ọ̀ bụ nanị usoro mmega ahụ́ nke ga-eme ka ahụ́ onye na-eme ya dị gịrịgịrị ma gbasie ike, meekwa ka obi rutụ ya ala? À pụrụ ime yoga n’ewebataghị ihe ọ bụla metụtara okpukpe na ya? Yoga ò kwesịịrị Ndị Kraịst?’

Ebe Yoga Si Malite

Mmalite nke okwu ahụ bụ́ “yoga” na nke okwu Igbo bụ́ “yok” nwere njikọ. Ọ pụrụ ịpụta ijikọ ihe ọnụ ma ọ bụ ime ka ihe nọrọ n’okpuru, ijikọ ma ọ bụ ịchịkwa. Nye onye Hindu, yoga bụ usoro ma ọ bụ ihe omume nke na-eduga n’ịbụ onye e jikọtara ya na ikike ma ọ bụ mmụọ dị elu bụ́ nke karịrị ike mmadụ. A kọwawo ya dị ka “ijikọta ike nile nke ahụ́, uche na mkpụrụ obi n’ebe Chineke nọ.”

Ole mgbe n’akụkọ ihe mere eme ka a pụrụ ikwu na yoga malitere? Ihe osise ndị mmadụ bụ́ ndị nọ ka hà na-eme yoga dị n’akara ndị a hụrụ na Ndagwurugwu Indus, nke dị na Pakistan nke oge a. Ndị ọkà mmụta ihe ochie kwuru na Ndagwurugwu Indus malitere mmepeanya n’agbata narị afọ iri nke atọ na nke abụọ T.O.A., bụ́ oge dị nnọọ nso n’oge Mesọpotemia mepere anya. Ihe ndị e nwetara n’ebe abụọ ahụ na-egosi nwoke, nke na-anọchite anya otu chi, bụ́ nke e kpukwasịrị okpu nwere mpi anụmanụ, nke ụmụ anụmanụ gbakwara gburugburu, bụ́ nke na-echetara anyị Nimrọd, bụ́ “dike n’ịchụ nta.” (Jenesis 10:8, 9) Ndị Hindu na-ekwu na ndị ahụ e sere ka ha nọ dị ka ndị na-eme yoga bụ ihe oyiyi dị iche iche nke chi bụ́ Siva, bụ́ onye nwe ụmụ anụmanụ na onye nwe yoga, onye a na-ejikarị lingam, bụ́ ihe oyiyi nke akụkụ ahụ́ e ji enwe mmekọahụ, efe ofufe. N’ihi ya, akwụkwọ bụ́ Hindu World na-akpọ yoga “usoro iwu nke ịta onwe onye ahụhụ, bụ́ nke malitere n’ụzọ bụ́ isi tupu oge ndị Aryan, ma nwee njimara nke ọtụtụ echiche na ememe nke ndị mgbe ochie.”

Na mbụ, ọ bụ ọnụ ka e ji mee ka a mara usoro e ji eme yoga. E mesịa, onye amamihe na-eme yoga bụ́ onye India bụ́ Patañjali deturu ya edetu n’ụzọ zuru ezu ka ọ bụrụ Yoga Sutra, nke nọgidere bụrụ akwụkwọ ndụmọdụ bụ́ isi nke yoga. Dị ka Patañjali si kwuo, yoga bụ “mgbalị e mere n’usoro iji ruo izu okè, site n’ịchịkwa akụkụ dị iche iche nke ọdịdị mmadụ, nke anụ ahụ́ na nke uche.” Site n’oge ọ malitere ruo ugbu a, yoga abụwo ihe omume bụ́ isi n’okpukpe nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, ndị buzi ya n’isi bụ okpukpe Hindu, okpukpe Jain, na okpukpe Buddha. Ụfọdụ ndị na-eme yoga kweere na ọ pụrụ iduga ha n’inweta moksha, ma ọ bụ ntọhapụ, site n’ịbụ onye e jikọrọ ya na mmụọ zuru ebe nile.

Ya mere, anyị na-ajụkwa ọzọ, sị: ‘À pụrụ ime yoga nanị dị ka usoro mmega ahụ́ iji nweta ezi ahụ́ ike na obi iru ala, n’ewebataghị ihe ọ bụla metụtara okpukpe na ya?’ N’ihi ebe o si malite, azịza ya aghaghị ịbụ ee e.

Ebee Ka Yoga Pụrụ Iduga Gị?

Nzube e ji enye ọzụzụ yoga bụ iji mee ka mmadụ nwee ahụmahụ ime mmụọ nke ịbụ onye ‘e jikọrọ’ ya na mmụọ karịrị ike mmadụ. Ma olee mmụọ nke ahụ ga-abụ?

N’akwụkwọ bụ́ Hindu World, onye edemede bụ́ Benjamin Walker na-ekwu banyere yoga, sị: “Ọ pụrụ ịbụwo ụzọ mbụ e si mee ememe okpukpe nke majik, a ka nwekwara ihe ndị metụtara anwansi na ịgba afa ná nkọwa a na-enye yoga.” Ndị ọkà ihe ọmụma bụ́ ndị Hindu na-ekweta na ime yoga pụrụ ime ka mmadụ nweta ike karịrị ike mmadụ, ọ bụ ezie na ha na-ekwukarị na nke a abụghị nzube bụ́ isi e ji eme yoga. Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ bụ́ Indian Philosophy, onye bụ́bu president India, bụ́ Dr. S. Radhakrishnan, na-ekwu banyere onye na-eme yoga na “iji otú o si nọrọ na-achịkwa ahụ́ ya na-eme ka ọ ghara ịma ma è nwere oké okpomọkụ na oké oyi. . . . Onye na-eme yoga pụrụ ịnọ n’ebe dị anya hụ ma nụ ihe . . . O kwere nnọọ omume ịgwa onye ọzọ okwu n’ejighị akụkụ ahụ́ ndị a na-ejikarị enwe nkwurịta okwu mee ihe. . . . Onye na-eme yoga pụrụ ime ka a ghara ịhụ ahụ́ ya anya.”

Ịhụ onye na-eme yoga ka ọ na-ehi ụra n’elu àkwà bụ́ ntú ntú ma ọ bụ na-eje ije n’elu icheku ọkụ pụrụ ịdị ụfọdụ ndị ka ọ̀ bụ ọgwụ, ebe ndị ọzọ pụrụ iwere ya dị ka ihe ọchị. Ma ihe ndị a bụ ihe ndị a na-emekarị n’India, dịkwa ka a na-eme iji otu ụkwụ guzoro ma na-elegide anyanwụ anya ruo ọtụtụ awa na ịkpachi ume bụ́ nke na-eme ka mmadụ nwee ike ịbụ onye e liri n’ájá ruo ogologo oge. Na June 1995, akwụkwọ akụkọ bụ́ The Times of India kọrọ na otu nwatakịrị nwanyị dị afọ atọ na ọkara dina ala n’amaghị onwe ya ka e kwere ka ụgbọala dị kilogram 750 n’ịdị arọ rịa ya elu n’afọ. N’ụzọ juru ìgwè mmadụ na-ekiri ya anya, mgbe nwata ahụ tetara, ọ dịghị ihe ọ bụla mere ya. Akụkọ ahụ gbakwụnyere, sị: “Ọ bụ kpọmkwem ike yoga.”

Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ dịghị mmadụ nkịtị nke pụrụ ime nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ. N’ihi ya, Onye Kraịst aghaghị ịjụ, sị: Gịnị ka ihe ndị a e mere na-egosi? Hà si n’aka Jehova Chineke, bụ́ “Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile,” ka ha si n’ebe ọzọ? (Abụ Ọma 83:18) Bible mere ka ihe doo anya n’akụkụ a. Mgbe ọ fọrọ nke nta ka ụmụ Izrel banye n’Ala Nkwa ahụ, bụ́ nke ndị Kenan bi na ya, Jehova si n’ọnụ Mozis gwa ụmụ Izrel, sị: “Amụtala ime dị ka ihe arụ nile nke mba ahụ nile si dị.” Olee “ihe arụ” ndị a na-ekwu okwu ha? Mozis dọrọ aka ná ntị megide “onye na-ajụ ase, ma ọ bụ onye na-eji igwe ojii tụọ isi ọma ma ọ bụ isi ọjọọ, ma ọ bụ onye na-agba afa, ma ọ bụ onye mgbaasị.” (Deuterọnọmi 18:9, 10) Ihe ndị a rụrụ arụ n’anya Chineke n’ihi na ha bụ ọrụ nke ndị mmụọ ọjọọ na nke anụ ahụ́ na-emehie emehie.—Ndị Galeshia 5:19-21.

Ọ Bụghị Ihe Ndị Kraịst Kwesịrị Ịhọrọ

Ọ sọ ndị ndụmọdụ ahụ́ ike ha kwuo ihe dị iche, yoga abụghị nanị usoro mmega ahụ́. Akwụkwọ bụ́ Hindu Manners, Customs and Ceremonies na-akọ ahụmahụ mmadụ abụọ otu onye nkụzi okpukpe na-akụziri otú e si eme yoga nwere. E hotara na otu n’ime ha kwuru, sị: “Emere m mgbalị karịrị ike mmadụ iji kpachie ume m ruo ogologo oge o kwere mee, ma kuo ume nanị mgbe ọ fọrọ nke nta ka m tụbọọ. . . . Otu ụbọchị, n’etiti ehihie, ọ dị m ka m hụrụ ọnwa na-eti gbaa, bụ́ nke yiri ka ọ na-aga aga ma na-adagharị adagharị. N’oge ọzọ, ọ bịara dị m ka oké ọchịchịrị ọ gbachigidere m n’etiti ehihie. Onye nkụzi m . . . . nwere aṅụrị dị ukwuu mgbe m kọọrọ ya ọhụụ ndị a. . . . O mesiri m obi ike na ọ gaghị ete aka mụ ahụwa ihe ndị dị ịtụnanya karị bụ́ ndị ga-esi n’ọpịpịa m pụta.” Onye nke abụọ na-akọ, sị: “Ọ manyere m ilegide anyanwụ anya kwa ụbọchị n’atabighị anya ma ọ bụ nọgharịa. . . . Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị m ka m hụrụ ụmụ irighiri ọkụ na mbara ikuku; n’oge ndị ọzọ, ọ na-adị m ka m hụrụ mbara igwe ndị yiri ọkụ dị okirikiri na mbara igwe ndị ọzọ. Onye nkụzi m nwere aṅụrị dị ukwuu maka ọganihu m na-enwe ná mgbalị m.”

N’ụzọ doro anya, ihe ndị a dị ịtụnanya a na-ahụ bụ ihe ndị nkụzi okpukpe weere na ha bụ ihe ndị kwesịrị isi na ha pụta iji mee ka e nweta nzube bụ́ isi e ji eme yoga. Ee, ihe mgbaru ọsọ bụ́ isi e ji eme yoga bụ moksha, bụ́ nke a kọwara dị ka ịbụ onye e jikọtara ya na ụfọdụ mmụọ ukwu na-abụghị onye. A na-akọwa ya dị ka mmadụ “(ịma ụma) kwụsị usoro ịrụ ọrụ nke uche.” Nke a dị iche n’ụzọ doro anya n’ihe mgbaru ọsọ e setịpụụrụ Ndị Kraịst, bụ́ ndị e nyere ndụmọdụ, sị: “Ka unu na-enyefe ahụ́ unu dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke Chineke na-anara nke ọma, ozi dị nsọ site n’ikike iche echiche unu. Kwụsịkwanụ ịbụ ndị a na-eme ka ha yie usoro ihe nke a, kama bụrụnụ ndị e nwoghara site n’ime ka uche unu dị ọhụrụ, ka unu wee na-anwapụtara onwe unu ihe bụ́ uche Chineke nke ziri ezi na nke a na-anara nke ọma na nke zuru okè.”—Ndị Rom 12:1, 2.

Ọ bụ mmadụ ka ọ dị n’aka ịhọrọ ụdị ihe ọ ga na-eme iji na-emega ahụ́. Otú ọ dị, Ndị Kraịst agaghị ekwe ka ihe ọ bụla—ọ sọ ya ya bụrụ ịnata ọzụzụ, iri ihe, ịṅụ ihe ọṅụṅụ, iji ejiji, ntụrụndụ, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ—mebie mmekọrịta ha na Jehova Chineke. (1 Ndị Kọrint 10:31) Maka ndị na-emega ahụ́ nanị n’ihi ahụ́ ike, e nwere ọtụtụ ụzọ e si emega ahụ́ bụ́ ndị na-adịghị etinye mmadụ n’ihe ize ndụ nke mgbaasị na anwansi. Site n’izere omume na nkwenkwe ndị gbanyere mkpọrọgwụ n’okpukpe ụgha, anyị pụrụ ịtụ anya ngọzi Chineke nke usoro ihe ọhụrụ nke ezi omume nke anyị pụrụ inwe ahụ́ ike zuru okè na ya n’anụ ahụ́ na n’uche ruo mgbe ebighị ebi.—2 Pita 3:13; Mkpughe 21:3, 4.

[Foto ndị dị na peeji nke 22]

Ọtụtụ mmadụ na-eme ihe ndị na-eme ka e nwee ezi ahụ́ ike bụ́ ndị na-adịghị eduba mmadụ ná mgbaasị