Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Ga-anọgide Na-eguzosi Ike n’Ezi Ihe?

Ị̀ Ga-anọgide Na-eguzosi Ike n’Ezi Ihe?

Ị̀ Ga-anọgide Na-eguzosi Ike n’Ezi Ihe?

NZA ole nwụrụ ụnyaahụ? Ọ dịghị onye maara, ma eleghịkwa anya, ọ bụ mmadụ ole na ole na-eche banyere ha—e nwere nnọọ ọtụtụ nnụnụ. Otú ọ dị, Jehova na-eche banyere ha. N’izo aka n’ebe nnụnụ ndị a o doro anya na ha pere mpe nọ, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “O nweghị otu n’ime ha ga-ada n’ala Nna unu aghara ịma.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Unu atụla egwu: unu dị oké ọnụ ahịa karịa ọtụtụ nza.”—Matiu 10:29, 31.

Mgbe e mesịrị, ndị ahụ na-eso ụzọ bịara ghọtakwuo nke ọma otú Jehova si jiri ha kpọrọ ihe. Otu n’ime ha, bụ́ Jọn onyeozi, dere, sị: “Site na nke a ka e mere ka ịhụnanya Chineke pụta ìhè n’ọnọdụ anyị, n’ihi na Chineke zitere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya n’ime ụwa ka anyị nwee ike inweta ndụ site na ya.” (1 Jọn 4:9) Ọ bụghị nanị na Jehova nyere ihe mgbapụta kamakwa ọ na-emesi nke ọ bụla n’ime ndị ohu ya obi ike, sị: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.”—Ndị Hibru 13:5.

N’ụzọ doro anya, ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ndị ya nọ adịghị ada ada. Otú ọ dị, ajụjụ na-ebilite bụ, ‘Ànyị na-arapagidesi ike n’ebe Jehova nọ nke na anyị agaghị ahapụ ya ma ọlị?’

Mgbalị Ndị Setan Na-eme Iji Mebie Iguzosi Ike n’Ezi Ihe Anyị

Mgbe Jehova mere ka Setan mara banyere iguzosi ike n’ezi ihe Job, Setan zaghachiri, sị: “Job ọ̀ ga-efe gị ofufe ma a sị na ọ dịghị ihe ọ na-enweta na ya?” (Job 1:9, Today’s English Version) O nyere echiche na iguzosi ike n’ihe nke ụmụ mmadụ nye Chineke na-adabere nanị ‘n’ihe ha pụrụ inweta na ya.’ Ọ bụrụ na nke a bụ eziokwu, a pụrụ imebi iguzosi ike n’ezi ihe nke Onye Kraịst ọ bụla—ma ọ bụrụhaala na ihe e nyere ya ruru ịbụ ihe na-adọrọ adọrọ.

N’ọnọdụ Job, Setan zọọrọ ná mmalite na Job ga-akwụsị iguzosi ike n’ihe nye Chineke ma ọ bụrụ na ihe onwunwe ndị ọ kasị jiri kpọrọ ihe efunahụ ya. (Job 1:10, 11) Mgbe ebubo mkparị a na-agazighịrị ya, Setan boro ebubo, sị: “Mmadụ ga-ahapụ ihe nile iji nọgide na-adị ndụ.” (Job 2:4, TEV ) Ọ bụ ezie na ihe Setan kwuru pụrụ ịbụ eziokwu n’ebe ụfọdụ ndị nọ, Job jụrụ isi n’iguzosi ike n’ezi ihe ya wepụga onwe ya. Ihe ndekọ ahụ mere eme na-agba akaebe nke ahụ. (Job 27:5; 42:10-17) Ị̀ na-eguzosi ike n’ihe n’ụzọ yiri nke ahụ? Ka ị̀ na-ekwe ka Setan na-emebi iguzosi ike n’ezi ihe gị? Chebara onwe gị echiche ka anyị na-enyocha ụfọdụ eziokwu ndị metụtara Onye Kraịst ọ bụla.

Pọl onyeozi kwetara na iguzosi ike n’ihe nke ezi Ndị Kraịst pụrụ isi nnọọ ike. O dere, sị: “Ekwetara m na ọnwụ ma ọ bụ ndụ . . . ma ọ bụ ihe ndị dị ugbu a ma ọ bụ ihe ndị gaje ịbịa . . . ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e kere eke agaghị enwe ike ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke nke dị n’ime Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.” (Ndị Rom 8:38, 39) Anyị pụrụ inwe nkwenye yiri nke ahụ ma ọ bụrụ na ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ siri ike. Ịhụnanya dị otú ahụ bụ ihe nkekọ a na-apụghị imebi emebi nke ọbụna ọnwụ na-apụghị imebi.

Ọ bụrụ na anyị na Chineke nwere mmekọrịta dị otú ahụ, ọ dịghị mgbe ọ bụla anyị ga-ajụ, sị, ‘Àka m ga na-ejere Jehova ozi n’afọ ole na ole na-abịanụ?’ Obi abụọ dị otú ahụ na-enye echiche na iguzosi ike n’ihe anyị nye Chineke na-adabere n’ihe pụrụ ime anyị ka anyị na-adị ndụ. Ọnọdụ ndị si n’èzí adịghị emetụta ezigbo iguzosi ike n’ezi ihe. Ọ na-adabere n’ụdị mmadụ anyị bụ n’ime. (2 Ndị Kọrint 4:16-18) Ọ bụrụ na anyị ji obi anyị dum hụ Jehova n’anya, anyị agaghị emechu ya ihu ma ọlị.—Matiu 22:37; 1 Ndị Kọrint 13:8.

Otú ọ dị, anyị aghaghị icheta na Setan na-achọ mgbe nile imebi iguzosi ike n’ezi ihe anyị. Ọ pụrụ ịnwa anyị ọnwụnwa ikwenyere ọchịchọ anụ ahụ́, ịda ná nrụgide ndị ọgbọ, ma ọ bụ ikwe ka ụdị nsogbu ụfọdụ mee ka anyị gbahapụ eziokwu ahụ. Ụwa nke e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ bụ ihe bụ́ isi ya na Setan so na-eme mwakpo a, ọ bụ ezie na ezughị okè anyị na-eme ka ọrụ ya dịkwuoro ya mfe. (Ndị Rom 7:19, 20; 1 Jọn 2:16) Otú o sina dị, anyị nwere ọtụtụ ohere ọma n’ọgụ a, otu n’ime ndị kasịnụ n’ime ha bụ eziokwu ahụ bụ́ na anyị abụghị ndị na-amaghị atụmatụ Setan.—2 Ndị Kọrint 2:11.

Olee ihe ndị bụ́ atụmatụ Setan? Pọl kọwara ha n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Efesọs dị ka “nzupụta ọjọọ dị iche iche,” ma ọ bụ nzupụta aghụghọ dị iche iche. * (Ndị Efesọs 6:11) Setan na-edebe ihe aghụghọ dị iche iche n’ụzọ anyị iji mebie iguzosi ike n’ezi ihe anyị. Anyị nwere ekele na anyị pụrụ ịmata nzupụta aghụghọ ndị a, ebe ọ bụ na e dekọworo anyị ụzọ Ekwensu si eme ihe n’Okwu Chineke. Mgbalị ndị Setan mere iji mebie iguzosi ike n’ezi ihe Jizọs na Job na-egosi ụfọdụ n’ime ụzọ ndị ọ na-achọ isi mebie iguzosi ike n’ezi ihe anyị dị ka Ndị Kraịst.

A Pụghị Imebi Iguzosi Ike n’Ezi Ihe nke Jizọs

Ná mmalite nke ozi Jizọs, Setan kara anya nwaa Ọkpara Chineke ọnwụnwa site n’iji anyaike gwa ya ka o mee ka nkume ghọọ achịcha. Lee ka o si dị aghụghọ! Jizọs eribeghị nri ruo ụbọchị 40, n’ihi ya, ihe ịrụ ụka adịghị ya na agụụ na-agụsi ya ike. (Luk 4:2, 3) Setan tụrụ aro ka Jizọs mejuo ọchịchọ ebumpụta ụwa ya ngwa ngwa, n’ụzọ megidere uche Jehova. N’otu aka ahụ taa, mgbasa echiche nke ụwa na-agba ume imeju agụụ ozugbo, n’echebaraghị ihe ga-esi na ya pụta echiche. Ozi a na-ezipụ bụ, ‘I kwesịrị inweta ya ugbu a,’ ma ọ bụ nnọọ, ‘Megodị ya!’

A sị na Jizọs gboro mkpa nke agụụ na-agụ ya n’atụleghị ihe ga-esi na ya pụta, Setan gaara enwewo ihe ịga nke ọma n’ime ka Jizọs mebie iguzosi ike n’ezi ihe ya. Jizọs lere okwu ahụ anya n’ụzọ ime mmụọ, ọ zaghachikwara n’ụzọ siri ike, sị: “E dere, sị, ‘Ọ bụghị nanị n’achịcha ka mmadụ ga-esi dị ndụ.’”—Luk 4:4; Matiu 4:4.

Mgbe ahụ, Setan si ụzọ ọzọ bịa. N’ịkọwahie Akwụkwọ Nsọ, bụ́ nke Jizọs nọworo na-ehota ihe na ya, Ekwensu gbara Jizọs ume isi n’elu ụlọ nsọ wụtuo. ‘Mmụọ ozi aghaghị ichebe gị,’ ka Setan kwuru. Jizọs enweghị ebumnobi ọ bụla nke ịrịọ Nna ya maka nchebe ọrụ ebube nanị iji mee ka e lewe ya. “Etinyela Jehova bụ́ Chineke gị n’ule,” ka Jizọs kwuru.—Matiu 4:5-7; Luk 4:9-12.

Atụmatụ ikpeazụ Setan ji mee ihe kpọrọ okwu aha karị. Ọ nwara ka ya na Jizọs banye ná nkwekọrịta site n’inye ya ụwa nile na ebube ya ma ọ kpọọ isiala nye ya nanị otu ugboro. Ọ fọrọ nke nta ka nke ahụ bụrụ ihe nile Setan nwere inye. Ma olee otú Jizọs ga-esi kpọọ isiala nye onye iro ukwu nke Nna ya? Tụfịakwa! “Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe, ọ bụkwa nanị ya ka ị na-aghaghị ijere ozi dị nsọ,” ka Jizọs zaghachiri.—Matiu 4:8-11; Luk 4:5-8.

Mgbe mgbalị atọ ahụ kụrụ afọ n’ala, Setan ‘si n’ebe Jizọs nọ pụọ ruo oge ọzọ ga-adaba adaba.’ (Luk 4:13) Nke a na-egosi na Setan nọ na nche mgbe nile ịchọpụta ohere ọ ga-eji tinye iguzosi ike n’ezi ihe Jizọs n’ule. Oge ọzọ dabara adaba dapụtara ihe dị ka afọ abụọ na ọkara n’ihu bụ́ mgbe Jizọs malitere ịkwadebe ndị na-eso ụzọ ya maka ọnwụ ya na-eru nso. Pita onyeozi kwuru, sị: “Meere onwe gị ebere, Onyenwe anyị; ihe a agaghị eme gị ma ọlị.”—Matiu 16:21, 22.

Ò kwere omume na ndụmọdụ dị otú ahụ hiere ụzọ e ji ezi obi nye ga-adị Jizọs ụtọ ná ntị, ebe ọ bụ otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya nyere ya ya? Jizọs ghọtara ozugbo na okwu ndị ahụ na-egosipụta echiche Setan, ọ bụghị nke Jehova. Kraịst zaghachiri n’ụzọ siri ike, sị: “Gaa n’azụ m, Setan! Ị bụụrụ m ihe ịsụ ngọngọ, n’ihi na ihe ndị ị na-eche abụghị echiche Chineke, kama nke mmadụ.”—Matiu 16:23.

Ebe ọ bụ na Jizọs nwere ịhụnanya na-adịgide adịgide n’ebe Jehova nọ, Setan emebilighị iguzosi ike n’ezi ihe ya. Ọ dịghị ihe ọ bụla Ekwensu pụrụ inye, ọ dịghị ọnwụnwa ọ bụla, otú ọ sọkwara ya taruo n’akpụ, nke pụrụ imebi iguzosi ike n’ihe Jizọs nye Nna ya nke eluigwe. Ànyị ga-enwe mkpebi siri ike otú ahụ mgbe ọnọdụ mere ka o siere anyị ike ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe? Ihe atụ Job pụrụ inyere anyị aka ịghọta n’ụzọ ka mma, ihe ịma aka ndị anyị pụrụ iche ihu.

Iguzosi Ike n’Ihe n’Agbanyeghị Nsogbu

Dị ka Job chọpụtara, nsogbu pụrụ ịdakwasị anyị mgbe ọ bụla. Ọ bụ nwoke lụrụ nwanyị nke obi dị ụtọ, nke nwekwara ụmụ iri ma nwee usoro ihe ime mmụọ dị mma. (Job 1:5) Ma, ka Job na-amaghị ihe na-emenụ, iguzosi ike n’ezi ihe ya nye Chineke ghọrọ ihe iseokwu ná nzukọ eluigwe, Setan kpebisikwara ike imebi ya n’ụzọ ọ bụla o nwere ike.

Ngwa ngwa, akụ̀ na ụba Job funahụrụ ya. (Job 1:14-17) Otú o sina dị, iguzosi ike n’ezi ihe Job mere ka ọ lanahụ ule ahụ n’ihi na ọ dịtụbeghị mgbe ọ tụkwasịrị obi ya n’ego. N’icheta oge ọ bara ọgaranya, Job kwuru, sị: “Ọ bụrụ na emewo m ọlaedo ka ọ bụrụ okwukwe efu m, . . . ọ bụrụ na aṅụrịa m ọṅụ n’ihi na akụ̀ m hiri nne, . . . nke ahụ bụkwa ajọ omume . . . : n’ihi na n’ime ihe a m ga-agọnahụ Chineke Nke dị n’elu.”—Job 31:24, 25, 28.

Taa, o kwekwara omume na ihe nile anyị nwere ga-efunahụ anyị n’otu ntabi anya. Ndị wayo gwunaara otu ọchụ ntá ego bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova ego buru nnọọ ibu, na-eme ka ọ fọ nke nta ka achụmnta ego ya dakpọọ. O kwetara n’ezoghị ọnụ, sị: “Ọ fọrọ nke nta ka m nwee nkụchi obi. N’ezie, echere m na m gaara enwe ya ma a sị na ọ bụghị n’ihi mmekọrịta mụ na Chineke. Otú o sina dị, ahụmahụ a mere ka m ghọta eziokwu ahụ bụ́ na ebuteghị m ihe ime mmụọ ụzọ ná ndụ m. Oké mkpali nke ịkpata ego yiri ka o kpuchiri ihe ọ bụla ọzọ.” Onyeàmà a emewo ka achụmnta ego ya belata, ọ na-ejechikwa ozi anya dị ka ọsụ ụzọ inyeaka, na-etinye awa 50 ma ọ bụ karịa n’ọnwa n’ozi Ndị Kraịst. Otú ọ dị, nsogbu ndị ọzọ pụrụ ọbụna ịdị njọ karịa ihe onwunwe ifunahụ mmadụ.

Job ka nụpụrụ ozi banyere akụ̀ na ụba funahụrụ ya mgbe e ziteere ya ozi na ụmụ ya iri anwụọla. Ọ nọgidekwara na-ekwu, sị: “Ka aha Jehova bụrụ ihe a gọziri agọzi.” (Job 1:18-21) Ànyị ga-anọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe ma ọ bụrụ na ọtụtụ n’ime ndị òtù ezinụlọ anyị anwụnahụ anyị na mberede? Ụmụ abụọ nke Francisco, bụ́ Onye Kraịst bụ́ onye nlekọta na Spen, nwụnahụrụ ya n’ajọ ihe ọghọm ụgbọala bọs. O nwetara nkasi obi site n’ịbịaru Jehova nso na ịmụba òkè ọ na-ekere n’ozi Ndị Kraịst.

Ọbụna mgbe ụmụ ya nwụsịrị n’ụzọ na-awụ akpata oyi n’ahụ́, ahụmahụ ọjọọ Job akwụsịghị. Setan ji ọrịa na-asọ oyi ma na-egbu mgbu tie ya ihe otiti. N’oge ahụ, Job nwetara ndụmọdụ ọjọọ n’aka nwunye ya. “Gbakụta Chineke azụ, nwụọ,” ka ọ gbara ya ume. Job leghaara ndụmọdụ ya anya, o ‘jighịkwa egbugbere ọnụ ya mehie.’ (Job 2:9, 10) Iguzosi ike n’ezi ihe ya dabeere, ọ bụghị ná nkwado nke ezinụlọ ya, kama ná mmekọrịta ya na Jehova.

Flora, bụ́ onye di ya na diọkpara ya hapụrụ ụzọ Ndị Kraịst ihe karịrị afọ iri gara aga, na-aghọta mmetụta Job na-aghaghị inwewo. “Mgbe ezinụlọ gị kwụsịrị na mberede ịkwado gị, ọ pụrụ ịbụ ihe na-akpasasị uche,” ka ọ na-ekweta. “Ma amaara m na agaghị m achọta obi ụtọ n’ebe ọzọ n’abụghị ná nzukọ Jehova. Ya mere, eguzosiri m ike ma kwee ka Jehova nọrọ n’ọnọdụ mbụ ka m na-agbalịsi ike ịnọgide na-abụ ezigbo nwunye na nne. Ekpere m ekpere n’esepụghị aka, Jehova wusikwara m ike. Abụ m onye obi dị ụtọ n’ihi na, n’agbanyeghị mmegide di m kpọrọ ekwo nkụ na-emegide m, amụtawo m ịdabere kpam kpam n’ebe Jehova nọ.”

Ngwá ọrụ ọzọ Setan ji mee ihe iji mebie iguzosi ike n’ezi ihe Job bụ mmadụ atọ n’ime ndị enyi ya. (Job 2:11-13) Lee ka ọ na-aghaghị isiwo bụrụ ihe na-agbawa obi mgbe ha malitere ịkatọ ya. A sị na o kwetara ihe ha kwuru, ọ gaara akwụsị inwe obi ike n’ebe Jehova Chineke nọ. Ndụmọdụ ha na-akụda mmụọ pụrụ igbuwo mmụọ ya ma mebie iguzosi ike n’ezi ihe ya, n’ụzọ dịkwa otú a, atụmatụ Setan gaara agawo nke ọma.

Kama nke ahụ, Job siri ọnwụ, sị: “Ruo mgbe m kubiri ume m gaghị esi n’ebe m nọ wezụga izu okè [“iguzosi ike n’ezi ihe,” NW] m.” (Job 27:5) Ọ sịghị, ‘Agaghị m ekwe ka unu napụ m iguzosi ike n’ezi ihe m!’ Job maara na iguzosi ike n’ezi ihe ya dabeere n’ebe ya onwe ya nọ na n’ịhụnanya o nwere n’ebe Jehova nọ.

Atụmatụ Ochie Iji Jide Onye Ọhụrụ

Setan ka na-eji ndụmọdụ hiere ụzọ ma ọ bụ okwu a na-echeghị eche kwuo bụ́ ndị na-esi n’ọnụ ndị enyi ma ọ bụ ndị kwere ekwe ibe anyị, eme ihe. Nkụda mmụọ sitere n’ime ọgbakọ pụrụ igbu mmụọ anyị n’ụzọ dị mfe karịa mkpagbu sitere n’èzí. Otu Onye Kraịst bụ́ okenye nke lụburu ọgụ n’ihu agha ji nke ahụ tụnyere ihe mgbu o nwere n’ihi ihe ụfọdụ Ndị Kraịst ibe ya kwuru ma mee n’echeghị eche. Banyere ihe ahụ ha kwuru ma mee, ọ sịrị: “Ọ bụ ihe kasị taa akpụ metụworo m.”

N’akụkụ ọzọ, anyị pụrụ iwe oké iwe n’ihi ezughị okè nke ndị kwere ekwe ibe anyị nke na anyị agaghịzi na-atụpụrụ ụfọdụ ndị ọnụ ma ọ bụ ọbụna malite ịgha nzukọ Ndị Kraịst. Ime ka obi anyị dajụọ n’iwe a kpasuru anyị pụrụ iyi ihe kasị mkpa. Ma lee ka o si dị mwute ịghara iji nghọta lee ihe anya otú ahụ ma kwe ka ihe ndị ọzọ mere ma ọ bụ kwuo mee ka ihe kasị dị oké ọnụ ahịa anyị nwere—mmekọrịta anyị na Jehova—jụọ oyi. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka nke ahụ mee, anyị ga-abụ ndị Setan ji otu n’ime ụzọ aghụghọ ochie ya na-aghọgbu.

N’ụzọ ziri ezi, anyị na-atụ anya ụkpụrụ ndị dị elu n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ma ọ bụrụ na anyị na-atụ anya ihe gabigara ókè n’aka ndị anyị na ha na-efekọ ofufe, bụ́ ndị na-ezubeghị okè, anyị ga-enwerịrị ndakpọ olileanya. N’ụzọ dị iche, Jehova na-eji ezi uche eme ihe banyere ihe ọ na-achọ n’aka ndị ohu ya. Ọ bụrụ na anyị eṅomie ihe nlereanya ya, anyị ga-adị njikere ịnagide ezughị okè ha. (Ndị Efesọs 4:2, 32) Pọl onyeozi nyere ndụmọdụ a, sị: “Ọ bụrụ na iwe na-ewe unu, unu ekwela ka iwe unu duba unu ná mmehie; unu ekwela ka anyanwụ daa ka unu ka nọ na-ewe ya; unu enyela ekwensu ohere.”—Ndị Efesọs 4:26, 27, The New English Bible.

Dị ka Bible na-egosi n’ụzọ doro anya, Setan na-eji ụzọ aghụghọ dịgasị iche iche eme ihe iji chọpụta—ma ọ bụrụ na o nwere ike—ụzọ ọ ga-esi mebie iguzosi ike n’ezi ihe nke Onye Kraịst. Ụfọdụ n’ime ụzọ aghụghọ ya na-adọrọ adọrọ nye anụ ahụ́ na-emehie emehie, ndị ọzọ na-akpata ihe mgbu. Site n’ihe a tụlere n’elu, ị pụrụ ịhụ ihe mere ị na-ejighị kwesị ịbụ onye e jidere n’amaghị ama ma ọlị. N’iburu ịhụnanya i nwere n’ebe Chineke nọ n’uche nke ọma, kpebisie ike ime Ekwensu onye ụgha ma mee ka obi Jehova ṅụrịa. (Ilu 27:11; Jọn 8:44) Cheta, anyị agaghị emebi ezi iguzosi ike n’ezi ihe anyị dị ka Ndị Kraịst ma ọlị, n’agbanyeghị ụdị ọnwụnwa bịaara anyị.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Ọkà mmụta Bible bụ́ W. E. Vine na-ekwu na a pụkwara ịsụgharị okwu Grik mbụ e ji mee ihe n’ebe a ịbụ “ihe aghụghọ.”