Ị̀ Na-echeta?
Ị̀ Na-echeta?
Ọ̀ masịwo gị ịgụ mbipụta Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Ọ dị mma, lee ma ị pụrụ ịza ajụjụ ndị na-esonụ:
• Gịnị bụ mmetụta ọmịiko, n’ihi gịnịkwa ka Ndị Kraịst ji kwesị ịzụlite ya?
Ọ bụ mmadụ inwe ikike nke itinye onwe ya n’ọnọdụ onye ọzọ, dị ka ihe mgbu onye ọzọ na-enwe imetụ anyị n’obi. A dụrụ Ndị Kraịst ọdụ ka ha na-egosi ‘mmetụta maka onye ọzọ, mmetụta ụmụnna na ọmịiko.’ (1 Pita 3:8) Jehova setịpụụrụ anyị ihe nlereanya anyị ga-agbaso n’igosipụta mmetụta ọmịiko. (Abụ Ọma 103:14; Zekaraịa 2:8) Anyị pụrụ ime ka nghọta anyị n’akụkụ a ka mma site n’ige ntị, ileru anya, na iji anya nke uche na-ahụ ihe.—4/15, peeji nke 24-26.
• Iji nweta ezi obi ụtọ, n’ihi gịnị ka ọgwụgwọ ime mmụọ na-aghaghị iji bute ụzọ tupu e nwee ngwọta ikpeazụ maka nkwarụ?
Ọtụtụ ndị nwere ezi ahụ́ ike adịghị enwe obi ụtọ, nsogbu na-akarị ha ike. N’ụzọ dị iche, ọtụtụ Ndị Kraịst nwere nkwarụ taa na-enwe nnọọ obi ụtọ n’ijere Jehova ozi. Ndị na-erite uru n’ọgwụgwọ ime mmụọ ga-eso ná ndị ga-ahụ mwepụ a ga-ewepụ nkwarụ n’ụwa ọhụrụ.—5/1, peeji nke 6-7.
• N’ihi gịnị ka Ndị Hibru 12:16 ji gụnye Ịsọ n’ebe a gụnyere onye na-akwa iko?
Ihe ndekọ ahụ dị na Bible na-egosi na Ịsọ nwere echiche nke lekwasịrị anya n’inweta ụgwọ ọrụ ozugbo na ileghara ihe ndị dị nsọ anya. Ọ bụrụ na mmadụ ekwe ka ụdị echiche ahụ bata ya n’obi taa, ọ pụrụ iduga ya n’ime mmehie dị oké njọ, dị ka ịkwa iko.—5/1, peeji nke 10-11.
• Ònye bụ Tertullian, gịnịkwa ka e ji mara ya?
Ọ bụ onye edemede na ọkà mmụta okpukpe nke biri ndụ na narị afọ nke abụọ na nke atọ O.A. A ma ya ama maka ide ọtụtụ akwụkwọ iji gbachitere ihe a sị na ọ bụ Iso Ụzọ Kraịst. Ka ọ nọ na-agbachitere ya, o webatara echiche na ụzọ nkà ihe ọmụma dị iche iche bụ́ ndị tọrọ ntọala maka mmerụ ndị e merụrụ ozizi, dị ka site n’ozizi Atọ n’Ime Otu.—5/15, peeji nke 29-31.
• N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị bụrụ nanị mkpụrụ ndụ ihe nketa ka ọrịa, akparamàgwà, na ọnwụ nke mmadụ si n’aka?
Ndị ọkà mmụta sayensị ekwubiwo na o doro anya na e nwere ihe si ná mkpụrụ ndụ ihe nketa nke na-akpata ọrịa dịgasị iche iche ụmụ mmadụ na-arịa, ụfọdụ kwekwaara na ọ bụ mkpụrụ ndụ ihe nketa na-ekpebi akparamàgwà anyị. Ma, Bible na-eme ka a ghọta otú ihe a kpọrọ mmadụ si malite, gụnyere otú mmehie na ezughị okè si bịa mekpawa ihe a kpọrọ mmadụ ahụ́. Ọ bụ ezie na mkpụrụ ndụ ihe nketa pụrụ ikere òkè n’ịkpụzi ụdị mmadụ anyị bụ, ezughị okè anyị na gburugburu ebe obibi anyị bụkwa ihe ndị bụ́ isi na-akpụzi ya.—6/1, peeji nke 9-11.
• Olee otú ibe papaịrọs a chọtara n’Oxyrhynchus, Ijipt, si mee ka a ghọtakwuo otú e si jiri aha Chineke mee ihe?
E nwere Tetragrammaton (mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ nke nọchitere anya aha Chineke) n’ibe papaịrọs Septuagint Grik a bụ́ nke bu Job 42:11, 12. Nke a bụ ihe àmà ọzọ na-egosi na aha Chineke n’asụsụ Hibru pụtara na Septuagint, bụ́ nke ndị dere Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst hotara mgbe mgbe.—6/1, peeji nke 30.
• Olee egwuregwu ndị a na-eme n’oge a na-amasị ọtụtụ ndị bụ́ ndị e jiworo tụnyere ọgụ aka ike na nke na-akpata ọnwụ a lụrụ n’Alaeze Ukwu Rom?
Ihe ngosi e mere n’oge na-adịbeghị anya n’ọgbọ egwuregwu bụ́ Colosseum nke dị na Rom, Ịtali, na-egosi ụdị ya nke oge a site n’igosi ihe nkiri vidio banyere ịlụso oké ehi ọgụ, ịkụ ọkpọ, ọsọ ụgbọala na ọgba tum tum, na ọgụ ndị nkiri lụrụ n’ihe omume egwuregwu nke oge a. Ndị Kraịst oge mbụ ghọtara na Jehova ahụghị ihe ike na ndị na-eme ihe ike n’anya, Ndị Kraịst nke oge a ekwesịghịkwa ịhụ ha n’anya. (Abụ Ọma 11:5)—6/15, peeji nke 29.
• Ka anyị na-agbalịsi ike ịbụ ndị nkụzi dị irè, gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya Ezra?
Ezra 7:10 mere ka ihe anọ Ezra mere pụta ìhè, bụ́ ihe ndị anyị pụrụ ịgbalịsi ike iṅomi. Ọ na-asị: “Ezra [1] doziri obi ya [2] ịchọ iwu Jehova, na [3] ime ya, na [4] izi ụkpụrụ Ya na ikpe Ya [n’Izrel].” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.)—7/1, peeji nke 20.
• N’ọnọdụ abụọ dị aṅaa ka o kwesịrị ekwesị ka nwanyị bụ́ Onye Kraịst yiri ihe mkpuchi isi?
Otu bụ n’ọnọdụ ndị bilitere n’ime ezinụlọ. Ya iyi ihe mkpuchi isi na-egosi na ọ ghọtara na ọ bụ di ya ka ọ dị n’aka idu n’ekpere na iduzi ihe ọmụmụ Bible. Nke ọzọ bụ n’ọrụ ọgbakọ, bụ́ ebe ọ na-egosi na ọ ghọtara na ọ bụ ụmụ nwoke e mere baptizim ka Akwụkwọ Nsọ nyere ikike izi ihe na inye nduzi. (1 Ndị Kọrint 11:3-10)—7/15, peeji nke 26-27.
• N’ihi gịnị ka Ndị Kraịst ji aghọta na yoga abụghị nanị usoro mmega ahụ́ nakwa na ọ dị ize ndụ?
Nzube e ji enye ọzụzụ yoga bụ iji mee ka mmadụ bụrụ onye e jikọrọ ya na mmụọ karịrị ike mmadụ. N’ụzọ megidere ntụziaka Chineke nyere, yoga na-agụnye ịkwụsị usoro ebumpụta ụwa nke iche echiche. (Ndị Rom 12:1, 2) Yoga pụrụ ikpughepụ mmadụ nye ihe ize ndụ nke mgbaasị na anwansi. (Deuterọnọmi 18:10, 11)—8/1, peeji nke 20-22.