Ònye Ka I Kwesịrị Iguzosi Ike n’Ihe Nye?
Ònye Ka I Kwesịrị Iguzosi Ike n’Ihe Nye?
“Mba anyị: . . . Ka ọ ghara ịdị mgbe ikpe ga-ama ya; ma ka ọ nọgide na-abụ mba anyị, ma ikpe ọ̀ mara ya ma ọ maghị ya.”—Stephen Decatur, onye agha mmiri nke United States, 1779-1820.
ỌTỤTỤ mmadụ na-ewere iguzosi ike n’ihe nye mba ha n’eleghị anya n’azụ dị ka ibu ọrụ kasịnụ ha nwere. Ndị ọzọ na-ekwu okwu Stephen Decatur n’ụzọ ọzọ, sị: ‘Okpukpe m, ka ọ ghara ịdị mgbe ikpe ga-ama ya; ma ka ọ nọgide na-abụ okpukpe m, ma ikpe ọ̀ mara ya ma ọ maghị ya.’
N’ezie, ihe na-ekpebikarị mba ma ọ bụ okpukpe anyị na-eguzosi ike n’ihe nye na-abụ ebe a mụrụ anyị, ma mkpebi metụtara onye anyị kwesịrị iguzosi ike n’ihe nye karịrị ihe a na-ahapụrụ ihe ndapụta. Otú ọ dị, mmadụ ịgbagha ihe a zụlitere ya iguzosi ike n’ihe nye na-achọ obi ike ma na-eweta ihe ịma aka.
Ule nke Iguzosi Ike n’Ihe
Otu nwanyị nke tolitere na Zambia na-ekwu, sị: “Eji m okpukpe kpọrọ ihe site n’oge m bụ nwata. Ikpe ekpere kwa ụbọchị n’ọnụ ụlọ ezinụlọ anyị ji mere òkwù arụsị, ime ememe okpukpe, na ịgachi ụlọ okpukpe anya socha n’ihe ndị a zụlitere m ime. Nkekọ chiri anya dị n’etiti okpukpe m ya na ụzọ e si efe ofufe na ya, na ọdịnala, obodo, na ezinụlọ m.”
N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe ọ nọ ná ngwụsị afọ iri na ụma, ọ malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, n’oge na-adịghịkwa anya mgbe e mesịrị, o kpebiri ịgbanwe okpukpe ya. Nke a ọ̀ bụ eguzosighị ike n’ihe?
A zụlitere Zlatko na Bosnia, ruokwa oge ụfọdụ, ọ lụrụ ọgụ n’agha ahụ rikpuru mba a mụrụ ya. Ya onwe ya malitekwara soro Ndịàmà Jehova mụwa Bible. Ugbu a, ọ dịghị ekwe ebuli ngwá agha megide mmadụ ọ bụla. Ihe o mere ọ̀ bụ eguzosighị ike n’ihe?
Otú ị ga-esi zaa ajụjụ ndị ahụ ga-adabere n’otú i si ele ihe anya. Nwanyị ahụ a kpọtụrụ aha na mbụ na-ekwu, sị: “N’obodo m, mmadụ ịgbanwe okpukpe ya bụ ihe ihere a na-adịghị agbaghara agbaghara; e weere ya dị ka eguzosighị ike n’ihe, mmadụ ịgọnahụ ezinụlọ ya na obodo ya.” N’otu aka ahụ, ndị ha na Zlatko jekọburu ozi agha weere onye ọ bụla jụrụ ịdụnyere ha úkwù n’agha dị ka onye sabo. Ma nwanyị ahụ ma Zlatko chere na ọ bụ ụdị iguzosi ike n’ihe ka elu—iguzosi ike n’ihe nye Chineke—kpaliri ha ime ihe ha mere. Nke ka mkpa, olee otú Chineke si ele ndị chọrọ iguzosi ike n’ihe nye ya anya?
Ezi Iguzosi Ike n’Ihe—Ngosipụta nke Ịhụnanya
Eze Devid gwara Jehova Chineke, sị: “N’ebe onye na-eguzosi ike n’ihe nọ ka ị ga-eguzosi ike n’ihe.” (2 Samuel 22:26, NW) Okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “iguzosi ike n’ihe” n’ebe a na-enye echiche nke obiọma nke ji ịhụnanya na-arapagide n’ihe ruo mgbe nzube ya maka ihe ahụ mezuru. N’inwe àgwà yiri nke nne na-enye nwa ara, Jehova na-eji ịhụnanya arapagide n’ebe ndị na-eguzosi ike n’ihe nye ya nọ. Jehova gwara ndị ohu ya na-eguzosi ike n’ihe n’Izrel oge ochie, sị: “Nwanyị, ọ̀ ga-echezọ nwa ya na-aṅụ ara, wee ghara inwe obi ebere n’ahụ nwa afọ ya? ee, eleghị anya ndị a ga-echezọ, ma Mụ onwe m agaghị echezọ gị.” (Aịsaịa 49:15) A na-emesi ndị dị njikere iguzosi ike n’ihe nye Chineke karịa ihe ọ bụla ọzọ obi ike na ọ ga-eji ịhụnanya lekọta ha.
Iguzosi ike n’ihe nye Jehova na-adabere n’ịhụnanya. Ọ na-akwali mmadụ ịhụ ihe Jehova hụrụ n’anya n’anya na ịkpọ ihe ọjọọ ndị ọ kpọrọ asị asị. (Abụ Ọma 97:10) Ebe ọ bụ na àgwà bụ́ isi nke Jehova bụ ịhụnanya, iguzosi ike n’ihe nye Chineke na-enye aka egbochi mmadụ imeso ndị ọzọ ihe n’ụzọ ịhụnanya na-adịghị na ya. (1 Jọn 4:8) Ya mere, ọ bụrụ na mmadụ agbanwee nkwenkwe okpukpe ya n’ihi iguzosi ike n’ihe nye Chineke, ọ dịghị apụta na ọ hụghịzi ezinụlọ ya n’anya.
Iguzosi Ike n’Ihe Nye Chineke—Ihe Mkpali Bara Uru
Nwanyị ahụ a kpọtụrụ aha na mbụ si otú a kọwaa ihe o mere: “Site n’ọmụmụ Bible m, abịara m mara Jehova dị ka ezi Chineke ahụ, amalitekwara m iso ya na-enwe mmekọrịta. Jehova adịghị ka nke ọ bụla n’ime chi ndị m feburu ofufe; ịhụnanya, ikpe ziri ezi, amamihe, na ike ya guzoziri eguzozi n’ụzọ zuru okè. Ebe ọ bụ na Jehova na-achọ ofufe a na-ekewaghị ekewa, aghaghị m ịhapụ chi ndị nke ọzọ.
“Ndị mụrụ m gwara m ugboro ugboro na obi adịtụghị ha mma n’ebe m nọ nakwa na m na-emechu ha ihu. Nke a nyere m nnọọ nsogbu n’obi, ebe ọ bụ na nkwado nke ndị mụrụ m dị m mkpa nke ukwuu. Ma ka m ji nke nta nke nta na-enwetakwu ihe ọmụma nke eziokwu Bible, nhọrọ chere m ihu bịara doo m anya. Apụghị m ịgbakụta Jehova azụ.
“Ịhọrọ iguzosi ike n’ihe nye Jehova kama ịbụ nye ọdịnala okpukpe apụtaghị na eguzosighị m ike n’ihe nye ezinụlọ m. Ana m agbalịsi ike igosi ha site n’okwu na omume m na m ghọtara otú ọ dị ha. Ma ọ bụrụ na eguzosighị m ike n’ihe nye Jehova, mgbe ahụ, apụrụ m igbochi ezinụlọ m ịbịa mara ya, nke ahụ ga-abụkwa nnọọ eguzosighị ike n’ihe n’ezie.”
N’otu aka ahụ, mmadụ abụghị sabo mgbe iguzosi ike n’ihe nye Chineke chọrọ na ọ ga-anọpụ iche na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma hapụ ibuli ngwá agha megide ndị ọzọ. Otú a ka Zlatko si kọwaa ihe o mere: “Ọ bụ ezie na a zụlitere m dị ka Onye Kraịst elu ọnụ, alụrụ m onye na-abụtụghịdị nke ọ bụla. Mgbe agha ahụ dara, akụkụ abụọ ahụ chọrọ ka m guzosie ike n’ihe nye ha. A manyere m ịhọrọ akụkụ nke m ga-adụnyere úkwù. Alụrụ m ọgụ n’agha ahụ ruo afọ atọ na ọkara. Mụ na nwunye m mesịrị gbaga Croatia, bụ́ ebe anyị nọ zute Ndịàmà Jehova.
“Site n’ọmụmụ Bible anyị, anyị bịara ghọta na Jehova bụ onye mbụ anyị kwesịrị iguzosi ike n’ihe nye nakwa na ọ chọrọ ka anyị hụ onye agbata obi anyị n’anya n’agbanyeghị okpukpe ma ọ bụ agbụrụ ya. Ugbu a, mụ na nwunye m dị n’otu n’ofufe anyị na-efe Jehova, amụtawokwa m na apụghị m iguzosi ike n’ihe nye Chineke ma ka na-alụso onye agbata obi m ọgụ.”
Iguzosi Ike n’Ihe nke E Ji Ezi Ihe Ọmụma Kpụzie
Ebe Jehova bụ Onye Okike anyị, iguzosi ike n’ihe nye ya kwesịrị ibutere iguzosi ike n’ihe nye ihe ọ bụla ọzọ ụzọ. (Mkpughe 4:11) Otú ọ dị, iji gbochie iguzosi ike n’ihe nye Chineke ịghọ ihe mkpali na-akpata ịnụbiga ọkụ n’obi ókè ma na-ebibi ihe, ọ ghaghị ịbụ nke e ji ezi ihe ọmụma kpụzie. Bible na-adụ anyị ọdụ, sị: “Ka e . . . mee ka unu dị ọhụrụ n’ikike nke na-akwali uche unu, ka unu . . . yikwasịkwa ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ bụ́ nke e kere dị ka uche Chineke si dị n’ezi . . . iguzosi ike n’ihe.” (Ndị Efesọs 4:23, 24) Nwoke ahụ a ma ama nke dere okwu ndị ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ katara obi ịgbagha ihe ndị a zụlitere ya iguzosi ike n’ihe nye. Nnyocha o mere dugara ya n’ime mgbanwe bara uru.
Ee, Sọl chere ule nke iguzosi ike n’ihe ihu, dị ka ọtụtụ ndị cheworo ya ihu n’oge anyị. A zụlitere Sọl n’ọdịnala siri ike nke ezinụlọ ya, ọ ghọkwara onye guzosiri ike n’ihe n’ụzọ pụtara ìhè nye okpukpe a mụnyere ya na ya. Ọbụna iguzosi ike n’ihe nye okpukpe ya kwaliri ya imeso ndị na-ekwenyeghị n’echiche ya ihe ike. A ma Sọl ama maka ịmabanye n’ebe obibi Ndị Kraịst na ịdọkpụrụ ha pụọ ka e wee taa ha ahụhụ na ọbụna gbuo ha.—Ọrụ 22:3-5; Ndị Filipaị 3:4-6.
Ma, ozugbo Sọl nwetara ezi ihe ọmụma nke Bible, o mere ihe ọtụtụ n’ime ndị ọgbọ ya weere dị ka ihe a na-apụghị ichetụ n’echiche. Ọ gbanwere okpukpe ya. Sọl, bụ́ onye e mesịrị mara dị ka Pọl onyeozi, họọrọ iguzosi ike n’ihe nye Chineke kama ịbụ nye ọdịnala. Iguzosi ike n’ihe nye Chineke, bụ́ nke dabeere n’ezi ihe ọmụma, kwaliri Sọl ịbụ onye na-ekwe ibe ya nọrọ, onye na-ahụ n’anya, na onye na-enye agbamume, n’ụzọ dị iche n’akparamàgwà mbụ ya nke imebi ihe na ịnụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè.
N’ihi Gịnị Ka Ị Ga-eji Na-eguzosi Ike n’Ihe?
Ikwe ka e jiri ụkpụrụ Chineke na-akpụzi iguzosi ike n’ihe anyị na-eweta abamuru doro anya. Dị ka ihe atụ, akụkọ e nwetara na 1999 site n’aka Ụlọ Akwụkwọ Maka Ihe Ọmụmụ Ezinụlọ n’Australia kwuru na “ntụkwasị obi na ikwesị ntụkwasị obi . . . [na] echiche nke iji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe” so n’ime ihe ndị bụ́ isi na-eme ka e nwee alụmdi na nwunye na-adịgide adịgide ma na-enye afọ ojuju. A chọpụtara n’otu nnyocha ahụ na inwe
“alụmdi na nwunye kwụsiri ike ma na-enye afọ ojuju” so eme ka ndị ikom na ndị inyom bụrụ ndị na-enwe obi ụtọ karị, ndị ahụ́ gbasiri ike karị, na ndị na-adị ogologo ndụ karị nakwa na alụmdi na nwunye kwụsiri ike na-enye ụmụaka ohere ka mma ibi ndụ obi ụtọ.N’ụwa nke taa a na-ejighị n’aka, iguzosi ike n’ihe yiri eriri nchebe nke na-eme ka onye na-egwu mmiri nke mmiri na-eri nwee ike ịbata n’ụgbọ nnapụta. Ọ bụrụ na ‘onye ahụ na-egwu mmiri’ adịghị eguzosi ike n’ihe, ebili mmiri na ifufe ga na-ebugharị ya. Ma ọ bụrụ na ọ dịghị eguzosi ike n’ihe nye ihe o kwesịrị, ọ ga-adị ka a ga-asị na e kegidere eriri nchebe ya n’ụgbọ mmiri na-emi emi. Dị ka Sọl, ọ pụrụ ịhụta onwe ya dị ka onye a dọkpụụrụ gaa n’ime omume na-ebibi ihe. Otú ọ dị, iguzosi ike n’ihe nye Jehova, bụ́ nke dabeere n’ezi ihe ọmụma, bụ eriri nchebe nke na-eme ka anyị kwụrụ chịm ma bụrụ ndị a zọpụtara.—Ndị Efesọs 4:13-15.
Jehova kwere ndị na-eguzosi ike n’ihe nye ya nkwa a, sị: “Jehova na-ahụ ezi ikpe n’anya, ọ dịghị ahapụkwa ndị ebere [“ndị na-eguzosi ike n’ihe nye,” NW] Ya; ruo mgbe ebighị ebi ka a na-edebe ha.” (Abụ Ọma 37:28) N’isi nso, a ga-eme ka ndị nile na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova banye n’ụwa paradaịs, bụ́ ebe ha ga-enwere onwe ha pụọ n’iru újú na ihe mgbu, ebe ha ga-enwekwa obi ụtọ ná mmekọrịta na-adịgide adịgide nke nkewa ndị okpukpe na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-akpata na-agaghị adị na ya.—Mkpughe 7:9, 14; 21:3, 4.
Ọbụna ugbu a, ọtụtụ nde mmadụ gburugburu ụwa achọpụtawo na ezi obi ụtọ na-abịa nanị site n’iguzosi ike n’ihe ha nye Jehova. Gịnị ma i kwe ka Ndịàmà Jehova nyere gị aka iji eziokwu Bible nyochaa echiche gị banyere iguzosi ike n’ihe? Bible na-agwa anyị, sị: “Nọgidenụ na-anwale ma ùnu nọ n’okwukwe ahụ, nọgidenụ na-anwapụta ihe unu onwe unu bụ.”—2 Ndị Kọrint 13:5.
Ọ na-achọ obi ike iji gbaghaa nkwenkwe okpukpe anyị na ihe mere anyị ji na-eguzosi ike n’ihe nye ya, ma ụgwọ ọrụ ya pụrụ iru nnọọ mgbalị e meere ya mgbe ihe ndị si na ya apụta na-eme ka anyị bịarukwuo Jehova Chineke nso. Nwanyị ahụ e hotara ná mmalite kwupụtara mmetụta nke ọtụtụ mmadụ mgbe o kwuru, sị: “Amụtawo m na iguzosi ike n’ihe nye Jehova na ụkpụrụ ya na-enyere anyị aka imeso ezinụlọ anyị ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị na ịbụ ezigbo ụmụ amaala nke obodo anyị. Otú ọ sọkwara ule ndị ahụ ha taruo n’akpụ, ọ bụrụ na anyị eguzosie ike n’ihe nye Jehova, ọ ga-anọgide na-eguzosi ihe n’ihe nye anyị.”
[Foto ndị dị na peeji nke 6]
Ezi ihe ọmụma kpaliri Sọl ịgbanwe ihe ọ na-eguzosi ike n’ihe nye
[Foto dị na peeji nke 7]
Gịnị ma i jiri eziokwu Bible nyochaa nguzosi ike n’ihe gị?
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 4]
Churchill, n’elu elu aka ekpe: foto U.S. National Archives; Joseph Göbbels, n’isi isi aka nri: Library of Congress