Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ùnu Maara Ihe Mere M Ji Weghachitere Unu Ego Unu?”

“Ùnu Maara Ihe Mere M Ji Weghachitere Unu Ego Unu?”

“Ùnu Maara Ihe Mere M Ji Weghachitere Unu Ego Unu?”

‘OO, EGO dị m mkpa nke ukwuu!’ ka Nana, bụ́ nne nanị ya na-azụ ụmụ okoro atọ, onye bi na Kaspi na Republic of Georgia, chere n’echiche. Otu ụtụtụ, e mezuru atụmanya ya nke inweta ego. Ọ hụrụ lari 300 n’akụkụ ụlọ ọrụ ndị uwe ojii. Ọ dịghị onye nọ nso. Ọ bụ nnọọ ego buru ibu. N’ezie, Nana ahụtụbeghị akwụkwọ ego 100 lari eri afọ ise lari ghọrọ ego mba ahụ ji eme ihe. Ndị ahịa nọ n’ógbè ya agaghị akpata ego haruru otú ahụ mgbe ha zụsịrị ahịa ruo ọtụtụ afọ.

‘Olee uru ego a ga-abara m ma ọ bụrụ na okwukwe m, egwu Chineke, na ọnọdụ ime mmụọ m ga-efunahụ m?’ ka Nana chere n’echiche. Ọ zụlitewo àgwà Ndị Kraịst dị otú ahụ, ọbụna na-atachi obi ná mkpagbu siri ike na iti ihe n’ihi ihe o kweere.

Mgbe ọ garuru n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii ahụ, Nana hụrụ ndị uwe ojii ise ka ha ji anya ọkụ na-achọ ihe. Ọ chọpụtara na ọ bụ ego ahụ ka ha na-achọ, n’ihi ya, ọ gakwuuru ha ma sị: “Ọ̀ dị ihe funahụrụ unu?”

“Ego,” ka ha zaghachiri.

“Ego ole?”

“Narị lari atọ!”

“Achọtara m ego unu,” ka Nana kwuru. Ya ajụzie, sị: “Ùnu maara ihe mere m ji weghachitere unu ego unu?” Ha amaghị.

“Ọ bụ n’ihi na abụ m otu n’ime Ndịàmà Jehova,” ka ọ gara n’ihu ikwu. “A sị na abụghị m, agaraghị m eweghachitere unu ego unu.”

Onyeisi ndị uwe ojii bụ́ onye ego ahụ funahụrụ nyere Nana lari 20 iji gosi ekele o nwere maka ime ihe n’eziokwu ya.

Akụkọ ahụ gbasara ngwa ngwa n’ógbè Kaspi nile. N’echi ya, otu nwanyị na-edebe ụlọ ọcha bụ́ onye si n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii ahụ pụta gwara Nana, sị: “[Onyeisi ahụ] na-edebekarị akwụkwọ unu n’ọfịs ya. Ikekwe ọ ga-eji ya na-akpọrọ ihe ugbu a ọbụna karị.” Ọbụna otu onye uwe ojii kwuru, sị: “A sị na mmadụ nile bụ Ndịàmà Jehova, ònye ga-eme mpụ?”