Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Nduzi dị aṅaa ka Akwụkwọ Nsọ na-enye banyere ịzụ ụmụ mgbe nne ma ọ bụ nna bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova ma onye nke ọzọ abụghị?

Ụkpụrụ abụọ bụ́ isi dabeere n’Akwụkwọ Nsọ na-enye Onyeàmà nke nwere di ma ọ bụ nwunye na-abụghị Onyeàmà nduzi n’ihe banyere ịzụ ụmụ. Otu bụ: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.” (Ọrụ 5:29) Nke ọzọ bụ: “Di bụ isi nke nwunye ya dị ka Kraịst bụkwa isi nke ọgbakọ ahụ.” (Ndị Efesọs 5:23) Nke ikpeazụ metụtara ọ bụghị nanị ndị nwunye di ha bụ Ndịàmà kamakwa ndị di ha na-abụghị Ndịàmà. (1 Pita 3:1) Olee otú nne ma ọ bụ nna bụ́ Onyeàmà pụrụ isi gbasoo ụkpụrụ ndị a mgbe ọ na-ezi ụmụ ya ihe?

Ọ bụrụ na di bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ọ bụ ya ka ọ dị n’aka igbo ma mkpa ime mmụọ ma nke anụ ahụ́ nke ezinụlọ ya. (1 Timoti 5:8) Ọ bụ ezie na oge nne ahụ na-ekweghị ekwe ji eso ụmụ ya anọkọ pụrụ ịdị ukwuu karị, nna ahụ bụ́ Onyeàmà kwesịrị ịkụziri ụmụ ya ihe site n’inye ha ọzụzụ ime mmụọ n’ebe obibi nakwa site n’ịkpọ ha na-aga nzukọ Ndị Kraịst, bụ́ ebe ha ga-erite uru site ná ntụziaka metụtara omume nakwa site ná mkpakọrịta na-ewuli elu.

Gịnị ma ọ bụrụ na nwunye ya na-ekweghị ekwe esie ọnwụ na ya ga-akpọ ụmụ ha na-aga n’ebe ya na-efe ofufe ma ọ bụ na-akụziri ha nkwenkwe ya? Iwu obodo pụrụ inye ya ikike ime otú ahụ. Ụmụaka ahụ ịbụ ndị a ratara ife ofufe n’ebe dị otú ahụ pụrụ ịdabere n’ụzọ ka ukwuu n’ụdị ozizi ime mmụọ nna ha na-enye ha. Ka ụmụaka ahụ na-etolitekwu, ọzụzụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ nke nna ha na-enye ha kwesịrị inyere ha aka ịgbaso eziokwu nke Okwu Chineke. Lee ka obi ga-esi dị di ahụ kwere ekwe ụtọ ma ọ bụrụ na ụmụ ya agbasoo ụzọ nke eziokwu ahụ!

Ọ bụrụ na nne bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ọ ghaghị ịkwanyere ụkpụrụ ịbụisi ùgwù ka ọ na-echebara ọdịmma ebighị ebi nke ụmụ ya echiche. (1 Ndị Kọrint 11:3) N’ọtụtụ ọnọdụ, di ya na-ekweghị ekwe agaghị enye nsogbu ma ọ bụrụ na nwunye ya bụ́ Onyeàmà enye ụmụ ha ọzụzụ banyere omume na ihe ime mmụọ, a na-achọtakwa enyemaka iji mezuo nke ahụ ná nzukọ dị iche iche nke ndị Jehova. Nne ahụ pụrụ inyere di ya na-ekweghị ekwe aka ịhụ uru ndị dị n’ọzụzụ na-ewuli elu ụmụ ya na-enweta site ná nzukọ Jehova. Ọ pụrụ iji akọ mesie uru dị n’ịkụbanye ụkpụrụ omume nke Bible n’ime ụmụ ha ike, ebe ọ bụ na ha na-ebi n’ụwa nke omume ọma na-adakpọ adakpọ na ya.

Otú ọ dị, di ahụ na-ekweghị ekwe pụrụ isi ọnwụ ka ụmụ ya kpewe okpukpe ya, na-akpọ ha aga ebe ọ na-efe ofufe ma na-enye ha ọzụzụ okpukpe n’ụzọ kwekọrọ na nkwenkwe okpukpe ya. Ma ọ bụ, di pụrụ imegide okpukpe nile ma sie ọnwụ ka ụmụ ya ghara inweta ọzụzụ okpukpe. Dị ka onyeisi ezinụlọ, ọ bụ ya ka ọ dị n’aka n’ụzọ bụ́ isi ime mkpebi ahụ. *

Ka ọ na-akwanyere ịbụisi nke di ya ùgwù, dị ka Onye Kraịst raara onwe ya nye, nwunye kwere ekwe ga-eburu àgwà nke ndịozi bụ́ Pita na Jọn n’uche, bụ́ ndị sịrị: “Anyị apụghị ịkwụsị ikwu banyere ihe ndị anyị hụworo ma nụ.” (Ọrụ 4:19, 20) N’ihi nchegbu o nwere maka ọdịmma ime mmụọ nke ụmụ ya, nne bụ́ Onyeàmà ga-achọ ohere ọ ga-eji nye ha nduzi n’ihe banyere omume. O nwere ibu ọrụ n’ebe Jehova nọ ịkụziri ndị ọzọ ihe ọ maara dị ka eziokwu, o kwesịghịkwa ịgụpụ ụmụ ya. (Ilu 1:8; Matiu 28:19, 20) Olee otú nne bụ́ Onyeàmà pụrụ isi mee ihe banyere ọnọdụ a tara akpụ?

Were dị ka ihe atụ, okwu metụtara ikwere na Chineke. Nwunye bụ́ Onyeàmà nwere ike ọ gaghị na-eso ụmụ ya enwe ọmụmụ Bible a haziri ahazi n’ihi ihe mgbochi di ya nyere ya. Ò kwesịrị iji n’ihi nke a zere ịdị na-agwa ụmụ ya ihe ọ bụla banyere Jehova? Ee e. Okwu ya na omume ya kwesịrị nnọọ ịdị na-egosi na o kweere n’ebe Onye Okike nọ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ụmụ ya ga-ajụ ajụjụ banyere ya. Ahụ́ kwesịrị iru ya ala iji nnwere onwe ikpe okpukpe ya mee ihe site n’ịgwa ndị ọzọ, gụnyere ụmụ ya, ihe o kweere banyere Onye Okike. Ọ bụrụgodị na ọ gaghị enwe ike iduziri ụmụ ya ọmụmụ Bible ma ọ bụ kpọrọ ha na-agachi nzukọ anya, ọ pụrụ ịkụnye ihe ọmụma banyere Jehova Chineke n’obi ha.—Deuterọnọmi 6:7.

Banyere mmekọrịta dị n’etiti Onyeàmà na di ma ọ bụ nwunye ya na-ekweghị ekwe, Pọl onyeozi dere, sị: “E dowo di ahụ na-ekweghị ekwe nsọ n’ihe metụtara nwunye ya, e dowokwa nwunye ahụ na-ekweghị ekwe nsọ n’ihe metụtara nwanna ahụ; ma ọ́ bụghị ya, ụmụ unu ga-abụ ndị na-adịghị ọcha n’ezie, ma ugbu a ha dị nsọ.” (1 Ndị Kọrint 7:14) Jehova na-ele mmekọrịta alụmdi na nwunye ahụ anya dị ka ihe dị nsọ n’ihi di ma ọ bụ nwunye ahụ kwere ekwe, a na-ewerekwa ụmụ ha dị ka ndị dị nsọ n’anya Jehova. Nwunye bụ́ Onyeàmà kwesịrị ime ike ya nile iji nyere ụmụ ya aka ịghọta eziokwu ahụ, na-ahapụrụ Jehova ihe ga-emesị si na ya pụta.

Ka ụmụaka ahụ na-etolitekwu, ha aghaghị ikpebi ụzọ ha ga-agbaso na-adabere n’ihe ọmụma ha nwetaworo n’aka nne na nna ha. Ha pụrụ ikpebi ime ihe kwekọrọ n’okwu Jizọs bụ́: “Onye nwere mmetụta na-ekpo ọkụ n’ebe nna ma ọ bụ nne ya nọ karịa ka o nwere n’ebe m nọ ekwesịghị m.” (Matiu 10:37) E nyekwara ha iwu, sị: “Ndị bụ́ ụmụ, na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi n’ihe metụtara Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:1) Ọtụtụ ndị ntorobịa ekpebiwo ‘irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị’ karịa nne ma ọ bụ nna ha na-abụghị Onyeàmà, n’agbanyeghị ihe isi ike nne ma ọ bụ nna ahụ na-ewetara ha. Lee ka ọ ga-esi bụrụ ihe na-akwụghachi ụgwọ nye nne ma ọ bụ nna ahụ bụ́ Onyeàmà ịhụ ka ụmụ ya kpebiri ijere Jehova ozi n’agbanyeghị mmegide!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Oruru o ruuru nwunye n’ụzọ iwu ikpe okpukpe masịrị ya na-agụnye oruru o ruuru ya ịga nzukọ Ndị Kraịst. N’ọnọdụ ụfọdụ, onye bụ́ di abụwo onye na-adịghị njikere ilekọta obere ụmụaka n’oge ndị a, n’ihi ya, iwu ji nne na-ahụ n’anya ịkpọrọ ha gaa nzukọ.