“M Na-esetịpụrụ Unu Ụkpụrụ”
“M Na-esetịpụrụ Unu Ụkpụrụ”
“Unu kwesịrị ịbụ ndị ozizi ka ọ dị ugbu a.”—NDỊ HIBRU 5:12.
1. N’ihi gịnị ka okwu ndị dị ná Ndị Hibru 5:12 pụrụ iji mee ka Onye Kraịst na-enwetụ nchegbu n’ụzọ ezi uche dị na ya?
KA Ị na-agụ okwu ndị ahụ e dere n’ike mmụọ nsọ bụ́ ndị dị n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ isiokwu a dabeere na ya, ị̀ na-enwetụ nchegbu banyere onwe gị? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ bụghị nanị gị ka ọ dị otú ahụ. Dị ka ndị na-eso ụzọ Kraịst, anyị maara na anyị aghaghị ịbụ ndị ozizi. (Matiu 28:19, 20) Anyị maara na oge anyị na-ebi n’ime ya na-eme ka ọ dị ngwa na anyị ga na-ezi ihe nke ọma ruo ókè ike kwere anyị. Anyị makwaara na izi ihe anyị pụrụ ọbụna ime ka ndị anyị na-ezi ihe dị ndụ ma ọ bụ nwụọ! (1 Timoti 4:16) Ya mere, n’ụzọ ezi uche dị na ya, anyị pụrụ ịjụ onwe anyị, sị: ‘Abụ m n’ezie ụdị onye ozizi m kwesịrị ịbụ? Olee otú m pụrụ isi meziwanye ihe?’
2, 3. (a) Olee otú otu onye nkụzi si kọwaa ntọala nke izi ihe n’ụzọ dị mma? (b) Ụkpụrụ dị aṅaa ka Jizọs setịpụụrụ anyị n’ihe banyere izi ihe?
2 Nchegbu ndị dị otú ahụ ekwesịghị ịkụda anyị mmụọ. Ọ bụrụ na anyị na-ele izi ihe anya dị ka ihe chọrọ nkà ụfọdụ pụrụ iche, anyị pụrụ iche na ọ ga-esiri anyị ike nke ukwuu imeziwanye ihe. Otú ọ dị, ntọala nke izi ihe n’ụzọ dị mma abụghị nkà kama ọ bụ ihe dị nnọọ mkpa karịa ya. Rịba ama ihe otu onye nkụzi nwere ahụmahụ dere n’akwụkwọ banyere nke a: “Izi ihe n’ụzọ dị mma adịghị adabere na nkà ma ọ bụ n’ụzọ izi ihe, atụmatụ ma ọ bụ omume ndị a kapịrị ọnụ. . . . N’ụzọ bụ́ isi, izi ihe na-adabere n’igosipụta ịhụnanya.” N’ezie, echiche ya bụ nke onye nkụzi ụlọ akwụkwọ. Otú ọ dị, isi ihe dị n’okwu ya pụrụ imetụta izi ihe anyị dị ka Ndị Kraịst ọbụna karị. N’ụzọ dị aṅaa?
3 Onye Nlereanya anyị dị ka onye ozizi abụghị onye ọzọ karịa Jizọs Kraịst, bụ́ onye gwara ụmụazụ ya sị: “M na-esetịpụrụ unu ụkpụrụ.” (Jọn 13:15) Ọ na-ezo aka n’ihe nlereanya ya n’igosipụta ịdị umeala n’obi, ma n’ezie, ụkpụrụ Jizọs setịpụụrụ anyị na-agụnye ọrụ bụ́ isi ọ rụrụ dị ka mmadụ n’elu ala—nke izi ndị mmadụ ozi ọma nke Alaeze Chineke. (Luk 4:43) Ugbu a, a sị gị họrọ otu okwu ị ga-eji kọwaa ozi Jizọs, eleghị anya ị ga-ahọrọ okwu bụ́ “ịhụnanya,” ọ́ bụghị ya? (Ndị Kọlọsi 1:15; 1 Jọn 4:8) Ịhụnanya Jizọs nwere n’ebe Nna ya nke eluigwe, bụ́ Jehova, nọ karịrị ihe nile ọzọ. (Jọn 14:31) Otú ọ dị, dị ka onye ozizi, Jizọs gosipụtara ịhụnanya n’ụzọ abụọ ọzọ. Ọ hụrụ eziokwu ahụ ọ kụziri n’anya, ọ hụkwara ndị ọ kụziiri ya n’anya. Ka anyị lebakwuo anya nke ọma n’akụkụ abụọ a nke ụkpụrụ o setịpụụrụ anyị.
Ịhụnanya nke Dịwara Eri Oge Maka Eziokwu Chineke
4. Olee otú Jizọs si zụlite ịhụnanya maka izi ihe Jehova?
4 Àgwà onye ozizi nwere n’ebe ihe ọ na-akụzi dị na-enwe mmetụta dị ukwuu n’otú o si ezi ihe. Aịsaịa 50:4, 5 dekọrọ okwu ndị a dabara adaba: “Onyenwe anyị, bụ́ Jehova, enyewo m ire nke ndị mmụta, ka m wee mara iwere okwu kwagide onye dara mbà: Ọ na-akpọte ntị m kwa ụtụtụ, Ọ na-akpọte ntị m ịnụ ihe dị ka ndị mmụta. Onyenwe anyị Jehova emegheworo m ntị m, ma Mụ onwe m enupụghị isi, alaghachighị m azụ.”
Omume ọ gbasaghị m ọ bụla nwere ike ịpụta ìhè ma feere ndị ọ na-ezi ihe. Jizọs enweghị omume ọ gbasaghị m ọ bụla n’ebe eziokwu ahụ dị oké ọnụ ahịa nke ọ kụziri banyere Jehova na Alaeze Ya dị. Mmasị Jizọs nwere n’isiokwu a miri nnọọ emi. Ọ zụlitere mmasị ahụ mgbe ọ na-amụ ihe amụ. N’ogologo afọ nile ọ dịrị adị tupu ọ ghọọ mmadụ, Ọkpara ahụ a mụrụ nanị ya bụ onye na-amụchi ihe anya.5, 6. (a) Ahụmahụ dị aṅaa ka ihe àmà na-egosi na Jizọs nwere mgbe e mere ya baptizim, mmetụta dịkwa aṅaa ka o nwere n’ahụ́ ya? (b) Ọdịiche dị aṅaa ka anyị na-ahụ n’etiti Jizọs na Setan n’ihe banyere iji Okwu Chineke eme ihe?
5 Mgbe Jizọs na-etolite dị ka mmadụ n’elu ala, ọ nọgidere na-ahụ amamihe Chineke n’anya. (Luk 2:52) Ka e mesịrị, mgbe a na-eme ya baptizim, o nwere ahụmahụ pụrụ iche. “E meghere eluigwe,” ka Luk 3:21 na-ekwu. Dị ka ihe àmà gosiri, Jizọs bịara nwee ike mgbe ahụ icheta ịdị adị ya tupu ọ ghọọ mmadụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, o buru ọnụ ruo ụbọchị 40 n’ọzara. Ọ ghaghị ịtọwo ya ụtọ nke ukwuu ịtụgharị uche n’ọtụtụ oge ndị o ji nata ntụziaka site n’aka Jehova mgbe ọ nọ n’eluigwe. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, e lere ịhụnanya o nwere maka eziokwu Chineke ule.
6 Mgbe ike gwụrụ Jizọs, agụụ amalitekwa ịgụ ya, Setan gbalịrị ịnwa ya. Lee ọdịiche anyị na-ahụ n’etiti ụmụ abụọ a nke Chineke! Ha abụọ hotachara ihe site n’Akwụkwọ Nsọ Hibru—ma ha ji àgwà dị nnọọ iche mee nke a. Setan gbagọrọ Okwu Chineke, jiri enweghị nkwanye ùgwù were ya mee ihe iji mezuo nzube ya ndị bụ́ maka ọchịchọ ọdịmma onwe ya nanị. N’ezie, ihe onye nnupụisi ahụ na-eme n’ebe eziokwu Chineke dị bụ nanị ilelị ya. N’aka nke ọzọ, Jizọs ji ịhụnanya pụtara ìhè hota Akwụkwọ Nsọ, jiri nlezianya were Okwu Chineke mee ihe ná nzaghachi nke ọ bụla o nyere. Ọ dịwo anya Jizọs dịwara adị tupu e detuo okwu ndị ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ na nke mbụ ha, n’agbanyeghị nke ahụ, ọ kwanyeere ha ùgwù. Ha bụ eziokwu ndị dị oké ọnụ ahịa sitere n’aka Nna ya nke eluigwe! Ọ gwara Setan na okwu ndị ahụ sitere n’ọnụ Jehova dị oké mkpa karịa nri. (Matiu 4:1-11) Ee, Jizọs hụrụ eziokwu nile nke Jehova kụziiri ya n’anya. Otú ọ dị, olee otú o si gosipụta ịhụnanya ahụ dị ka onye ozizi?
Ịhụnanya Maka Eziokwu Ndị Ọ Kụziri
7. N’ihi gịnị ka Jizọs ji zere ichepụta ozizi nke aka ya?
7 Ịhụnanya Jizọs nwere maka eziokwu ahụ ọ kụziri pụtara ìhè mgbe nile. E kwuwerị, ọ pụrụ ichepụtawo echiche nke onwe ya n’ụzọ dị mfe. O nwere ihe ọmụma na amamihe sara nnọọ mbara. (Ndị Kọlọsi 2:3) Otú o sina dị, o chetaara ndị na-ege ya ntị ugboro ugboro na ihe nile ọ kụziri esiteghị n’aka ya, kama ha sitere n’aka Nna ya nke eluigwe. (Jọn 7:16; 8:28; 12:49; 14:10) Ọ hụrụ eziokwu nke Chineke n’anya nke ukwuu nke na ọ pụghị iji echiche nke onwe ya dochie ha.
8. Ná mmalite nke ozi ya, olee otú Jizọs si setịpụ ụkpụrụ nke ịdabere n’Okwu Chineke?
8 Mgbe Jizọs malitere ozi ihu ọha ya, o setịpụrụ ụkpụrụ ngwa ngwa. Tụlee otú o si gwa ndị Chineke na nke mbụ ya na ya bụ Mezaịa ahụ e kwere ná nkwa. Ọ̀ pụtara nnọọ n’ihu ìgwè mmadụ, kwuo na ya bụ Kraịst, ma rụzie ọrụ ebube ndị dị ịrịba ama iji gosi na ihe o kwuru bụ eziokwu? Ee e. Ọ gara n’ụlọ nzukọ, bụ́ ebe ndị Chineke na-anọkarị agụ Akwụkwọ Nsọ. N’ebe ahụ, ọ gụrụ amụma nke Aịsaịa 61:1, 2 n’olu dara ụda ma kọwaa na ọ bụ ya onwe ya ka eziokwu ndị a e buru n’amụma na-ekwu banyere ya. (Luk 4:16-22) Ọtụtụ ọrụ ebube ọ rụrụ nyere aka ịnwapụta na o nwere nkwado Jehova. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dabeere n’Okwu Chineke mgbe nile n’ozizi ya.
9. N’ụzọ Jizọs si mesoo ndị Farisii ihe, olee otú o si gosipụta ezi ịhụnanya maka Okwu Chineke?
9 Mgbe ndị okpukpe na-emegide Jizọs mara ya aka, ọ gaghị ka ya na ha sọrịtawa mpi banyere onye ka ibe ya nwee amamihe, ọ bụ ezie na ọ gaara emeri ha n’asọmpi dị otú ahụ. Kama nke ahụ, o kwere ka Okwu Chineke mee ha ndị Matiu 12:1-5) N’ezie, ọ pụrụ ịbụ nnọọ na ndị ikom ahụ bụ́ ndị ezi omume n’anya onwe ha agụwo ihe ndekọ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ nke e dekọrọ na 1 Samuel 21:1-6. Ọ bụrụ otú ahụ, ha aghọtaghị ihe mmụta dị mkpa dị na ya. Otú ọ dị, Jizọs emewo ihe karịrị ịgụ ihe ndekọ ahụ. O chebaworo ya echiche ma buru ụkpụrụ ndị dị na ya n’uche. Ọ hụrụ ụkpụrụ ndị Jehova kụziri n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ n’anya. Ya mere, o ji ihe ndekọ ahụ na ihe atụ sitere n’Iwu Mozis gosi otú Iwu ahụ si gosipụta nchebara echiche. N’ụzọ yiri nke ahụ, ezi ịhụnanya Jizọs nwere kpaliri ya ịgbachitere Okwu Chineke mgbe ndị ndú okpukpe na-eme mgbalị ịgbagọ ya maka abamuru nke onwe ha ma ọ bụ jiri ọdịnala nke mmadụ kpuchigide ya.
ụgha. Dị ka ihe atụ, cheta mgbe ndị Farisii boro ebubo na ụmụazụ Jizọs dara iwu Ụbọchị Izu Ike site n’ịghọrọtụ ọka n’ubi ma na-ata ha ka ha na-agafe. Jizọs zaghachiri, sị: “Ọ̀ bụ na unu agụbeghị ihe Devid mere mgbe agụụ gụrụ ya na ndị ikom so ya?” (10. Olee otú Jizọs si mezuo amụma ndị kwuru banyere otú izi ihe ya ga-adị?
10 Mmasị Jizọs nwere n’ihe ọ kụziri agaghị ekwe ma ọlị ka o zie ihe n’ụdị ikwughachi ihe o bu n’isi, n’ụzọ na-agwụ ike ma ọ bụ jụọ oyi. Amụma ndị e buru n’ike mmụọ nsọ ekwuwo na Mezaịa ahụ ga-eji ‘amara nke egbugbere ọnụ ya abụọ’ kwuo okwu, na-eji “okwu ọnụ nile dị ụtọ” eme ihe. (Abụ Ọma 45:2; Jenesis 49:21) Jizọs mezuru amụma ndị ahụ site n’ime ka ozi ya na-adọrọ mmasị ma doo anya, na-eji “okwu ọma” eme ihe ka ọ na-akụzi eziokwu ahụ ọ hụrụ n’anya nke ukwuu. (Luk 4:22) Obi abụọ adịghị ya na ịnụ ọkụ n’obi ya pụtara ìhè n’ihu ya, anya ya gbukepụkwara n’ihi oké mmasị o nwere n’ihe ọ na-ekwu. Lee ka ọ na-aghaghị isiwo bụrụ ihe na-enye obi ụtọ ige ya ntị, leekwa ụkpụrụ dị mma ọ bụụrụ anyị ịgbaso mgbe anyị na-agwa ndị ọzọ banyere ihe anyị mụtaworo!
11. N’ihi gịnị ka nkà ndị Jizọs nwere dị ka onye ozizi na-ejitụghị mee ka ọ bụrụ onye nganga fụliri elu?
11 Nghọta Jizọs ghọtara eziokwu nke Chineke n’ụzọ sara mbara na okwu ya ndị na-adọrọ adọrọ hà mere ka ọ bụrụ onye nganga fụliri elu? Nke ahụ na-emekarị n’ebe ndị nkụzi bụ́ mmadụ nọ. Otú ọ dị, cheta na Jizọs maara ihe n’ụzọ na-egosipụta na ọ na-asọpụrụ Chineke. Amamihe dị otú ahụ adịghị ekwe ka mmadụ fụlie onwe ya elu, n’ihi na “n’ebe ndị dị umeala n’obi nọ ka amamihe dị.” (Ilu 11:2) Ọ dị ihe ọzọ mere ka Jizọs ghara ịdị mpako ma ọ bụ ịfụli onwe ya elu.
Jizọs Hụrụ Ndị O Ziri Ihe n’Anya
12. Olee otú Jizọs si gosi na ya achọghị ka ụmụazụ ya na-atụ ya egwu?
12 Ịhụnanya miri emi Jizọs nwere n’ebe ndị mmadụ nọ pụtara ìhè mgbe nile n’ozizi ya. Ozizi ya adịghị mgbe o menyere ndị mmadụ ụjọ, n’adịghị ka nke ụmụ mmadụ ndị dị mpako. (Eklisiastis 8:9) Mgbe Pita hụsịrị otu ọrụ ebube nke Jizọs, ibobo nwụrụ ya n’ahụ́, ọ dakwara n’ala n’ụkwụ Jizọs. Ma Jizọs achọghị ka ụmụazụ ya na-atụ ya egwu na-ekwesịghị ekwesị. O ji obiọma kwuo sị, “Kwụsị ịtụ egwu” ma gwazie Pita banyere ọrụ na-akpali akpali nke ime ndị na-eso ụzọ nke ọ ga-ekere òkè na ya. (Luk 5:8-10) Jizọs chọrọ ka ihe ga-akpali ndị na-eso ụzọ ya bụrụ ịhụnanya ha onwe ha nwere maka eziokwu dị oké ọnụ ahịa banyere Chineke, ọ bụghị egwu ha na-atụ onye ozizi ha.
13, 14. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jizọs si gosi mmetụta ọmịiko n’ebe ndị mmadụ nọ?
13 Ịhụnanya Jizọs nwere n’ebe ndị o ziri ihe nọ pụtakwara ìhè ná mmetụta ọmịiko o nwere Matiu 9:36) O meteere ha ebere n’ihi ọnọdụ ha kwesịrị imere ebere, a kpalikwara ya inyere ha aka.
n’ahụ́ ha. “Mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, o nwere ọmịiko n’ahụ́ ha, n’ihi na a gbara ha akpụkpọ, chụsasịakwa ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” (14 Rịba ama mmetụta ọmịiko Jizọs gosipụtara n’oge ọzọ. Mgbe otu nwanyị nwere oruru ọbara bịakwutere ya n’etiti ìgwè mmadụ ma metụ ọnụ ọnụ uwe ya aka, a gwọrọ nwanyị ahụ n’ụzọ ọrụ ebube. O metụrụ Jizọs n’ahụ́ na ike esiwo n’ahụ́ ya pụọ, ma ọ hụghị onye a gwọrọ ọrịa. O siri ọnwụ ịhụ nwanyị ahụ. N’ihi gịnị? Ọ bụghị iji katọọ ya maka imebi Iwu ahụ ma ọ bụ ụkpụrụ iwu nke ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, dị ka nwanyị ahụ pụrụ ịtụwo ụjọ na ọ ga-eme. Kama nke ahụ, ọ gwara ya, sị: “Nwa m nwanyị, okwukwe gị emewo ka ahụ́ dị gị mma. Laa n’udo, sikwa n’ajọ ọrịa gị pụta wee nwee ahụ́ ike.” (Mak 5:25-34) Rịba ama mmetụta ọmịiko dị n’okwu ndị ahụ. Ọ sịghị nanị, “Ka a gwọọ gị.” Kama nke ahụ, ọ sịrị: “Sikwa n’ajọ ọrịa gị pụta wee nwee ahụ́ ike.” N’ebe a, Mak jiri okwu pụrụ ịpụta “ịpịa ihe” n’ụzọ nkịtị mee ihe, bụ́ ụdị ịpịa ihe nke a na-ejikarị emekpọ ndị mmadụ ọnụ. N’ụzọ dị otú a, Jizọs kwetara na ọrịa ya akpataworo ya nhụjuanya, ikekwe oké ihe mgbu anụ ahụ́ na nke mmetụta uche. O meteere ya ebere.
15, 16. Ihe ndị dị aṅaa mere n’oge ije ozi Jizọs gosiri na ọ na-achọ ebe ndị mmadụ na-emezi emezi?
15 Jizọs gosipụtakwara ịhụnanya n’ebe ndị mmadụ nọ site n’ịchọ ebe ha na-emezi emezi. Tụlee ihe mere mgbe o zutere Nataniel, bụ́ onye mesịrị ghọọ onyeozi. “Jizọs hụrụ ka Nataniel na-abịakwute ya wee kwuo banyere ya, sị: ‘Lee, onye Izrel n’ezie, bụ́ onye aghụghọ ọ bụla na-adịghị n’ime ya.’” N’ụzọ ọrụ ebube, Jizọs elebawo anya n’obi Nataniel, si otú ahụ na-amara ihe dị ukwuu banyere ya. N’ezie, Nataniel ezughị okè. O nwere amaghị eme, dị ka anyị nile nwere. N’ezie, mgbe ọ nụrụ banyere Jizọs, o kwuru okwu na-agbatụ agba: “Ọ̀ dị ihe ọma ọ bụla pụrụ isi na Nazaret pụta?” (Jọn 1:45-51) Otú ọ dị, n’ime ihe nile a pụrụ ikwu banyere Nataniel, Jizọs họọrọ ilekwasị anya n’omume kwesịrị ịja mma, bụ́ obi eziokwu nke nwoke ahụ.
16 N’ụzọ yiri nke ahụ, mgbe otu onyeisi ndị agha—ikekwe onye Jentaịl, bụ́ onye Rom—bịakwutere Jizọs ma rịọ ya ka ọ gwọọ otu ohu na-arịa ọrịa, Jizọs maara na onye agha ahụ nwere ebe ndị ọ na-adịghị emezi emezi. Eleghị anya onyeisi ndị agha n’oge ahụ ga-ebiwo ndụ jupụtara n’ime ihe ike, ịkwafu ọbara, nakwa ife ofufe ụgha. N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs lekwasịrị anya n’ezi ihe—okwukwe nwoke ahụ bụ́ nke dị ịrịba ama. (Matiu 8:5-13) Ka e mesịrị, mgbe Jizọs na-agwa onye mmebi iwu nke a kwụwara n’osisi ịta ahụhụ dịketere nke ya okwu, Jizọs abaghịrị nwoke ahụ mba n’ihi mpụ o mere n’oge gara aga kama nke ahụ, o ji olileanya maka ọdịnihu gbaa ya ume. (Luk 23:43) Jizọs maara nke ọma na nanị ihe ịhụchata ebe ndị ọzọ na-adịghị emezi emezi na ịkatọ ha na-eme bụ ịkụda ha mmụọ. Obi abụọ adịghị ya na mgbalị o mere ịchọ ebe ndị ọzọ na-emezi emezi gbara ọtụtụ ndị ume ime nke ọma ọbụna karị.
Ịdị Njikere Ijere Ndị Ọzọ Ozi
17, 18. N’ịnara ọrụ nke ịbịa n’ụwa, olee otú Jizọs si gosipụta mmụọ nke ịdị njikere ijere ndị ọzọ ozi?
17 Ihe àmà ọzọ gbara ọkpụrụkpụ nke gosipụtara ịhụnanya Jizọs nwere n’ebe ndị o ziri ihe nọ bụ njikere ọ dị ijere ha ozi. N’oge ọ dịrị ndụ tupu ọ ghọọ mmadụ, ihe banyere ihe a kpọrọ mmadụ anọwo na-atọ Ọkpara Chineke ụtọ mgbe nile. (Ilu 8:30, 31) Dị ka “Okwu” Jehova, ma ọ bụ ọnụ na-ekwuru ya, ọ ghaghị ịbụ na ya na ụmụ mmadụ emekọrịtawo ihe ọtụtụ ugboro. (Jọn 1:1) Otú ọ dị, otu n’ime ihe ndị mere o ji “[mee] onwe ya ihe efu ma were ọdịdị onye ohu,” na-ahapụ ọnọdụ ya dị elu n’eluigwe, bụ iji zie ihe a kpọrọ mmadụ ihe ihu na ihu. (Ndị Filipaị 2:7; 2 Ndị Kọrint 8:9) Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ tụghị anya ka a bịa jewere ya ozi. Kama nke ahụ, o kwuru, sị: “Nwa nke mmadụ bịara, ọ bụghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi nakwa ka o nye mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:28) Jizọs biri ndụ kwekọrọ nnọọ n’okwu ndị ahụ.
18 Jizọs ji obi umeala gboo mkpa nke ndị o ziri ihe, na-adị njikere ịrụsi ọrụ ike n’ihi ha. O ji ụkwụ gazuo Ala Nkwa ahụ, na-aga ọtụtụ narị kilomita n’ụkwụ ije mee nkwusa ná mgbalị irute ọtụtụ ndị dị ka o kwere mee. N’adịghị ka ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ dị mpako, ọ nọgidere bụrụ onye dị obi umeala na onye a pụrụ ijekwuru. Ụdị mmadụ nile—ndị oké ozu, ndị agha, ndị ọkàiwu, ndị inyom, ụmụaka, ndị ogbenye, ndị ọrịa, ọbụna ndị ọha jụrụ ajụ—jiri ịnụ ọkụ n’obi bịakwute ya, n’atụghị egwu. Ọ bụ ezie na Jizọs zuru okè, ọ bụ mmadụ, ike na-agwụ ya, agụụ na-agụkwa ya. Otú ọ dị, ọbụna mgbe ike gwụrụ ya ma ọ bụ mgbe ọ chọrọ izuru ike ma ọ bụ mgbe ọ chọrọ oge dị jụụ iji kpee ekpere, o butere mkpa nke ndị ọzọ ụzọ.—Mak 1:35-39.
19. Olee ụzọ Jizọs si setịpụ ụkpụrụ nke iji obi umeala, ndidi, na obiọma mesoo ndị na-eso ụzọ ya ihe?
19 Jizọs dịkwa njikere ijere ndị na-eso ụzọ ya ozi. O mere otú ahụ site n’iji obiọma na ndidi zie ha ihe. Mgbe ha na-aghọtaghị ụfọdụ ihe ọmụma dị oké mkpa ngwa ngwa, ọ daghị mbà, wee iwe, ma ọ bụ baara ha mba. Ọ nọgidere na-achọta ụzọ ọhụrụ iji nyere ha aka ịghọta isi ihe ọ na-ekwu. Dị ka ihe atụ, cheedị banyere ugboro ole ndị na-eso ụzọ ya serịtara okwu banyere onye kasị ukwuu n’etiti ha. Ugboro ugboro, ọbụna ruo n’abalị bọtara ụbọchị e gburu ya, Jizọs chọtara ụzọ ndị ọhụrụ iji kụziere ha ka ha jiri obi umeala na-emeso ibe ha ihe. N’okwu banyere ịdị umeala n’obi, dị ka ọ dị n’ihe nile ọzọ, Jizọs pụrụ ikwu n’ụzọ ziri ezi, sị: “M na-esetịpụrụ unu ụkpụrụ.”—Jọn 13:5-15; Matiu 20:25; Mak 9:34-37.
20. Ụzọ izi ihe dị aṅaa mere ka Jizọs dị iche n’ebe ndị Farisii nọ, gịnịkwa mere ụzọ izi ihe ahụ ji dị irè?
20 Rịba ama na ihe Jizọs mere abụghị nnọọ ịgwa ndị na-eso ụzọ ya ihe ụkpụrụ ahụ bụ; o ‘setịpụrụ ụkpụrụ ahụ.’ O ji ihe nlereanya zie ha ihe. Ọ gwaghị ha okwu dị ka onye ka ha elu, dị ka a ga-asị na ọ na-ele onwe ya anya na ọ karịala ime ihe ọ na-agwa ha ka ha mee. Nke ahụ bụ otú ndị Farisii si eme ihe. “Ha na-ekwu ma ha adịghị eme,” ka Jizọs kwuru banyere ha. (Matiu 23:3) Jizọs ji obi umeala gosi ndị o ziri ihe kpọmkwem ihe ozizi ya pụtara site n’ibi ndụ kwekọrọ na ha, na-eme ha eme. Ya mere, mgbe ọ gbara ụmụazụ ya ume ka ha na-ebi ndụ dị mfe nke a na-ejighị ịhụ ihe onwunwe n’anya bogbuo, ọ dịghị ha mkpa ichewe ihe o bu n’obi. Ha pụrụ ịhụ ịbụ eziokwu nke okwu ya bụ́: “Nkịta ọhịa nwere ọgba, anụ ufe nke eluigwe nwekwara akwụ́, ma Nwa nke mmadụ enweghị ebe ọ bụla ịtọgbọ isi ya.” (Matiu 8:20) Jizọs jeere ndị na-eso ụzọ ya ozi site n’iji obi umeala setịpụrụ ha ụkpụrụ.
21. Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
21 N’ụzọ doro anya, Jizọs bụ Onye Ozizi kasị ukwuu nke dịtụworo ndụ n’ụwa! Mmasị o nwere n’ihe o ziri na ịhụnanya o nwere n’ebe ndị o ziri ihe nọ pụtara ìhè nye ndị nile nwere obi eziokwu bụ́ ndị hụrụ ya anya ma nụ ihe o kwuru. Otú ahụ ka ọ pụtakwara ìhè nye anyị taa bụ́ ndị na-amụ ụkpụrụ ahụ o setịpụrụ. Otú ọ dị, olee otú anyị pụrụ isi gbasoo ihe nlereanya zuru okè nke Kraịst? Isiokwu na-esonụ ga-atụle ajụjụ ahụ.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
• Gịnị bụ ntọala nke izi ihe n’ụzọ dị mma, dị ka ònye gosipụtara?
• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jizọs si gosipụta ịhụnanya maka eziokwu ahụ ọ kụziri?
• Olee otú Jizọs si gosipụta ịhụnanya n’ebe ndị o ziri ihe nọ?
• Ihe atụ ndị dị aṅaa na-egosi na Jizọs ji obi umeala dịrị njikere ijere ndị o ziri ihe ozi?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 12]
Olee otú Jizọs si gosi na ya hụrụ ụkpụrụ ndị dị n’Okwu Chineke n’anya?