Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Nọgide Na-eso M’

‘Nọgide Na-eso M’

‘Nọgide Na-eso M’

“Ọ bụ n’ụzọ a ka a kpọrọ unu, n’ihi na ọbụna Kraịst taara unu ahụhụ, na-ahapụrụ unu ihe nlereanya ka unu wee gbasochie nzọụkwụ ya anya.”—1 PITA 2:21.

1, 2. N’ihi gịnị ka ihe nlereanya zuru okè Jizọs setịpụrụ dị ka onye ozizi na-ejighị dịrị anyị oké elu iṅomi?

JIZỌS KRAỊST bụ nnọọ Onye Ozizi kasị bụrụ ọkà bitụrụla n’ụwa. Ọzọkwa, o zuru okè, n’emeghị mmehie ma ọlị n’oge nile ọ dịrị ndụ dị ka mmadụ. (1 Pita 2:22) Otú ọ dị, nke ahụ ọ̀ pụtara na ihe nlereanya Jizọs dị ka onye ozizi dịịrị anyị bụ́ ụmụ mmadụ na-ezughị okè oké elu iṅomi? Ọ dịghị ma ọlị.

2 Dị ka anyị hụrụ n’isiokwu bu ụzọ, ntọala nke ozizi Jizọs bụ ịhụnanya. Ịhụnanya bụkwa ihe anyị nile pụrụ ịzụlite. Okwu Chineke na-agbakarị anyị ume ito eto na imeziwanye ihe n’ịhụnanya anyị nwere n’ebe ndị ọzọ nọ. (Ndị Filipaị 1:9; Ndị Kọlọsi 3:14) Ọ dịghị mgbe Jehova na-atụ anya ka ndị o kere eke mee ihe ha na-apụghị ime. N’ezie, ebe “Chineke bụ ịhụnanya” ma mee anyị n’onyinyo ya, a pụrụ ikwu na o mere anyị igosipụta ịhụnanya. (1 Jọn 4:8; Jenesis 1:27) N’ihi ya mgbe anyị na-agụ okwu Pita onyeozi bụ́ nke e dekọrọ n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ isiokwu a dabeere na ya, anyị pụrụ imeghachi omume n’obi ike. Anyị pụrụ ịgbasochi nzọụkwụ Kraịst anya. N’ezie, anyị pụrụ irube isi n’iwu Jizọs n’onwe ya nyere, bụ́: ‘Nọgide na-eso m.’ (Luk 9:23) Ka anyị tụlee otú anyị pụrụ isi ṅomie ịhụnanya nke Kraịst gosipụtara, nke mbụ maka eziokwu ahụ ọ kụziri, e mesịa, maka ndị ọ kụziiri ya.

Ịzụlite Ịhụnanya Maka Eziokwu Ndị Anyị Na-amụta

3. N’ihi gịnị ka o ji esiri ụfọdụ ndị ike ịmụ ihe, ma ndụmọdụ dị aṅaa ka a na-achọta n’Ilu 2:1-5?

3 Iji hụ eziokwu ndị anyị na-akụziri ndị ọzọ n’anya, anyị onwe anyị aghaghị inwe mmasị n’ịmụta eziokwu ndị dị otú ahụ. N’ụwa taa, a dịghị azụlite mmasị dị otú ahụ n’ụzọ dị mfe mgbe nile. Ihe ndị dị ka amachaghị akwụkwọ na àgwà ọjọọ ndị ọtụtụ ndị zụlitere n’oge ha bụ ndị ntorobịa na-eme ka ọ ghara ịdị mgbe ịmụ ihe na-amasị ha. Otú ọ dị, ọ dị oké mkpa ka anyị mụta ihe site n’ọnụ Jehova. Ilu 2:1-5 na-asị: “Nwa m, ọ bụrụ na ị nara okwu ọnụ m nile, ọ bụrụkwa na i zobe ihe nile m nyere n’iwu n’ebe ị nọ; ị tọọrọ amamihe ntị gị n’ala, wee wezụga obi gị inwe nghọta; ee, ọ bụrụ na ọ bụ mmata ka ị na-akpọku, ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị; ọ bụrụ na ị chọọ ya dị ka ọlaọcha, ọ bụrụkwa na ọ bụ dị ka akụ̀ zoro ezo ka ị na-egwupụta ya: mgbe ahụ ka ị ga-aghọta egwu Jehova, ọ bụkwa ihe ọmụma Chineke ka ị ga-achọta.”

4. Gịnị ka ‘iwezụga’ obi pụtara, ụzọ ile ihe anya dịkwa aṅaa ga-enyere anyị aka ime nke ahụ?

4 Rịba ama na n’amaokwu 1 ruo 4, a gbara anyị ume ugboro ugboro ime mgbalị ọ bụghị nanị iji ‘nara’ ma ‘zobe’ kamakwa iji “chọọ” ma ‘gwupụta.’ Otú ọ dị, gịnị ga-akpali anyị ime ihe a nile? Ọ dị mma, rịba ama nkebi ahịrịokwu ahụ bụ́ “wezụga obi gị inwe nghọta.” Otu akwụkwọ e ji eme nchọpụta na-ekwu na ndụmọdụ a “abụghị nanị arịrịọ ka a ṅaa ntị; ọ bụ iwu ka e nwee àgwà ụfọdụ: ọchịchọ siri ike ịnabata ihe a na-ezi.” Gịnịkwa ga-eme ka anyị bụrụ ndị na-anabata ihe na ndị nwere ọchịchọ siri ike ịmụta ihe Jehova na-akụziri anyị? Ọ bụ otú anyị si ele ihe anya. Ọ dị anyị mkpa ile “ihe ọmụma Chineke” anya dị ka “ọlaọcha” na dị ka “akụ̀ zoro ezo.”

5, 6. (a) Gịnị pụrụ ime ka oge na-aga, oleekwa otú anyị pụrụ isi gbochie nke ahụ? (b) N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịnọgide na-atụkwasị ihe n’akụ̀ nke ihe ọmụma anyị chọtaworo na Bible?

5 O sighị ike ịzụlite ụzọ ile ihe anya dị otú ahụ. Dị ka ihe atụ, ikekwe “ihe ọmụma Chineke” nke i nwetaworo na-agụnye eziokwu ahụ bụ́ na Jehova zubere na ihe a kpọrọ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi ga-adị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs n’elu ala. (Abụ Ọma 37:28, 29) Mgbe mbụ ị mụtara eziokwu ahụ, obi abụọ adịghị ya na i lere ya anya dị ka ezigbo akụ̀, ihe ọmụma nke mere ka uche na obi gị jupụta n’olileanya na ọṅụ. Gịnị banyere ugbu a? Ka oge gafeworo, ekele i nwere maka akụ̀ gị ọ̀ jụwo oyi? Ọ bụrụ otú ahụ, gbalịa ime ihe abụọ. Nke mbụ, mee ka obi ekele gị dịghachi ọhụrụ, ya bụ, na-echetaghachi mgbe nile ihe mere i ji jiri eziokwu nke ọ bụla Jehova kụziwooro gị kpọrọ ihe, ọbụna ndị ahụ ị mụtara ọtụtụ afọ gara aga.

6 Nke abụọ, nọgide na-atụkwasị ihe n’akụ̀ gị. E kwuwerị, ọ bụrụ na o nwere otú i si gwupụta akụ̀ dị oké ọnụ ahịa, ihe ị ga-eme ọ̀ bụ nnọọ itinye ya n’akpa ma pụọ na-enwe afọ ojuju? Ka ị̀ ga-egwutụkwu iji hụ ma e nwere ọzọ? Ihe jupụtara n’Okwu Chineke bụ eziokwu ndị dị oké ọnụ ahịa yiri ọlaọcha na akụ̀ zoro ezo. N’agbanyeghị ole ị chọtaworo, ị pụrụ ịchọtakwu ọzọ. (Ndị Rom 11:33) Ka ị na-egwupụta akụ̀ nke eziokwu ahụ, jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị mere ka ọ bụrụ akụ̀ dị oké ọnụ ahịa? Ọ̀ na-eme ka m ghọtakwuo ụdị onye Jehova bụ ma ọ bụ nzube ya? Ọ̀ na-enye m nduzi ụfọdụ dị irè bụ́ ndị pụrụ inyere m aka ịgbaso nzọụkwụ Jizọs?’ Ịtụgharị uche n’ajụjụ ndị dị otú ahụ ga-enyere gị aka ịzụlite ịhụnanya maka eziokwu ndị ahụ Jehova kụziwooro gị.

Igosipụta Ịhụnanya Maka Eziokwu Ndị Anyị Na-akụzi

7, 8. Olee ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi gosi ndị ọzọ na anyị hụrụ eziokwu ndị anyị mụtaworo na Bible n’anya? Nye ihe atụ.

7 Ka anyị na-akụziri ndị ọzọ ihe, olee otú anyị pụrụ isi na-egosi na anyị hụrụ eziokwu ndị anyị mụtaworo n’Okwu Chineke n’anya? N’ịgbaso ihe nlereanya Jizọs, anyị na-adaberesi ike na Bible mgbe anyị na-eme nkwusa na mgbe anyị na-ezi ihe. N’oge na-adịbeghị anya, a nọwo na-agba ndị Chineke n’ụwa nile ume ka ha jirikwuo Bible na-eme ihe n’ụzọ dị ukwuu n’ozi ha na-eje maka ọha. Ka ị na-etinye aro ahụ n’ọrụ, chọọ ụzọ isi mee ka onye nwe ụlọ mara na gị onwe gị ji ihe ị na-agwa ya site na Bible kpọrọ ihe.—Matiu 13:52.

8 Dị ka ihe atụ, mgbe mwakpo ahụ ndị na-eyi ọha egwu mere na New York City n’afọ gara aga gasịrị, otu nwanna nwanyị Onye Kraịst nọ na-agụrụ ndị o zutere n’ozi ya Abụ Ọma 46:1, 11. Ọ na-ebu ụzọ ajụ ndị mmadụ otú ha na-eme ka ọdachi ahụ gasịworo. Ọ na-ege ntị nke ọma ná nzaghachi ha, kwere n’ihe ha kwuru, ma sị: “M̀ pụrụ ịgụrụ gị otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ nke kasiworo m obi n’ezie n’oge ihe isi ike a?” Ọ bụ nanị mmadụ ole na ole jụrụ, ọ rụpụtakwara ọtụtụ mkparịta ụka magburu onwe ha. N’ịgwa ndị na-eto eto okwu, otu nwanna nwanyị ahụ na-ekwukarị, sị: “Anọwo m na-akụzi Bible ruo afọ 50 ugbu a, ma ị̀ maara ihe merenụ? Ọ dịbeghị nsogbu ọ bụla m zutere nke akwụkwọ a na-apụghị inye aka idozi.” Site n’iji mmetụta dị mma na ịnụ ọkụ n’obi na-ekwu okwu, anyị na-egosi ndị mmadụ na anyị nwere mmasị n’ihe anyị mụtaworo n’Okwu Chineke ma jiri ha kpọrọ ihe.—Abụ Ọma 119:97, 105.

9, 10. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa iji Bible na-eme ihe mgbe anyị na-aza ajụjụ banyere nkwenkwe anyị?

9 Mgbe ndị mmadụ jụrụ anyị ajụjụ banyere nkwenkwe anyị, anyị na-enwe ohere mara mma igosi ha na anyị hụrụ Okwu Chineke n’anya. N’ịgbaso ihe nlereanya Jizọs, anyị adịghị adabere nnọọ n’echiche nke aka anyị aza ha ajụjụ. (Ilu 3:5, 6) Kama nke ahụ, anyị na-eji Bible aza ya. Ụjọ ọ̀ na-atụ gị na mmadụ pụrụ ịjụ gị ajụjụ ị na-agaghị azali? Tụlee nzọụkwụ abụọ ziri ezi ị pụrụ iwere.

10 Mee ihe ị pụrụ ime iji dịrị njikere. Pita onyeozi dere, sị: “Doonụ Kraịst nsọ dị ka Onyenwe anyị n’obi unu, na-adịnụ njikere mgbe nile ime ngọpụ n’ihu onye ọ bụla nke na-ajụ unu ihe mere unu ji nwee olileanya ahụ dị n’ime unu, ma jirinụ obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù miri emi na-eme nke ahụ.” (1 Pita 3:15) Ị̀ dị njikere ịgọpụrụ ihe ndị i kweere? Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ịma ihe mere na ị dịghị ekere òkè n’omenala ma ọ bụ ihe omume ụfọdụ Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, asịla nanị, “O megidere okpukpe m.” Azịza dị otú ahụ pụrụ igosi na ị na-ekwe ka ndị ọzọ na-emere gị mkpebi, n’ihi ya kwa, na ọ ghaghị ịbụ na ị nọ n’òtù nzuzo. Ọ pụrụ ịka mma ịsị, “Okwu Chineke, bụ́ Bible, kagburu ya” ma ọ bụ, “Ọ ga-ewute Chineke m.” Nyezie nkọwa ezi uche dị na ya banyere ihe mere i ji kwuo otú ahụ.—Ndị Rom 12:1.

11. Ngwá ọrụ dị aṅaa e ji eme nnyocha pụrụ inyere anyị aka ịdị njikere ịza ajụjụ dị iche iche banyere eziokwu nke Okwu Chineke?

11 Ọ bụrụ na ọ dị gị ka ị dịghị njikere, gịnị ma i jiri oge ụfọdụ mụọ akwụkwọ ahụ bụ́ Reasoning From the Scriptures ma ọ bụrụ na e nwere ya n’asụsụ gị? * Họrọ isiokwu ole na ole ndị o yiri ka ndị mmadụ ha ga-ajụ ajụjụ banyere ha, ma buru isi ihe ụfọdụ sitere n’Akwụkwọ Nsọ n’isi. Debe akwụkwọ Reasoning na Bible gị n’ebe aka gị ga-eru ha ngwa ngwa. Alala azụ iji ha abụọ eme ihe, na-ekwu na i nwere ngwá ọrụ e ji eme nnyocha nke na-amasị gị iji na-achọpụta azịza Bible nye ajụjụ dị iche iche.

12. Olee otú anyị pụrụ isi zaghachi ma ọ bụrụ na anyị amaghị azịza nke otu ajụjụ dabeere na Bible?

12 Gbalịa ịghara ichegbu onwe gị n’ụzọ na-enweghị isi. Ọ dịghị mmadụ ọ bụla na-ezughị okè nke nwere azịza nye ajụjụ nile. Ya mere, mgbe a jụrụ gị ajụjụ dabeere na Bible nke ị na-agaghị azali, ị pụrụ isi otú a zaghachi mgbe nile: “I meela maka ịjụ ajụjụ dị otú ahụ na-akpali mmasị. Ịgwa gị eziokwu, amaghị m azịza ya, ma eji m n’aka na Bible zara ajụjụ ahụ. Ọ na-amasị m ime nnyocha na Bible, n’ihi ya aga m eme nnyocha banyere ajụjụ gị ma bịaghachi zaa gị ya.” Iji ezoghị ọnụ na obi umeala kwuo okwu otú ahụ pụrụ imeghe ohere maka inwekwu nkwurịta okwu.—Ilu 11:2.

Ịhụnanya Maka Ndị Anyị Na-ezi Ihe

13. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịnọgide na-enwe nchekwube banyere ndị anyị na-ekwusara ozi ọma?

13 Jizọs gosipụtara ịhụnanya n’ebe ndị o ziri ihe nọ. Olee otú anyị pụrụ isi na-eṅomi ya na nke a? Ya adịla mgbe ọ bụla anyị ga-enwe àgwà enweghị mmetụta n’ebe ndị gbara anyị gburugburu nọ. N’ezie, ‘agha nke oké ụbọchị nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile’ na-eruwanye nso, a gajekwa ibibi ọtụtụ ndị n’ime ọtụtụ ijeri nke ihe a kpọrọ mmadụ. (Mkpughe 16:14; Jeremaịa 25:33) Ma anyị amaghị onye ga-adị ndụ na onye ga-anwụ. Ikpe ahụ ga-ewere ọnọdụ n’ọdịnihu, ọ bụkwa onye Jehova họpụtara, bụ́ Jizọs Kraịst, ga-ekpe ya. Ruo mgbe a ga-ekpe ikpe ahụ, anyị ga na-ele onye ọ bụla anya dị ka onye nwere ike ịghọ ohu Jehova.—Matiu 19:24-26; 25:31-33; Ọrụ 17:31.

14. (a) Olee otú anyị pụrụ isi nyochaa onwe anyị iji mara ma anyị nwere ọmịiko n’ebe ndị mmadụ nọ? (b) N’ụzọ ndị dị aṅaa dị irè ka anyị pụrụ isi gosi mmetụta ọmịiko na mmasị onwe onye n’ebe ndị ọzọ nọ?

14 N’ihi ya, dị ka Jizọs, anyị ga na-achọ inwe ọmịiko n’ebe ndị mmadụ nọ. Anyị pụrụ ịjụ onwe anyị, sị: ‘Àna m emetere ndị e jiworo ụgha yiri eziokwu na aghụghọ nke okpukpe, ọchịchị, na usoro azụmahịa nke ụwa a duhie, ebere? Ọ bụrụ na o yiri ka ha enweghị mmasị n’ozi anyị wetaara ha, àna m agbalị ịghọta ihe mere ha ji ghara igosi mmasị? Àna m aghọta na mụ onwe m, ma ọ bụ ndị ọzọ na-ejere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ugbu a, nwere mgbe ọ dị anyị otú ahụ? Èmewo m mgbanwe n’ụzọ m si eme nkwusa iji kwekọọ n’ọnọdụ ha? Ka m̀ na-eleghara ndị a anya dị ka ndị na-apụghị ime mgbanwe?’ (Mkpughe 12:9) Mgbe ndị mmadụ hụrụ ezi mmetụta ọmịiko anyị nwere, o yikarịrị ka ha ga-anabata ozi anyị. (1 Pita 3:8) Mmetụta ọmịiko pụkwara ịkpali anyị igosikwu mmasị n’ebe ndị anyị na-ezute n’ozi anyị nọ. Anyị pụrụ idetu ajụjụ na nchegbu ha edetu. Mgbe anyị bịaghachiri, anyị pụrụ igosi ha na anyị anọwo na-eche banyere ihe ha kwuru n’oge gara aga anyị bịara. Ọ bụrụkwa na ha nwere mkpa ụfọdụ dị ngwa n’oge ahụ, anyị pụrụ inwe ike inyere ha aka n’ụzọ ụfọdụ dị irè.

15. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịdị na-achọ ebe ndị ọzọ na-emezi emezi, oleekwa otú anyị pụrụ isi mee ya?

15 Dị ka Jizọs, anyị na-achọ ebe ndị ọzọ na-emezi emezi. Ikekwe nne ma ọ bụ nna nanị ya na-azụ ụmụ na-eme mgbalị dị mma ịzụ ụmụ ya. Otu nwoke na-adọga ịkwado ezinụlọ ya. Onye meworo agadi na-egosi mmasị n’ihe ime mmụọ. Ànyị na-ahụ ihe ndị ahụ n’ebe ndị anyị na-ezute nọ ma na-aja ha mma dị ka o kwesịrị? Site n’ime otú ahụ, anyị na-emesi ihe anyị na ha nwekọrọ ọnụ ike, nke a pụkwara imeghe ohere maka ịgba àmà banyere Alaeze ahụ.—Ọrụ 26:2, 3.

Ịdị Umeala n’Obi Dị Oké Mkpa n’Igosipụta Ịhụnanya

16. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịnọgide na-adị nwayọọ ma na-egosi nkwanye ùgwù n’ebe ndị anyị na-ekwusara ozi ọma nọ?

16 Ịhụnanya anyị nwere n’ebe ndị anyị na-ezi ihe nọ ga-akpali anyị ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị amamihe dị na ya nke dị na Bible: “Ihe ọmụma na-afụli elu, ma ịhụnanya na-ewuli elu.” (1 Ndị Kọrint 8:1) Jizọs nwere ihe ọmụma dị ukwuu, n’agbanyeghị nke ahụ, ọ dịghị mgbe ọ fụliri onwe ya elu. Ya mere, ka ị na-agwa ndị ọzọ banyere nkwenkwe gị, zere iji olu arụmụka na-agwa ha ya ma ọ bụ ime ka ị ka ha mara ihe. Ihe mgbaru ọsọ anyị bụ iru n’obi ndị mmadụ ma dọta ha n’eziokwu ahụ anyị hụrụ n’anya. (Ndị Kọlọsi 4:6) Cheta, mgbe Pita dụrụ Ndị Kraịst ọdụ ka ha dịrị njikere ime ngọpụ, ọ gbakwụnyere ihe ncheta bụ́ na anyị kwesịrị ‘iji obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù miri emi’ na-eme nke ahụ. (1 Pita 3:15) Ọ bụrụ na anyị dị nwayọọ ma na-egosi nkwanye ùgwù, o yikarịrị ka anyị ga-adọta ndị mmadụ n’ebe Chineke anyị na-ejere ozi nọ.

17, 18. (a) Olee otú anyị kwesịrị isi na-emeghachi omume n’àgwà nkatọ banyere iru eru anyị dị ka ndị ozi? (b) N’ihi gịnị ka ịmara asụsụ oge ochie e ji dee Bible na-ejighị dị ndị na-amụ Bible oké mkpa?

17 Ọ dịghị mkpa igosi ndị mmadụ na anyị maara ihe ma ọ bụ gụọ oké akwụkwọ. Ọ bụrụ na ụfọdụ ndị nọ n’ókèala gị na-ajụ ige onye ọ bụla na-enweghị akara ugo mmụta ụfọdụ nke mahadum ma ọ bụ onye na-echighị echichi ntị, ekwela ka àgwà ha kụda gị mmụọ. Jizọs leghaara ihe mgbochi bụ́ na ọ gaghị ụlọ akwụkwọ a na-akwanyere ùgwù nke ndị rabaị nke oge ya anya; o nweghịkwa ajọ mbunobi nke ọtụtụ ndị nwere site n’ịgbalị iji ihe ọmụma dị ukwuu o nwere mee ka ndị mmadụ nwee mmasị n’ebe ọ nọ.—Jọn 7:15.

18 Ịdị umeala n’obi na ịhụnanya dị Ndị Kraịst bụ́ ndị ozi mkpa karịa ọ̀tụ̀tụ̀ agụmakwụkwọ ọ bụla nke ụwa. Onye Ọkà Nkụzi Ukwu ahụ, bụ́ Jehova, mere ka anyị ruo eruo maka ozi ahụ. (2 Ndị Kọrint 3:5, 6) N’agbanyeghịkwa ihe ụfọdụ ndị ụkọchukwu nke Krisendọm na-ekwu, ọ dịghị anyị mkpa ịmụ asụsụ oge ochie e ji dee Bible iji ghọọ ndị na-ezi Okwu Chineke. Jehova nyere mmụọ nsọ ya ka e wee dee Bible n’ụzọ doro anya na nke a kapịrị ọnụ otú ahụ nke na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile pụrụ ịghọta eziokwu dị oké ọnụ ahịa ndị dị n’ime ya. Eziokwu ndị ahụ agbanwebeghị ọbụna ka a sụgharịsịworo ha gaa n’ọtụtụ narị asụsụ. Ya mere, ọ bụ ezie na mgbe ụfọdụ ịmara asụsụ ndị oge ochie bara uru, ha adịghị oké mkpa. Ọzọkwa, ịdị mpako n’ihi inwe ike ịmụta asụsụ pụrụ ime ka mmadụ ghara inwe àgwà dị ezi Ndị Kraịst oké mkpa—ịbụ ndị a pụrụ izi ihe.—1 Timoti 6:4.

19. N’echiche dị aṅaa ka ozi Ndị Kraịst anyị bụ ọru e ji obi umeala arụ?

19 A pụghị inwe ihe ịrụ ụka na ozi Ndị Kraịst anyị bụ ọrụ chọrọ àgwà obi umeala. Anyị na-ekpughepụ onwe anyị mgbe nile nye mmegide, enweghị mmasị, ọbụna mkpagbu. (Jọn 15:20) N’agbanyeghị nke ahụ, site n’iji ikwesị ntụkwasị obi na-eje ozi anyị, anyị na-arụ ọrụ dị oké mkpa. Ọ bụrụ na anyị anọgide jiri obi umeala na-ejere ndị ọzọ ozi n’ọrụ a, anyị na-eṅomi ịhụnanya nke Jizọs Kraịst gosipụtara n’ebe ndị mmadụ nọ. Tụlee nke a: Ọ bụrụ na anyị ga-ekwusara otu puku ndị na-enweghị mmasị ma ọ bụ ndị na-emegide anyị ozi ọma iji rute otu onye yiri atụrụ, ọ̀ bụ na o rughị mgbalị anyị mere maka ya? N’ezie o ruru ya! N’ihi ya, site n’ịnọgide na-arụ ọrụ ahụ, ma ghara ịda mbà ma ọlị, anyị ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere ndị yiri atụrụ bụ́ ndị anyị na-ezutebeghị ozi. Obi abụọ adịghị ya na Jehova na Jizọs ga-ahụ na a ga-achọta ọtụtụ ndị dị otú ahụ dị oké ọnụ ahịa ma nyere ha aka tupu ọgwụgwụ abịa.—Hagaị 2:7.

20. Olee ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi zie ihe site n’ihe nlereanya?

20 Izi ihe site n’ihe nlereanya bụ ụzọ ọzọ isi gosi njikere anyị dị ijere ndị ọzọ ozi. Dị ka ihe atụ, anyị na-achọ ịkụziri ndị mmadụ na ijere Jehova, bụ́ “Chineke onye obi ụtọ” ozi, bụ ụzọ ndụ kasị mma na nke kasị enye afọ ojuju a pụrụ ịgbaso. (1 Timoti 1:11) Ka ha na-ahụ àgwà anyị na otú anyị si emeso ndị agbata obi anyị, ụmụ akwụkwọ ibe anyị, na ndị ọrụ ibe anyị ihe, hà pụrụ ịhụ na anyị nwere obi ụtọ na afọ ojuju? N’ụzọ yiri nke ahụ, anyị na-akụziri ndị anyị na-amụrụ Bible na ọgbakọ Ndị Kraịst bụ ebe ịhụnanya dị, n’ime ụwa nke na-enweghị mmetụta na nke na-eme ihe ike ike. Ndị anyị na-amụrụ ihe hà pụrụ ịhụ ngwa ngwa na anyị hụrụ mmadụ nile nọ n’ọgbakọ n’anya ma na-arụsị ọrụ ike iji mee ka anyị na ibe anyị nọgide na-adị n’udo?—1 Pita 4:8.

21, 22. (a) Inyocha onwe anyị n’ihe banyere ozi anyị pụrụ iduga anyị n’iji ohere ndị dị aṅaa na-eme ihe? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu ndị ga-adị ná mbipụta na-esonụ nke Ụlọ Nche?

21 Àgwà ịdị njikere ime ihe n’ozi anyị pụrụ, mgbe ụfọdụ, ịkpali anyị inyochagharị onwe anyị. Site n’iji obi eziokwu na-eme nke ahụ, ọtụtụ ndị na-achọpụta na ha nwere ike ịmụba ozi ha site n’ịbanye n’ozi oge nile ma ọ bụ site n’ịga jee ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu. Ndị ọzọ ekpebiwo ịmụ asụsụ mba ọzọ iji jeere ọnụ ọgụgụ na-amụbawanye amụbawanye nke ndị mba ọzọ nọ kpọmkwem n’ókèala obodo ha ozi. Ọ bụrụ na ị pụrụ ime nke ọ bụla n’ime ihe ndị a, jiri nlezianya na ekpere chebara ya echiche. Ndụ e ji jee ozi na-eweta ọṅụ, afọ ojuju, na udo nke obi dị ukwuu.—Eklisiastis 5:12.

22 N’ụzọ ọ bụla, ka anyị nọgide na-eṅomi Jizọs Kraịst site n’ịdị na-ewulite ịhụnanya anyị nwere n’ebe eziokwu ahụ anyị na-akụzi dị nakwa n’ebe ndị anyị na-ezi ihe nọ. Ịzụlite na igosipụta ịhụnanya n’akụkụ abụọ a ga-enyere anyị aka ịtọ ntọala dị mma maka ịbụ ndị ozizi dị ka Kraịst. Otú ọ dị, olee otú anyị pụrụ isi na-ewunye ihe n’elu ntọala ahụ? Ná mbipụta na-esonụ nke Ụlọ Nche, e nwere isiokwu ndị ga-atụle ụfọdụ n’ime ụzọ izi ihe ndị doro anya Jizọs jiri mee ihe.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Mmesi obi ike dị aṅaa ka anyị nwere na ihe nlereanya Jizọs dị ka onye ozizi adịghịrị anyị oké elu iṅomi?

• Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị hụrụ eziokwu ndị anyị mụtaworo na Bible n’anya?

• N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịnọgide na-adị obi umeala ka anyị na-enwetakwu ihe ọmụma?

• Olee ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi gosipụta ịhụnanya n’ebe ndị anyị na-agbalị izi ihe nọ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

Mee ihe ị pụrụ ime iji dịrị njikere

[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]

Ọ bụrụ na i ji “ihe ọmụma Chineke” akpọrọ ihe, ị pụrụ iji Bible na-eme ihe n’ụzọ dị irè

[Foto dị na peeji nke 18]

Anyị na-egosi ịhụnanya n’ebe ndị mmadụ nọ site n’iso ha na-ekerịta ozi ọma ahụ