Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Obi Dị Ha Ụtọ na Ha Mụtara Ịgụ Ihe!

Obi Dị Ha Ụtọ na Ha Mụtara Ịgụ Ihe!

Obi Dị Ha Ụtọ na Ha Mụtara Ịgụ Ihe!

N’AKỤKỤ ụfọdụ nke Solomon Islands, ihe ruru pasent 80 nke ndị bụ́zi Ndịàmà Jehova nweburu nsogbu nke amaghị agụ na amaghị ede. Ọ bụghị nanị na nke a mere ka ha na-ekere òkè dị nta ná nzukọ a na-enwe n’ọgbakọ kwa izu kamakwa o mere ka o sikwuoro ha ike ịkụziri ndị ọzọ eziokwu Alaeze ahụ. Ò kwere omume n’ezie ndị meworo okenye bụ́ ndị na-agbajitụbeghịdị chọọkụ ịghọ ndị ma ka e si agụ ihe?

E jiriwo broshuọ bụ́ Apply Yourself to Reading and Writing, nke Ndịàmà Jehova bipụtara, mee ihe na klas ịgụ na ide n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ọgbakọ nile nke Ndịàmà Jehova gburugburu Solomon Islands. Ahụmahụ ndị na-esonụ na-egosi otú e siworo nyere ọtụtụ narị mmadụ aka imeziwanye nkà ha site n’usoro ihe ọmụmụ a. Nke ka mkpa, ịmụta ịgụ ihe emewo ka ha nwee ike ịgba àmà ka mma banyere nkwenkwe ha.—1 Pita 3:15.

Otu onye ozi ala ọzọ e zigara n’otu ọgbakọ nke e nwere ihe karịrị otu narị ndị nkwusa Alaeze na ya chọpụtara na, n’ọmụmụ Bible e ji Ụlọ Nche amụ kwa izu, ọ bụ nanị mmadụ ole na ole nwere magazin nke ha nakwa na ọbụna ndị na-aza ajụjụ dị ole na ole karị. Gịnị kpatara ya? Ọ bụ amaghị ka e si agụ ihe. Mgbe ọgbakọ ahụ mara ọkwa iguzobe ụlọ akwụkwọ maka ịkụzi ịgụ na ide, onye ozi ala ọzọ ahụ ji obi ụtọ wepụta onwe ya ịbụ onye nkụzi. Na mbụ, ọ bụ nanị ụmụ akwụkwọ ole na ole nọ na-aga ya, ma n’oge na-adịghị anya, ihe karịrị mmadụ 40 nọ n’afọ ndụ nile malitere ịga ya.

Olee ihe ndị si na ya pụta? Onye ozi ala ọzọ ahụ na-akọ, sị: “Obere oge klas ịmụ ịgụ na ide ahụ malitesịrị, agara m ahịa n’elekere isii nke ụtụtụ ịzụ ihe oriri ndị nọ n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ ahụ ga-eri. N’ebe ahụ, ahụrụ m ụfọdụ n’ime ụmụ akwụkwọ ahụ, ọbụna ndị nke ka bụ́ nnọọ ụmụaka, ka ha na-ere akị Bekee na akwụkwọ nri. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha chọrọ inweta ego ga-ezuru ha iji zụọ mkpịsị akwụkwọ na akwụkwọ ha ga-eji na-eme ihe na klas ịmụ ịgụ na ide ahụ! Ọzọkwa, ịga ihe ọmụmụ ahụ bụ ihe mkpali maka ha inwe magazin Ụlọ Nche nke ha.” Ọ na-agbakwụnye, sị: “Ugbu a, n’oge Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche n’ọgbakọ, ndị na-eto eto na ndị agadi na-etinyecha ọnụ, ihe ọmụmụ ahụ na-adịkwa ụtọ.” Obi dị onye ozi ala ọzọ a ụtọ karịsịa mgbe mmadụ anọ n’ime ndị klas ahụ jụrụ ya ma hà pụrụ ikere òkè n’ọrụ nkwusa ihu ọha n’ihi na, dị ka ha si kwuo ya, “ụjọ anaghịzi atụ” ha.

Uru ụmụ akwụkwọ so na klas ịgụ na ide ahụ na-erite akarịala ịmụta ịgụ na ide. Dị ka ihe atụ, ruo ọtụtụ afọ, nwunye na-ekweghị ekwe nke otu Onyeàmà mere ka ọgbakọ ahụ na-enwe nchegbu. Ọ na-atụ ndị mmadụ nkume ma a kpasutụ ya iwe, ọbụna ọ na-eji okpiri awakpo ụmụ nwanyị ndị ọzọ. Mgbe ụfọdụ o so di ya bịa nzukọ Ndị Kraịst, ọ na-ekwoso ya ekworo nke ukwuu nke na di ya kpebiri ịdị na-eyi ugegbe ojii ka o wee ghara ibo ya ebubo na ọ na-ele ụmụ nwanyị ndị ọzọ anya.

Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya klas ịgụ na ide ahụ malitesịrị, nwanyị a ji nwayọọ jụọ, sị: “M̀ nwere ike isonye na klas a?” A zara ya ee. Site mgbe ahụ gawa, ọ ghabeghị ihe ọmụmụ klas ahụ ma ọ bụ nzukọ ọgbakọ. Ọ rụsiri ọrụ ike n’ihe ọmụmụ ịgụ ihe ya ma nwee ọganihu dị ịtụnanya, bụ́ nke mere ka obi dị ya ụtọ nke ukwuu. Ihe ọzọ ọ rịọrọ bụ: “È nwere ike iduziri m ọmụmụ Bible?” Di ya ji obi ụtọ malite ịmụrụ ya ihe, ọ nọgidekwara na-enwe ọganihu na nkà ịgụ na ide ihe ya nakwa n’ihe ọmụma banyere Bible.

Nye onye dị afọ 50 nke na-agbajitụbeghị chọọkụ, nanị ijide mkpịsị akwụkwọ na iji ya dee mkpụrụ okwu pụrụ ịbụ ọgụ na mgba. Ụ́kpọ̀ na-agba ụfọdụ ndị na mkpịsị aka ha n’ihi iji ike eji mkpịsị akwụkwọ ede ihe n’akwụkwọ n’oge ha ka malitere ịmụ ya amụ. Mgbe ụfọdụ ụmụ akwụkwọ na mkpịsị akwụkwọ lụsịrị ruo ọtụtụ izu, ha ji ihu ọchị kwuo, sị: “Ejighịzi m ike ede ihe n’akwụkwọ!” Ịhụ ka ụmụ akwụkwọ ahụ na-enwe ọganihu na-emekwa ka ndị nkụzi ha na-enwe obi ụtọ. Otu onye nkụzi kwuru, sị: “Ịkụziri ụmụ akwụkwọ ahụ ihe bụ ihe na-enye ọṅụ, ụmụ akwụkwọ ahụ na-ejikarịkwa ịkụ aka mgbe a mụsịrị ihe na-egosipụta ezi ekele ha nwere maka ndokwa a sitere n’aka Jehova.”

Ndịàmà a ka mụtara ịgụ na ide amụta so ndị ozi ala ọzọ ahụ na-enwe ọṅụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha pụziri iji ikike ha nwere ịgụ na ide na-asọpụrụ Jehova.

[Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]

Ma ndị na-eto eto ma ndị agadi nwere ekele maka klas ịgụ na ide ahụ