Ṅomie Onye Ozizi Ahụ Bụ́ Ọkà
Ṅomie Onye Ozizi Ahụ Bụ́ Ọkà
“Ya mere gaanụ mee ndị [mmadụ] ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ, . . . na-ezi ha ka ha debe ihe nile m nyeworo unu n’iwu.”—MATIU 28:19, 20.
1, 2. (a) Olee otú anyị nile, n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ, si bụrụ ndị ozizi? (b) A bịa n’izi ihe, ibu ọrụ dị aṅaa pụrụ iche ka ezi Ndị Kraịst nwere?
Ị̀ BỤ onye ozizi? Anyị nile bụ n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ. Mgbe ọ bụla i ziri onye gahiere ụzọ ụzọ, gosi onye ọrụ ibe gị otú e si arụ otu ọrụ, ma ọ bụ kọwaara nwatakịrị otú ọ ga-esi kechie eriri akpụkpọ ụkwụ ya, ị na-ezi ihe. Inyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ndị dị otú ahụ na-enyetụ afọ ojuju, ọ́ bụghị ya?
2 A bịa n’izi ihe, ezi Ndị Kraịst nwere ibu ọrụ pụrụ iche. E nyere anyị ọrụ ‘ime ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ, na-ezi ha ihe.’ (Matiu 28:19, 20) N’ime ọgbakọ kwa, anyị na-enwe ohere maka izi ihe. A na-ahọpụta ndị ikom ruru eru ije ozi dị ka “ndị ọzụzụ atụrụ na ndị ozizi,” iji wulie ọgbakọ elu. (Ndị Efesọs 4:11-13) N’ọrụ Ndị Kraịst ha na-arụ kwa ụbọchị, ndị inyom tozuru okè kwesịrị ịbụ “ndị na-akụzi ihe dị mma” nye ụmụ agbọghọ. (Taịtọs 2:3-5) A na-agba anyị nile ume ịgba ndị kwere ekwe ibe anyị ume, anyị pụkwara ịṅa ntị na ndụmọdụ ahụ site n’iji Bible na-ewuli ndị ọzọ elu. (1 Ndị Tesalonaịka 5:11) Lee ihe ùgwù ọ bụ ịbụ onye ozizi nke Okwu Chineke na iso ndị ọzọ na-ekerịta ihe ime mmụọ ndị dị oké ọnụ ahịa bụ́ ndị pụrụ ịba uru n’ụzọ na-adịte aka!
3. Olee otú anyị pụrụ isi na-adịkwu irè dị ka ndị ozizi?
3 Otú ọ dị, olee otú anyị pụrụ isi na-adịkwu irè dị ka ndị ozizi? N’ụzọ bụ́ isi, ọ bụ site n’iṅomi Onye Ozizi ahụ Bụ́ Ọkà, bụ́ Jizọs. ‘Ma olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Jizọs?’ ka ụfọdụ pụrụ iche n’echiche. ‘O zuru okè.’ N’ezie, anyị apụghị ịbụ ndị ozizi zuru okè. Otú o sina dị, n’agbanyeghị otú ikike anyị ha, anyị pụrụ ime ike anyị n’iṅomi ụzọ Jizọs si zie ihe. Ka anyị tụlee otú anyị pụrụ isi jiri anọ n’ime ụzọ izi ihe ya mee ihe—okwu ndị dị mfe, ajụjụ ndị dị irè, arụmụka ndị ezi uche dị na ha, na ihe atụ ndị dabara adaba.
Ime Ka Ọ Dị Mfe
4, 5. (a) N’ihi gịnị ka okwu ndị dị mfe ji bụrụ ihe bụ́ isi e ji mara eziokwu Bible? (b) Iji zie ihe n’ụzọ dị mfe, n’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịkpachapụ anya banyere ụdị ìgwè okwu anyị ji eme ihe?
4 Eziokwu ndị bụ́ isi nke Okwu Chineke adịghị mgbagwoju anya. N’ekpere, Jizọs kwuru, sị: “Nna, . . . ana m enye gị otuto n’ihu ọha n’ihi na i zonahụwo ndị amamihe na ndị nwere ọgụgụ isi ihe ndị a, i kpughewokwara ha ụmụ ọhụrụ.” (Matiu 11:25) Jehova emewo ka e kpugheere ndị nwere ezi obi na obi umeala nzube ya. (1 Ndị Kọrint 1:26-28) N’ihi ya, okwu ndị dị mfe bụ ihe bụ́ isi e ji mara eziokwu Bible.
5 Mgbe ị na-eduziri ndị nwere mmasị ọmụmụ Bible ebe obibi ma ọ bụ na-eletaghachi ha, olee otú ị pụrụ isi zie ihe n’ụzọ dị mfe? Ọ dị mma, gịnị ka anyị mụtara n’aka Onye Ozizi ahụ Bụ́ Ọkà? Iji ruo n’obi ndị na-ege ya ntị, ndị ọtụtụ n’ime ha bụ “ndị na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị,” Jizọs ji okwu ndị dị mfe ha pụrụ ịghọta mee ihe. (Ọrụ 4:13) Ya mere, iji zie ihe n’ụzọ dị mfe, ihe mbụ a chọrọ n’aka anyị bụ ịkpachapụ anya banyere ụdị ìgwè okwu anyị ji eme ihe. Ọ dịghị anyị mkpa iji okwu ma ọ bụ nkebi ahịrịokwu ndị na-ada ka nke ndị gụrụ oké akwụkwọ mee ihe iji mee ka Okwu Chineke dokwuo ndị ọzọ anya. “Oké okwu” dị otú ahụ pụrụ ịbụ ihe na-emenye ụjọ, karịsịa nye ndị na-agụghị oké akwụkwọ ma ọ bụ ndị na-enwechaghị ikike. (1 Ndị Kọrint 2:1, 2) Ihe nlereanya Jizọs na-egosi na okwu ndị dị mfe e leziri anya họrọ pụrụ ime ka a ghọta eziokwu ahụ n’ụzọ gbara ọkpụrụkpụ.
6. Olee otú anyị pụrụ isi zere iji ihe ọmụma dị ukwuu ebogbu onye anyị na-amụrụ Bible?
6 Iji na-ezi ihe n’ụzọ dị mfe, anyị aghaghịkwa ịkpachapụ anya izere iji ihe ọmụma dị ukwuu bogbuo onye anyị na-amụrụ Bible. Jizọs chebaara erughị eru nke ndị na-eso ụzọ ya echiche. (Jọn 16:12) Anyị onwe anyị aghaghịkwa ichebara onye anyị na-amụrụ ihe echiche. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị ji akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi na-eduzi ọmụmụ ihe, ọ dịghị anyị mkpa ịkọwa ihe nile n’ụzọ zuru ezu. * Ọ dịghịkwa mkpa ịmụchapụ isiokwu ọkụ ọkụ, dị ka a ga-asị na ịmụchapụ ebe e bu n’obi ịmụ bụ ihe kasị mkpa. Kama nke ahụ, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ikwe ka mkpa na ikike nke onye ahụ a na-amụrụ ihe kpebie oge ihe ọmụmụ ahụ ga na-ewe. Ihe mgbaru ọsọ anyị bụ inyere onye ahụ a na-amụrụ ihe aka ịghọ onye na-eso ụzọ Kraịst na onye na-efe Jehova ofufe. Ọ dị anyị mkpa iwepụta oge ọ bụla a chọrọ iji nyere onye ahụ nwere mmasị aka ịghọta ihe ọ na-amụ nke ọma. N’ụzọ dị otú a, eziokwu ahụ pụrụ iru ya n’obi ma kpalie ya ime ihe.—Ndị Rom 12:2.
7. Aro ndị dị aṅaa pụrụ inyere anyị aka izi ihe n’ụzọ dị mfe mgbe anyị na-ekwu okwu n’ọgbakọ?
7 Mgbe anyị na-ekwu okwu n’ọgbakọ, karịsịa ma ọ bụrụ na e nwere ndị ọhụrụ so na-ege ntị, olee otú anyị pụrụ isi kwuo okwu “dị mfe nghọta”? (1 Ndị Kọrint 14:9) Tụlee aro atọ ndị pụrụ inye aka. Nke mbụ, kọwaa okwu ọ bụla ha na-amaghị bụ́ ndị ị na-aghaghị iji mee ihe. Nghọta anyị nwere banyere Okwu Chineke emewo ka anyị nwee ìgwè okwu pụrụ iche. Ọ bụrụ na anyị ejiri okwu ndị dị ka “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche,” “atụrụ ọzọ,” na “Babilọn Ukwu ahụ” mee ihe, ọ pụrụ ịdị mkpa ka anyị jiri nkebi ahịrịokwu ndị dị mfe ga-eme ka ihe ha pụtara doo anya kọwaa ha. Nke abụọ, zere ikwu ọtụtụ okwu. Ọtụtụ okwu, bụ́ ndị e kwuru n’ụzọ sabigara mbara ókè, pụrụ ime ka ndị na-ege ntị gharazie inwe mmasị n’ihe a na-ekwu. A na-eme ka ihe doo anya site n’iwepụ okwu na nkebi ahịrịokwu ndị na-adịghị mkpa. Nke atọ, anwala ikwu banyere ọtụtụ ihe. Anyị pụrụ inweta ọtụtụ nkọwa ndị na-akpali mmasị site ná nnyocha anyị mere. Ma ọ kasị mma ịhazi ihe omume ahụ gaa n’isi ihe ole na ole, na-eji nanị ihe ọmụma ndị na-akwado isi ihe ndị ahụ bụ́kwa ndị a pụrụ ikwucha n’ime oge e dokwara maka ya mee ihe.
Iji Ajụjụ Na-eme Ihe n’Ụzọ Dị Irè
8, 9. Olee otú anyị pụrụ isi họrọ ajụjụ ndị e mere ka ha kwekọọ n’ihe na-amasị onye nwe ụlọ? Nye ihe atụ ụfọdụ.
8 Cheta na Jizọs bụ ọkà n’iji ajụjụ eme ihe iji mee ka ndị na-eso ụzọ ya kwuo ihe dị ha n’obi na iji kpalie ma zụọ ikike iche echiche ha. Site n’ịjụ ha ajụjụ, Jizọs ji nwayọọ ruo n’obi ha ma kpalie ha ime ihe. (Matiu 16:13, 15; Jọn 11:26) Olee otú anyị, dị ka Jizọs, pụrụ isi jiri ajụjụ na-eme ihe n’ụzọ dị irè?
9 Mgbe anyị na-eme nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ, anyị pụrụ iji ajụjụ na-akpali mmasị ndị mmadụ, na-emeghere onwe anyị ohere ikwu banyere Alaeze Chineke. Ànyị pụrụ isi aṅaa họrọ ajụjụ e mere ka o kwekọọ n’ihe na-amasị onye nwe ụlọ? Na-eleru anya. Mgbe ị na-abịarute n’ụlọ mmadụ, legharịa anya gburugburu ya. È nwere ihe ndị e ji egwuri egwu n’èzí, na-egosi na e nwere ụmụaka n’ụlọ ahụ? Ọ bụrụ otú ahụ, anyị pụrụ ịjụ, sị, ‘Ì chetụwo banyere ihe ụwa ga-adị Abụ Ọma 37:10, 11) È nwere ọtụtụ ihe mkpọchi n’ọnụ ụzọ dị n’ihu ụlọ ahụ, ma ọ bụ ihe nchebe na-eji ike eletrik eme ihe? Anyị pụrụ ịjụ, sị: ‘Ì chere na ọ dị mgbe ahụ́ ga-eru ndị dị ka mụ na gị ala n’ebe obibi anyị nakwa n’okporo ámá?’ (Maịka 4:3, 4) È nwere ihe e ji arịgo n’oche nkwagharị? Anyị pụrụ ịjụ, sị: ‘Ọ̀ dị mgbe mmadụ nile nọ ndụ ga-enwe ezi ahụ́ ike?’ (Aịsaịa 33:24) A pụrụ ịhụ ọtụtụ aro n’akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible. *
ka ya mgbe ụmụ gị ga-etolite?’ (10. Olee otú anyị pụrụ isi jiri ajụjụ ‘dọpụta’ ihe bụ́ echiche onye a na-amụrụ Bible na mmetụta ọ na-enwe n’obi ya, ma gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche?
10 Olee otú anyị pụrụ isi jiri ajụjụ mee ihe n’ụzọ dị irè mgbe anyị na-eduzi ọmụmụ Bible? N’adịghị ka Jizọs, anyị apụghị ịma ihe dị ndị mmadụ n’obi. Otú ọ dị, ajụjụ ndị e ji akọ jụọ n’ụzọ kwekọrọ n’ọnọdụ e nwere pụrụ inyere anyị aka ‘ịdọpụta’ ihe bụ́ echiche onye a na-amụrụ ihe na mmetụta ọ na-enwe n’obi ya. (Ilu 20:5) Dị ka ihe atụ, ka e were ya na anyị na-amụ isiakwụkwọ bụ́ “Ihe Mere Ịdị Ndụ nke Nsọpụrụ Chineke Ji Eweta Obi Ụtọ,” n’akwụkwọ Ihe Ọmụma. Ọ tụlere otú Chineke si ele akwụwaghị aka ọtọ, ịkwa iko, na ihe ndị ọzọ anya. Onye a na-amụrụ ihe pụrụ ịzata ajụjụ ndị ahụ e biri ebi, ma ò kweere n’ihe ọ na-amụ? Anyị pụrụ ịjụ, sị: ‘Otú Jehova si ele ihe ndị a anya ò yiri gị ihe ezi uche dị na ya?’ ‘Olee otú ị pụrụ isi tinye ụkpụrụ ndị a dị na Bible n’ọrụ ná ndụ gị?’ Otú ọ dị, buru n’uche mkpa ọ dị igosi nkwanye ùgwù, na-adabere n’ùgwù nke onye a na-amụrụ ihe. Anyị agaghị achọ ịjụ ajụjụ ndị ga-emenye onye a na-amụrụ Bible ihere ma ọ bụ wedaa ya ala.—Ilu 12:18.
11. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ndị na-ekwu okwu n’ihu ọha pụrụ isi jiri ajụjụ mee ihe n’ụzọ dị irè?
11 Ndị na-ekwu okwu n’ihu ọha pụkwara iji ajụjụ mee ihe n’ụzọ dị irè. Ajụjụ ndị na-akpali echiche—ajụjụ ndị anyị na-adịghị atụ anya ka ndị na-ege anyị ntị zapụta azapụta—pụrụ inyere ndị na-ege ntị aka iche echiche na ịtụgharị uche. Jizọs ji ajụjụ ndị dị otú ahụ mee ihe mgbe mgbe. (Matiu 11:7-9) Tụkwasị na nke ahụ, mgbe ọka okwu kwusịrị okwu mmeghe, ọ pụrụ iji ajụjụ mee ka a mara isi ihe ndị a ga-atụle. Ọ pụrụ ịsị: “N’okwu a, anyị gaje ịtụle azịza nye ajụjụ ndị a . . . ” Mgbe e mesịrị, n’okwu mmechi ya, ọ pụrụ izo aka n’ajụjụ ndị ahụ iji tụleghachi isi ihe ndị ahụ.
12. Nye otu ihe atụ iji gosi otú Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye pụrụ isi jiri ajụjụ nyere onye kwere ekwe ibe ha aka inweta nkasi obi n’Okwu Chineke.
12 N’ọrụ ọzụzụ atụrụ ha, Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye pụrụ iji ajụjụ mee ihe iji nyere ‘mkpụrụ obi dara mbà’ aka inweta nkasi obi n’Okwu Jehova. (1 Ndị Tesalonaịka 5:14) Dị ka ihe atụ, iji nyere onye nwere nkụda mmụọ aka, onye okenye pụrụ ịdọrọ uche gaa n’Abụ Ọma 34:18. Ọ na-asị: “Jehova nọ nso ndị obi ha tiwara etiwa, Ọ na-azọpụtakwa ndị a zọpịaworo n’ime mmụọ ha.” Iji jide n’aka na onye ahụ nwere nkụda mmụọ hụrụ otú nke a si metụta ya kpọmkwem, onye okenye ahụ pụrụ ịjụ, sị: ‘Olee ndị Jehova nọ nso? Ọ̀ na-adị gị mgbe ụfọdụ ka ‘e tiwara obi gị’ ma ‘zọpịa mmụọ gị’? Ọ bụrụ na, dị ka Bible na-ekwu, Jehova nọ ndị dị otú ahụ nso, nke ahụ ọ́ dịghị apụta na ọ nọ gị nso?’ Iji nwayọọ mesighachi onye nwere nkụda mmụọ obi ike n’ụzọ dị otú ahụ pụrụ ime ka mmụọ ya dịghachi mma.—Aịsaịa 57:15.
Arụmụka Ezi Uche Dị na Ya
13, 14. (a) Olee otú anyị pụrụ isi soro onye sịrị na ya ekweghị na Chineke ya na-apụghị ịhụ anya tụgharịa uche? (b) Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịtụ anya na mmadụ nile ga-ekwenye?
13 N’ozi anyị, anyị na-achọ iji arụmụka dị Ọrụ 19:8; 28:23, 24) Nke ahụ ọ̀ na-apụta na anyị aghaghị iji arụmụka na-agbagwoju anya na-eme ihe iji mee ka ndị ọzọ kwenye n’eziokwu nke Okwu Chineke? Ọ dịghị ma ọlị. Ọ dịghị mkpa na arụmụka ezi uche dị na ya ga-abụ nke dị mgbagwoju anya. Arụmụka ezi uche dị na ya nke e kwuru n’ụzọ dị mfe na-akasị adị irè mgbe mgbe. Tụlee otu ihe atụ.
mma ma na-eme ka e kwenye na-eru n’obi ndị mmadụ. (14 Olee otú anyị pụrụ isi zaghachi mgbe mmadụ sịrị na ya ekweghị na Chineke ya na-apụghị ịhụ anya? Anyị pụrụ iso ya tụgharịa uche n’iwu ihe kpatara ihe na ihe ọ rụpụtara bụ́ nke na-achịkwa ihe okike. Mgbe anyị hụrụ ihe a rụpụtara, anyị na-ekweta na a ghaghị inwe ihe kpatara ya. Anyị pụrụ ịsị: ‘Ọ bụrụ na ị nọ n’ebe dịpụrụ adịpụ ma hụ ụlọ e wuru nke ọma nke a kwanyejuru ihe oriri na ya (ihe a rụpụtara), ị ga-ekwere ozugbo na ọ dị onye (ihe kpatara ihe) wuru ụlọ ahụ ma kwanyejuo ihe n’igbe nri ndị dị na ya. N’otu aka ahụ, mgbe anyị hụrụ nkà pụtara ìhè n’ihe okike na ihe oriri e nwere n’ụba ‘n’ụlọ nri’ nke ụwa (ihe a rụpụtara), ọ́ bụghị ihe ezi uche dị na ya ikwere na ọ dị Onye (ihe kpatara ihe) mere ka ha dịrị?’ Arụmụka dị mfe nke Bible kwuru ya n’ụzọ kasị mma, sị: “N’ezie, ụlọ ọ bụla nwere onye wuru ya, ma onye wuru ihe nile bụ Chineke.” (Ndị Hibru 3:4) Otú ọ dị, otú ọ sọkwara arụmụka anyị ya bụrụ nke ezi uche dị na ya, ọ bụghị mmadụ nile ga-ekwenye. Bible na-echetara anyị na ọ bụ nanị ndị nwere “ezi ọchịchọ obi” ga-aghọ ndị kwere ekwe.—Ọrụ 13:48; 2 Ndị Tesalonaịka 3:2.
15. Olee ụdị arụmụka anyị pụrụ iji mee ka àgwà na ụzọ Jehova pụta ìhè, ihe atụ abụọ dịkwa aṅaa na-egosi otú anyị pụrụ isi jiri arụmụka dị otú ahụ mee ihe?
15 Mgbe anyị na-ezi ihe, ma ọ bụ n’ozi ubi ma ọ bụ n’ọgbakọ, anyị pụrụ iji arụmụka ezi uche dị na ya mee ka àgwà na ụzọ dị iche iche nke Jehova pụta ìhè. Nke kasị dị irè bụ ụzọ iche echiche bụ́ ‘lee ka ọ ga-esi mee ya karị’ bụ́ nke Jizọs ji mee ihe mgbe ụfọdụ. (Luk 11:13; 12:24) N’ịbụ nke dabeere n’ọdịiche, ụdị arụmụka a pụrụ inwe mmetụta miri emi. Iji gbaa ozizi ọkụ ala mmụọ n’anwụ dị ka ihe ezi uche na-adịghị na ya, anyị pụrụ ịsị: ‘Ọ dịghị nna na-ahụ n’anya nke ga-enye nwa ya ntaramahụhụ site n’itinye aka nwa ya n’ọkụ. Lee ka echiche nke ọkụ ala mmụọ na-aghaghị isi bụrụ ihe na-agbaka ntị karị nye Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya!’ (Jeremaịa 7:31) Iji kụzie na Jehova na-elekọta ndị ohu ya n’otu n’otu, anyị pụrụ ịsị: ‘Ọ bụrụ na Jehova maara aha nke ọ bụla n’ime ọtụtụ ijeri kpakpando, lee ka ọ na-aghaghị isi na-eche banyere ụmụ mmadụ karị bụ́ ndị hụrụ ya n’anya, bụrụkwa ndị e ji ọbara dị oké ọnụ ahịa nke Ọkpara ya zụta!’ (Aịsaịa 40:26; Ọrụ 20:28) Arụmụka dị otú ahụ bụ́ ịgba pụrụ inyere anyị aka iru n’obi nke ndị ọzọ.
Ihe Atụ Ndị Dabara Adaba
16. N’ihi gịnị ka ihe atụ ji baa uru n’izi ihe?
16 Ihe atụ ndị dị irè bụ nnú nke pụrụ ime ka ozizi anyị bụrụ ihe na-adọrọkwu adọrọ nye ndị ọzọ. N’ihi gịnị ka ihe atụ ji baa uru n’izi ihe? Otu onye nkụzi kwuru, sị: “Inwe ike iche echiche banyere ihe n’elekwasịghị ya anya bụ otu n’ime ihe ndị kasị taa akpụ ụmụ mmadụ na-eme.” Ihe atụ na-eme ka anyị jiri anya nke uche na-ahụ ihe n’ụzọ nwere nzube, na-enyere anyị aka ịghọta echiche ọhụrụ n’ụzọ zuru ezu karị. Jizọs bụ aka ochie n’iji ihe atụ eme ihe. (Mak 4:33, 34) Ka anyị tụlee otú anyị pụrụ isi jiri ụzọ izi ihe a mee ihe.
17. Olee isi ihe anọ na-eme ka ihe atụ dị irè?
17 Gịnị na-eme ka ihe atụ dị irè? Nke mbụ, o kwesịrị ikwesị ndị na-ege anyị ntị, bụrụ nke dabeere n’ihe ndị na-ege anyị ntị pụrụ ịghọta ngwa ngwa. Anyị na-echeta na Jizọs nwetara ọtụtụ n’ime ihe atụ ya n’ihe ndị gere ya ntị na-ahụ kwa ụbọchị. Nke abụọ, ihe atụ kwesịrị ikwekọ n’ụzọ ezi uche dị na ya n’ihe a na-ekwu. Ọ bụrụ na ihe atụ ekwekọghị n’ihe a na-ekwu, ihe ọ pụrụ ime bụ nanị ịdọpụ uche ndị na-ege anyị ntị. Nke atọ, e kwesịghị iji nkọwa ndị na-enweghị isi mejuo ihe atụ. Cheta na Jizọs nyere nkọwa zuru ezu ndị dị mkpa ma hapụ nkọwa ndị na-adịghị mkpa. Nke anọ, mgbe anyị nyere ihe atụ, anyị kwesịrị ijide n’aka na anyị kọwara ya n’ụzọ doro anya. Ma ọ́ bụghị ya, ụfọdụ nwere ike ha agaghị aghọta otú o si kwekọọ n’ihe a na-ekwu.
18. Olee otú anyị pụrụ isi chepụta ihe atụ ndị dabara adaba?
n’Ọrụ 3:19, bụ́ ebe na-asị na Jehova ‘na-ehichapụ’ njehie anyị. Nke ahụ n’onwe ya bụ atụmatụ okwu doro anya, ma olee ihe atụ gbara ọkpụrụkpụ anyị pụrụ iji gosipụta ihe a na-ekwu—ọ̀ bụ nchicha? ka ọ̀ bụ ogbo? Anyị pụrụ ịsị: ‘Mgbe Jehova gbaghaara anyị mmehie, ọ na-ehichapụ ha dị ka a ga-asị na o ji ogbo (ma ọ bụ nchicha) mee otú ahụ.’ O siri ike ka a ghara ịghọta isi ihe dị n’ihe atụ dị mfe otú ahụ.
18 Olee otú anyị pụrụ isi chepụta ihe atụ dabara adaba? Ọ dịghị anyị mkpa ichepụta akụkọ ndị toro ogologo ma saa mbara. Ihe atụ ndị dị mkpirikpi pụrụ ịdị nnọọ irè. Gbalịa nnọọ ichepụta ihe atụ ndị kwekọrọ n’isi ihe ị na-ekwu banyere ha. Dị ka ihe atụ, were ya na anyị na-atụle isiokwu metụtara Chineke ịgbaghara mmehie, anyị achọọkwa inye ihe atụ banyere isi ihe dị19, 20. (a) Ebee ka anyị pụrụ ịchọta ihe atụ ndị dị mma? (b) Olee ihe atụ ụfọdụ nke ihe atụ ndị dị irè e bipụtaworo n’akwụkwọ anyị? (Leekwa igbe.)
19 Ebee ka ị pụrụ ịchọta ihe atụ ndị dabara adaba, gụnyere ihe atụ ndị mere eme? Chọọ ha ná ndụ gị ma ọ bụ ná nzụlite na ahụmahụ dịgasị iche iche nke ndị kwere ekwe ibe gị. A pụrụ ịhọrọ ihe atụ site n’ọtụtụ ihe ndị ọzọ, gụnyere ihe ndị dị ndụ na ihe ndị na-adịghị ndụ, ihe ndị e ji eme ihe n’ụlọ, ma ọ bụ okwu a kpụ n’ọnụ bụ́ nke a maara nke ọma n’ógbè unu. Isi ihe ga-eme ka anyị chọta ihe atụ ndị dị mma bụ ịmụrụ anya, ‘ileru anya nke ọma’ n’ọnọdụ ndị anyị na-ahụ kwa ụbọchị. (Ọrụ 17:22, 23) Otu akwụkwọ nke na-ekwu banyere ikwu okwu n’ihu ọha na-akọwa, sị: “Ọkà okwu nke na-eleru anya ná ndụ ndị mmadụ na n’ọrụ dị iche iche ha na-arụ, nke na-eso ụdị mmadụ nile ekwurịta okwu, nke na-enyocha ihe nke ọma ma na-ajụ ajụjụ ruo mgbe ọ ghọtara ha, ga-enweta ọtụtụ ihe ndị ọ ga-eji mee ihe atụ mgbe ọ chọrọ ha.”
20 E nwere ebe ọzọ a pụrụ isi nweta ọtụtụ ihe atụ ndị dị irè—Ụlọ Nche, Teta!, na akwụkwọ ndị ọzọ Ndịàmà Jehova bipụtara. Ị pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu site n’ịchọpụta otú akwụkwọ ndị a si jiri ihe atụ dị iche iche mee ihe. * Were, dị ka ihe atụ, ihe atụ ahụ e ji mee ihe na paragraf nke 11 nke isi 17 n’akwụkwọ Ihe Ọmụma. O ji ndịrịta iche nke ọdịdị mmadụ n’ọgbakọ tụnyere ụgbọala dịgasị iche iche bụ́ ndị na-agba gị n’akụkụ n’okporo ụzọ. Gịnị mere o ji dị irè? Rịba ama na ọ dabeere n’ihe a na-ahụ kwa ụbọchị, o kwekọrọ nnọọ n’ihe a na-ekwu, nkọwa ya dokwara anya. Anyị pụrụ iji ihe atụ ndị e bipụtara ebipụta mee ihe mgbe anyị na-ezi ihe, ikekwe na-eme ka ha kwekọọ ná mkpa nke onye anyị na-amụrụ Bible ma ọ bụ na-agbanwe ha ka anyị wee nwee ike iji ha mee ihe n’okwu anyị na-ekwu.
21. Ụgwọ ọrụ dị aṅaa ka a na-enweta site n’ịbụ onye ozizi dị irè nke Okwu Chineke?
21 Ụgwọ ọrụ a na-enweta n’ịbụ onye ozizi dị irè buru ibu. Mgbe anyị na-ezi ihe, anyị na-eso ndị ọzọ ekerịta ihe; anyị na-eji ụfọdụ n’ime ihe ndị anyị nwere enyere ha aka. Ụdị inye ihe ahụ na-enye obi ụtọ, n’ihi na Bible na-asị: “A na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Nye ndị na-ezi Okwu Chineke, obi ụtọ ahụ bụ ọṅụ nke ịmara na anyị na-enye ihe bara uru n’ụzọ dị mma ma na-adịgide adịgide—eziokwu banyere Jehova. Anyị pụkwara inweta afọ ojuju na-abịa site n’ịmara na anyị na-eṅomi Onye Ozizi ahụ Bụ́ Ọkà, bụ́ Jizọs Kraịst.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 6 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
^ par. 9 Lee nkebi bụ́ “Okwu Mmeghe Maka Iji Mee Ihe n’Ozi Ubi,” dị na peeji nke 2-7.—Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
^ par. 20 Iji chọta ihe atụ, lee Watch Tower Publications Index 1986-2000, n’okpuru isiokwu bụ́ “Illustrations” (“Ihe Atụ”)—Nke Ndịàmà Jehova bipụtara n’ọtụtụ asụsụ.
Ị̀ Na-echeta?
• Olee otú anyị pụrụ isi zie ihe n’ụzọ dị mfe mgbe anyị na-eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi? mgbe anyị na-ekwu okwu n’ọgbakọ?
• Olee otú anyị pụrụ isi jiri ajụjụ mee ihe n’ụzọ dị irè mgbe anyị na-eme nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ?
• Olee otú anyị pụrụ isi jiri arụmụka ezi uche dị na ya mee ka àgwà na ụzọ Jehova pụta ìhè?
• Ebee ka anyị pụrụ ịchọta ihe atụ ndị dabara adaba?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Igbe/Foto dị na peeji nke 23]
Ị̀ Na-echeta Ihe Atụ Ndị A?
Ihe atụ ndị na-esonụ bụ ihe atụ ole na ole ndị dị irè. Gịnị ma ị sapeta ebe ndị e zoro aka na ha ma rịba ama otú ihe atụ ndị ahụ si nye aka n’imesi ihe a na-ekwu ike?
• Dị ka ndị na-eti egwu ma ọ bụ ndị si na gwongworo na-ebudata katọn ndị ngwá ahịa juru, ndị na-achọ iwulite alụmdi na nwunye dị mma na-adabere n’ụzọ dị ukwuu n’ezi onye ibe.—Ụlọ Nche, May 15, 2001, peeji nke 16.
• Ikwu obi gị dị ka ịtụ bọl. Ị pụrụ iji nwayọọ tụọ ya ma ọ bụ ị pụrụ ịtụsi ya ike otú ọ ga-emerụ mmadụ ahụ́.—Teta!, January 8, 2001, peeji nke 10.
• Ịmụta igosipụta ịhụnanya dị ka ịmụ asụsụ ọhụrụ.—Ụlọ Nche, February 15, 1999, peeji nke 18, 22-23.
• A pụrụ iji mmehie e ketara eketa tụnyere ihe na-eme mgbe e tinyere ntụziaka ụfọdụ n’ime kọmputa na nzuzo iji mebie ihe ndị dị na ya.—Is There a Creator Who Cares About You?, peeji nke 156.
• Mgbaasị na-emere ndị mmụọ ọjọọ ihe ihe ụra na-emere ndị dinta. Ọ na-adọta anụ oriri.—Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, peeji nke 111.
• A pụrụ iji otú Jizọs si gbatara ụmụ Adam ọsọ enyemaka tụnyere otu onye ọgaranya nke bụ́ omepụrụ onye ọ dịịrị bụ́ onye kwụrụ ụgwọ nile otu ụlọ ọrụ ji (bụ́ nke onye nlekọta ụlọ ọrụ nke na-adịghị eme ihe n’eziokwu kotere) ma mepeghachi ụlọ ọrụ ahụ, si otú ahụ na-eme ka ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ na ya rite uru.—Ụlọ Nche, February 15, 1991, peeji nke 13.
• Dị ka ndị nwere mmasị n’ihe osise ma ọ bụ n’ọrụ nkà ndị ọzọ ga-eme ihe nile ha pụrụ ime iji mezighachi ihe osise ma ọ bụ ọrụ nkà e mebiri n’ụzọ dị ukwuu, Jehova pụrụ ile anya gabiga ezughị okè anyị, hụ ebe ndị anyị na-emezi emezi, ma mee n’ikpeazụ ka anyị nwetaghachi ọnọdụ zuru okè nke Adam tụfuru.—Ụlọ Nche, February 15, 1990, peeji nke 22.
[Foto ndị dị na peeji nke 20]
Ezi Ndị Kraịst bụ ndị na-ezi Okwu Chineke
[Foto dị na peeji nke 21]
Ndị okenye pụrụ iji ajụjụ nyere ndị kwere ekwe ibe ha aka inweta nkasi obi site n’Okwu Chineke