Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ọ Dịbeghị Mgbe Mmadụ Ọzọ Kwuru Okwu Otú A”

“Ọ Dịbeghị Mgbe Mmadụ Ọzọ Kwuru Okwu Otú A”

“Ọ Dịbeghị Mgbe Mmadụ Ọzọ Kwuru Okwu Otú A”

“Ha nile wee malite ịgba àmà dị mma banyere ya, okwu ọma ndị si n’ọnụ ya apụta tụkwara ha n’anya.”—LUK 4:22.

1, 2. (a) N’ihi gịnị ka ndị ọrụ nche e zigara ijide Jizọs ji gbara aka lọta? (b) Gịnị na-egosi na ọ bụghị nanị ndị ọrụ nche ahụ ka ozizi Jizọs masịrị?

NDỊ ọrụ nche ahụ emezughị ihe e zigara ha ime. E zigara ha ijide Jizọs Kraịst, ma ha gba aka lọta. Ndị isi nchụàjà na ndị Farisii ji olu ike jụọ ha ihe kpatara ya: “N’ihi gịnị ka unu ji ghara ịkpọta ya?” N’ezie, n’ihi gịnị ka ndị ọrụ nche ahụ na-ejighị jide nwoke nke na-agaraghị azọwa onwe ya? Ndị ọrụ nche ahụ kọwara, sị: “Ọ dịbeghị mgbe mmadụ ọzọ kwuru okwu otú a.” Ozizi Jizọs masịrị ha nke ukwuu nke na obi akaghị ha ijichi onye udo a. *Jọn 7:32, 45, 46.

2 Ọ bụghị nanị ndị ọrụ nche ahụ ka ozizi Jizọs masịrị. Bible na-agwa anyị na oké ìgwè mmadụ na-abịakwute ya nanị iji nụrụ ka ọ na-ekwu okwu. ‘Okwu ọma ndị si n’ọnụ ya apụta tụrụ ndị obodo ya n’anya.’ (Luk 4:22) Ihe karịrị otu ugboro, ọ nọ n’ụgbọ mmiri gwa oké ìgwè mmadụ gbakọtara n’ụsọ Oké Osimiri Galili okwu. (Mak 3:9; 4:1; Luk 5:1-3) N’otu oge, “ìgwè mmadụ” nọnyeere ya ruo ụbọchị ụfọdụ, ọbụna n’erighị ihe.—Mak 8:1, 2.

3. Olee isi ihe mere Jizọs ji bụrụ onye ozizi dị ịrịba ama otú ahụ?

3 Gịnị mere Jizọs ji bụrụ onye ozizi dị ịrịba ama? Ịhụnanya bụ isi ihe kpatara ya. * Jizọs hụrụ eziokwu ọ kụziri n’anya, ọ hụkwara ndị ọ kụziiri ihe n’anya. Ma Jizọs nwekwara nghọta na-enweghị atụ banyere ụzọ ndị e si ezi ihe. N’isiokwu ndị dịịrị ọmụmụ bụ́ ndị dị ná mbipụta a, anyị ga-atụle ụfọdụ n’ime ụzọ ndị dị irè o si mee ihe na otú anyị pụrụ isi gbasoo ha.

Ịdị Mfe na Ido Anya

4, 5. (a) N’ihi gịnị ka Jizọs ji jiri okwu dị mfe mee ihe n’ozizi ya, gịnịkwa dị ịrịba ama banyere eziokwu ahụ bụ́ na o mere otú ahụ? (b) Olee otú Ozizi Elu Ugwu ahụ si bụrụ ihe atụ nke ụzọ dị mfe Jizọs si zie ihe?

4 Ọ bụghị ihe ijuanya bụ́ ndị gụrụ oké akwụkwọ iji okwu ndị na-ege ha ntị na-agaghị aghọta wee na-ekwu okwu. Ma ọ bụrụ na ndị ọzọ apụghị ịghọta ihe anyị na-ekwu, olee otú ha pụrụ isi rite uru n’ihe ọmụma anyị? Dị ka onye ozizi, ọ dịghị mgbe Jizọs kwuru okwu n’ụzọ ndị ọzọ na-agaghị aghọta. Cheedị banyere ìgwè okwu ndị ọ pụrụ ịmawo. Ma, n’agbanyeghị otú ọ maruuru ihe, o chere banyere ndị na-ege ya ntị, ọ bụghị banyere onwe ya. Ọ maara na ọtụtụ n’ime ha bụ “ndị na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị.” (Ọrụ 4:13) Iji ruo n’obi ha, o ji okwu mmadụ ndị dị otú ahụ pụrụ ịghọta wee mee ihe. Okwu ndị o ji mee ihe pụrụ ịdịwo mfe, ma eziokwu ndị e ji ha kwupụta gbara ọkpụrụkpụ.

5 Were, dị ka ihe atụ, Ozizi Elu Ugwu ahụ, bụ́ nke e dekọrọ na Matiu 5:3–7:27. Ọ pụrụ iwewo Jizọs nanị minit 20 iji zie ozizi ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ndị ọ kụziri gbara ọkpụrụkpụ, na-eru n’ụmị nke okwu ndị dị ka ịkwa iko, ịgba alụkwaghịm, na ịhụ ihe onwunwe n’anya. (Matiu 5:27-32; 6:19-34) Otú ọ dị, o nweghị okwu ndị dị mgbagwoju anya ma ọ bụ ndị na-ada ka nke ndị gụrụ oké akwụkwọ. Leenụ, o siri ike ịhụ okwu ọbụna nwatakịrị na-apụghị ịghọta ozugbo! Ka a sịkwa ihe mere “ụzọ o si ezi ihe [ji ju] ìgwè mmadụ ahụ anya”—ndị gụnyere ma eleghị anya ọtụtụ ndị ọrụ ugbo, ndị ọzụzụ atụrụ, na ndị ọkụ azụ̀!—Matiu 7:28.

6. Nye ihe atụ nke otú Jizọs si kwuo okwu ndị dị mfe ma bụrụ nnọọ ndị ezi uche dị na ha.

6 Mgbe mgbe, Jizọs ji nkebi ahịrịokwu ndị dị mkpirikpi ma doo anya kwuo okwu ndị dị mfe ma bụrụ nnọọ ndị ezi uche dị na ha. N’oge ahụ a na-enwebeghị akwụkwọ ndị e biri ebi, o si otú ahụ kụnye ozi ya n’uche na n’obi nke ndị na-ege ya ntị n’ụzọ ha na-apụghị ichefu echefu. Rịba ihe atụ ụfọdụ ama: “Ọ dịghị onye pụrụ ịbụ ohu nke nna ukwu abụọ; . . . unu apụghị ịbụ ohu Chineke na nke Akụ̀ na Ụba.” “Kwụsịnụ ikpe ikpe ka e wee ghara ikpe unu ikpe.” “Unu ga-amata ndị ahụ site ná mkpụrụ ha.” “Ndị nwere ahụ́ ike enweghị mkpa maka dibịa, ma ndị ahụ́ na-enye nsogbu nwere.” “Ndị nile na-ebu mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.” “Kwụghachinụ Siza ihe nke Siza, ma kwụghachinụ Chineke ihe nke Chineke.” “A na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.” * (Matiu 6:24; 7:1, 20; 9:12; 26:52; Mak 12:17; Ọrụ 20:35) Ruo ugbu a, bụ́ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 eri Jizọs kwusịrị ha, a na-echeta okwu ndị ahụ bụ́ ịgba n’ụzọ dị mfe.

Iji Ajụjụ Mee Ihe

7. N’ihi gịnị ka Jizọs ji ajụ ajụjụ?

7 Jizọs ji ajụjụ mee ihe n’ụzọ dị ịrịba ama. O mere otú ahụ mgbe mgbe ọbụna mgbe ọ gaara ewewo ya nnọọ oge dị nta karị ịgwa ndị na-ege ya ntị kpọmkwem isi ihe ọ chọrọ ịgwa ha. Gịnịzi mere o ji ajụ ajụjụ? Site n’oge ruo n’oge, o ji ajụjụ ndị na-eru n’obi gbaa ebumnobi nke ndị na-emegide ya n’anwụ, si otú ahụ mee ka ha ghara inwe ọnụ okwu. (Matiu 12:24-30; 21:23-27; 22:41-46) Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe, Jizọs wepụtara oge ịjụ ajụjụ iji kụzie eziokwu ahụ, iji mee ka ndị na-ege ya ntị kwuo ihe dị ha n’obi, na iji kpalie ma zụọ echiche nke ndị na-eso ụzọ ya. Ka anyị tụlee ihe atụ abụọ ndị metụtachara Pita onyeozi.

8, 9. Olee otú Jizọs si jiri ajụjụ nyere Pita aka iru ná nkwubi okwu ziri ezi n’okwu banyere ịtụ ụtụ isi ụlọ nsọ?

8 Nke mbụ, cheta mgbe ndị ọna ụtụ jụrụ Pita ma Jizọs ọ na-atụ ụtụ isi ụlọ nsọ. * Pita, bụ́ onye na-eme ihe ná mkpali mgbe ụfọdụ, zara “Ee.” Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya ka e mesịrị, Jizọs sooro ya tụgharịa uche: “‘Gịnị ka i chere, Saịmọn? Ọ̀ bụ n’aka ole ndị ka ndị eze nke ụwa na-anata ụtụ ahịa ma ọ bụ ụtụ isi? N’aka ụmụ ha ka ọ̀ bụ n’aka ndị bịara abịa?’ Mgbe ọ sịrị: ‘N’aka ndị bịara abịa,’ Jizọs sịrị ya: ‘Ya mere, n’ezie ụmụ ha anaghị atụ ụtụ.’” (Matiu 17:24-27) Isi ihe dị n’ajụjụ Jizọs kwesịrị idowo Pita anya. N’ihi gịnị?

9 N’oge Jizọs, a maara ndị òtù ezinụlọ ndị eze dị ka ndị na-adịghị atụ ụtụ isi. N’ihi ya, dị ka Ọkpara nke Eze eluigwe ahụ a na-efe ofufe n’ụlọ nsọ ahụ mụrụ nanị ya, iwu ekwesịghị iji Jizọs ịtụ ụtụ isi ahụ. Rịba ama na kama ịgwa nnọọ Pita ihe bụ́ azịza ya, Jizọs ji nwayọọ jiri ajụjụ mee ihe n’ụzọ dị irè iji nyere Pita aka iru ná nkwubi okwu ziri ezi—na ikekwe ime ka ọ hụ mkpa ọ dị ichekwu echiche nke ọma tupu ọ na-ekwu okwu.

10, 11. Olee otú Jizọs si meghachi omume mgbe Pita bipụrụ ntị otu nwoke n’abalị Ememe Ngabiga nke 33 O.A., oleekwa otú nke a si gosi na Jizọs ghọtara uru ajụjụ bara?

10 Ihe atụ nke abụọ bụ banyere ihe mere n’abalị Ememe Ngabiga nke 33 O.A., mgbe ìgwè ndị na-eme ihe ike bịara ijide Jizọs. Ndị na-eso ụzọ Jizọs jụrụ ya ma ọ̀ bụ ha lụọ ọgụ iji chebe ya. (Luk 22:49) N’echeghị ka ọ zaa ya, Pita ji mma agha bipụ ntị nke otu nwoke (ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na Pita bu n’obi ime ya ihe karịrị nke ahụ). Pita mere ihe n’ụzọ na-ekwekọghị n’uche nna ya ukwu, n’ihi na Jizọs dị njikere n’ụzọ zuru ezu inye ha onwe ya. Olee otú Jizọs si meghachi omume? N’ịbụ onye na-enwe ndidi mgbe nile, ọ jụrụ Pita ajụjụ atọ: “Iko nke Nna m nyeworo m, ọ̀ bụ na mụ ekwesịghị ijisi ike ṅụọ ya?” “Ì chere na mụ apụghị ịrịọ Nna m ka o zitere m ugbu a ihe karịrị ìgwè ndị mmụọ ozi iri na abụọ? Ọ bụrụ otú ahụ, olee otú Akwụkwọ Nsọ ga-esi mezuo na ọ ghaghị iwere ọnọdụ otú a?”—Jọn 18:11; Matiu 26:52-54.

11 Tụgharịtụ uche n’ihe ndekọ ahụ. Jizọs, bụ́ onye ìgwè ndị na-eme ihe ike iwe ji gbara gburugburu, maara na ọnwụ ya eruwela nso nakwa na ido nsọ nke aha Nna ya na nzọpụta nke ezinụlọ mmadụ dị ya n’ubu. N’agbanyeghị nke ahụ, o wepụtara oge ozugbo ahụ iji jiri ajụjụ kụba eziokwu ndị dị mkpa n’obi Pita. Ó doghị anya na Jizọs ghọtara uru ajụjụ bara?

Ịma Ụma Kwufee Okwu Ókè

12, 13. (a) Gịnị bụ ikwufe okwu ókè? (b) Olee otú Jizọs si jiri ikwufe okwu ókè mesie nzuzu dị n’ịkatọ obere mmejọ nke ụmụnna anyị ike?

12 N’ozi ya, Jizọs ji ụzọ izi ihe ọzọ dị irè—ikwufe okwu ókè—mee ihe ugboro ugboro. Nke a bụ ịma ụma kwubiga okwu ókè iji mesie okwu ike. Site n’ikwufe okwu ókè, Jizọs mere ka e jiri anya nke uche hụ ihe ndị siri ike nchefu. Ka anyị tụlee ihe atụ ole na ole.

13 N’Ozizi Elu Ugwu ahụ, mgbe Jizọs na-emesi ike mkpa ọ dị ‘ịkwụsị ikpe ndị ọzọ ikpe,’ ọ sịrị: “Gịnịzi mere i ji ele irighiri ahịhịa nke dị n’anya nwanna gị, ma i chebaraghị ntụhie dị n’anya nke gị echiche.” (Matiu 7:1-3) Ị̀ pụrụ iji anya nke uche gị hụ ihe ọ na-ekwu? Onye nkatọ maara ahụ́ sị ka ya wepụ irighiri ahịhịa nkịtị “n’anya” nwanna ya. Onye nkatọ ahụ ga na-ekwu na nwanna ya apụghị ịhụ ihe nke ọma iji mee mkpebi dị mma. Ma “ntụhie”—osisi a pụrụ iji jigide elu ụlọ—na-eme ka onye nkatọ ahụ n’onwe ya ghara inwe ike ime mkpebi dị mma. Lee ka nke a si bụrụ ụzọ a na-apụghị ichefu echefu isi mesie ike ihe nzuzu ọ bụ ịkatọ obere mmejọ nke ụmụnna anyị mgbe ọ pụrụ ịbụ na anyị nwere mmejọ ndị dị oké njọ n’onwe anyị!

14. N’ihi gịnị ka okwu Jizọs banyere ịzapụ ahụhụ nta na iloda Kamel ji bụrụ kpọmkwem okwu e kwufere nnọọ ókè?

14 N’oge ọzọ, Jizọs katọrọ ndị Farisii dị ka “ndị nduzi kpuru ìsì, ndị na-azapụ ahụhụ nta ma na-eloda kamel.” (Matiu 23:24) Nke a bụ kpọmkwem okwu e kwufere ókè n’ụzọ siri ike. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọdịiche dị n’etiti ahụhụ pere mpe na kamel, nke bụ́ anụ kasị ukwuu ndị na-ege Jizọs ntị maara, bụ ihe na-akpali mmasị. A na-eme atụmatụ na a ga-ewekọta ahụhụ nta dị nde 70 iji nweta ịdị arọ nke otu kamel há otú kamel na-ahakarị! Ọzọkwa, Jizọs maara na ndị Farisii na-eji ákwà aza mmanya ha. Ndị ahụ na-esi ọnwụ n’ịgbasoru iwu n’isi na-eme ya iji zere iloda ahụhụ nta ma si otú ahụ ghọọ ndị na-adịghị ọcha n’ụzọ omenala. Ma, n’ụzọ ihe atụ, ha na-eloda kamel, bụ́kwa nke na-adịghị ọcha. (Levitikọs 11:4, 21-24) Isi ihe dị n’okwu Jizọs doro anya. Ndị Farisii gbasochiri nnọọ akụkụ ndị kasị nta nke ihe ndị Iwu ahụ chọrọ n’aka ha anya, ma ha leghaara ihe ndị ka mkpa anya—“ikpe ziri ezi na ebere na ikwesị ntụkwasị obi.” (Matiu 23:23) Lee ka Jizọs si gbaa nnọọ ụdị mmadụ ha bụ n’anwụ!

15. Olee ihe ụfọdụ Jizọs kụziri site n’iji ikwufe okwu ókè mee ihe?

15 N’ozi ya, Jizọs ji ikwufe okwu ókè mee ihe mgbe mgbe. Tụlee ihe atụ ụfọdụ. “Okwukwe hà ka mkpụrụ osisi mọstad” pere mpe nke pụrụ ibupụ ugwu—ọ pụrụ isiworo Jizọs ike ịchọta ụzọ ka nke ahụ dị irè isi mesie ike na ọbụna okwukwe dị nta pụrụ ịrụzu ihe dị ukwuu. (Matiu 17:20) Nnukwu kamel nke na-adọga isi n’anya agịga gafee—lee ka nke ahụ si egosi ihe isi ike ọgaranya nke na-anwa ijere Chineke ozi ma na-arapagidesi ike n’ụzọ ndụ nke ịhụ ihe onwunwe n’anya na-eche ihu! (Matiu 19:24) Atụmatụ okwu bụ́ ịgba nke Jizọs na ikike o nwere iji okwu dị nta rụzuo ihe dị ukwuu ọ́ dịghị atụ gị n’anya?

Arụmụka A Na-apụghị Ịgbagha Agbagha

16. N’ụzọ dị aṅaa ka Jizọs si jiri ikike iche echiche ya bụ́ ịgba mee ihe mgbe nile?

16 N’ịbụ onye nwere uche zuru okè, Jizọs bụ onye ọkà n’iso ndị mmadụ tụgharịa uche n’ụzọ ezi uche dị na ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dịtụghị mgbe o ji ikike a mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. N’ozizi ya, o ji ikike iche echiche bụ́ ịgba o nwere mee ihe mgbe nile iji kwalite eziokwu. N’oge ụfọdụ, o ji arụmụka bụ́ ịgba mee ihe iji gbaghaa ebubo ụgha nke ndị na-emegide ya bụ́ ndị okpukpe. Ọtụtụ mgbe, o ji arụmụka ezi uche dị na ha mee ihe iji kụziere ndị na-eso ụzọ ya ihe ndị dị mkpa. Ka anyị leba anya n’ikike bụ́ ịgba Jizọs nwere n’iji arụmụka eme ihe.

17, 18. Olee arụmụka bụ́ ịgba Jizọs ji mee ihe iji gbaghaa ebubo ụgha ndị Farisii boro ya?

17 Tụlee oge Jizọs gwọrọ otu nwoke mmụọ ọjọọ ji nke kpuru isi, nke na-adịghịkwa ekwuli okwu. Ozugbo ndị Farisii nụrụ ya, ha sịrị: “Onye a adịghị achụpụ ndị mmụọ ọjọọ ma ọ́ bụghị site na Bielzebọb [Setan], onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ.” Rịba ama na ndị Farisii kwetara na a chọrọ ike karịrị nke mmadụ iji chụpụ ndị mmụọ ọjọọ Setan. Otú ọ dị, iji mee ka ndị mmadụ ghara ikwere na Jizọs, ha kwuru na ike o ji mee ya bụ nke Setan. N’igosi na ha ejighị ezi uche chebara arụmụka ha echiche nke ọma, Jizọs zaghachiri, sị: “Alaeze ọ bụla nke kewara megide onwe ya na-atọgbọrọ n’efu, obodo ọ bụla ma ọ bụ ụlọ ọ bụla nke kewara megide onwe ya agaghị eguzo. N’otu ụzọ ahụ, ọ bụrụ na Setan achụpụ Setan, o kewawo megide onwe ya; oleezi otú alaeze ya ga-esi guzo?” (Matiu 12:22-26) Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ihe Jizọs na-ekwu bụ: ‘Ọ bụrụ na, dị ka unu kwuru, na m bụ onye ozi Setan, na-emerụ ihe Setan mere, ọ pụtaziri na Setan na-arụ ọrụ megide ọdịmma nke aka ya, na ọ ga-adakwa n’oge na-adịghị anya.’ Ọ bụ arụmụka bụ ịgba, ọ́ bụghị ya?

18 Mgbe ahụ, Jizọs so ha tụgharịkwuo uche n’okwu a. Ọ maara na ụfọdụ n’ime ndị Farisii achụpụla ndị mmụọ ọjọọ. N’ihi ya, ọ jụrụ ha ajụjụ dị mfe ma rie ha ọnụ, sị: “Ọ bụrụ na m na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ site n’ike Bielzebọb, ọ̀ bụ site n’ike onye ka ụmụ [ma ọ bụ ndị na-eso ụzọ] unu na-achụpụ ha?” (Matiu 12:27) N’otu echiche, arụmụka Jizọs bụ: ‘Ọ bụrụ n’ezie na m ji ike Setan achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, mgbe ahụ ọ ghaghị ịbụ otu ike a ka ndị na-eso ụzọ unu ji na-eme ya.’ Gịnị ka ndị Farisii ga-ekwu? Ọ dịghị mgbe ha ga-ekweta na ndị na-eso ụzọ ha ji ike Setan mee ihe. Site n’iji arụmụka a na-apụghị ịgbagha agbagha mee ihe, Jizọs mere ka ebubo ha boro ya bụrụ ihe ezi uche na-adịghị na ya.

19, 20. (a) N’ụzọ dị aṅaa dị mma ka Jizọs si jiri arụmụka mee ihe? (b) Olee otú Jizọs si jiri ụdị arụmụka bụ́ ‘lee ka ọ ga-esi mee ya karị’ mee ihe mgbe ọ na-azaghachi arịrịọ ndị na-eso ụzọ ya rịọrọ ka ọ kụziere ha otú e si ekpe ekpere?

19 Tụkwasị n’iji arụmụka mee ka ndị na-emegide ya ghara inwe ọnụ okwu, Jizọs jikwa arụmụka ndị ezi uche dị na ha ma na-akwali ime ihe kụzie eziokwu ndị na-enye agbamume na obi ụtọ banyere Jehova. Ọtụtụ ugboro, o ji ụdị arụmụka a pụrụ ịkpọ ‘lee ka ọ ga-esi mee ya karị’ mee ihe, na-enyere ndị na-ege ya ntị aka isi n’eziokwu ha maara nke ọma gaa n’ikwenyesikwu ike n’ihe. Ka anyị tụlee nanị ihe atụ abụọ.

20 Mgbe ọ na-azaghachi arịrịọ ndị na-eso ụzọ ya rịọrọ ka ọ kụziere ha otú e si ekpe ekpere, Jizọs nyere ihe atụ nke otu nwoke bụ́ onye “ịnọgidesi ike ya” mesịrị mee ka otu enyi ya na-achọghị inyere ya aka kweta ime ihe ọ rịọrọ ya. Jizọs kọwakwara njikere ndị mụrụ ụmụ na-adị ‘inye ụmụ ha ezi onyinye.’ Mgbe ahụ, o kwubiri, sị: “Ọ bụrụ na unu, ọ bụ ezie na unu bụ ndị ajọ omume, maara ụzọ isi nye ụmụ unu ezi onyinye, lee ka Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ karị!” (Luk 11:1-13) Ihe Jizọs mere ka ọ pụta ìhè dabeere ọ bụghị ná myirịta, kama n’ọdịiche. Ọ bụrụ na a pụrụ imesị mee ka enyi na-achọghị inye aka kwenye igbo mkpa nke onye agbata obi ya, ọ bụrụkwa na nne na nna bụ́ ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-egbo mkpa ụmụ ha, lee ka Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya ga-esi were mmụọ nsọ karị nye ndị ohu ya na-eguzosi ike n’ihe bụ́ ndị ji obi umeala na-abịakwute ya n’ekpere!

21, 22. (a) Olee ụdị arụmụka Jizọs ji mee ihe mgbe ọ na-enye ndụmọdụ banyere ịnagide nchegbu banyere ihe onwunwe? (b) Ka anyị tụlesịrị ole na ole n’ime ụzọ izi ihe Jizọs, gịnị ka anyị na-ekwubi?

21 Jizọs ji arụmụka yiri nke ahụ mee ihe mgbe ọ na-enye ndụmọdụ banyere ịnagide nchegbu banyere ihe onwunwe. O kwuru, sị: “Rịbanụ ama nke ọma na ugoloọma adịghị akụ mkpụrụ, ha adịghịkwa ewe ihe ubi, ha enweghịkwa ọba ma ọ bụ ụlọ nkwakọba ihe, ma Chineke na-azụ ha. Ruo ókè hà aṅaa ka unu dị oké ọnụ ahịa karịa nnụnụ? Rịbanụ ama nke ọma otú okooko lili si eto, ha adịghị adọgbu onwe ha n’ọrụ, ha adịghịkwa atụ ogho . . . Ọ bụrụkwa na Chineke si otú a na-eyikwasị ahịhịa ndụ dị n’ubi uwe bụ́ nke na-adị taa ma bụrụ nke a na-atụba n’ekwú ọkụ echi, lee ka ọ ga-esi yikwasị unu uwe karị, unu ndị okwukwe nta!” (Luk 12:24, 27, 28) Ee, ọ bụrụ na Jehova na-elekọta nnụnụ na okooko osisi, lee ka ọ ga-esi lekọta ndị ohu ya karị! Ihe ịrụ ụka adịghị ya na arụmụka dị otú ahụ nke dị nro ma dị ike ruru n’obi nke ndị gere Jizọs ntị.

22 Ka anyị tụlesịrị ole na ole n’ime ụzọ izi ihe Jizọs, anyị pụrụ ikwubi n’ụzọ dị mfe na ndị ọrụ nche ahụ na-ekweghị ijide ya ekwubigaghị okwu ókè mgbe ha sịrị: “Ọ dịbeghị mgbe mmadụ ọzọ kwuru okwu otú a.” Ma ụzọ izi ihe a kasị jiri mara Jizọs ma eleghị anya bụ iji ihe atụ, ma ọ bụ ilu, eme ihe. N’ihi gịnị ka o ji jiri ụzọ izi ihe a mee ihe? Gịnịkwa mere ihe atụ ya ji dị nnọọ irè? A ga-atụle ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 1 Ikekwe ndị ọrụ nche ahụ bụ ndị ozi Sanhedrin na ndị nọ n’okpuru ikike nke ndị isi nchụàjà.

^ par. 3 Lee isiokwu ndị bụ́ “M Na-esetịpụrụ Unu Ụkpụrụ” na ‘Nọgide Na-eso M,’ ná mbipụta Ụlọ Nche nke August 15, 2002.

^ par. 6 Ọ bụ nanị Pọl onyeozi hotara ihe atụ nke ikpeazụ a, bụ́ nke a na-achọta n’Ọrụ 20:35, n’agbanyeghị na a na-ahụ echiche dị n’okwu ndị ahụ n’Oziọma ndị ahụ. Ọ pụrụ ịbụwo na Pọl nụtara ya n’ọnụ onye ọzọ (ma ọ́ bụghị n’ọnụ onye na-eso ụzọ nke nụrụ mgbe Jizọs kwuru ya ọ bụrụ n’ọnụ Jizọs ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie), ma ọ bụkwanụ na ọ bụ Chineke kpughere ya nye ya.—Ọrụ 22:6-15; 1 Ndị Kọrint 15:6, 8.

^ par. 8 A chọrọ n’aka ndị Juu ịkwụ drakma abụọ (ihe dị ka ego a na-akwụ maka ọrụ ụbọchị abụọ) dị ka ụtụ isi ụlọ nsọ kwa afọ. A na-eji ego ụtụ isi ahụ akwụ ụgwọ maka idozi ụlọ nsọ ahụ, maka ozi a na-eje n’ebe ahụ, nakwa maka àjà a na-achụ kwa ụbọchị n’isi mba ahụ.

Ị̀ Na-echeta?

• Ihe atụ ndị dị aṅaa na-egosi na Jizọs kụziri ihe n’ụzọ dị mfe ma doo anya?

• N’ihi gịnị ka Jizọs ji jiri ajụjụ mee ihe n’ozizi ya?

• Gịnị bụ ikwufe okwu ókè, oleekwa otú Jizọs si jiri ụzọ izi ihe a mee ihe?

• Olee otú Jizọs si jiri arụmụka ezi uche dị na ya mee ihe iji kụziere ndị na-eso ụzọ ya eziokwu ndị na-enye obi ụtọ banyere Jehova?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 9]

Jizọs ji okwu dị mfe nke ndị nkịtị pụrụ ịghọta mee ihe

[Foto dị na peeji nke 10]

Ndị Farisii ‘zapụrụ ahụhụ nta ma lodaa kamel’