Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ọ Dịghị Agwa Ha Okwu Ma Ọ Bụrụ Na O Jighị Ihe Atụ”

“Ọ Dịghị Agwa Ha Okwu Ma Ọ Bụrụ Na O Jighị Ihe Atụ”

“Ọ Dịghị Agwa Ha Okwu Ma Ọ Bụrụ Na O Jighị Ihe Atụ”

“Jizọs ji ihe atụ dị iche iche gwa ìgwè mmadụ ahụ [okwu]. N’ezie, ọ dịghị agwa ha okwu ma ọ bụrụ na o jighị ihe atụ.”—MATIU 13:34.

1, 2. (a) Gịnị mere na a dịghị echefu ihe atụ ndị dị irè ngwa ngwa? (b) Olee ụdị ihe atụ ndị Jizọs ji mee ihe, ajụjụ ndị dịkwa aṅaa na-ebilite banyere ojiji o ji ihe atụ mee ihe? (Lee ihe odide ala ala peeji.)

Ị̀ PỤRỤ icheta ihe atụ ị nụrụ, ikekwe n’okwu ihu ọha, ọtụtụ afọ gara aga? A dịghị echefu ihe atụ ndị dị irè ngwa ngwa. Otu onye edemede kwuru na ihe atụ “na-eme ka ihe a nụrụ ná ntị ghọọ ihe a pụrụ iji anya nke uche hụ, na-emekwa ka o kwe ndị na-ege ntị omume iji anya nke uche ha na-ahụ ihe.” Ebe ọ bụ na anyị na-aghọtakarị ihe nke ọma mgbe anyị ji anya nke uche na-ahụ ya, ihe atụ pụrụ ime ka echiche ụfọdụ dị mfe nghọta. Ihe atụ pụrụ ime ka anyị ghọta okwu nke ọma, na-akụziri anyị ihe ndị anyị na-apụghị ichefu echefu.

2 Ọ dịghị onye nkụzi nọ n’ụwa nke dịworo irè n’iji ihe atụ eme ihe karịa Jizọs Kraịst. A na-echeta ọtụtụ ilu Jizọs n’ụzọ dị mfe ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ o kwusịrị ha. * N’ihi gịnị ka Jizọs ji dabere nke ukwuu n’ụzọ izi ihe a? Gịnịkwa mere ihe atụ ya ji dị nnọọ irè?

Ihe Mere Jizọs Ji Jiri Ihe Atụ Kụzie ihe

3. (a) Dị ka Matiu 13:34, 35 si kwuo, gịnị bụ otu ihe mere Jizọs ji jiri ihe atụ mee ihe? (b) Gịnị na-egosi na Jehova aghaghị iji ụzọ izi ihe a kpọrọ ihe?

3 Bible kwuru ihe abụọ dị ịrịba ama mere Jizọs ji jiri ihe atụ mee ihe. Nke mbụ, ya ime otú ahụ mezuru amụma. Matiu onyeozi dere, sị: “Jizọs ji ihe atụ dị iche iche gwa ìgwè mmadụ ahụ [okwu]. N’ezie, ọ dịghị agwa ha okwu ma ọ bụrụ na o jighị ihe atụ; ka e wee mezuo ihe e kwuru site n’ọnụ onye amụma bụ́ onye kwuru, sị: ‘M ga-emeghe ọnụ m n’ihe atụ.’” (Matiu 13:34, 35) “Onye amụma” Matiu hotara bụ onye dere Abụ Ọma 78:2. Ode abụ ahụ ji ike nke mmụọ Chineke dee ya ọtụtụ narị afọ tupu a mụọ Jizọs. Ọ́ bụghị ihe dị ịrịba ama na ọtụtụ narị afọ tupu ya emee, Jehova kpebiri na Ọkpara ya ga-eji ihe atụ kụzie ihe? N’ezie, Jehova aghaghị iji ụzọ izi ihe a kpọrọ ihe!

4. Olee otú Jizọs si kọwaa ihe mere o ji jiri ihe atụ mee ihe?

4 Nke abụọ, Jizọs n’onwe ya kọwara na ya na-eji ihe atụ eme ihe iji yọchapụ ndị obi ha na-adịghị anabata ihe. Mgbe ọ tụsịịrị “ìgwè mmadụ” ilu banyere ọgha mkpụrụ, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ, sị: “Gịnị mere i ji jiri ihe atụ na-agwa ha okwu?” Jizọs zara, sị: “Ọ bụ unu ka e nyere ikike ịghọta ihe nzuzo ndị dị nsọ nke alaeze eluigwe, ma e nyeghị ndị ahụ ikike ya. Ọ bụ nke a mere m ji eji ihe atụ agwa ha okwu, n’ihi na n’ile anya, ha na-ele n’efu, n’ịnụkwa ihe, ha na-anụ n’efu, ha adịghịkwa aghọta ihe ọ pụtara; n’ebe ha nọ ka amụma Aịzaịa na-enwe mmezu, bụ́ nke na-asị, ‘N’ọnụnụ, unu ga-anụ ma unu agaghị aghọta ihe ọ pụtara ma ọlị; n’ile anya, unu ga-ele ma unu agaghị ahụ ụzọ ma ọlị. N’ihi na obi ndị a adịkwaghị anabata ihe.’”—Matiu 13:2, 10, 11, 13-15; Aịsaịa 6:9, 10.

5. Olee otú ihe atụ Jizọs si yọchaa ndị ji obi umeala ege ntị pụọ n’ebe ndị dị mpako nọ?

5 Olee ihe mere ihe atụ Jizọs ji kewapụ ndị mmadụ iche iche? Mgbe ụfọdụ, ndị na-ege ya ntị aghaghị ime nchọpụta nke ọma iji ghọta ihe okwu ya pụtara n’ụzọ zuru ezu. A kpaliri ndị dị umeala n’obi ịchọkwu ihe ọmụma. (Matiu 13:36; Mak 4:34) Ya mere, ihe atụ Jizọs kpughere eziokwu nye ndị ọ na-agụ obi ha agụụ; n’otu mgbe ahụ, ihe atụ ya zochiri eziokwu n’ebe ndị nwere obi mpako nọ. Lee onye ozizi dị ịrịba ama Jizọs bụ! Ka anyị tụlezie ụfọdụ n’ime isi ihe ndị mere ihe atụ ya ji dị nnọọ irè.

Inye Nkọwa Zuru Ezu Banyere Ihe Ndị A Họọro

6-8. (a) Olee ohere ọma ndị gere Jizọs ntị na narị afọ mbụ na-enwebeghị? (b) Ihe atụ ndị dị aṅaa na-egosi na Jizọs na-ahọrọ ihe ndị ọ na-akọwa n’ụzọ zuru ezu?

6 Ì chetụwo echiche banyere ihe ọ na-aghaghị ịdịwo ka ya nye ndị ahụ na-eso ụzọ na narị afọ mbụ bụ́ ndị ji ntị ha nụ ka Jizọs kụziri ihe? Ọ bụ ezie na ha nwere ihe ùgwù nke ịnụ olu Jizọs, ha aka-enweghị ohere ọma nke inyocha ihe ndekọ e dere ede iji cheta ihe ndị o kwuru. Kama nke ahụ, ha aghaghị iburu okwu Jizọs n’uche na n’obi ha. Site n’iji ihe atụ mee ihe n’ụzọ bụ́ ịgba, Jizọs mere ka ọ dịkwuoro ha mfe icheta ihe ọ kụziri. N’ụzọ dị aṅaa?

7 Jizọs họọrọ ihe ndị ọ na-akọwa n’ụzọ zuru ezu. Mgbe ọ dị mkpa inye nkọwa zuru ezu iji ghọta ihe a na-akọ ma ọ bụ iji mesie ihe ike, ọ na-eji nnọọ nlezianya eme otú ahụ. N’ihi ya, o kwuru atụrụ ole a hapụrụ mgbe onye nwe ha nọ na-achọgharị nke furu efu, awa ole ndị ọrụ rụrụ ọrụ n’ubi vaịn, na talent ole e nyefere n’aka ndị ohu.—Matiu 18:12-14; 20:1-16; 25:14-30.

8 N’otu oge ahụ, Jizọs hapụrụ nkọwa ndị na-adịghị mkpa bụ́ ndị pụrụ igbochi anyị ịghọta isi ihe dị n’ihe atụ ya. Dị ka ihe atụ, n’ilu banyere ohu na-adịghị obi ebere, ọ dịghị nkọwa e nyere banyere otú ohu ahụ si jide ụgwọ dị dinarịọs 60,000,000. Jizọs nọ na-emesi ike mkpa ịdị na-agbaghara ndị ọzọ dị. Ihe dị mkpa abụghị otú ohu ahụ si jide ụgwọ, kama ọ bụ otú e si gbaghara ya ụgwọ o ji nakwa otú ya onwe ya, n’aka nke ya, si mesoo ohu ibe ya nke ji ya ego dị nnọọ nta karịa nke ya onwe ya ji. (Matiu 18:23-35) N’ụzọ yiri nke ahụ, n’ilu banyere nwa mmefu, Jizọs enyeghị nkọwa ọ bụla banyere ihe mere nwa nwoke nke obere ji rịọ na mberede ka e nye ya ihe nketa ya na ihe mere o ji rikpọọ ya. Ma Jizọs nyere nkọwa zuru ezu banyere ụdị mmetụta nna ya nwere na otú o si meghachi omume mgbe nwa ya nwoke gbanwere obi ya ma lọghachite. Nkọwa dị otú ahụ banyere mmeghachi omume nna ahụ dị oké mkpa n’ihe Jizọs na-eme ka ọ pụta ìhè, na Jehova na-agbaghara “n’ụba.”—Aịsaịa 55:7; Luk 15:11-32.

9, 10. (a) Mgbe ọ na-akọwa ndị o ji mee ihe n’ihe atụ ya, gịnị ka Jizọs lekwasịrị anya na ya? (b) Olee otú Jizọs si mee ka ọ dịkwuoro ndị gere ya ntị na ndị ọzọ mfe icheta ihe atụ ya?

9 Jizọs jikwa ezi uche mee ihe n’ụzọ o si kọwaa ndị o ji mee ihe n’ilu ya. Kama inye nkọwa sara mbara banyere otú ha dị, Jizọs na-elekwasịkarị anya n’ihe ha mere ma ọ bụ n’otú ha si meghachi omume n’ihe ndị ọ na-akọ banyere ha. N’ihi ya, kama ịkọwa otú onye Sameria ahụ bụ́ ezi onye agbata obi dị, Jizọs kọrọ ihe dị nnọọ ịrịba ama karị—otú onye Sameria ahụ si jiri ọmịiko gbatara onye Juu merụrụ ahụ́ nke tọgbọ n’okporo ụzọ ọsọ enyemaka. Jizọs nyere nkọwa ndị dị mkpa iji kụzie na ịhụnanya nke onye agbata obi kwesịrị iruru ndị na-esighị n’agbụrụ ma ọ bụ mba anyị.—Luk 10:29, 33-37.

10 Otú Jizọs si jiri nlezianya nye nkọwa mere ka ihe atụ ya dị mfe ma ghara ịdị mgbagwoju anya. N’ụzọ dị otú a, o mere ka ọ dịkwuoro ndị gere ya ntị na narị afọ mbụ—na imerime ndị ọzọ bụ́ ndị ga-emesị gụọ Oziọma ndị ahụ e ji ike mmụọ nsọ dee—mfe icheta ha na ihe ndị bara uru a na-amụta na ha.

Ihe Atụ Ndị E Si n’Ihe Ndị Na-eme Kwa Ụbọchị Nweta

11. Nye ihe atụ dị iche iche nke otú ilu Jizọs si gosipụta ihe ndị obi abụọ na-adịghị ya na ọ hụrụ mgbe ọ na-etolite na Galili.

11 Jizọs bụ onye ọkà n’iji ihe atụ ndị metụtara ndụ ndị mmadụ eme ihe. Ọtụtụ n’ime ilu ya na-egosi ihe ndị obi abụọ na-adịghị ya na ọ hụrụ mgbe ọ na-etolite na Galili. Chetụ echiche banyere oge ọ bụ nwata. Ugboro ole ka ọ hụrụ ka nne ya na-eme achịcha koro eko site n’iji obere ihe iko achịcha nke o mefọrọ n’achịcha nke ikpeazụ o mere, ma jiri ya mee ka achịcha ya koo? (Matiu 13:33) Ugboro ole ka ọ hụrụ ka ndị ọkụ azụ̀ na-awụnye ụgbụ ha n’ime mmiri na-acha nnọọ anụnụ anụnụ nke Oké Osimiri Galili? (Matiu 13:47) Ugboro ole ka ọ hụrụ ka ụmụaka na-egwuri egwu n’ọma ahịa? (Matiu 11:16) O yiri ka Jizọs ọ rịbara ihe nkịtị ndị ọzọ o ji mee ihe atụ ama—mkpụrụ a na-agha, oriri alụmdi na nwunye na-enye ọṅụ, na ubi mkpụrụ nke nọ na-acha n’anwụ.—Matiu 13:3-8; 25:1-12; Mak 4:26-29.

12, 13. Olee otú ilu Jizọs banyere ọka na ata si egosipụta na ọ maara ọnọdụ ndị e nwere n’ógbè ọ nọ kwuo okwu?

12 Mgbe ahụ, ọ bụghị ihe ijuanya na ọnọdụ ndị a na-ahụ ná ndụ kwa ụbọchị juru n’ọtụtụ ihe atụ ndị Jizọs nyere. Ya mere, iji ghọtakwuo nke ọma nkà o nwere n’iji ụzọ izi ihe a eme ihe, ọ ga-abụ ihe enyemaka ịtụle ihe okwu ya pụtara nye ndị Juu gere ya ntị. Ka anyị leba anya n’ihe atụ abụọ.

13 Nke mbụ, n’ilu ọka na ata, Jizọs kọrọ banyere nwoke nke ghara ọka ọma n’ubi ya ma “onye iro” abanye n’ubi ahụ ma ghakwasị ya ata. N’ihi gịnị ka Jizọs ji họrọ omume obi ọjọọ ahụ? Ọ dị mma, buru n’uche na o nyere ihe atụ ahụ n’ebe dị nso n’Oké Osimiri Galili, ihe àmà na-egosikwa na ọrụ ugbo bụ ọrụ bụ́ isi ndị Galili na-arụ. Ọ̀ dị ihe pụrụ imebiri onye ọrụ ugbo ihe karịa onye iro ịbanye n’ubi ya na nzuzo ma ghakwasị ya ata na-emebi ihe? Iwu obodo ndị dị n’oge ahụ na-egosi na e mere mwakpo ndị dị otú ahụ n’ezie. Ọ̀ bụ na o doghị anya na Jizọs ji ọnọdụ ndị na-ege ya ntị pụrụ ịghọta mee ihe?—Matiu 13:1, 2, 24-30.

14. N’ilu banyere onye Sameria ahụ bụ́ ezi onye agbata obi, n’ihi gịnị ka o ji dị ịrịba ama na Jizọs ji ụzọ ‘si Jeruselem gbadaa Jeriko’ mee ka isi ihe ọ na-ekwu pụta ìhè?

14 Nke abụọ, cheta ilu nke onye Sameria ahụ bụ́ ezi onye agbata obi. Jizọs malitere site n’ịsị: “Otu nwoke si Jeruselem na-agbada Jeriko ma daba n’aka ndị na-apụnara mmadụ ihe, bụ́ ndị gbara ya ọtọ, kụọkwa ya ihe, wee pụọ, hapụ ya ọdị ndụ ọnwụ ka mma.” (Luk 10:30) N’ụzọ dị ịrịba ama, Jizọs ji ụzọ ‘si Jeruselem gaa Jeriko’ mee ka isi ihe ọ na-ekwu pụta ìhè. Mgbe ọ na-atụ ilu a, ọ nọ na Judia, bụ́ ebe na-adịghị anya site na Jeruselem; n’ihi ya, o yiri ka ndị na-ege ya ntị ha maara ụzọ ọ na-ekwu banyere ya. A ma ụzọ ahụ ama dị ka ụzọ dị ize ndụ, karịsịa nye onye na-aga ya nanị ya. Ọ gbagọrọ agbagọ nke ukwuu ma dịrị n’ịkpa, na-eme ka ndị na-apụnara mmadụ ihe nwee ọtụtụ ebe ha pụrụ izo.

15. Gịnị mere na ọ dịghị onye pụrụ izi ezi n’ịgọpụrụ enweghị mmasị nke onye nchụàjà na onye Livaị ahụ a kọrọ n’ihe atụ metụtara onye Sameria bụ́ ezi onye agbata obi?

15 Ọ dị ihe ọzọ kwesịrị ka a rịba ya ama banyere aka Jizọs zoro n’ụzọ ahụ si ‘Jeruselem gbadaa Jeriko.’ Dị ka e kwuru n’akụkọ ahụ, onye nchụàjà bu ụzọ gafere, e mesịakwa onye Livaị esikwa n’ụzọ ahụ gafee—ọ bụ ezie na ọ dịghị onye n’ime ha kwụsịrị iji nyere onye ahụ e merụrụ ahụ́ aka. (Luk 10:31, 32) Ndị nchụàjà jere ozi n’ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem, ndị Livaị nyekwaara ha aka. Ọtụtụ ndị nchụàjà na ndị Livaị na-ebi na Jeriko mgbe ha na-adịghị arụ ọrụ n’ụlọ nsọ, n’ihi na Jeriko dị nanị kilomita 23 site na Jeruselem. N’ihi ya, ihe ịrụ ụka adịghị ya na o nwere mgbe ha na-esi n’ụzọ ahụ agafe. Rịbakwa ama na onye nchụàjà ahụ na onye Livaị ahụ “si Jeruselem” na-aga n’ụzọ ahụ, si otú ahụ na-apụ n’ụlọ nsọ ahụ. * N’ihi ya, ọ dịghị onye pụrụ izi ezi n’ịgọpụrụ enweghị mmasị a ndị ikom ahụ gosipụtara site n’ịsị, ‘Ha zeere nwoke ahụ e merụrụ ahụ́ n’ihi na o yiri onye nwụrụ anwụ, imetụ ozu aka gaara emewo ka ha ghara ikwesị ekwesị ije ozi n’ụlọ nsọ ruo nwa oge.’ (Levitikọs 21:1; Ọnụ Ọgụgụ 19:11, 16) Ọ̀ bụ na o doghị anya na ilu Jizọs gosipụtara ihe ndị na-ege ya ntị maara nke ọma?

Ihe Atụ Ndị E Si n’Ihe Ndị E Kere Eke Nweta

16. N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị bụrụ ihe ijuanya na Jizọs maara ihe e kere eke nke ọma?

16 Ọtụtụ n’ime ihe atụ na ilu Jizọs na-ekpughe otú o si mara ihe ọkụkụ, ụmụ anụmanụ, na ihe ndị dị n’ígwé. (Matiu 6:26, 28-30; 16:2, 3) Ebee ka o si nweta ihe ọmụma dị otú ahụ? Mgbe ọ na-etolite na Galili, ihe ịrụ ụka adịghị ya na o nwere ohere buru ibu ikiri ihe ndị Jehova kere. Nke ka nke ahụ, Jizọs bụ “onye e buru ụzọ mụọ n’ime ihe nile e kere eke,” Jehova jikwa ya mee ihe dị ka “onye ọkà” n’ike ihe nile. (Ndị Kọlọsi 1:15, 16; Ilu 8:30, 31) Ọ̀ bụ ihe ijuanya na Jizọs maara ihe e kere eke nke ọma? Ka anyị hụ otú o si jiri ihe ọmụma a mee ihe n’ụzọ bụ́ ịgba n’ozizi ya.

17, 18. (a) Olee otú okwu Jizọs nke e dekọrọ na Jọn isi 10 si egosi na ọ maara àgwà atụrụ na-akpa? (b) Gịnị ka ndị gara nleta n’ala ndị a kpọtụrụ aha na Bible chọpụtaworo banyere nkekọ na-adị n’etiti ndị ọzụzụ atụrụ na atụrụ ha?

17 Ihe atụ ahụ e dekọrọ na Jọn isi 10, bụ́ ebe Jizọs ji mmekọrịta chiri anya nke dị n’etiti ya na ụmụazụ ya tụnyere nke dị n’etiti onye ọzụzụ atụrụ na atụrụ ya, so n’ihe atụ ndị kasị emetụ n’ahụ́ o ji mee ihe. Okwu Jizọs na-ekpughe na ọ maara àgwà atụrụ ụlọ na-akpa nke ọma. O gosiri na atụrụ na-ekwe ka e duo ha nakwa na ha na-eso onye na-azụ ha n’agbaghị isi akwara. (Jọn 10:2-4) Ndị nleta gara n’ala ndị a kpọtụrụ aha na Bible achọpụtawo nkekọ pụrụ iche dị n’etiti ndị ọzụzụ atụrụ na atụrụ ha. Na narị afọ nke 19, ọkà mmụta ihe ndị si n’okike bụ́ H. B. Tristram kwuru, sị: “N’otu oge, ekiriri m ka onye ọzụzụ atụrụ na ìgwè atụrụ ya na-egwuri egwu. O mere ka a ga-asị na ọ na-achọ ịgbalaga; ìgwè atụrụ ahụ chụsoro ya ma gbaa ya gburugburu. . . . N’ikpeazụ, ìgwè atụrụ ahụ gbara okirikiri, na-amali elu gburugburu ya.”

18 Gịnị mere atụrụ ji eso onye na-azụ ha? Ọ bụ “n’ihi na ha maara olu ya,” ka Jizọs kwuru. (Jọn 10:4) Atụrụ hà maara olu onye na-azụ ha n’ezie? Site ná nchọpụta o ji aka ya mee, George A. Smith dere n’akwụkwọ ya bụ́ The Historical Geography of the Holy Land, sị: “N’oge ụfọdụ, anyị na-ezu ike ehihie n’akụkụ otu n’ime olulu mmiri ndị dị na Judia, bụ́ ebe ndị ọzụzụ atụrụ atọ ma ọ bụ anọ na-akpọrọ ìgwè atụrụ ha abịa. Ìgwè atụrụ ndị ahụ na-agwakọta ọnụ, anyị na-adị echekwa otú nke ọ bụla n’ime ndị ọzụzụ atụrụ ahụ ga-esi mara ndị bụ́ nke ya ọzọ. Mgbe ha nyesịrị ha mmiri ma gwurichaa egwuregwu, ndị ọzụzụ atụrụ ahụ n’otu n’otu na-eche ihu n’akụkụ dị iche na ndagwurugwu ahụ, onye nke ọ bụla na-akpọkwa ụdị òkù e ji mara ya; atụrụ nke onye nke ọ bụla na-esikwa n’ìgwè atụrụ ahụ pụọ sowe onye na-azụ ha, ìgwè atụrụ ahụ na-apụkwa n’usoro otú ha si bịa.” Ọ pụrụ isiworo Jizọs ike ịchọta ụzọ ọzọ ka mma ọ ga-esi mee ka a ghọta isi ihe ọ na-ekwu. Ọ bụrụ na anyị na-aghọta ma na-erube isi n’ozizi ya, ọ bụrụkwa na anyị na-agbaso idu ndú ya, mgbe ahụ, anyị pụrụ isonye ná ndị “onye ọzụzụ atụrụ ọma” ahụ ji ịhụnanya na ọmịiko na-elekọta.—Jọn 10:11.

Ihe Atụ Ndị E Si n’Ihe Omume Ndị Na-ege Ya Ntị Maara Nweta

19. Iji gbaghaa otu nkwenkwe ụgha, olee otú Jizọs si jiri ọdachi mere n’ógbè ahụ mee ihe n’ụzọ dị irè?

19 Ihe atụ dị irè pụrụ ịdị n’ụdị nke ahụmahụ ma ọ bụ ihe atụ nkịtị bụ́ ndị a pụrụ ịmụta ihe na ha. N’otu oge, Jizọs ji ihe mere n’oge na-adịghị anya mgbe ahụ mee ihe iji gbaghaa echiche ụgha bụ́ na ọdachi na-adakwasị ndị metara ihe ọdachi. O kwuru, sị: “Mmadụ iri na asatọ ahụ ndị ụlọ elu dị na Silom dakwasịrị, wee gbuo ha, ùnu chere na ha bụ ndị ji ụgwọ [ndị mmehie] karịa ndị ọzọ nile bi na Jeruselem?” (Luk 13:4) Jizọs rụrụ ụka n’ụzọ bụ́ ịgba megide nkwenkwe akara aka. Mkpụrụ obi 18 ahụ alaghị n’iyi n’ihi mmehie ụfọdụ nke mere ka Chineke wesa ha iwe. Kama nke ahụ, ọnwụ ike ha nwụrụ bụ n’ihi mgbe na ihe ndapụta. (Eklisiastis 9:11) N’ụzọ dị otú a, ọ gbaghara ozizi ụgha site n’izo aka n’ihe omume ndị na-ege ya ntị maara nke ọma.

20, 21. (a) N’ihi gịnị ka ndị Farisii ji katọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs? (b) Ihe ndekọ dị aṅaa dị n’Akwụkwọ Nsọ ka Jizọs ji gosi na ọ dịghị mgbe Jehova zubere ka a na-agbaso iwu Ụbọchị Izu Ike n’ụzọ gabigara ókè? (ch) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

20 N’ozizi ya, Jizọs jikwa ihe atụ ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ mee ihe. Cheta oge ndị Farisii katọrọ ndị na-eso ụzọ ya maka ịghọrọ ọka na ịta ya n’Ụbọchị Izu Ike. N’ezie, ndị ahụ na-eso ụzọ dara, ọ bụghị Iwu Chineke, kama nkọwa siri ike ndị Farisii nyere banyere ihe ndị bụ́ ọrụ megidere iwu n’Ụbọchị Izu Ike. Iji gosi na ọ dịghị mgbe Chineke zubere ka a na-agbasochi iwu Ụbọchị Izu Ike anya n’ụzọ na-enweghị isi otú ahụ, Jizọs zoro aka n’ihe e dekọrọ na 1 Samuel 21:3-6. Mgbe agụụ gụrụ ha, Devid na ndị ikom ya kwụsịrị n’ụlọikwuu ma taa achịcha nsọ, bụ́ nke e dochiworo. Dị ka o kwesịrị, ọ bụ ndị nchụàjà ka a na-edebere achịcha ochie ahụ. Ma, n’ọnọdụ ahụ, a katọghị Devid na ndị ikom ya maka ịta ha. N’ụzọ dị ịrịba ama, ihe ndekọ ahụ bụ nanị ihe atụ e dekọrọ edekọ na Bible banyere ndị na-abụghị ndị nchụàjà ịta achịcha ochie ahụ. Jizọs maara kpọmkwem ihe ndekọ kwesịrị ekwesị ọ ga-eji mee ihe, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na ndị Juu gere ya ntị maara banyere ya.—Matiu 12:1-8.

21 N’ezie, Jizọs bụ Onye Ozizi Bụ́ Ọkà! Ikike o nwere ime ka a mara eziokwu dị mkpa n’ụzọ ga-eru ndị na-ege ya ntị n’obi na-eju anyị anya n’ezie. Otú ọ dị, olee otú anyị pụrụ isi ṅomie ya n’ozizi anyị? A ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Ihe atụ Jizọs dị n’ụdị dị iche iche, gụnyere ihe atụ nkịtị, ihe ntụnyere, ihe yiri ihe, na ihe bụ́ ihe. A maara ya nke ọma maka iji ilu na-eme ihe, bụ́ nke a kọwaworo dị ka “akụkọ dị mkpirikpi a na-echepụtakarị echepụta bụ́ nke e si na ya amụta eziokwu nke omume ma ọ bụ nke ime mmụọ.”

^ par. 15 Ebe Jeruselem dị dị elu karịa ebe Jeriko dị. N’ihi ya, onye njem ‘na-esi Jeruselem agbada Jeriko,’ dị ka e kwuru n’ilu ahụ.

Ị̀ Na-echeta?

• N’ihi gịnị ka Jizọs ji jiri ilu kụzie ihe?

• Olee ihe atụ na-egosi na Jizọs ji ihe atụ ndị gere ya ntị na narị afọ mbụ pụrụ ịghọta mee ihe?

• Olee otú Jizọs si jiri ihe ọmụma o nwere banyere ihe e kere eke mee ihe n’ụzọ dị irè n’ihe atụ ya?

• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jizọs si jiri ihe omume ndị na-ege ya ntị maara mee ihe?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Jizọs kọrọ banyere ohu nke jụrụ ịgbaghara onye ji ya obere ego na nna nke gbaghaara nwa ya nwoke nke rikpọrọ ihe nketa ya dum

[Foto dị na peeji nke 16]

Gịnị ka Jizọs na-eme ka ọ pụta ìhè n’ilu ya banyere onye Sameria bụ́ ezi onye agbata obi?

[Foto dị na peeji nke 17]

Atụrụ hà maara n’ezie olu onye na-azụ ha?