Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Agaghị M Agbanwe Ihe Ọ Bụla!”

“Agaghị M Agbanwe Ihe Ọ Bụla!”

Akụkọ Ndụ

“Agaghị M Agbanwe Ihe Ọ Bụla!”

DỊ KA GLADYS ALLEN SI KỌỌ

A na-ajụ m mgbe ụfọdụ, sị, “Ọ bụrụ na a sị gị maliteghachi ndụ gị n’isi, gịnị ka ị ga-agbanwe?” N’eziokwu, apụrụ m ịza, sị, “Agaghị m agbanwe ihe ọ bụla!” Ka m kọwaa ihe mere m ji chee otú ahụ.

N’OGE okpomọkụ nke 1929, bụ́ mgbe m dị afọ abụọ, otu ihe dị ebube mere nna m, bụ́ Matthew Allen. O nwetara akwụkwọ nta bụ́ Millions Now Living Will Never Die!, bụ́ nke Ndị Mmụta Bible nke Mba Nile, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova mgbe ahụ, bipụtara. Mgbe papa m gụsịrị nanị peeji ole na ole, o tiri mkpu, sị, “Nke a bụ ihe kasị mma m gụtụrụla!”

Nwa oge ka nke ahụ gasịrị, papa m nwetara akwụkwọ ndị ọzọ nke Ndị Mmụta Bible. O gbughị oge isoro ndị agbata obi anyị nile na-ekerịta ihe ọ na-amụta. Otú ọ dị, e nweghị ọgbakọ Ndịàmà Jehova n’ime obodo anyị. N’ịghọta mkpa ọ dị iso Ndị Kraịst na-akpachi anya, papa m kpọọrọ ezinụlọ anyị kwaga Orangeville, Ontario, Canada na 1935 n’ihi na e nwere ọgbakọ n’ebe ahụ.

N’oge ndị ahụ, a dịghị agbacha ụmụaka ume ịga nzukọ ọgbakọ; ha na-anọkarị n’èzí ebe a na-anọ enwe nzukọ ma na-egwuri egwu ruo mgbe ndị toworo eto gbasara. Nke a amasịghị papa m. O chere, sị, “Ọ bụrụ na nzukọ ndị a dị mma nye m, ha dịkwa mma nye ụmụ m.” N’ihi ya, n’agbanyeghị na papa m bụ onye ọhụrụ, o nyere mụ, nwanne m nwoke bụ́ Bob, na ụmụnne m ndị nwanyị bụ́ Ella na Ruby ntụziaka ka anyị na-esonyere ndị toworo eto ná nzukọ, anyị mekwara otú ahụ. N’oge na-adịghị anya, ụmụ nke Ndịàmà ndị ọzọ malitekwara ịga. Ịga nzukọ na ịza ajụjụ ghọrọ akụkụ dị oké mkpa nke ndụ anyị.

Papa m nwere mmasị na Bible, o nwekwara ụzọ na-atọ ụtọ o si eme ihe ngosi nke akụkọ ndị dị na Bible. Site n’ụzọ ndị dị otú a, ọ kụnyere ihe ọmụma ndị dị oké mkpa n’obi anyị bụ́ ndị m na-eji obi ụtọ dị ukwuu echeta. Otu nke m na-echeta bụ na Jehova na-agọzi ndị na-erubere ya isi.

Papa m kụzikwaara anyị iji Bible na-agọpụrụ okwukwe anyị. Anyị na-adị eji ya eme egwuregwu. Papa m pụrụ ikwu, sị, “Ekweere m na mgbe m nwụrụ, aga m aga eluigwe. Ngwa, unu gosi m na m gaghị aga.” Mụ na Ruby ga-enyocha ndepụta okwu iji chọta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị anyị pụrụ iji gosi na ozizi ahụ abụghị eziokwu. Mgbe anyị gụsịrị akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị anyị chọtara, papa m na-asị, “Nke ahụ dị mma, ma ekwenyebeghị m.” N’ihi ya, anyị na-agaghachi ná ndepụta okwu ahụ. Anyị na-emekarị nke a ruo ọtụtụ awa ruo mgbe papa m nwere afọ ojuju n’azịza ndị anyị nyere ya. N’ihi ya, mụ na Ruby bịara dịrị njikere nke ọma ịkọwa ihe ndị anyị kweere na ịgọpụrụ okwukwe anyị.

Imeri Egwu Mmadụ

N’agbanyeghị ọzụzụ mara mma m nwetara n’ụlọ na ná nzukọ ọgbakọ, aghaghị m ikweta na e nwere akụkụ ụfọdụ nke ịbụ Onye Kraịst ndị bụụrụ m ihe ịma aka. Dị ka ọ na-adị ọtụtụ ndị na-eto eto, ọ naghị amasị m ịgbapụ iche n’ebe ndị ọzọ nọ, karịsịa n’ebe ụmụ klas m nọ. Ihe mbụ lere okwukwe m ule bụ ihe anyị kpọrọ ngagharị mgbasa ozi.

Nzube ya bụ ka otu ìgwè nke ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị buru kaadị ndị e dere ihe na ha ma jiri nwayọọ nwayọọ na-agagharị n’okporo ámá ndị bụ́ isi dị n’obodo. Onye ọ bụla maara ibe ya n’obodo anyị nke ihe dị ka mmadụ 3,000 bi na ya. N’otu ngagharị mgbasa ozi nke anyị mere, anọ m n’azụ azụ na-ebu kaadị e dere “Okpukpe Bụ Ọnyà na Ihe Aghụghọ” na ya. Ụfọdụ ụmụ klas m hụrụ m, ha egbughịkwa oge ọ bụla ịbịa kwụrụ m n’azụ, na-abụ abụ, sị, “Chineke Zọpụta Eze.” Olee otú m si nagide nke a? Ekpesiri m ekpere ike maka ume iji nọgide na-aga n’ihu. Mgbe ngagharị ahụ mesịrị bịa ná njedebe, eji m ọsọ gbaga n’Ụlọ Nzukọ Alaeze idebe kaadị m ma lawa. Otú ọ dị, onye na-ahụ maka ya gwara m na a na-aga ịmalite ngagharị ọzọ nakwa na ha chọkwuru otu onye iburu otu kaadị. N’ihi ya, m gara ọzọ, na-ekpesi ekpere ike karịa ka m kpetụworo. Otú ọ dị, ka ọ dị ugbu a, ike agwụla ụmụ klas m, ha alawokwa n’ụlọ ha. Kama ikpewa ekpere maka ume, ekpere m ghọrọziri nke inye ekele!—Ilu 3:5.

Anyị na-anabata ndị ozi oge nile n’ụlọ anyị mgbe nile. Ha bụ ìgwè ndị nwere obi ụtọ, ọ na-enyekwa ọṅụ ile ha ọbịa. Laa azụ ruo oge m pụrụ icheta, nne na nna anyị na-agwa anyị bụ́ ụmụ ha mgbe nile na ozi oge nile bụ ọrụ kasị mma anyị pụrụ ịrụ.

N’ime ihe ha gbara m ume ya, na 1945, amalitere m ọrụ m dị ka onye ozi oge nile. Emesịrị m sonyere nwanne m nwanyị bụ́ Ella, bụ́ onye na-asụ ụzọ na London, Ontario. N’ebe ahụ, e mere ka m mata banyere otu akụkụ nke ozi a nke m chere na m gaghị ejeli ma ọlị. Ụmụnna na-adị aga site na tebụl ruo na tebụl n’ụlọ mmanya ndị dị n’ógbè ahụ na-enye ndị na-aṅụ mmanya Ụlọ Nche na Consolation (nke a na-akpọ Teta! ugbu a). N’ụzọ dabara adaba, a na-arụ ọrụ ahụ n’ehihie Saturday, n’ihi ya, enwere m otu izu zuru ezu iji kpee ekpere maka obi ike iji na-aga! Mba, ọrụ ahụ adịghịrị m mfe, ma ọ na-akwụghachi ụgwọ.

N’aka nke ọzọ, amụtakwara m otú e si enyefe mbipụta Consolation ndị pụrụ iche bụ́ ndị kwuru banyere mkpagbu a kpagburu ụmụnna anyị n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche nke ndị Nazi, karịsịa ịkpọtụrụ ndị ọchụnta ego a na-akwanyere ùgwù na Canada, gụnyere ndị isi nke nnukwu ụlọ ọrụ dị iche iche. N’afọ ndị gafeworonụ, achọpụtawo m na Jehova na-akwado anyị mgbe nile ma ọ bụrụhaala na anyị adabere n’ebe ọ nọ maka ume. Dị ka papa m na-adị ekwu, Jehova na-agọzi ndị na-erubere Ya isi.

Ịza Òkù Ịga Jee Ozi na Quebec

Na July 4, 1940, a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu na Canada. Ka e mesịrị, e wepụrụ mmachibido iwu ahụ, ma a ka na-akpagbu anyị n’ógbè ndị Roman Katọlik juru bụ́ Quebec. E mere mkpọsa pụrụ iche nke e ji traktị e dere okwu ndị siri ike na ya bụ́ Quebec’s Burning Hate for God and Christ and Freedom Is the Shame of All Canada (Oké Asị Quebec Kpọrọ Chineke na Kraịst na Nnwere Onwe Bụụrụ Ndị Canada Nile Ihe Ihere) mee ihe iji dọrọ uche gaa ná mmeso ọjọọ a na-emeso ụmụnna anyị n’ebe ahụ. Nathan H. Knorr, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, sooro ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ nọ n’obodo Montreal zukọọ iji kọwaa ihe pụrụ isi n’ihe anyị na-aga ime pụta. Nwanna Knorr gwara anyị na ọ bụrụ na anyị ekwere ikere òkè ná mkpọsa ahụ, anyị pụrụ ịtụ anya ịbụ ndị a ga-ejide ma tụba n’ụlọ nga. Lee ka nke ahụ si bụrụ eziokwu! Ka oge na-aga, e jidere m ugboro 15. Mgbe anyị na-aga ozi ubi, anyị na-ahụ na anyị ji brọsh e ji asa ezé na mbọ́, a dịghị ama ama ọ bụrụ na anyị ehie n’ụlọ nga.

Na mbụ, anyị na-arụ ihe ka ukwuu n’ọrụ anyị n’abalị ka ndị mmadụ ghara ịhụcha anyị ruo n’ókè o kwere mee. Ana m eburukwu traktị nke m na-etinye n’akpa m na-anya n’olu m bụ́ nke kootu m na-ekpuchi. Akpa ahụ traktị jupụtara n’ime ya na-enupụta nnọọ enupụta, na-eme ka m yie onye dị ime. Nke ahụ na-abara m uru mgbe m banyere bọs ndị mmadụ juru iji gaa n’ókèala m. Ihe karịrị otu ezigbo nwa amadị ebilitewo ọtọ ma nye nwaada “dị ime” oche ya.

Ka oge na-aga, anyị malitere ikere òkè n’ọrụ ikesa akwụkwọ ahụ n’oge ehihie. Anyị na-edebe traktị n’ọnụ ụzọ atọ ma ọ bụ anọ, ma gawazie n’ókèala ọzọ. Nke ahụ rụpụtara ihe dị mma mgbe mgbe. Otú ọ dị, ọ bụrụ na onye ụkọchukwu parish achọpụta na anyị nọ n’ógbè ahụ, anyị pụrụ ịtụwa anya nsogbu. N’otu oge, otu ụkọchukwu kpaliri ìgwè ụmụaka na ndị toworo eto dị mmadụ 50 ma ọ bụ 60 ịtụ anyị tomato na àkwá. Anyị gbabara n’ụlọ nwanna nwanyị Onye Kraịst, bụ́ ebe anyị hiri ụra abalị n’ala ụlọ.

E nwere mkpa dị ukwuu maka ndị ọsụ ụzọ ikwusara ndị na-asụ French bi na Quebec ozi ọma, n’ihi ya na December 1958, mụ na nwanne m nwanyị bụ́ Ruby malitere ịmụ asụsụ French. Mgbe anyị mesịrị nke ahụ, e kenyere anyị ọrụ n’ọtụtụ ebe ndị a na-asụ French n’ógbè ahụ. Ọrụ nke ọ bụla mere ka anyị nwee ahụmahụ pụrụ iche. N’otu ebe, anyị gara site n’ụlọ ruo n’ụlọ ruo awa asatọ kwa ụbọchị ruo afọ abụọ n’enwetaghị onye ọ bụla anyị gwara okwu! Nanị ihe ndị mmadụ na-eme bụ ịbịa n’ọnụ ụzọ ma si n’ebe e tinyere enyo na ya nyopụ anya ma mechie kọtịn ha. Ma anyị adaghị mbà. Taa, e nwere ọgbakọ abụọ na-eme nke ọma n’obodo ahụ.

Jehova Kwagidere M n’Ụzọ Ọ Bụla

Anyị malitere ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche na 1965. N’otu ebe e kenyere anyị ọrụ dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, anyị bịara ghọta nke ọma ihe okwu Pọl e dekọrọ na 1 Timoti 6:8 pụtara: “Ebe anyị nwere ihe oriri na ihe mgbokwasị, anyị ga-enwe afọ ojuju n’ihe ndị a.” Anyị aghaghị ịgbaso atụmatụ mmefu ego siri ike iji na-ahụ maka mmefu anyị. Ya mere, anyị wepụtara ego iche maka ihe na-enye okpomọkụ, ụgwọ ụlọ, ụgwọ ọkụ, na ihe oriri. Mgbe anyị mechara nke ahụ, ihe na-afọdụrụ anyị n’ọnwa na-abụ cent 25 bụ́ nke anyị na-emefu otú masịrị anyị.

Ebe ọ bụ na anyị enweghị ego buru ibu, ego anyị na-emefu maka ihe na-enye okpomọkụ n’ụlọ anyị na-abụ maka nke ga-adịru awa ole na ole n’abalị. N’ihi ya, ọ dịghị mgbe ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ nke ụlọ ihi ụra anyị gafere 15 degree Celsius, ọ na-ajụkwa oyi karịa otú ahụ mgbe mgbe. Ma, otu ụbọchị, nwa nwoke nke otu n’ime ndị Ruby na-amụrụ Bible bịara leta anyị. Ọ ghaghị ịbụ na ọ laruru ụlọ ma gwa mama ya na oyi na-achọ ịtụgbu anyị, n’ihi na ka e mesịrị, mama ya malitere inye anyị dollar iri kwa ọnwa ka anyị wee na-azụrụ mmanụ ka anyị wee nwee ike ịdị na-ahapụ ọkụ anyị n’emenyụghị ya emenyụ. Ọ dịghị anyị ka ọ dị ihe kọrọ anyị n’ụzọ ọ bụla. Anyị abaghị ọgaranya, ma anyị nwere ihe ndị bụ́ isi na-akpa anyị mgbe nile. Ọ dị anyị ka ihe ọ bụla fọdụrụ afọdụ ọ̀ bụ ngọzi. Lee ka okwu dị n’Abụ Ọma 37:25 si bụrụ eziokwu: “Ahụghị m onye ezi omume ka a hapụrụ ya, ahụghịkwa m mkpụrụ ya ka ha na-arịọ nri”!

N’agbanyeghị mmegide anyị chere ihu, enwere m obi ụtọ ịhụ ka ọtụtụ ndị m duziiri ọmụmụ Bible bịara mara eziokwu ahụ. Ụfọdụ weere ozi oge nile dị ka ọrụ ha ná ndụ, bụ́ nke wetaara m ọṅụ pụrụ iche.

Inwe Ihe Ịga nke Ọma n’Iche Ihe Ịma Aka Ndị Ọhụrụ Ihu

Cornwall, Ontario, ghọrọ ebe ọhụrụ e kenyere anyị ọrụ na 1970. Ihe dị ka afọ abụọ anyị kwagasịrị na Cornwall, mama m dara ọrịa. Papa m anwụọlarị na 1957, mụ na ụmụnne m ndị nwanyị abụọ nọkwa na-elekọta mama anyị onye lekọtatụ ibe ya elekọta ruo mgbe ọ nwụrụ na 1972. Ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche anyị na ha na-arụkọ ọrụ bụ́ Ella Lisitza na Ann Kowalenko wusiri anyị ike ma nye anyị nkwado ịhụnanya n’oge a. Ha hụrụ maka ndị anyị na-amụrụ Bible na ibu ọrụ ndị ọzọ n’oge ndị anyị na-anọghị ya. Lee ka ha si bụrụ eziokwu bụ́ okwu ndị dị n’Ilu 18:24: “Ma [enyi] na-ahụ n’anya dị nke na-arapara n’ahụ́ karịa nwanne”!

N’ezie, ndụ m jupụtara n’ihe ịma aka. Site ná nkwado Jehova ji ogwe aka ịhụnanya ya na-enye, enwewo m ike ịnagide ha. Aka m ji ọṅụ na-achụso ụzọ ndụ nke ozi oge nile. Bob, bụ́ onye nwụrụ na 1993, sụrụ ụzọ ihe karịrị afọ 20, bụ́ nke gụnyere afọ 10 dị oké ọnụ ahịa nke ya na nwunye ya sụkọrọ ụzọ. Nwanne m nwanyị nke okenye bụ́ Ella, bụ́ onye nwụrụ n’October 1998, sụrụ ụzọ ruo afọ 30 ma nọgide na-enwe mmụọ ịsụ ụzọ ruo ọnwụ ya. Na 1991, a chọpụtara na nwanne m nwanyị nke ọzọ bụ́ Ruby na-arịa ọrịa cancer. N’agbanyeghị nke ahụ, o ji ume dị nta o nwere kwusaa ozi ọma ahụ. Ọ nọgidekwara na-enwe omume ịkpa ọchị ruo n’ụtụtụ ahụ ọ nwụrụ, bụ́ September 26, 1999. Ọ bụ ezie na ụmụnne m ndị nwanyị anọghịzi, enwere m ezinụlọ ime mmụọ bụ́ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị na-enyere m aka ịnọgide na-enwe omume ịkpa ọchị m.

Mgbe m leghachiri anya azụ ná ndụ m, gịnị ka m ga-agbanwe? Alụghị m di ma ọlị, ma e jiwo nne na nna na-ahụ n’anya, nwanne nwoke, na ụmụnne ndị nwanyị bụ́ ndị butere eziokwu ahụ ụzọ ná ndụ ha gọzie m. Ana m atụ anya ịhụ ha nile n’isi nso ná mbilite n’ọnwụ. Apụrụ m iji anya nke uche ugbu a na-ahụ papa m ka ọ na-amakụ m ma hụkwa anya mmiri nke mama m ka anyị na-amakụ onwe anyị n’ụzọ na-ekpo ọkụ. Ella, Ruby, na Bob ga na-awụli elu n’ọṅụ.

Ka ọ dịgodị, achọsiri m ike ịnọgide jiri ahụ́ ike na ume fọdụụrụ m na-eto ma na-asọpụrụ Jehova. Ozi ọsụ ụzọ oge nile bụ ụzọ ndụ dị ebube nke na-akwụghachi ụgwọ. Ọ dị ọbụna otú ode abụ ahụ kwuru na ọ na-adịrị ndị na-eje ije n’ụzọ Jehova: “Onye ihe na-agara nke ọma ka ị bụ, ọ ga-adịkwara gị mma.”—Abụ Ọma 128:1, 2.

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Papa m nwere mmasị na Bible. Ọ kụziiri anyị iji ya na-agọpụrụ okwukwe anyị

[Foto dị na peeji nke 28]

Site n’aka ekpe gaa n’aka nri: Ruby, mụ, Bob, Ella, mama m, na papa m na 1947

[Foto dị na peeji nke 28]

Ahịrị nke ihu, site n’aka ekpe gaa n’aka nri: Mụ, Ruby, na Ella n’otu Mgbakọ Distrikti, 1998