Ebee Ka Ndị Agbata Obi Nile Ọ Bụ Gara?
Ebee Ka Ndị Agbata Obi Nile Ọ Bụ Gara?
“Ọha mmadụ nke oge a amaghị banyere ịbụ onye agbata obi.”—Benjamin Disraeli, bụ́ onye England ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị na narị afọ nke 19.
NDỊ Cuba mere agadi nwere ụzọ pụrụ iche ha si akwalite ahụ́ ike: njikọ nke ndị agbata obi, ma ọ bụ círculos de abuelos (òtù ndị nne nne na ndị nna nna), dị ka ha na-akpọ ha. Dị ka otu akụkọ kwuru na 1997, ihe dị ka 1 onye n’ime ndị Cuba 5 meworo agadi so n’òtù ndị dị otú ahụ, bụ́ ebe ha na-achọta mkpakọrịta, nkwado, na enyemaka dị irè bụ́ ndị na-eme ka ha nọgide na-ebi ndụ dị mma. “Mgbe ọ bụla ndị dọkịta ezinụlọ ndị ha na ha gbara agbata obi chọrọ ndị ga-enye aka ịkpọsa atụmatụ ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa,” ka magazin bụ́ World-Health na-ekwu, “ọ bụ na círculos de abuelos ka ha na-achọta ndị dị njikere ma nwee ike ime ya.”
Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa, e nweghịzi ndị agbata obi dị otú ahụ na-ahụ n’anya n’ógbè dị iche iche. Dị ka ihe atụ, tụlee otu ihe atụ dị oké njọ metụtara Wolfgang Dircks, bụ́ onye bi n’otu ụlọ nwere ọtụtụ ọnụ ụlọ nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ Europe. Afọ ụfọdụ gara aga, akwụkwọ akụkọ bụ́ The Canberra Times kọrọ na ọ bụ ezie na ezinụlọ 17 ha na Wolfgang bi n’otu ụlọ ahụ nwere ọtụtụ ọnụ ụlọ adịghị ahụ ya, “ọ dịghị onye o metụrụ n’uche ịpị mgbịrịgba ụzọ ya.” Mgbe onye nwe ụlọ ahụ mesịrị bịa, “ọ hụrụ ọkpụkpụ nọ ọdụ n’ihu telivishọn.” Ihe dị n’apata ụkwụ nke ọkpụkpụ ahụ bụ ndepụta nke usoro ihe omume telivishọn nke nwere akara ụbọchị bụ́ December 5, 1993. O ruola afọ ise Wolfgang nwụrụ. Lee ihe àmà dị mwute nke a bụ banyere ndakpọ mmasị na ịhụnanya na-adakpọ n’etiti ndị agbata obi! Ka a sịkwa ihe mere otu onye edemede ji kwuo na The New York Times Magazine na ógbè o bi na ya, dịkwa ka ọtụtụ ógbè ndị ọzọ, aghọwo “ógbè nke ndị bi na ya bụcha ndị ọbịa.” Ọ̀ bụ otú a ka ọ dịkwa n’agbata obi gị?
Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ime ime obodo ka na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị nwere ezigbo ndị agbata obi nakwa na ụfọdụ ógbè ndị mepere emepe na-agbalịsi ike ịdị na-enwekwu nchegbu maka ndị agbata obi ha. Otú o sina dị, ọtụtụ ndị bi n’obodo ukwu na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị owu na-ama na ndị nọ n’ihe ize ndụ n’agbata obi ha. Owu na-amagbu ha n’ihi ịbụ ndị na-amaghị ibe ha. N’ụzọ dị aṅaa?
Ndị Na-amaghị Ibe Ha
N’ezie, ọtụtụ n’ime anyị nwere ndị agbata obi bi anyị nso. Ìhè ọkụ telivishọn, onyinyo ndị a na-ahụ na windo, ọkụ ndị a na-agbanye ma na-agbanyụ, ụda nke ụgbọala ndị na-abata abata na ndị na-apụ apụ, ụda ụkwụ ndị a na-anụ na paseeji, ụda mkpịsị ugodi ndị e ji akpọchi ma ọ bụ na-akpọghe ụzọ, bụcha ihe àmà na-egosi na agbata obi dị “ndụ.” Otú ọ dị, ezi mmetụta nke inwe ndị agbata obi na-apụ n’anya mgbe ndị bi nso ghọrọ ndị na-amaghị ibe ha ma ọ bụ ndị na-eleghara ibe ha anya ka ha nọ na-agbagharị n’ihi ndụ jupụtara n’ihe omume. Ndị mmadụ pụrụ iche na ọ dịghị mkpa iso ndị agbata obi na-emekọ ihe ma ọ bụ jiri ụgwọ imere ha ihe n’ụzọ ọ bụla. Akwụkwọ akụkọ Australia, bụ́ Herald Sun, na-ekweta, sị: “Ndị mmadụ n’otu n’otu na-abụkarị ndị a na-amaghị ndị ha bụ kpọmkwem na gburugburu ebe obibi ha, n’ihi ya kwa, bụrụ ndị na-echeghị na ha nwere ibu ọrụ n’ebe ndị ọzọ nọ. Ọ dị mfe ugbu a ileghara ndị na-enweghị àgwà nke iso ndị ọzọ na-emekọrịta ihe anya ma ọ bụ ịgụpụ ha.”
Ihe a na-emenụ abụghị ihe ijuanya. N’ụwa ebe ndị mmadụ bụ “ndị hụrụ onwe ha n’anya,” agbata obi na-aghọrọ mkpụrụ ọjọọ sitere ná ndụ iche nanị banyere onwe onye nke ọtụtụ ndị na-ebi. (2 Timoti 3:2) Ihe siworo na ya pụta bụ owu ọmụma na nkewa juru ebe nile. Nkewa na-eme ka ndị mmadụ ghara ịtụkwasị ibe ha obi, karịsịa mgbe ime ihe ike na mpụ nọgidere na-eme ka agbata obi dịrị ize ndụ. N’aka nke ya, ndị mmadụ atụkwasịghị ibe ha obi na-eme ka ha ghara inwerịta ọmịiko.
N’agbanyeghị ọnọdụ e nwere n’agbata obi gị, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-ekweta na ezi ndị agbata obi na-aba uru n’obodo. A na-arụzu ihe dị ukwuu mgbe ndị mmadụ na-arụ ọrụ iji ruo otu ihe mgbaru ọsọ. Ezi ndị agbata obi pụkwara ịbụ ngọzi. Isiokwu na-esonụ ga-egosi otú nke a pụrụ isi mee.