“Na-agbaghara Ibe Unu Kpam Kpam”
“Na-agbaghara Ibe Unu Kpam Kpam”
ÌKWEERE na Chineke agbagharawo gị mmehie gị? Na United States, o yiri ka ọtụtụ ndị toruworo ogo mmadụ ha kweere. Dr. Loren Toussaint, bụ́ onye mbụ bipụtara otu nnyocha n’Ụlọ Akwụkwọ Na-ahụ Maka Nnyocha Mmekọrịta Mmadụ na Ibe Ya nke Mahadum nke Michigan, na-akọ na n’ime ndị America 1,423 a gbara ajụjụ ọnụ, ihe dị ka pasent 80 nke ndị karịworo afọ 45 kwuru na Chineke agbagharawo ha mmehie ha.
Otú ọ dị, ọ na-akpali mmasị na ọ bụ nanị pasent 57 nke ndị a gbara ajụjụ kwuru na ha agbagharawo ndị ọzọ. Ndekọ ọnụ ọgụgụ ahụ na-echetara anyị okwu Jizọs kwuru n’Ozizi Elu Ugwu ahụ: “Ọ bụrụ na unu na-agbaghara ndị mmadụ njehie ha, Nna unu nke eluigwe ga-agbagharakwa unu; ma ọ bụrụ na unu adịghị agbaghara ndị mmadụ njehie ha, Nna unu agaghịkwa agbaghara unu njehie unu.” (Matiu 6:14, 15) Ee, Chineke ịgbaghara anyị mmehie anyị nwere ihe ọ na-adabere na ya, n’otu akụkụ, n’ịdị njikere anyị ịgbaghara ndị ọzọ.
Pọl onyeozi chetaara Ndị Kraịst nọ na Kọlọsi ụkpụrụ a. Ọ gbara ha ume, sị: “Nọgidenụ na-anagiderịta ibe unu ma na-agbaghara ibe unu kpam kpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya. Ọbụna dị ka Jehova gbaghaara unu kpam kpam, na-emekwanụ otú ahụ.” (Ndị Kọlọsi 3:13) N’eziokwu, nke a anaghị adịcha mfe. Dị ka ihe atụ, mgbe a gwara anyị okwu ọjọọ ma ọ bụ okwu a na-echeghị echiche kwuo, ọ na-esi ike ịgbaghara onye kwuru ya.
Otú ọ dị, uru na-adị n’ịgbaghara mmadụ dị ọtụtụ. Dr. David R. Williams, bụ́ ọkà ná mmụta mmekọrịta ọha na eze, kwuru banyere nnyocha o mere, sị: “Anyị na-ahụ njikọ chiri nnọọ anya dị n’etiti ịgbaghara ndị ọzọ mmehie na ahụ́ ike nke uche nke ndị America katatụrụ ahụ́ na ndị meworo agadi.” Nke ahụ kwekọrọ n’okwu nke Eze Solomọn maara ihe, bụ́ onye dere ihe dị ka afọ 3,000 gara aga, sị: “Ndụ nke anụ ahụ́ ka obi a gwọrọ ọrịa ya bụ.” (Ilu 14:30) Ebe ọ bụ na mmụọ mgbaghara na-akwalite ezi mmekọrịta n’ebe anyị na Chineke na ndị agbata obi anyị nọ, anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji na-adị njikere ịgbaghara ibe anyị site n’obi.—Matiu 18:35.