Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-ele Ọnwụnwa Anya?

Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-ele Ọnwụnwa Anya?

Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-ele Ọnwụnwa Anya?

ULE! Ọnwụnwa! Onye ọ bụla aghaghị iche ha ihu. Ihe ndị pụrụ ịkpata ha bụ ndịrịta iche n’ọdịdị mmadụ, ihe isi ike akụ̀ na ụba, nsogbu ahụ́ ike, nrụgide sitere n’aka ndị ọgbọ ime ihe na-ezighị ezi, mkpagbu, ihe ịma aka megide nguzo anyị n’ihe banyere nnọpụiche ma ọ bụ ikpere arụsị, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. N’agbanyeghị otú ọnwụnwa dị iche iche si bịa, ha na-akpatakarị nchegbu. Olee otú anyị pụrụ isi nwee ihe ịga nke ọma n’ịnagide ha? Ọ̀ dị ụzọ ọ bụla ha si abara anyị uru?

Nkwado Kasị Mma

Eze Devid nke oge ochie biri ndụ nke jupụtara n’ọnwụnwa, n’agbanyeghị nke ahụ ọ nwụrụ n’ikwesị ntụkwasị obi. Olee otú o si nwee ike ịtachi obi? O kwuru ebe o si nweta ike mgbe ọ sịrị: “Jehova bụ onye na-azụ m dị ka atụrụ; ọ dịghị ihe kọrọ m.” Ọ gaziri n’ihu ikwu, sị: “A sị na ejee m ije na ndagwurugwu onyinyo ọnwụ, m gaghị atụ egwu ihe ọjọọ ọ bụla; n’ihi na Gị onwe gị nọnyeere m: ndele Gị na mkpanaka Gị, ha onwe ha na-akasi m obi.” (Abụ Ọma 23:1, 4) Ee, Jehova bụ isi iyi nke nkwado na-enweghị nsọtụ. Ọ zụrụ Devid dị ka atụrụ n’oge ụfọdụ ihe siiri ya nnọọ ike, ọ dịkwa njikere imere anyị otu ihe ahụ mgbe ọ dị mkpa.

Olee otú anyị pụrụ isi nweta nkwado Jehova? Bible na-agwa anyị otú anyị pụrụ isi nweta ya mgbe ọ na-asị: “Detụnụ ire, hụ na Jehova dị mma.” (Abụ Ọma 34:8) Nke ahụ bụ ọkpụkpọ òkù na-ekpo ọkụ, ma gịnị ka ọ pụtara? Ọ bụ agbamume ka anyị na-ejere Jehova ozi ma na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ nnọọ n’uche ya. Ụzọ ndụ dị otú ahụ pụtara ịhapụ nnwere onwe anyị ụfọdụ, ịchụ ihe n’àjà. N’ọnọdụ ụfọdụ, ọ pụrụ ọbụna iduga n’ọnwụnwa—mkpagbu na nhụjuanya. Ma, ọ dịghị ndị ji obi ha dum nakwere ọkpụkpọ òkù Jehova mkpa ịkwa ụta ma ọlị n’ihi ime otú ahụ. Jehova ga-egosi ha obiọma. Ọ ga-eduzi ha ma lekọta ha n’ụzọ ime mmụọ. Ọ ga-eji Okwu ya, mmụọ nsọ ya, na ọgbakọ Ndị Kraịst kwagide ha gabiga ọnwụnwa dị iche iche. Ọ ga-ejikwa ndụ ebighị ebi kwụghachi ha ụgwọ n’ikpeazụ.—Abụ Ọma 23:6; 25:9; Aịsaịa 30:21; Ndị Rom 15:5.

Ndị mere mkpebi ahụ na-agbanwe ndụ bụ́ ijere Jehova ozi ma nọgidesie ike na ya na-achọpụta na Jehova na-emezu nkwa ya nile. Nke ahụ bụ ahụmahụ ụmụ Izrel, bụ́ ndị sooro Jọshụa banye n’Ala Nkwa ahụ, nwere. Ozugbo ha gafesịrị Jọdan, e nwere ọnwụnwa ndị ha ga-atachi obi na ha, agha ndị ha ga-alụ, na ihe ndị ha ga-amụta n’ụzọ siri ike. Ma ọgbọ ahụ gosipụtara na ha kwesịrị ntụkwasị obi karịa ndị nna ha, bụ́ ndị si n’Ijipt pụta ma nwụọ n’ọzara. N’ihi ya, Jehova kwadoro ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, banyekwara ọnọdụ ha n’ọgwụgwụ nke ndụ Jọshụa, ihe ndekọ Bible na-asị: “Jehova wee mee ka ha zuru ike gburugburu, dị ka ihe nile si dị nke Ọ ṅụụrụ ndị bụ́ nna ha iyi . . . Ọ dịghị ihe ọ bụla dapụrụ n’ezi ihe nile nke Jehova gwara ụlọ Izrel; ha nile mere.” (Joshua 21:44, 45) Nke ahụ pụkwara ịbụ ahụmahụ anyị ma ọ bụrụ na anyị adabere kpam kpam n’ebe Jehova nọ n’oge anyị na-eche ọnwụnwa ihu nakwa n’oge ọ bụla ọzọ.

Gịnị pụrụ ibelata obi ike anyị nwere n’ebe Jehova nọ? Jizọs rụtụrụ otu ihe aka mgbe ọ sịrị: “Ọ dịghị onye pụrụ ịbụ ohu nke nna ukwu abụọ . . . Unu apụghị ịbụ ohu Chineke na nke Akụ̀ na Ụba.” (Matiu 6:24) Ọ bụrụ na anyị tụkwasịrị Jehova obi, anyị agaghị achọ isi n’ihe onwunwe nweta nchebe bụ́ ebe ihe ka ọtụtụ ná ndị nọ n’ụwa na-achọ isi nweta ya. Jizọs dụrụ ụmụazụ ya ọdụ, sị: “Ya mere, nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu [ihe onwunwe nile ọzọ a dị mkpa].” (Matiu 6:33) Onye Kraịst nke nwere echiche ziri ezi banyere ihe onwunwe ma na-ebute Alaeze Chineke ụzọ ná ndụ ya na-eme nhọrọ ziri ezi. (Eklisiastis 7:12) N’ezie, ọ pụrụ ifu ya ihe. Ọ pụrụ ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà n’ụzọ ihe onwunwe. Ma, ọ ga-enweta ọtụtụ ụgwọ ọrụ. Jehova ga-akwadokwa ya.—Aịsaịa 48:17, 18.

Ihe Anyị Na-amụta Site n’Ọnwụnwa

N’ezie, ịhọrọ ‘idetụ ire ma hụ na Jehova dị mma’ adịghị echebe mmadụ pụọ n’ihe ndị a na-atụghị anya ha ná ndụ; ọ dịghịkwa echebe anyị kpam kpam pụọ ná mwakpo nke Setan na ndị ozi ya bụ́ mmadụ. (Eklisiastis 9:11) N’ihi ya, a pụrụ ile ezi obi na mkpebi siri ike nke Onye Kraịst ule. N’ihi gịnị ka Jehova ji ahapụ ndị na-efe ya ofufe ka a nwaa ha ọnwụnwa ndị dị otú ahụ? Pita onyeozi kwuru otu ihe kpatara ya mgbe o dere, sị: “Ruo nwa oge ugbu a, ma ọ bụrụ na ọ ghaghị ịdị, e mewo ka unu ruo újú site n’ọnwụnwa dị iche iche, ka ọdịdị okwukwe unu nke e lere ule, nke bara oké uru karịa ọlaedo nke na-ala n’iyi n’agbanyeghị ịbụ nke e ji ọkụ nwapụta, wee bụrụ nke a hụrụ dị ka ihe na-akpata inye otuto na ịdị ebube na nsọpụrụ ná mkpughe nke Jizọs Kraịst.” (1 Pita 1:6, 7) Ee, ule dị iche iche na-enye anyị ohere igosipụta otú okwukwe anyị na ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ dị. Ha na-enyekwa aka ime ka e nwee ihe a ga-eji zaghachi ịta ụta na ebubo nke Setan bụ́ Ekwensu.—Ilu 27:11; Mkpughe 12:10.

Ule na-enyekwara anyị aka ịzụlite àgwà ndị ọzọ nke Ndị Kraịst. Dị ka ihe atụ, tụlee okwu nke ode abụ ahụ: “Onye dị umeala n’obi ka [Jehova] na-ahụ anya: ma onye mpako, Ọ na-esite n’ebe dị anya mara ya.” (Abụ Ọma 138:6) Ọtụtụ n’ime anyị ebughị ịdị umeala n’obi pụta ụwa, ma ọnwụnwa pụrụ inyere anyị aka ịzụlite àgwà ahụ dị mkpa. Cheta ihe mere laa azụ n’oge Mozis mgbe ụmụ Izrel hụrụ ya dị ka ihe na-agwụ ike iri mana site n’izu ruo n’izu, site n’ọnwa ruo n’ọnwa. Ihe àmà na-egosi na nke ahụ bụ ihe e ji nwalee ha, ọ bụ ezie na mana ahụ bụ ihe e nyere n’ụzọ ọrụ ebube. Gịnị bụ nzube nke ule ahụ? Mozis gwara ha, sị: “[Jehova] na-eme ka i rie mana n’ọzara . . . ka O wee weda gị n’ala, ka O wee nwaakwa gị.”—Deuterọnọmi 8:16.

A pụkwara ile ịdị umeala n’obi anyị ule. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ dị mma, olee otú anyị si emeghachi omume mgbe e mere mgbanwe n’usoro nhazi? (Aịsaịa 60:17) Ànyị na-eji obi anyị dum akwado ọrụ nkwusa na nke izi ihe? (Matiu 24:14; 28:19, 20) Ànyị na-eji oké mmasị anakwere nkọwa nke eziokwu Bible dị ka “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-enye ha? (Matiu 24:45-47; Ilu 4:18) Ànyị na-eguzogide nrụgide nke inwe ngwá ụlọ eletrik ndị kasị pụta ọhụrụ, uwe ndị kasị pụta ọhụrụ, ma ọ bụ ụdị ụgbọala ndị kasị pụta ọhụrụ? Onye dị umeala n’obi ga-enwe ike ịza ee n’ajụjụ ndị dị otú ahụ.—1 Pita 1:14-16; 2 Pita 3:11.

Ọnwụnwa na-enyekwa aka ịzụlite àgwà ọzọ dị oké mkpa n’ime anyị—ntachi obi. Jems onye na-eso ụzọ kwuru, sị: “Gụọnụ ya dị ka nanị ihe ọṅụ, ụmụnna m, mgbe unu zutere ọnwụnwa dị iche iche, ebe unu maara na ọdịdị okwukwe unu a bụ́ nke e lere ule na-arụpụta ntachi obi.” (Jems 1:2, 3) Inwe ihe ịga nke ọma n’ịtachi obi n’ọtụtụ ule na-adabere n’ụzọ zuru ezu n’ebe Jehova nọ, na-azụlite iguzosi ike, ịkwụsi ike, na iguzosi ike n’ezi ihe. Ọ na-ewusi anyị ike iguzogide mwakpo Setan, bụ́ chi iwe na-ewe nke ụwa a, ka ga-eme.—1 Pita 5:8-10; 1 Jọn 5:19; Mkpughe 12:12.

Na-ele Ọnwụnwa Anya n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị

Ọkpara zuru okè nke Chineke, bụ́ Jizọs Kraịst, chere ọtụtụ ọnwụnwa ihu mgbe ọ nọ n’ụwa, ma rite uru dị ukwuu site n’ịtachi obi na ha. Pọl dere na Jizọs “mụtara nrubeisi site n’ahụhụ ndị ọ tara.” (Ndị Hibru 5:8) Iguzosi ike n’ihe ya ruo ọnwụ wetaara aha Jehova otuto ma mee ka o kwe Jizọs omume inye uru nke ndụ mmadụ ya zuru okè dị ka ihe mgbapụta maka ihe a kpọrọ mmadụ. Nke ahụ megheere ndị na-egosipụta okwukwe na Jizọs ụzọ inwe atụmanya nke ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:16) Ebe ọ bụ na Jizọs nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi n’ọnwụnwa, ọ bụzi Nnukwu Onye Nchụàjà na Eze anyị nke nọkwasịworo n’ocheeze.—Ndị Hibru 7:26-28; 12:2.

Gịnị banyere anyị? Iguzosi ike n’ihe anyị mgbe anyị na-eche ọnwụnwa ihu na-ewetakwa ngọzi dị ukwuu. Banyere ndị nwere olileanya ịga eluigwe, Bible na-asị: “Obi ụtọ na-adịrị onye nọgidere na-atachi obi n’ọnwụnwa, n’ihi na n’ịbụ onye a nwapụtara, ọ ga-anata okpueze bụ́ ndụ, nke Jehova kwere ndị nọgidere na-ahụ ya n’anya ná nkwa.” (Jems 1:12) Ndị nwere olileanya elu ala nwere mmesi obi ike na ọ bụrụ na ha ejiri ikwesị ntụkwasị obi tachie obi, ha ga-enweta ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. (Mkpughe 21:3-6) Nke kakwa mkpa, ntachi obi ha ji ikwesị ntụkwasị obi na-enwe na-ewetara aha Jehova otuto.

Ka anyị na-agbaso nzọụkwụ Jizọs, anyị pụrụ inwe obi ike na anyị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’imeri ule nile anyị pụrụ izute n’usoro ihe a. (1 Ndị Kọrint 10:13; 1 Pita 2:21) N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ịdabere na Jehova, bụ́ onye na-enye ndị na-adabere n’ebe ọ nọ “ike karịrị ike nkịtị.” (2 Ndị Kọrint 4:7) Ka nkwenye anyị dịrị ka nke Job bụ́ onye, ọbụna ka ọ na-edi ọnwụnwa ndị siri oké ike, ji obi ike kwuo, sị: “Mgbe Ọ nwapụtasịrị m, dị ka ọlaedo ka m ga-apụta.”—Job 23:10.

[Foto dị na peeji nke 31]

Iguzosi ike n’ihe Jizọs n’ule wetaara aha Jehova otuto. Nke anyị pụrụ ime otú ahụ