Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ọ Na-edu M n’Akụkụ Mmiri Dị Jụụ”

“Ọ Na-edu M n’Akụkụ Mmiri Dị Jụụ”

“Ọ Na-edu M n’Akụkụ Mmiri Dị Jụụ”

N’ALA okpomọkụ ndị a kpọtụrụ aha na Bible, ọ dị atụrụ mkpa ịṅụ mmiri kwa ụbọchị. N’ihi ya, otu akụkụ dị mkpa nke ọrụ onye ọzụzụ atụrụ bụ inye ìgwè atụrụ ya mmiri. Mgbe ụfọdụ, ndị ọzụzụ atụrụ na-enye atụrụ ha mmiri site n’olulu mmiri, na-awụnye mmiri ahụ n’ihe e ji enye anụ ụlọ mmiri ka atụrụ ha wee nwee ike ịṅụ ya. (Jenesis 29:1-3) Otú ọ dị, karịsịa n’oge udu mmiri, a na-enwe ‘akụkụ mmiri nke izu ike’ bụ́ nke dị jụụ na gburugburu ebe e nwegasịrị iyi nta na osimiri.— Abụ Ọma 23:2.

Ezi onye ọzụzụ atụrụ aghaghị ịma ebe ọ ga-achọtara ìgwè atụrụ ya ma mmiri ma ahịhịa dị mma. Ya ịmara ebe ọ na-azụ atụrụ nke ọma ga-eme ka e jide n’aka na atụrụ ya ga-adị ndụ. Devid, bụ́ onye ji ọtụtụ afọ zụọ atụrụ n’ugwu ndị dị na Judia, ji nduzi ime mmụọ Chineke na-enye tụnyere nke onye ọzụzụ atụrụ bụ́ onye na-eduru atụrụ ya gaa n’ahịhịa ndị dị mma na mmiri na-enye ndụ. “Ọ na-edu m n’akụkụ mmiri dị jụụ,” ka Devid kwuru dị ka otu nsụgharị si sụgharịa ya.—Abụ Ọma 23:1-3, New International Version.

Ọtụtụ afọ ka e mesịrị, site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Izikiel, Jehova ji ihe atụ yiri nke ahụ mee ihe. O kwere nkwa ịchịkọta ndị ya site n’ala ndị a chụsasịworo ha, dị ka onye ọzụzụ atụrụ si achịkọta atụrụ ya. “M ga-emekwa ka ha . . . baa n’ala ha; M ga-azụkwa ha n’ugwu nile nke [Izrel], na n’akụkụ ebe nile mmiri si eru,” ka o mesiri ha obi ike.—Ezikiel 34:13.

Jehova Chineke na-enwekwa nnọọ nchegbu banyere inye mmiri ime mmụọ. Akwụkwọ Mkpughe na-akọwa “osimiri nke mmiri nke ndụ” bụ́ nke si n’ocheeze Chineke na-asọpụta. (Mkpughe 22:1) A na-akpọ mmadụ nile òkù ịṅụ mmiri si n’osimiri a. “Onye ọ bụla nke chọrọnụ [pụrụ ịnara] mmiri nke ndụ ahụ n’efu.”—Mkpughe 22:17.

Mmiri nke ndụ ihe atụ a na-anọchite anya ndokwa Chineke mere maka ndụ ebighị ebi. Onye ọ bụla pụrụ ịmalite ịṅụ mmiri dị otú ahụ site ‘n’inweta ihe ọmụma banyere nanị ezi Chineke ahụ nakwa banyere onye ahụ o zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.’—Jọn 17:3.