Mmasị E Nwere n’Oge A n’Ebe “Ndị Senti” Nọ
Mmasị E Nwere n’Oge A n’Ebe “Ndị Senti” Nọ
“Ì chetara oge o yiri ka ọ dịghị amasị anyị ige ihe banyere ndị dike? O yighị ka ọ dị nde 4.2 nke ndị America kiriri ememe olili ozu nke Mọda Teresa na Sept. 13 otú ahụ. Kemgbe ọ nwụrụ na Sept. 5, ndị mmadụ ejiriwo arịrịọ ka e chie ya senti mekpaa Vatican ahụ́. Ọ bụ mmadụ ole na ole na-enwe obi abụọ ma ọ̀ ga-enwe isi.”—Sun-sentinel, United States, October 3, 1997.
ỌTỤTỤ mmadụ na-ele ọrụ ịkwalite ọdịmma ndị mmadụ na ọrụ ebere ndị onye ozi ala ọzọ nke Katọlik bụ́ Mọda Teresa rụrụ anya dị ka ihe na-egosi mmadụ ịbụ ezigbo onye senti. E nwere ndị mere ihe kwesịrị ncheta n’okpukpe ndị ọzọ. Otú ọ dị, ikekwe ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha a na-akwanyere ùgwù otú e si akwanyere ndị nke Chọọchị Roman Katọlik chiri “senti.”
Popu John Paul nke Abụọ echiwo ihe karịrị mmadụ 450 senti kemgbe ọ bụwara popu, nke a karịrị mmadụ ole ndị popu ndị ọzọ e nwere na narị afọ nke 20 chiri “senti” ma a gụkọta ha. * Gịnị mere e ji nwee nsọpụrụ na-adịgide adịgide otú ahụ n’ebe “ndị senti” nọ, bụ́ ndị ndị Katọlik n’ozuzu ha na-amachaghị ọtụtụ n’ime ha?
Ọkà mmụta okpukpe nke Mahadum Notre Dame bụ́ Lawrence Cunningham na-akọwa, sị: “Echiche bụ́ na e nwere ịdị nsọ n’ụwa na-amasị ndị mmadụ. Ndị senti na-egosi na o kwere omume ibi ndụ dị ka ndị dike, ọbụna taa.” Tụkwasị na nke ahụ, e kweere na “ndị senti” nwere ụzọ pụrụ iche ha si abịaru Chineke nso, na-eme ka ha bụrụ ndị ogbugbo dị irè nye ndị dị ndụ. Mgbe a chọtara ihe onwunwe ma ọ bụ akụkụ ahụ́ “onye senti,” a na-enye ya nsọpụrụ ofufe n’ihi nkwenkwe bụ́ na e si na ha enweta ike.
Katkizim nke Kansụl nke Trent, bụ́ nke e bipụtara na narị afọ nke 16 iji mesighachi nkwenkwe ndị Katọlik ike, kwubiri, sị: “Anyị ziri ezi n’ikwubi na ịsọpụrụ ndị senti ‘na-arahụ ụra n’ime Onyenwe anyị,’ ịgwa ha ka ha rịọchitere anyị arịrịọ, na inye ihe onwunwe na ntụ ha dị nsọ nsọpụrụ ofufe, kama ịbụ ihe na-ebelata ebube Chineke, na-eme ka ọ dịkwuo ukwuu ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ olileanya Onye Kraịst ahụ dịruru ọhụrụ ma siruo ike, a na-akpalikwa ya iṅomi omume ọma ha.” (The Catechism of the Council of Trent, 1905) N’ezie, ezi Ndị Kraịst na-achọ ibi ndụ dị mma, ịgakwuru Chineke n’ụzọ kwesịrị ekwesị, na inweta enyemaka Chineke. (Jems 4:7, 8) Ya mere, dị ka Okwu Chineke si kwuo, olee ndị ruru eru ịbụ ezigbo ndị senti? Ọrụ dịkwa aṅaa ka ha na-arụ?
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 4 Ichi onye Roman Katọlik nwụrụ anwụ “senti” na-eme ka chọọchị nakwere ya dị ka onye ruru eru ịbụ onye a ga-enyerịrị nsọpụrụ ofufe n’ebe nile.