Olee Otú Ezi Ndị Senti Pụrụ Isi Nyere Gị Aka?
Olee Otú Ezi Ndị Senti Pụrụ Isi Nyere Gị Aka?
N’AKWỤKWỌ NSỌ, a pụrụ ịsụgharị okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “onye senti” ná nsụgharị ụfọdụ ịbụ “onye nsọ.” Ònye ka okwu ahụ na-ezo aka n’ebe ọ nọ? “N’ụdị ụbara ya, dị ka mgbe e ji ya eme ihe maka ndị kwere ekwe,” ka akwụkwọ bụ́ An Expository Dictionary of New Testament Words na-ekwu, “ọ na-ezo aka n’ebe ndị nile dị otú ahụ nọ, e jighịkwa ya eme ihe nanị n’ebe ndị dị nsọ n’ụzọ pụrụ iche nọ, ma ọ bụ n’ebe ndị e ji omume ịdị nsọ ndị pụrụ iche mara mgbe ha nwụsịrị nọ.”
N’ihi ya, Pọl onyeozi kọwara Ndị Kraịst oge mbụ nile dị ka ezi ndị senti, ma ọ bụ ndị nsọ. Dị ka ihe atụ, o degaara “ọgbakọ Chineke nke dị na Kọrint, ya na ndị nsọ nile nọ n’Akea dum [nke dị na Rom],” akwụkwọ ozi na narị afọ mbụ O.A. (2 Ndị Kọrint 1:1) Mgbe e mesịrị, Pọl degaara “ndị nile nọ na Rom dị ka ndị Chineke hụrụ n’anya, ndị a kpọrọ ịbụ ndị nsọ” akwụkwọ ozi. (Ndị Rom 1:7) O doro anya na ndị nsọ a anwụbeghị n’oge ahụ, e dobeghịkwa ha iche karịa ndị ọzọ kwere ekwe n’ihi omume ọma ha pụrụ iche. Gịnị ka a dabeere na ya wee doo ha iche dị ka ndị senti?
Ndị Chineke Doro Nsọ
Okwu Chineke na-egosi na ọ bụghị mmadụ ma ọ bụ òtù na-eme mmadụ senti. Akwụkwọ Nsọ na-ekwu, sị: “[Chineke] zọpụtara anyị ma kpọọ anyị ọkpụkpọ dị nsọ, ọ bụghị n’ihi ọrụ anyị, kama n’ihi nzube na obiọma na-erughịrị mmadụ nke ya.” (2 Timoti 1:9) A na-edo onye nsọ nsọ n’ihi ọkpụkpọ Jehova kpọrọ ya, dị ka obiọma na-erughịrị mmadụ nke Chineke si dị nakwa n’ụzọ kwekọrọ ná nzube Ya.
Ndị nsọ nke ọgbakọ Ndị Kraịst so ‘n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ’ ahụ. Ọbara Jizọs Kraịst wụsịrị na-eme ka ọgbụgba ndụ a dị irè ma na-edo ndị so na ya nsọ. (Ndị Hibru 9:15; 10:29; 13:20, 24) N’ịbụ ndị e mere ka ha dị ọcha n’anya Chineke, ha bụ ‘òtù ndị nchụàjà dị nsọ, ha na-achụkwa àjà ime mmụọ ndị Chineke na-anara nke ọma site n’aka Jizọs Kraịst.’—1 Pita 2:5, 9.
Ịrịọ Ndị Senti Arịrịọ na Ha Ịrịọchite Arịrịọ
Ebe ọ bụ na ha kweere na “ndị senti” pụrụ inye ndị kwere ekwe ike pụrụ iche, ọtụtụ nde mmadụ na-enye ha nsọpụrụ ofufe site n’iji ihe onwunwe ha eme ihe ma ọ bụ site n’ịkpọku ha ka ha rịọchitere ha arịrịọ. Nke a ọ̀ bụ ozizi dabeere na Bible? N’Ozizi Elu Ugwu ahụ, Jizọs kụziiri ụmụazụ ya otú e si abịaru Chineke nso, na-asị: “Ya mere, kpeenụ Matiu 6:9) Ọ bụ nanị Jehova Chineke ka e kwesịrị ikpegara ekpere.
ekpere otú a: ‘Nna anyị nke nọ n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.’” (Ná mgbalị iji kwado “ndị senti” ịrịọchitere mmadụ arịrịọ, ụfọdụ ndị ọkà mmụta okpukpe na-ehota Ndị Rom 15:30, bụ́ ebe anyị na-agụ, sị: “Ana m agba unu ume, ụmụnna m, site n’Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na site n’ịhụnanya nke mmụọ nsọ, ka unu soro m na-ekpesi ekpere ike nye Chineke maka m.” Pọl ọ̀ na-agba ndị ahụ kwere ekwe ume ikpeku ya ekpere ma ọ bụ iji aha ya na-agakwuru Chineke? Ee e. Ọ bụ ezie na a gbara ume na Bible ikpe ekpere maka ezi ndị senti, ma ọ bụ ndị nsọ, ọ dịghị ebe ọ bụla Chineke nyere anyị iwu ikpe ekpere nye ndị nsọ dị otú ahụ ma ọ bụ isi n’aka ha na-ekpe ekpere.—Ndị Filipaị 1:1, 3, 4.
Otú ọ dị, Chineke ahọpụtawo onye anyị ga na-esi n’aka ya ekpe ekpere. “Abụ m ụzọ na eziokwu na ndụ,” ka Jizọs Kraịst sịrị. “Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.” Jizọs kwukwara, sị: “Ihe ọ bụla unu rịọrọ n’aha m, m ga-eme nke a, ka e wee nye Nna ahụ otuto n’ihe metụtara Ọkpara ya. Ọ bụrụ na unu arịọ ihe ọ bụla n’aha m, m ga-eme ya.” (Jọn 14:6, 13, 14) Obi pụrụ isi anyị ike na Jehova dị njikere ịnụ ekpere ndị e kpere n’aha Jizọs. Banyere Jizọs, Bible na-ekwu, sị: “O nwekwara ike ịzọpụta ndị ahụ n’ụzọ zuru ezu bụ́ ndị na-abịaru Chineke nso site na ya, n’ihi na ọ na-adị ndụ mgbe nile ịrịọ arịrịọ maka ha.”—Ndị Hibru 7:25.
Ọ bụrụ na Jizọs dị njikere ịrịọchitere anyị arịrịọ, n’ihi gịnị ka ndị na-efe ofufe na Krisendọm jikarị akpọku “ndị senti” n’ekpere? N’akwụkwọ ya bụ́ The Age of Faith, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Will Durant chọpụtara ebe omume a si malite. Ka ọ na-ekwu na a tụrụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile egwu, Jizọs eyiekwa onye a pụrụ ịbịaru nso karị, Durant sịrị: “Ọ na-esiri mmadụ ike ịgwa [Jizọs] okwu ihu na ihu mgbe onye ahụ na-emezughị ma ọlị ihe ndị dị n’Okwu Ngọzi Ya. O yiri ihe amamihe dị na ya karị ikpegara onye senti ekpere bụ́ onye o doro anya na ọ nọ n’eluigwe n’ihi na e chiri ya senti, ma rịọ ya ka ọ rịọchitere anyị arịrịọ n’ihu Kraịst.” Nchegbu ndị a hà ziri ezi?
Bible na-akụziri anyị na site n’aka Jizọs, anyị pụrụ inwe ‘nkwuwa okwu ma jiri obi ike bịaruo Chineke nso’ n’ekpere. (Ndị Efesọs 3:11, 12) Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile anọghị ihe a kpọrọ mmadụ n’ebe dị nnọọ anya ịnụ ekpere anyị. Ode abụ bụ́ Devid ji obi ike kpee ekpere, sị: “Gị Onye na-anụ ekpere, Gị ka anụ ahụ́ nile, bụ́ mmadụ, ga-abịakwute.” (Abụ Ọma 65:2) Kama isite n’ihe onwunwe “ndị senti” nwụrụ anwụ na-enye ike, Jehova na-awụkwasị mmụọ nsọ ya n’ahụ́ ndị ji okwukwe na-arịọ maka ya. Jizọs chere echiche, sị: “Ọ bụrụ na unu, ọ bụ ezie na unu bụ ndị ajọ omume, maara ụzọ isi nye ụmụ unu ezi onyinye, lee ka Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ karị!”—Luk 11:13.
Ọrụ Ndị Nsọ Na-arụ
Ndị nsọ Pọl degaara akwụkwọ ozi nwụrụ ọtụtụ narị afọ gara aga, ka oge na-agakwa, ha gaje ịnata “okpueze bụ́ ndụ,” mbilite n’ọnwụ gaa n’eluigwe. (Mkpughe 2:10) Ndị na-efe Jehova Chineke ofufe maara na inye ezi ndị senti a nsọpụrụ ofufe ekwekọghi n’Akwụkwọ Nsọ, nakwa na ọ pụghị ichebe mmadụ pụọ n’ọrịa, ọdachi ndị na-emere onwe ha, ọnọdụ akụ̀ na ụba a na-ejighị n’aka, ịka nká, ma ọ bụ ọnwụ. N’ihi ya, ị pụrụ ịjụ, sị, ‘Ndị nsọ Chineke hà na-eche banyere anyị n’ezie? Ànyị kwesịrị ịtụ anya ka ha na-eme ihe maka ọdịmma anyị?’
A kpọtụrụ ndị nsọ aha ugboro ugboro n’otu amụma Daniel dekọrọ. Na narị afọ nke isii T.O.A., ọ hụrụ otu ọhụụ na-akpali akpali, bụ́ nke nọgidere na-emezu ruo n’oge anyị. N’oké osimiri ka anụ ọhịa anọ dị egwu si pụta, bụ́ ndị na-anọchi anya ọchịchị ụmụ mmadụ, bụ́ ndị na-enweghị ike igbo mkpa nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ezie. Mgbe ahụ, Daniel buru amụma, sị: “Ma ndị nsọ nke Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu ga-anata alaeze ahụ, nwee alaeze ahụ ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe nile ebighị ebi.”—Daniel 7:17, 18.
Pọl gbara akaebe banyere ihe a e nyere “ndị nsọ dị ka ihe nketa,” ya bụ, iso Kraịst chịa n’eluigwe. (Ndị Efesọs 1:18-21) Ọbara Jizọs meghere ụzọ maka ndị nsọ 144,000 ịbụ ndị a kpọlitere n’ọnwụ gaa n’ebube eluigwe. Jọn onyeozi kwupụtara, sị: “Onye obi ụtọ na onye dị nsọ ka onye ọ bụla nke nwere òkè ná mbilite n’ọnwụ mbụ bụ; ọnwụ nke abụọ enweghị ikike n’ebe ndị a nọ, kama ha ga-abụ ndị nchụàjà nke Chineke na nke Kraịst ahụ, ha ga-esokwa ya chịa dị ka ndị eze ruo otu puku afọ ahụ.” (Mkpughe 20:4, 6; 14:1, 3) N’ọhụụ, Jọn nụrụ ka ìgwè ihe ndị e kere eke nọ n’eluigwe nọ n’ihu Jizọs ahụ e mere ka ọ dị ebube na-abụ abụ, sị: “I jikwa ọbara gị zụtara Chineke ndị mmadụ site n’ebo na asụsụ na ndị na mba ọ bụla, i mekwara ka ha bụrụ otu alaeze na ndị nchụàjà nye Chineke anyị, ha gajekwa ịchị ụwa dị ka ndị eze.” (Mkpughe 5:9, 10) Lee ihe na-emesighachi obi ike ọ bụ! Jehova Chineke n’onwe ya ejiriwo nlezianya họrọ ndị ikom na ndị inyom a. Ọzọkwa, ha ejiwo ikwesị ntụkwasị obi jee ozi n’ụwa, chee ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nsogbu nile ụmụ mmadụ na-enwe ihu. (1 Ndị Kọrint 10:13) Ya mere, anyị pụrụ inwe obi ike na ndị nsọ, ma ọ bụ ndị senti a e si n’ọnwụ kpọlite, ga-abụ ndị ọchịchị dị obi ebere ma dị ọmịiko, na-echebara adịghị ike na erughị eru anyị echiche.
Ngọzi Ndị A Ga-enweta n’Okpuru Ọchịchị Alaeze
Ọchịchị Alaeze ahụ ga-eme ihe n’isi nso iji wepụ ajọ omume na nhụjuanya nile n’ụwa. N’oge ahụ, ndị mmadụ ga-abịarukwu Chineke nso karịa ka ha metụworo. Jọn dere, sị: “M wee nụ ka otu oké olu si n’ocheeze ahụ na-asị: ‘Lee! Ụlọikwuu nke Chineke na-adịnyere ihe a kpọrọ mmadụ, ya na ha ga-ebikwa, ha ga-abụkwa ndị nke ya. Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha.’” Nke a ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ ngọzi dị ukwuu, n’ihi na amụma ahụ gara n’ihu, sị: “Ọ ga-ehichapụkwa anya Mkpughe 21:3, 4.
mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.”—Lee oge ọṅụ nke ahụ ga-abụ! A kọwakwuru ihe ga-esi n’ọchịchị zuru okè nke Kraịst Jizọs na ndị nsọ 144,000 pụta n’okwu ndị a e dekọrọ na Maịka 4:3, 4, sị: “[Jehova] ga-ekpekwa ikpe n’etiti ọtụtụ ndị dị iche iche, doziekwara mba dị iche iche nwere ume okwu ha ruo ebe dị anya; ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ. Ma ha ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi vaịn ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji: n’ihi na ọnụ nke Jehova nke usuu nile nke ndị agha ekwuwo okwu.”
Ọ bụ ndị nsọ na-akpọ òkù ịbịa nweta ngọzi ndị dị otú ahụ. N’ịbụ ndị nwanyị a na-alụ ọhụrụ nọchiri anya ha, ezi ndị senti nọgidere na-asị: “Bịa!” Ihe odide ahụ gara n’ihu, sị: “Ka onye ọ bụla nke na-anụ sịkwa: ‘Bịa!’ Ka onye ọ bụla nke akpịrị na-akpọ nkụ bịakwa; ka onye ọ bụla nke chọrọnụ nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.” (Mkpughe 22:17) Gịnị ka “mmiri nke ndụ” na-agụnye? Tinyere ihe ndị ọzọ, ọ bụ ezi ihe ọmụma banyere nzube Chineke. N’ekpere o kpekuru Chineke, Jizọs sịrị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) A na-enweta ihe ọmụma a site n’ịmụchi Bible anya. Lee ka obi si dị anyị ụtọ na site n’Okwu Chineke, anyị pụrụ ịmata n’ezie ndị ndị nsọ bụ ma mụta otú ọ ga-esi jiri ha mee ihe n’ụzọ ga-abara ihe a kpọrọ mmadụ uru ruo mgbe ebighị ebi!
[Foto dị na peeji nke 4]
Pọl degaara ezi ndị senti akwụkwọ ozi ndị sitere n’ike mmụọ nsọ
[Foto dị na peeji nke 4, 5]
Ndịozi kwesịrị ntụkwasị obi nke Jizọs ghọrọ ezi ndị senti, ma ọ bụ ndị nsọ
[Foto dị na peeji nke 6]
Obi pụrụ isi anyị ike isi n’aka Jizọs Kraịst na-ekpegara Chineke ekpere
[Foto dị na peeji nke 7]
Ndị senti, ma ọ bụ ndị nsọ, e si n’ọnwụ kpọlite ga-eji ọmịiko chịa ụwa