Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Septuagint”—Ọ Bara Uru n’Oge Ochie Nakwa n’Oge A

“Septuagint”—Ọ Bara Uru n’Oge Ochie Nakwa n’Oge A

“Septuagint”—Ọ Bara Uru n’Oge Ochie Nakwa n’Oge A

OTU nwoke a na-akwanyere ùgwù nke si Etiopia, si Jeruselem na-ala. Ka o ji ụgbọ ịnyịnya ya si n’otu ụzọ dị n’ọzara na-aga, ọ nọ na-agụ otu akwụkwọ mpịakọta okpukpe n’olu dara ụda. Nkọwa nke ihe ọ gụtara nwere mmetụta dị ukwuu n’ahụ́ ya nke na ndụ ya gbanwere site mgbe ahụ gawa. (Ọrụ 8:26-38) Nwoke ahụ nọ na-agụ Aịsaịa 53:7, 8 site ná nsụgharị mbụ nke Bible—Septuagint nke Grik. Nsụgharị a ekerewo òkè dị nnọọ mkpa n’ime ka ozi Bible gbasaa n’ime narị afọ ndị gafeworonụ nke na a kpọwo ya nsụgharị Bible nke gbanwere ụwa.

Olee mgbe a sụgharịrị Septuagint, ọ̀ bụkwa n’ọnọdụ ndị dị aṅaa? N’ihi gịnị ka e ji nwee mkpa maka nsụgharị dị otú ahụ? Olee otú o siworo baa uru na narị afọ ndị gafeworonụ? Gịnị, ma ọ bụrụ na ọ dị, ka Septuagint pụrụ ịkụziri anyị taa?

E Mere Ya Maka Ndị Juu Na-asụ Grik

Na 332 T.O.A., bụ́ mgbe Alexander Onye Ukwu banyere Ijipt ka o bibisịrị obodo Taịa nke dị na Fonishia, a nabatara ya dị ka onye nnapụta. N’ebe ahụ, o guzobere obodo Aleksandria, bụ́ ebe mmụta hiwere isi n’oge ochie. N’ịchọ ka ndị bi n’ala ndị o meriri na-agbaso ọdịbendị ndị Gris, Alexander webara asụsụ Grik nke a na-asụ n’oge ahụ (Koine) n’ógbè nile ọ na-achị.

Na narị afọ nke atọ T.O.A., ọtụtụ ndị Juu bịara biri n’Aleksandria. Ọtụtụ ndị Juu bụ́ ndị bi n’ógbè ndị dịsasịrị adịsasị ná mpụga Palestaịn mgbe ha lọtasịrị ná ndọrọ n’agha Babilọn, kwagara Aleksandria. Olee otú ndị Juu a maruuru asụsụ Hibru nke ọma? Akwụkwọ bụ́ Cyclopedia nke McClintock na Strong dere na-ekwu, sị: “A maara nke ọma na mgbe ndị Juu lọtasịrị ná ndọrọ n’agha Babilọn, ebe ọ bụ na ha amaghịzi asụsụ Hibru oge ochie otú ha sibu mara ya, e ji asụsụ ndị Kaldea kọwaara ha ihe ndị a gụpụtara n’akwụkwọ ndị Mozis dere n’ụlọ nzukọ ndị dị na Palestaịn . . . Ikekwe ndị Juu nọ n’Aleksandria nwere ọbụna ihe ọmụma dị nta karị banyere Hibru; asụsụ ha maara nke ọma bụ Grik nke ndị Aleksandria.” N’ụzọ doro anya, ọnọdụ e nwere n’Aleksandria dị mma maka ịsụgharị Akwụkwọ Nsọ Hibru gaa n’asụsụ Grik.

Aristobulus, bụ́ onye Juu nke biri ndụ na narị afọ nke abụọ T.O.A., dere na a sụgharịrị otu nsụgharị nke iwu Hibru gaa n’asụsụ Grik, na a sụgharịchara ya mgbe Ptolemy Philadelphus na-achị (285-246 T.O.A.). E nwere echiche dịgasị iche iche banyere ihe Aristobulus bu n’uche mgbe ọ sịrị “iwu.” Ụfọdụ na-eche na ihe ọ na-ekwu banyere ya bụ nanị Pentateuch, ebe ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ Akwụkwọ Nsọ Hibru dum ka ọ pụrụ ibuwo n’obi.

Nke ọ sọrọ ya bụrụ, ọdịnala na-ekwu na ihe dị ka ndị ọkà mmụta 72 bụ́ ndị Juu, keere òkè ná nsụgharị mbụ ahụ e dere ede nke Akwụkwọ Nsọ site n’asụsụ Hibru gaa na nke Grik. Mgbe e mesịrị, a malitere iji ọnụ ọgụgụ ahụ fọrọ nke nta ka o zuo ezuo bụ́ 70 mewe ihe. N’ihi ya, a kpọrọ nsụgharị ahụ Septuagint, nke pụtara “70,” e jikwa LXX, bụ́ otú ndị Rom si ede 70, mara ya. Ka ọ na-erule ngwụsị narị afọ nke abụọ T.O.A., a pụrụ ịgụ akwụkwọ nile nke Akwụkwọ Nsọ Hibru n’asụsụ Grik. N’ihi ya, aha ahụ bụ́ Septuagint bịara na-ezo aka n’Akwụkwọ Nsọ Hibru dum a sụgharịrị gaa na Grik.

Ọ Bara Uru na Narị Afọ Mbụ

Ndị Juu na-asụ Grik ji Septuagint mee ihe n’ụzọ sara mbara tupu nakwa n’oge Jizọs Kraịst na ndịozi ya. Ọtụtụ n’ime ndị Juu na ndị ọhụrụ na-eso ụzọ bụ́ ndị gbakọtara na Jeruselem n’ụbọchị Pentikọst 33 O.A., si n’ógbè Eshia, Ijipt, Libia, Rom, na Krit—ógbè ndị a na-asụ Grik na ha. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụ omenala ha ịgụ ihe site na Septuagint. (Ọrụ 2:9-11) N’ụzọ dị otú a, nsụgharị a bịara baa uru n’ịgbasa ozi ọma ahụ na narị afọ mbụ.

Dị ka ihe atụ, mgbe Stivin onye na-eso ụzọ na-agwa ndị si Saịrini, Aleksandria, Silishia, na Eshia okwu, ọ sịrị: “Josef ziri ozi ma kpọpụta Jekọb bụ́ nna ya na ndị ikwu ya nile n’ebe ahụ [Kenan], bụ́ ndị dị mkpụrụ obi iri asaa na ise n’ọnụ ọgụgụ.” (Ọrụ 6:8-10; 7:12-14) Ihe odide Hibru nke dị na Jenesis isi 46 na-asị na ọnụ ọgụgụ ndị ikwu Josef dị iri asaa. Ma Septuagint ji ọnụ ọgụgụ bụ́ iri asaa na ise mee ihe. Ihe àmà na-egosi na ọ bụ na Septuagint ka Stivin si hota okwu ya.—Jenesis 46:20, 26, 27.

Ka Pọl onyeozi gagharịrị gburugburu Asia Minor na Gris n’oge njem ozi ala ọzọ ya nke abụọ na nke atọ, o kwusaara ọtụtụ ndị Jentaịl na-atụ egwu Chineke na ‘ndị Grik na-efe Chineke’ ozi ọma. (Ọrụ 13:16, 26; 17:4) Ndị a amalitewo ịtụ egwu Chineke ma ọ bụ ife ya ofufe n’ihi na ha enwetawo ihe ọmụma ụfọdụ banyere ya site na Septuagint. Mgbe ọ na-ekwusara ndị a na-asụ Grik ozi ọma, mgbe mgbe Pọl hotara ma ọ bụ kwutetụ ihe si ná nsụgharị ahụ.—Jenesis 22:18; Ndị Galeshia 3:8.

Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst nwere ihe 320 e si n’Akwụkwọ Nsọ Hibru hota otú e si dee ha kpọmkwem nakwa ma eleghị anya ngụkọta nke ihe 890 ndị e hotatụrụ ehotatụ na ndị e zoro aka na ha. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha si na Septuagint. N’ihi ya, ihe ndị e si ná nsụgharị ahụ hota, ọ bụghị ndị e si n’ihe odide Hibru hota, ghọrọ akụkụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Lee eziokwu dị ịrịba ama nke a bụ! Jizọs ebuwo amụma na a ga-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ n’elu ụwa dum mmadụ bi. (Matiu 24:14) Iji mezuo nke a, Jehova ga-ekwe ka a sụgharịa Okwu ya sitere n’ike mmụọ nsọ gaa n’asụsụ dịgasị iche iche nke ndị mmadụ na-agụ n’ụwa nile.

Ọ Bara Uru Taa

Septuagint ka bara uru taa, a na-ejikwa ya eme ihe dị ka ihe enyemaka n’ịchọpụta ebe ndị ndepụtaghachi pụrụ idehiewo ihe n’amaghị ama n’ihe odide Hibru ndị e depụtaghachiri mgbe e mepụtasịrị Septuagint. Dị ka ihe atụ, ihe ndekọ dị na Jenesis 4:8 na-agụ, sị: “Ken wee sị Ebel, bụ́ nwanne ya, Ka anyị jee n’ọhịa. O ruo, mgbe ha nọ n’ọhịa, na Ken biliri imegide Ebel, bụ́ nwanne ya, wee gbuo ya.”

Nkebi ahịrịokwu ahụ bụ́ “ka anyị jee n’ọhịa” adịghị n’ihe odide Hibru ndị dịwara malite na narị afọ nke iri O.A. Otú ọ dị, ọ dị n’ihe odide Septuagint ndị dịwara tupu mgbe ahụ nakwa n’ihe odide ole na ole ndị ọzọ dịwara tupu mgbe ahụ. Ihe odide Hibru ndị ahụ nwere okwu na-egosi na ọ dị ihe e kwuru, ma ọ dịghị ihe e depụtara e kwuru. Olee ihe pụrụ ịkpatawo ya? Jenesis 4:8 nwere nkebi ahịrịokwu abụọ ndị ji okwu ndị bụ́ “n’ọhịa,” mechie. Akwụkwọ bụ́ Cyclopedia nke McClintock na Strong dere na-atụ aro, sị: “Ikekwe anya onye depụtaghachiri Hibru ahụ rafuru ya n’ihi [otu] okwu ahụ . . . imechi nkebi ahịrịokwu abụọ ahụ.” N’ihi ya, ọ pụrụ ịbụ na onye depụtaghachiri ya mafere ebe mbụ nkebi ahịrịokwu ahụ ji okwu bụ́ “n’ọhịa” mechie, putara. N’ụzọ doro anya, Septuagint, nakwa ihe odide ndị ọzọ ka ochie ka fọdụrụnụ, pụrụ ịba uru n’ịchọpụta ihe ndị e dehiere n’ihe odide Hibru ndị e depụtaghachiri mgbe e mesịrị.

N’aka nke ọzọ, e dehiekwara ihe n’ihe odide ụfọdụ nke Septuagint, mgbe ụfọdụkwa, a na-eji ihe odide Hibru edezi ihe e dehiere na nke Grik. N’ihi ya, iji ihe odide dị iche iche nke Hibru na-atụle ndị nke Grik nakwa ndị a sụgharịrị gaa n’asụsụ ndị ọzọ na-eme ka a chọpụta ebe ndị nsụgharị na-asụgharịghị nke ọma nakwa ebe ndị ndepụtaghachi dehiere ihe ma na-emesi anyị obi ike na a sụgharịrị Okwu Chineke n’ụzọ ziri ezi.

Septuagint ndị zuru ezu e nwere taa dịwara laa azụ na narị afọ nke anọ O.A. Ihe odide ndị dị otú ahụ na ndị ha bu ụzọ enweghị aha Chineke, bụ́ Jehova, bụ́ nke e ji Tetragrammaton (YHWH) egosipụta n’asụsụ Hibru. Ihe odide ndị a ejiriwo okwu Grik ndị bụ maka “Chineke” na “Onyenwe anyị” mee ihe n’ebe ọ bụla Tetragrammaton ahụ pụtara n’ihe odide Hibru. Otú ọ dị, otu ihe a chọtara na Palestaịn ihe dị ka afọ 50 gara aga mere ka a ghọtakwuo okwu a. Otu ìgwè nke ndị na-enyocha ọgba ndị dị nso n’ọnụ mmiri ebe ọdịda anyanwụ nke Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ chọtara iberibe dị iche iche nke akwụkwọ mpịakọta e ji akpụkpọ anụ oge ochie mee nke bu ihe odide nke ndị amụma 12 (Hozia ruo Malakaị) bụ́ ndị e ji Grik dee. E kwuru na ihe odide ndị a dịwara n’agbata 50 T.O.A. na 50 O.A. N’iberibe ihe odide ndị a dịwara tupu narị afọ nke anọ O.A., e jibeghị okwu Grik ndị e ji eme ihe maka “Chineke” na “Onyenwe anyị” dochie Tetragrammaton ahụ. N’ihi ya, a chọpụtara na e ji aha Chineke mee ihe ná nsụgharị Septuagint ndị mbụ nke Akwụkwọ Nsọ.

N’afọ 1971, e bipụtara ihe ndị e dere n’iberibe otu akwụkwọ mpịakọta papaịrọs oge ochie (Fouad 266 papyri). Gịnị ka akụkụ Septuagint ndị a, bụ́ ndị e dere laa azụ na narị afọ nke abụọ ma ọ bụ nke mbụ T.O.A., kpughere? Aha Chineke dịkwa na ha. Iberibe Septuagint ndị ochie a na-enye ihe àmà siri ike na Jizọs na ndị na-eso ụzọ na ya na narị afọ mbụ maara ma jiri aha Chineke mee ihe.

Taa, Bible bụ akwụkwọ a kasị sụgharịa n’akụkọ ihe mere eme. Ihe karịrị pasent 90 nke ezinụlọ mmadụ nwere ma ọ dịkarịa ala akụkụ ya ụfọdụ n’asụsụ ha. Anyị nwere ekele karịsịa maka otu nsụgharị nke ziri ezi e ji olu nke oge a sụgharịa, bụ́ New World Translation of the Holy Scriptures, bụ́ nke dị ugbu a n’ozuzu ya ma ọ bụ n’akụkụ ya ụfọdụ n’ihe karịrị asụsụ 40. New World Translation of the Holy Scriptures—With References nwere ọtụtụ narị ihe odide ala ala peeji bụ́ ndị zoro aka na Septuagint nakwa n’ihe odide ndị ọzọ nke oge ochie. N’ezie, Septuagint nọgidere na-amasị ndị mmụta Bible n’oge anyị ma na-abara ha uru.

[Foto dị na peeji nke 26]

Filip onye na-eso ụzọ kọwara ihe odide e si na “Septuagint” hota

[Foto ndị dị na peeji nke 29]

Pọl onyeozi hotara ihe mgbe mgbe site na “Septuagint”