Ì Kwesịrị Ịbụ Onye Na-adịghị Enye Onwe Ya Nsogbu?
Ì Kwesịrị Ịbụ Onye Na-adịghị Enye Onwe Ya Nsogbu?
ELEGHỊ anya ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ ga-eche na ọ bụ ezigbo ihe iwere ha dị ka ndị na-adịghị enye onwe ha nsogbu, ndị na-achọghị nsogbu, na ndị na-ekwenye ekwenye. Otú ọ dị, e nwere ihe ọzọ ịbụ onye na-adịghị enye onwe ya nsogbu pụtara. Bible na-asị: “[Enyeghị onwe onye nsogbu, NW] nke ndị nzuzu ga-eme ka ha laa n’iyi.” (Ilu 1:32) Gịnị ka nke ahụ pụtara?
Nsụgharị Bible ndị ọzọ ji okwu ndị bụ́ “mmadụ ịbụ onye onwe ya jubigara afọ ókè” (The New American Bible), na “mmadụ ịbụ onye onwe ya juru afọ” (The New English Bible) sụgharịa okwu Hibru mbụ e ji mee ihe maka ya. N’echiche a, e jikọtara enyeghị onwe onye nsogbu na umengwụ na ejighị ihe kpọrọ ihe, n’ihi ya kwa, e jikọtara ya na ịdị nzuzu ma ọ bụ ịda iberibe.
Na narị afọ mbụ, Ndị Kraịst nọ n’ọgbakọ dị na Leodisia amaghị ebe ndị ha na-adịghị emezi emezi n’ụzọ ime mmụọ n’ihi ejighị ihe kpọrọ ihe ma ọ bụ n’ihi ịbụ ndị ọnọdụ ha juru afọ. N’ihi ịbụ ndị onwe ha juru afọ, ha turu ọnụ na ‘ọ dịghị ihe na-akpa ha ma ọlị.’ Jizọs Kraịst gbaziri echiche ha, na-agwa ha ka ha nweghachi ịnụ ọkụ n’obi ha dị ka Ndị Kraịst.—Mkpughe 3:14-19.
E jikwa mmadụ ịbụ onye onwe ya juru afọ mara ndị biri ndụ n’oge Noa. Ha mikpuru onwe ha n’ihe nke ụwa a na-enweta ná ndụ, “na-eri ihe ma na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ndị ikom ana-alụ nwunye, a na-enyekwa ndị inyom n’ọlụlụ di . . . , ha amaghịkwa ruo mgbe iju mmiri ahụ bịara wee kpochapụ ha nile.” Jizọs gbakwụnyeziri, sị: “Otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị.”—Matiu 24:37-39.
Amụma Bible ndị mezuworonụ na-egosi na anyị na-ebi n’oge “ọnụnọ Nwa nke mmadụ,” bụ́ Jizọs Kraịst. Ka anyị ghara ịghọ ndị onwe ha juru afọ, ndị na-ejighị ihe akpọrọ ihe, ndị onwe ha jubigara afọ ókè—ịbụ onye na-adịghị enye onwe onye nsogbu n’echiche na-ezighị ezi.—Luk 21:29-36.