Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Nrite nke Ịja Mma Maka Ụlọ Nzukọ Alaeze

Ihe Nrite nke Ịja Mma Maka Ụlọ Nzukọ Alaeze

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Ihe Nrite nke Ịja Mma Maka Ụlọ Nzukọ Alaeze

MINISTRỊ Na-ahụ Maka Gburugburu Ebe Obibi na Finland wepụtara afọ 2000 dị ka “Afọ Ịhado Ala.” Otu n’ime ndị na-ahazi ya kwuru na “nzube e ji were ịhado ala mere isiokwu nke afọ a bụ iji chetara anyị nile mmetụta gburugburu ebe obibi jupụtara n’ahịhịa ndụ na-enwe ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị na n’ahụ́ ike anyị.”

Na January 12, 2001, akwụkwọ ozi sitere n’aka Òtù Ụlọ Ọrụ Ndị Na-ahụ Maka Nhado Ala na Finland rutere n’alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova dị na Finland. Akwụkwọ ozi ahụ kọwara na e nyewo Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova dị na Tikkurila otu n’ime ihe nrite ndị e wepụtara maka afọ ịhado ala ahụ n’ihi otú ọdịdị ya si maa mma pụrụ iche nakwa n’ihi ogige ya ndị a na-elekọta nke ọma. Akwụkwọ ozi ahụ gbakwụnyere na “ebe ahụ n’ozuzu ya, ma n’oge okpomọkụ ma n’oge oyi, na-adị mma, na-ama mma dị egwu, ma bụrụ ịgba.”

E nyere Ndịàmà Jehova ihe nrite ahụ n’Ụlọ Oriri Rosendahl nke dị na Tampere, Finland, n’otu ihe omume ndị ọkachamara na ndị ọchụnta ego 400 gara. Òtù Ụlọ Ọrụ Ndị Na-ahụ Maka Nhado Ala na Finland nyekwara ụlọ ọrụ mgbasa ozi ihe ha ga-agwa ọha na eze, bụ́ nke kwuru, sị: “N’ebe dịgasị iche na mba a, Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova na-abụkarị ndị a na-eme atụmatụ ha nke ọma. Otú e si elekọta gburugburu ha na-amasị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ onye ọ bụla na-agafe agafe. Ụlọ Nzukọ Alaeze nke dị na Tikkurila bụ otu ihe atụ nke ogige magburu onwe ya n’ozuzu ya. Ụlọ ahụ na gburugburu ya bụ́ nke sara mbara dị nnọọ jụụ ma bụrụ nke a haziri ahazi n’ile anya.”

E nwere Ụlọ Nzukọ Alaeze 233 na Finland, bụ́ ndị okooko osisi ndị mara mma gbara ọtụtụ n’ime ha gburugburu. Otú ọ dị, ihe na-eme ka ebe ndị a maa mma n’ezie bụ na ha bụ ebe ndị bụ́ isi a na-anọ efe ezi ofufe ma na-akụzi Bible. Nye ihe karịrị nde Ndịàmà Jehova isii gburugburu ụwa, Ụlọ Nzukọ Alaeze—ndị nwere ngwá zuru ezu ma ọ bụ hara otú kwesịrị ekwesị—bụ ebe e nwere mmasị na ya nke ukwuu. Ọ bụ ya mere ha ji achọsi ike iji mmasị na-elekọta ya nke ọma. Ọnụ ụzọ nke Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche iche ghere oghe nye mmadụ nile nọ n’ógbè unu!