Jehova Na-agọzi Ma Na-echebe Ndị Na-erube isi
Jehova Na-agọzi Ma Na-echebe Ndị Na-erube isi
“Ma onye na-ege m ntị ga-ebi ná ntụkwasị obi, ọ ga-anọkwa jụụ n’atụghị oké egwu ihe ọjọọ.”—ILU 1:33.
1, 2. N’ihi gịnị ka irubere Chineke isi ji dị mkpa? Nye ihe atụ.
ỤMỤ ọkụkọ na-akaghị aka bụ́ ndị na-acha odo odo nọ nnọọ na-atụ nri n’ebe ahịhịa na-etoghị eto, n’amatụghị na egbe na-efegharị n’elu. Na mberede, nne ha ebesie ube ike ma gbasaa nkù ya. Ụmụ ya agbaga n’ebe ọ nọ, n’otu ntabi anya kwa, nku ya ekpuchie ha n’ụzọ dị nchebe. Egbe ahụ efere pụọ. * Gịnị ka a na-amụta na nke a? Ọ bụ na nrubeisi na-azọpụta ndụ!
2 Ihe mmụta ahụ dị Ndị Kraịst mkpa taa karịsịa, n’ihi na Setan na-eme mgbalị nile ọ pụrụ ime iji nweta ndị Chineke. (Mkpughe 12:9, 12, 17) Ihe mgbaru ọsọ ya bụ imebi ọnọdụ ime mmụọ anyị ka anyị wee ghara inwe ihu ọma Jehova na atụmanya nke ndụ ebighị ebi. (1 Pita 5:8) Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị anọrọ Chineke nso ma na-agbaso ntụziaka anyị na-enweta site n’Okwu na nzukọ ya n’egbughị oge, anyị pụrụ ijide n’aka na ọ ga-echebe anyị. “Nku Ya ka Ọ ga-eji kpuchie gị, ọ bụkwa n’okpuru nku Ya abụọ ka ị ga-agbaba,” ka ode abụ ahụ dere.—Abụ Ọma 91:4.
E Nweta Mba Na-adịghị Erube Isi
3. Gịnị si ná nnupụisi Izrel nupụrụ ugboro ugboro pụta?
3 Mgbe mba Izrel rubeere Jehova isi, O lekọtara ya nke ọma mgbe nile. Ma, ọtụtụ mgbe, ndị ahụ hapụrụ Onye mere ha ma chigharịkwuru chi dị iche iche e ji osisi na nkume mee—“ihe tọgbọrọ n’efu, nke na-adịghị aba uru, nke na-adịghị anapụtakwa.” (1 Samuel 12:21) Mgbe o nupụsịrị isi otú ahụ ruo ọtụtụ narị afọ, mba ahụ n’ozuzu ya bịara si nnọọ n’ezi ofufe dapụ nke na o siziiri ya ike ịlaghachi. N’ihi ya, Jizọs kwara arịrị, sị: “Jeruselem, Jeruselem, nke na-egbu ndị amụma, nke na-atụkwa ndị e zigaara ya nkume,—lee ọtụtụ ugboro m chọrọ ịchịkọta ụmụ gị, dị ka nnekwu ọkụkọ si achịkọta ụmụ ya n’okpuru nku ya! Ma unu achọghị ya. Lee! A gbahapụworo unu ụlọ unu.”—Matiu 23:37, 38.
4. Olee otú mgbahapụ Jehova gbahapụrụ Jeruselem si pụta ìhè na 70 O.A.?
4 E mere ka mgbahapụ Jehova gbahapụrụ Izrel dị isi ike pụta ìhè n’ụzọ dị mwute na 70 O.A. N’afọ ahụ, usuu ndị agha Rom, bụ́ ndị weliri nnọọ ọkọlọtọ ha ndị e sere ugo na ha elu, bịakwasịrị Jeruselem iji gbukpọọ ndị bi na ya. N’oge ahụ, ndị na-eme Ememe Ngabiga jupụtara n’obodo ahụ. Ọtụtụ àjà ha chụrụ emeghị ka ha nweta ihu ọma Chineke. Nke 1 Samuel 15:22.
ahụ na-echetara anyị n’ụzọ dị mwute, okwu Samuel gwara Eze Sọl na-adịghị erube isi: “Àjà nsure ọkụ na àjà ọzọ, hà na-atọ Jehova ụtọ dị ka ige ntị olu Jehova? Lee, ige ntị dị mma karịa ịchụ àjà, ịṅa ntị dị mma karịa abụba ebulu.”—5. Olee ụdị nrubeisi Jehova na-achọ, oleekwa otú anyị si mara na ụdị nrubeisi ahụ kwere omume?
5 N’agbanyeghị na Jehova chọsiri ike ka a na-erube isi, ọ maara nke ọma banyere erughị eru nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè. (Abụ Ọma 130:3, 4) Ihe ọ chọrọ bụ ezi obi na nrubeisi nke dabeere n’okwukwe, ịhụnanya, na ịtụ egwu ziri ezi imejọ ya. (Deuterọnọmi 10:12, 13; Ilu 16:6; Aịsaịa 43:10; Maịka 6:8; Ndị Rom 6:17) ‘Oké ìgwè ndị àmà dịrị ndụ tupu oge Ndị Kraịst,’ bụ́ ndị nọgidere na-eguzosi ike n’ezi ihe mgbe ha chere ọnwụnwa ndị tara akpụ, ọbụna ọnwụ, ihu, gosiri na nrubeisi dị otú ahụ kwere omume. (Ndị Hibru 11:36, 37; 12:1) Lee ka ndị a si mee ka obi Jehova ṅụrịa! (Ilu 27:11) Otú ọ dị, ndị ọzọ ji ikwesị ntụkwasị obi malite ma ha anọgideghị na-erube isi. Otu n’ime ha bụ Eze Joash nke Juda oge ochie.
Eze nke Mkpakọrịta Ọjọọ Lara n’Iyi
6, 7. Olee ụdị eze Joash bụ mgbe Jehoịada nọ ndụ?
6 Ọ fọrọ nke nta ka e gbuo Eze Joash mgbe ọ ka bụ nwa ọhụrụ. Mgbe Joash ruru afọ asaa, Onyeisi nchụàjà bụ́ Jehoịada ji obi ike kpọpụta ya n’ebe e zoro ya ma chie ya eze. Ebe ọ bụ na Jehoịada na-atụ egwu Chineke bụụrụ Joash nna na onye ndụmọdụ, onye ọchịchị ahụ na-eto eto “[mere] ihe ziri ezi n’anya Jehova ụbọchị nile nke Jehoịada, bụ́ onye nchụàjà.”—2 Ihe E Mere 22:10–23:1, 11; 24:1, 2.
7 Ezi ọrụ Joash rụrụ gụnyere ime ka ụlọ nsọ Jehova dị ọhụrụ—ọrụ nke “dị n’obi Joash.” O chetaara Onyeisi Nchụàjà bụ́ Jehoịada mkpa ọ dị ịnata ndị Juda na Jeruselem ụtụ isi ụlọ nsọ, dị ka ‘Mozis nyere n’iwu,’ iji nweta ego a ga-eji rụzie ụlọ nsọ ahụ. O doro anya na Jehoịada enwewo ihe ịga nke ọma n’ịgba eze ahụ na-eto eto ume ịmụ na irube isi n’Iwu Chineke. N’ihi ya, e meziri ụlọ nsọ ahụ nakwa arịa ndị dị n’ime ya ngwa ngwa.—2 Ihe E Mere 24:4, 6, 13, 14; Deuterọnọmi 17:18.
8. (a) Olee isi ihe kpatara ọdịda Joash dara n’ụzọ ime mmụọ? (b) Gịnị ka nnupụisi eze ahụ mesịrị duga ya ime?
8 N’ụzọ dị mwute, Joash anọgideghị na-erubere Jehova isi. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Okwu Chineke na-agwa anyị, sị: “Mgbe ọnwụ Jehoịada gasịrị, ndị isi Juda bịara, kpọọ isiala nye eze. Mgbe ahụ eze gere ha ntị. Ha wee hapụ ụlọ Jehova, bụ́ Chineke nke ndị bụ́ nna ha, wee fee Asherim na arụsị ofufe: iwe wee dịkwasị Juda na Jeruselem n’ikpe ọmụma ha nke a.” Mmetụta na-adịghị mma nke ndị isi Juda dugakwara eze ahụ n’ileghara ndị amụma Chineke anya, ndị otu n’ime ha bụ nwa Jehoịada bụ́ Zekaraịa, bụ́ onye ji obi ike baara Joash na ndị ahụ mba maka nnupụisi ha. Kama ichegharị, Joash mere ka e jiri nkume tụgbuo Zekaraịa. Lee nwoke kpọrọ obi nkụ ma na-enupụ isi Joash ghọworo—ihe a nile bụ n’ihi na ọ dabara ná mkpakọrịta ọjọọ!—2 Ihe E Mere 24:17-22; 1 Ndị Kọrint 15:33.
9. Olee otú ihe mesịrị dakwasị Joash na ndị isi ahụ si emesi nzuzu dị ná nnupụisi ike?
9 N’ịbụ ndị gbahapụworo Jehova, olee otú 2 Ihe E Mere 24:23-25; 2 Ndị Eze 12:17, 18) Lee ka okwu Jehova gwara Izrel si bụrụ eziokwu: “Ọ bụrụ na i geghị ntị olu Jehova, bụ́ Chineke gị, ilezi anya ime ihe nile O nyere n’iwu na ụkpụrụ Ya nile . . . ; nkọcha nile ndị a ga-abịakwasị gị, wee ruo gị ahụ́”!—Deuterọnọmi 28:15.
ihe si gaara Joash na ajọ ndị isi bụ́ ndị enyi ya? Usuu ndị agha Siria—nanị “ndị ikom ole na ole”—wakporo Juda ma “bibie ndị isi nile nke ndị Juda.” Ndị mwakpo ahụ manyekwara eze ahụ inye ha ihe onwunwe nke ya nakwa ọlaedo na ọlaọcha nke ebe nsọ ahụ. Ọ bụ ezie na e gbughị Joash, ọ ghọrọ onye na-adịkwaghị ike na onye ọrịa. N’oge na-adịghị anya ka e mesịrị, ndị na-agba izu mmegide bụ́ ndị so ná ndị ohu ya gburu ya. (Odeakwụkwọ nke Nrubeisi Zọpụtara
10, 11. (a) Gịnị mere ịtụgharị uche na ndụmọdụ Jehova nyere Beruk ji bụrụ ihe enyemaka? (b) Ndụmọdụ dị aṅaa ka Jehova nyere Beruk?
10 Ị̀ na-enwe nkụda mmụọ mgbe ụfọdụ n’ihi na ọ bụ mmadụ ole na ole n’ime ndị ị na-ezute n’ozi Ndị Kraịst na-egosi mmasị n’ozi ọma ahụ? Ị̀ na-ekwoso ndị aka ji akụ̀ na ụzọ ndụ ha nke ime otú masịrị onye ekworo mgbe ụfọdụ? Ọ bụrụ otú ahụ, tụlee ihe banyere Beruk, bụ́ odeakwụkwọ Jeremaịa, nakwa banyere ndụmọdụ ịhụnanya Jehova nyere ya.
11 Beruk nọ na-achọ idetu ozi amụma mgbe Jehova lekwasịrị ya onwe ya anya. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Beruk malitere ịkwa arịrị banyere ọnọdụ ya ná ndụ na ịchọ ihe dị mma karịa ihe ùgwù ya pụrụ iche nke ijere Chineke ozi. N’ịchọpụta mgbanwe a Beruk gbanwere n’àgwà, Jehova ji obiọma nye ya ndụmọdụ doro anya, na-asị: “Ị̀ na-achọrọ onwe gị ihe ukwu? achọla ha: n’ihi na, lee, M gaje ime ka ihe ọjọọ bịakwasị anụ ahụ́ nile, bụ́ mmadụ, . . . ma M ga-enye gị ndụ gị ka ọ bụrụ ihe nkwata n’ebe nile ị ga-eje.”—Jeremaịa 36:4; 45:5.
12. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị izere ịchọrọ onwe anyị “ihe ukwu” n’usoro ihe dị ugbu a?
12 Ị̀ pụrụ ịhụ nchegbu miri emi Jehova nwere maka Beruk site n’okwu ọ gwara ezigbo nwoke a, bụ́ onye jiworo ikwesị ntụkwasị obi na obi ike soro Jeremaịa jeere ya ozi? N’otu aka ahụ taa, Jehova na-enwe nchegbu miri emi maka ndị a na-anwa ọnwụnwa ịchụso ihe ha chere na ọ bụ ihe ndị ka mma n’usoro ihe a. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, dị ka Beruk, ọtụtụ n’ime ndị dị otú ahụ anabatawo mgbazi ịhụnanya nke ụmụnna ime mmụọ ha tozuru okè nyere ha. (Luk 15:4-7) Ee, ka anyị nile ghọta na ndị na-achọrọ onwe ha “ihe ukwu” n’usoro ihe a enweghị ọdịnihu. Ọ bụghị nanị na ndị dị otú ahụ adịghị achọta ezi obi ụtọ, kama, nke ka njọ bụ na ha ga-eso ụwa a na ọchịchọ ya nile nke ọdịmma onwe onye nanị na-akpali, gabiga n’isi nso.—Matiu 6:19, 20; 1 Jọn 2:15-17.
13. Gịnị ka ihe ndekọ banyere Beruk na-akụziri anyị banyere ịdị umeala n’obi?
13 Ihe ndekọ banyere Beruk na-akụzikwara anyị ezigbo ihe banyere ịdị umeala n’obi. Rịba ama na Jehova ejighị aka ya nye Beruk ndụmọdụ kama o si n’aka Jeremaịa, bụ́ onye Beruk maara nnọọ ezughị okè na amaghị eme ya nke ọma ma eleghị anya. (Jeremaịa 45:1, 2) N’agbanyeghị nke ahụ, Beruk emeghị mpako; o ji obi umeala ghọta onye ndụmọdụ ahụ si n’aka ya n’ezie—Jehova. (2 Ihe E Mere 26:3, 4, 16; Ilu 18:12; 19:20) Ya mere, ọ bụrụ na anyị ‘azọhie ụkwụ tupu anyị amara banyere ya’ ma nweta ndụmọdụ dị anyị mkpa site n’Okwu Chineke, ka anyị ṅomie ntozu okè, nghọta ime mmụọ, na ịdị umeala n’obi Beruk.—Ndị Galeshia 6:1.
14. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị na-erubere ndị na-edu ndú n’etiti anyị isi?
14 Anyị inwe obi umeala dị otú ahụ na-enyekwara ndị na-enye anyị ndụmọdụ aka. Ndị Hibru 13:17 na-ekwu, sị: “Na-eruberenụ ndị na-edu ndu n’etiti unu isi, na-anọkwanụ n’okpuru, n’ihi na ha na-eche mkpụrụ obi unu nche dị ka ndị ga-aza ajụjụ; ka ha wee jiri ọṅụ na-eme nke a, ọ bụghị n’isu ude, n’ihi na nke a ga-ebibiri unu ihe.” Lee ka ndị okenye si agwa Jehova ihe nile dị ha n’obi mgbe mgbe, na-ekpeku ya ekpere maka obi ike, amamihe, na akọ ndị dị mkpa iji na-arụzu akụkụ a tara akpụ nke ọrụ ọzụzụ atụrụ ha! Ka anyị “werenụ ndị dị otú ahụ ná ndị bara uru.”—1 Ndị Kọrint 16:18.
15. (a) Olee otú Jeremaịa si gosipụta obi ike o nwere n’ebe Beruk nọ? (b) Olee otú e si kwụghachi Beruk ụgwọ maka nrubeisi o ji obi umeala gosipụta?
15 O doro anya na Beruk gbanwere echiche ya, n’ihi na, mgbe nke ahụ gasịrị, Jeremaịa nyere ya ọrụ kasị eweta ihe ịma aka—ịga n’ụlọ nsọ ma gụpụta ozi ikpe ọmụma ahụ ya onwe ya deturu bụ́ nke ọ nụrụ n’ọnụ Jeremaịa. Beruk ò rubere isi? Ee, o “[mere] dị ka ihe nile si dị nke Jeremaịa, bụ́ onye amụma, nyere ya n’iwu.” N’ezie, ọ gụkwaara ndị isi Jeruselem otu ozi ahụ, bụ́ nke ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na o were ya obi ike dị ukwuu iji mee ya. (Jeremaịa 36:1-6, 8, 14, 15) Mgbe ndị Babilọn bibiri obodo ahụ ihe dị ka afọ 18 ka e mesịrị, cheedị banyere obi ekele Beruk na-aghaghị inwewo maka ịbụ onye e chebere n’ihi na o gere ntị n’ịdọ aka ná ntị Jehova ma kwụsị ịchọrọ onwe ya “ihe ukwu”!—Jeremaịa 39:1, 2, 11, 12; 43:6.
Nrubeisi n’Oge Nnọchibido Chebere Ndụ
16. Olee otú Jehova si gosi ndị Juu nọ na Jeruselem ọmịiko mgbe ndị Babilọn nọchibidoro ha na 607 T.O.A.?
16 Mgbe e bibiri Jeruselem na 607 T.O.A., ọmịiko Chineke nwere n’ebe ndị na-erube isi nọ pụtakwara ìhè ọzọ. Mgbe nnọchibido ahụ ruru ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu, Jehova gwara ndị Juu, sị: “Lee, M na-eche n’ihu unu ụzọ ndụ na ụzọ ọnwụ. Onye na-anọgide n’obodo a ga-anwụ site ná mma agha, na site n’oké ụnwụ, na site n’ajọ ọrịa na-efe efe: ma onye na-apụ apụ, nke na-adakwuru ndị Kaldea ndị na-anọchigide unu n’agha, ọ ga-adị ndụ, ndụ ya ewee ghọọrọ ya ihe nkwata.” (Jeremaịa 21:8, 9) Ọ bụ ezie na ndị bi na Jeruselem kwesịrị mbibi, Jehova gosiri ndị na-erubere ya isi ọmịiko, ọbụna n’oge awa ikpeazụ ahụ dị oké mkpa. *
17. (a) Ụzọ abụọ dị aṅaa ka e si nwalee nrubeisi Jeremaịa mgbe Jehova nyere ya ntụziaka ịgwa ndị Juu ahụ a nọchibidoro ka ha ‘dakwuru ndị Kaldea’? (b) Olee otú anyị pụrụ isi rite uru site ná nrubeisi Jeremaịa ji obi ike gosipụta?
17 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ịgwa ndị Juu ka ha chịlie aka elu lekwara nrubeisi Jeremaịa ule. Otu ihe kpatara ya bụ na ọ na-ekworo aha Chineke ekworo. Ọ chọghị ka ndị iro bụ́ ndị ga-asị na ọ bụ arụsị ha ndị na-adịghị ndụ mere ha ji nwee mmeri, kọchaa aha ahụ. (Jeremaịa 50:2, 11; Abụ Ákwá 2:16) Tụkwasị na nke ahụ, Jeremaịa maara na site n’ịgwa ndị ahụ ka ha chịlie aka elu, ọ nọ na-etinye ndụ ya n’oké ihe ize ndụ, n’ihi na ọtụtụ ga-akọwa okwu ya dị ka ịgba ọchịchị mgba okpuru. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ tụghị ụjọ, kama o ji nrubeisi kwupụta okwu Jehova. (Jeremaịa 38:4, 17, 18) Dị ka Jeremaịa, anyị onwe anyị kwa na-akpọsa ozi ndị mmadụ na-achọghị ịnụ. Ọ bụ otu ozi ahụ e ji maka ya ledaa Jizọs anya. (Aịsaịa 53:3; Matiu 24:9) Ya mere, ka anyị ghara ‘ịtụ egwu mmadụ,’ kama dị ka Jeremaịa, ka anyị jiri obi ike na-erubere Jehova isi, na-atụkwasị ya obi n’ụzọ zuru ezu.—Ilu 29:25.
Nrubeisi n’Agbanyeghị Mwakpo Gọg
18. Ule dị aṅaa nke nrubeisi ka ndị ohu Jehova ga-eche ihu n’ọdịnihu?
18 N’oge na-adịghị anya, a ga-ebibi ajọ usoro ihe Setan dum ‘n’oké mkpagbu’ a na-enwetụbeghị ụdị ya. (Matiu 24:21) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na tupu mgbe ahụ nakwa n’oge ahụ, a ga-ele okwukwe na nrubeisi nke ndị Chineke ule n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ. Dị ka ihe atụ, Bible na-agwa anyị na Setan, n’ọnọdụ ya dị ka “Gọg, nke ala Megọg,” ga-awakpo ndị ohu Jehova n’ụzọ dị egwu, na-akwali usuu ndị agha a kọwara dị ka “usuu ndị agha bara ụba . . . , dị ka igwe ojii ikpuchi ala.” (Ezikiel 38:2, 14-16) N’ịbụ ndị a karịrị n’ọnụ ọgụgụ na ndị na-ejighị ngwá agha, ndị Chineke ga-achọ nchebe n’okpuru “nku” Jehova, bụ́ nke ọ na-agbasa iji kpuchie ndị na-erube isi.
19, 20. (a) N’ihi gịnị ka Izrel irube isi ji dị oké mkpa mgbe ha nọ n’Oké Osimiri Uhie? (b) Olee otú iji ekpere na-atụgharị uche n’ihe ndekọ banyere Oké Osimiri Uhie ahụ pụrụ isi baara anyị uru taa?
19 Ọnọdụ a na-echetara anyị Ọpụpụ Izrel site n’Ijipt. Mgbe Jehova tisịrị Ijipt ihe otiti iri dị egwu, o sighị n’ụzọ kasị nso e si aga Ala Nkwa ahụ duo ndị ya, kama o duuru ha gawa n’Oké Osimiri Uhie, bụ́ ebe a pụrụ ijide ma wakpo ha n’ụzọ dị mfe. N’ụzọ ndị agha si ele ihe anya, nke ahụ yiri ihe ga-eweta ọdachi. A sị na ị nọ ebe ahụ, ị̀ gaara egewo ntị n’okwu Jehova si n’ọnụ Mozis kwuo, ma jiri obi ike zuru ezu zọrọ njem gawa n’Oké Osimiri Uhie, ebe ị maara na ọ bụghị ụzọ ahụ ka e si aga Ala Nkwa ahụ?—Ọpụpụ 14:1-4.
20 Ka anyị na-agụrụ Ọpụpụ isi 14 gaa n’ihu, anyị na-ahụ otú Jehova si napụta ndị ya ná ngosipụta dị egwu nke ike ya. Lee ka ihe ndekọ ndị dị otú ahụ pụrụ isi wusikwuo okwukwe anyị ike mgbe anyị wepụtara oge iji mụọ ma tụgharịa uche na ha! (2 Pita 2:9) N’aka nke ya, okwukwe siri ike na-ewusikwu anyị ike irubere Jehova isi, ọbụna mgbe ihe ndị ọ chọrọ n’aka anyị yiri ka ha na-emegide ụzọ iche echiche nke mmadụ. (Ilu 3:5, 6) Ya mere, jụọ onwe gị, sị, ‘Àna m agbalịsi ike iwulite okwukwe m site n’iji ịdị uchu na-amụ Bible, na-ekpe ekpere, ma na-atụgharị uche, nakwa site n’iso ndị Chineke na-akpachi anya?’—Ndị Hibru 10:24, 25; 12:1-3.
Nrubeisi Na-eme Ka E Nwee Olileanya
21. Ngọzi ndị dị aṅaa ka ndị na-erubere Jehova isi ga-enweta n’oge a na n’ọdịnihu?
21 Ndị na-eme ka nrubeisi nye Jehova bụrụ ụzọ ndụ ha na-ahụ, ọbụna ugbu a, mmezu nke Ilu 1:33, bụ́ nke na-asị: “Ma onye [ji nrubeisi] na-ege m ntị ga-ebi ná ntụkwasị obi, ọ ga-anọkwa jụụ n’atụghị oké egwu ihe ọjọọ.” Lee ka okwu nkasi obi ndị a ga-esi dị irè n’ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ na-abịanụ nke Jehova! N’ezie, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mgbe ihe ndị a nile malitere ime, guzonụ kwem ma welie isi unu elu, n’ihi na mgbapụta unu na-eru nso.” (Luk 21:28) N’ụzọ doro anya, ọ bụ nanị ndị na-erubere Chineke isi ga-enwe obi ike ịṅa ntị n’okwu ndị a.—Matiu 7:21.
22. (a) Olee ihe mere ndị Jehova ga-eji na-enwe obi ike? (b) Olee ihe ndị a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
22 Ihe ọzọ mere a ga-eji na-enwe obi ike bụ na “Onyenwe anyị Jehova agaghị eme ihe, ma ọ bụrụ na O kpugheghị izu nzuzo Ya nye ndị ohu Ya, bụ́ ndị amụma Ya.” (Emọs 3:7) Taa, Jehova adịghị enye ndị amụma ike mmụọ nsọ ya dị ka o mere n’oge gara aga; kama nke ahụ, o nyewo òtù ohu na-ekwesị ntụkwasị obi ọrụ inye ezinụlọ ya nri ime mmụọ n’oge ya. (Matiu 24:45-47) Ya mere, lee ka o si dị mkpa ka anyị na-erubere “ohu” ahụ isi! Dị ka isiokwu na-esonụ ga-egosi, nrubeisi dị otú ahụ na-egosipụtakwa àgwà anyị n’ebe Jizọs, bụ́ onye nwe “ohu” ahụ, nọ. Ọ bụ ya bụ Onye nwe “ịṅa ntị [“nrubeisi,” NW] ndị dị iche iche.”—Jenesis 49:10.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 1 Ọ bụ ezie na a na-egosikarị ya dị ka anụ na-enweghị obi ike, “nne ọkụkọ na-alụgide ọgụ ruo n’ọnwụ iji chebe ụmụ ya pụọ ná mmerụ ahụ́,” ka otu akwụkwọ nke òtù na-ahụ maka nchebe nke ụmụ anụmanụ bipụtara, na-ekwu.
^ par. 16 Jeremaịa 38:19 na-ekpughe na ọtụtụ ndị Juu ‘dakwuuru’ ndị Kaldea, e gbughịkwa ha kama a dọọrọ ha n’agha. A gwaghị anyị ma ọ bụ ihe Jeremaịa kwuru mere ha ji chịlie aka elu. Otú o sina dị, na e gbughị ha gosiri na ihe onye amụma ahụ kwuru mezuru.
Ị̀ Na-echeta?
• Gịnị si ná nnupụisi Izrel nupụrụ ugboro ugboro pụta?
• Olee otú ụzọ ndụ Eze Joash si metụta ya, ma ná mmalite ndụ ya ma n’ikpeazụ ya?
• Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’aka Beruk?
• N’ihi gịnị ka ndị Jehova na-erube isi na-ejighị nwee ihe mere ha ga-eji na-atụ egwu ka usoro ihe a na-eru ọgwụgwụ ya?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 13]
N’okpuru nduzi Jehoịada, Joash na-eto eto rubeere Jehova isi
[Foto dị na peeji nke 15]
Mkpakọrịta ọjọọ mere ka Joash gbuo onye amụma Chineke
[Foto dị na peeji nke 16]
Ị̀ gaara erubeworo Jehova isi ma hụ ike nzọpụta ya dị egwu?