“Na-azụ Onwe Gị”
“Na-azụ Onwe Gị”
CITIUS, altius, fortius—gbasikwuo ike, wụlikwuo elu, dịkwuo ike! Ihe ndị a bụ echiche ndị ndị na-eme egwuregwu na Gris na Rom oge ochie na-agbalị inwe. Ruo ọtụtụ narị afọ, n’Olympia, Delphi, na Nemea, nakwa n’Isthmus nke Kọrint, a na-enweta “ngọzi” n’aka chi dị iche iche maka egwuregwu ndị siri ike, ọtụtụ puku mmadụ na-ekirikwa ha. Ọtụtụ afọ nke ịrụsi ọrụ ike na-eme ka mmadụ nwee ihe ùgwù nke iso sọọ mpi n’egwuregwu ndị a. Inwe mmeri na-eme ka ndị mmeri ahụ na obodo ha nwee otuto dị ukwuu.
Ọ bụghị ihe ijuanya na n’ebe dị otú ahụ a na-eme egwuregwu ndị a, ndị dere Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst jiri ọsọ ime mmụọ nke Ndị Kraịst na-agba tụnyere egwuregwu. Iji mee ka a ghọta isi ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ dị n’ozizi ha, ndịozi bụ́ Pita na Pọl ji ihe atụ ndị dabeere n’egwuregwu ndị ahụ mee ihe n’ụzọ bụ́ ịgba. N’oge anyị, a nọgidere na-agba otu ọsọ Ndị Kraịst ahụ tara akpụ. Ndị Kraịst narị afọ mbụ aghaghị ịsọ mpi megide usoro ihe ndị Juu; taa, anyị aghaghị ‘ịsọ mpi’ megide usoro ihe nke ụwa a nke mbibi ya dị nnọọ ezi nso. (2 Timoti 2:5; 3:1-5) Ụfọdụ pụrụ ịchọpụta na “ọsọ okwukwe” nke ha adịghị akwụsị akwụsị, na ọ na-agwụkwa ike. (1 Timoti 6:12, The New English Bible) Inyocha myirịta dị n’etiti ime egwuregwu na ọsọ Ndị Kraịst e kwuru okwu ya na Bible ga-aba uru nke ukwuu.
Onye Ọzụzụ Bụ́ Aka Ochie
Ihe ịga nke ọma nke onye na-eme egwuregwu dabeere n’ụzọ dị ukwuu n’ebe onye na-enye ya ọzụzụ nọ. Banyere egwuregwu ndị e mere n’oge ochie, akwụkwọ bụ́ Archaeologia Graeca na-ekwu, sị: “Iwu ji ndị na-asọ mpi ịṅụ iyi na ha ejiwo ọnwa iri zuru ezu nwee mmega ahụ́ iji kwadebe.” Ọzụzụ siri ike dịkwa Ndị Kraịst mkpa. Pọl dụrụ Timoti, bụ́ Onye Kraịst bụ́ okenye ọdụ, sị: “Jiri nsọpụrụ Chineke na-azụ onwe gị dị ka nzube gị.” (1 Timoti 4:7) Ònye na-azụ Ndị Kraịst “na-eme egwuregwu”? Ọ dịghị onye ọzọ ọ bụ ma ọ bụghị Jehova Chineke n’onwe ya! Pita onyeozi dere, sị: “Chineke nke obiọma nile na-erughịrị mmadụ . . . ga-enyesị unu ọzụzụ unu n’onwe ya, ọ ga-eme ka unu guzosie ike, ọ ga-eme ka unu sie ike.”—1 Pita 5:10.
Dị ka akwụkwọ bụ́ Theological Lexicon of the New Testament si kwuo, okwu ahụ bụ́ “ga-enyesị unu ọzụzụ” sitere na ngwaa Grik nke pụtara n’ụzọ bụ́ isi “ime ka ihe [ma ọ bụ mmadụ] ruo eruo maka ihe a chọrọ iji ya eme, ịkwadebe ya ma mee ka o kwekọọ n’ihe a chọrọ iji ya eme.” N’otu aka ahụ, Greek-English Lexicon nke Liddell na Scott dere na-ekwu na a pụrụ ịkọwa ngwaa a dị ka “kwadebe, zụọ, ma ọ bụ jikere nke ọma.” N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jehova si ‘akwadebe anyị, azụ anyị, ma ọ bụ na-eme ka anyị jikere nke ọma’ maka ọsọ Ndị Kraịst a chọrọ mgbalị siri ike? Iji ghọta myirịta a, ka anyị tụlee ụzọ ụfọdụ onye na-enye ọzụzụ si eme ihe.
Akwụkwọ bụ́ The Olympic Games in Ancient Greece na-ekwu, sị: “Ndị ọ bụ ọrụ ha inye ndị na-eto eto ọzụzụ na-eji ụzọ abụọ bụ́ isi eme ya, nzube nke mbụ bụ ịgba onye ahụ a na-enye ọzụzụ ume itinye mgbalị nkịtị ruo ókè ike kwere ya iji rụzuo ihe kasị mma, nke abụọ bụ iji hụ na ọ na-eme ka nkà ya ka mma.”
N’ụzọ yiri nke ahụ, Jehova na-agba anyị ume ma na-ewusi anyị ike imezu ihe kasịnụ anyị pụrụ ime na imeziwanye nkà anyị n’ozi ya. Chineke anyị na-enye anyị ume site na Bible, nzukọ elu ala ya, na Ndị Kraịst ibe anyị tozuru okè. Mgbe ụfọdụ ọ na-azụ anyị site n’ịdọ anyị aka ná ntị. (Ndị Hibru 12:6) N’oge ndị ọzọ, ọ pụrụ ikwe ka ọnwụnwa dịgasị iche iche na ihe isi ike bịakwasị anyị ka anyị wee nwee ike ịzụlite ntachi obi. (Jems 1:2-4) Ọ na-enyekwa anyị ume dị anyị mkpa. Aịzaịa onye amụma na-ekwu, sị: “Ndị na-ele anya Jehova ga-agbanwe ike ha; ha ga-efego elu na nkù dị ka ugo; ha ga-agba ọsọ, ike agaghị agwụkwa ha; ha ga-eje ije, ghara ịda mbà.”—Aịsaịa 40:31.
Karịsịa, Chineke na-enye anyị mmụọ nsọ ya n’ụba, bụ́ nke na-ewusi anyị ike ịnọgide na-ejere ya ozi ọ na-anara nke ọma. (Luk 11:13) N’ọtụtụ ọnọdụ, ndị ohu Chineke atachiwo obi n’ọnwụnwa nke okwukwe ndị siri ike ruo ogologo oge. Ndị meworo otú ahụ bụ ndị ikom na ndị inyom nkịtị dị ka onye ọ bụla n’ime anyị. Ma ndabere ha dabeere kpam kpam na Chineke enyeworo ha aka ịtachi obi. N’ezie, ‘ike karịrị ike nkịtị bụ nke Chineke, n’abụghịkwa nke sitere n’aka ha onwe ha.’—2 Ndị Kọrint 4:7.
Onye Ọzụzụ nke Nwere Ọmịiko
Otu n’ime ọrụ onye na-enye ọzụzụ n’oge ochie bụ “ịmata ụdị mmega ahụ́ dị onye nke ọ bụla na-eme egwuregwu mkpa na ugboro ole ọ ga-eme ya na ụdị egwuregwu ọ ga-eme,” ka otu ọkà mmụta na-ekwu. Ka Chineke na-azụ anyị, ọ na-eburu ọnọdụ, ikike, otú e si kee anyị, na erughị eru anyị n’otu n’otu, n’uche. Ọtụtụ mgbe, n’oge Jehova na-azụ anyị, anyị na-arịọ ya dị ka Job rịọrọ, sị: “Biko, cheta na dị ka ụrọ ka Ị kpụworo m.” (Job 10:9) Olee otú onye na-enye anyị ọzụzụ nke nwere ọmịiko si emeghachi omume? Devid dere banyere Jehova, sị: “Ya onwe ya maara otú a kpụworo anyị; Ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ.”—Abụ Ọma 103:14.
Ọ pụrụ ịbụ na i nwere nnukwu nsogbu ahụ́ ike bụ́ nke na-ebelata ihe ị pụrụ ime n’ozi, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na i nwechaghị ùgwù onwe onye. Ikekwe ị na-agbalịsi ike ịkwụsị otu àgwà ọjọọ, ma ọ bụ ị pụrụ iche na i nweghị ike ịnagide nrụgide ndị ọgbọ n’agbata obi gị, n’ebe ọrụ, ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ. N’agbanyeghị ihe pụrụ ịbụ ọnọdụ gị, ya adịla mgbe ị ga-echefu na Jehova ghọtara nsogbu gị karịa ka onye ọ bụla ọzọ ghọtara—gụnyere gị! Dị ka onye na-enye ọzụzụ nke na-eche banyere gị, ọ nọ ya mgbe nile inyere gị aka ma ọ bụrụ na ị bịaruo ya nso.—Jems 4:8.
Onye na-enye ọzụzụ n’oge ochie “pụrụ ịmata ọdịiche dị n’ike ọgwụgwụ ma ọ bụ adịghị ike nke ihe ndị kpatara ha na-abụghị mmega ahụ́
kama ọnọdụ uche, obi adịghị mma, nrụgide, na ihe ndị ọzọ. . . . Ihe [ndị na-enye ọzụzụ] na-arụ dị nnọọ ọtụtụ nke na ọbụna ha na-eleba anya ná ndụ onwe onye nke ndị na-eme egwuregwu ma na-etinye aka n’ebe ndị ha chere na ọ dị mkpa.”Ò nwere mgbe ọ na-adị gị ka ike ọ gwụrụ gị ma ọ bụ na ị dịghị ike n’ihi nrụgide na-adịghị akwụsị akwụsị na ọnwụnwa dị iche iche nke ụwa a? Dị ka onye na-enye gị ọzụzụ, Jehova nwere nnọọ mmasị n’ebe ị nọ. (1 Pita 5:7) Ọ na-adị ngwa n’ịchọpụta adịghị ike ma ọ bụ ike ọgwụgwụ ime mmụọ ọ bụla n’ime gị. Ọ bụ ezie na Jehova na-akwanyere nnwere onwe na nhọrọ onwe onye anyị ùgwù, n’ihi nchegbu maka ọdịmma ebighị ebi anyị, ọ na-enyere anyị aka n’ụzọ zuru ezu ma na-agbazi anyị mgbe ọ dị mkpa. (Aịsaịa 30:21) N’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụ site na Bible na akwụkwọ ndị dabeere na Bible, ndị okenye ime mmụọ nọ n’ọgbakọ, na òtù ụmụnna anyị na-ahụ n’anya.
“Njide Onwe Onye n’Ihe Nile”
N’ezie, a chọrọ ihe karịrị nanị inwe ezigbo onye na-enye ọzụzụ iji nwee ihe ịga nke ọma. Ọ dabeere n’ụzọ dị ukwuu n’ebe onye ahụ na-eme egwuregwu nọ nakwa na ya itinye onwe ya n’ọzụzụ ya siri ike. Usoro ahụ tara akpụ, ebe ọ bụ na ọzụzụ ahụ gụnyere izere ọtụtụ ihe na ịhọ nri. Horace, bụ́ onye na-ede uri na narị afọ mbụ T.O.A., kwuru na ndị na-asọ mpi “na-ezere ndị inyom na mmanya” iji “ruo ihe mgbaru ọsọ ha chọsiri ike iru.” Dị ka ọkà mmụta Bible bụ́ F. C. Cook si kwuo, ndị na-eme egwuregwu aghaghị igosipụta “njide onwe onye [ma] zere iri ihe ụfọdụ . . . ruo ọnwa iri.”
Pọl ji myirịta a mee ihe mgbe o degaara Ndị Kraịst nọ na Kọrint, bụ́ obodo nke maara banyere Egwuregwu Isthmus a na-eme n’ebe dị ya nso, akwụkwọ, sị: “Onye ọ bụla nke na-ekere òkè n’ịsọ mpi na-egosipụta njide onwe onye n’ihe nile.” (1 Ndị Kọrint 9:25) Ezi Ndị Kraịst na-ezere ụzọ ndụ ịhụ ihe onwunwe n’anya, nke rụrụ arụ, na nke na-adịghị ọcha nke ụwa. (Ndị Efesọs 5:3-5; 1 Jọn 2:15-17) A ghaghịkwa iyipụ àgwà asọpụrụghị Chineke na àgwà ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị ma yikwasị àgwà ndị yiri nke Kraịst.—Ndị Kọlọsi 3:9, 10, 12.
Olee otú a pụrụ isi mee nke a? Nke mbụ, rịba ama azịza Pọl ji ihe atụ siri ike nye: “M na-etipụta ahụ́ m ọnyá ma na-achịkwa ya dị ka ohu, ka a ghara inwe ụzọ ọ bụla m ga-esi bụrụ onye a jụrụ ajụ mgbe m kwusasịwooro ndị ọzọ ozi ọma.”—1 Ndị Kọrint 9:27.
Lee isi ihe gbara ọkpụrụkpụ nke Pọl kwupụtara n’ebe a! Ọ dịghị atụ aro ka mmadụ na-etipụta onwe ya ọnyá n’ụzọ nkịtị. Kama nke ahụ, o kwetara na ya na onwe ya na-alụ ọgụ. Mgbe ụfọdụ, o mere ihe ndị ọ na-achọghị ime ma ghara ime ihe ndị ọ chọrọ ime. Ma ọ lụrụ ọgụ ịghara ikwe ma ọlị ka adịghị ike ya chịkwaa ya. O ‘tipụtara ahụ́ ya ọnyà,’ jisie ike na-emeri ọchịchọ anụ ahụ́ na àgwà ndị kwekọrọ na ya.—Ndị Rom 7:21-25.
Ọ dị Ndị Kraịst nile mkpa ime otu ihe ahụ. Pọl kwuru banyere mgbanwe nke ụfọdụ ndị Kọrint bụ́ ndị tinyeburu aka n’ịkwa iko, ikpere arụsị, idina ụdị onwe, izu ohi, na ihe ndị ọzọ, mere. Gịnị nyeere ha aka ịgbanwe? Ọ bụ ike nke Okwu Chineke na mmụọ nsọ, tinyere mkpebi siri ike ha mere ime ihe kwekọrọ na ya. “Ma a sachawo unu,” ka Pọl kwuru, “ma e dowo unu nsọ, ma a kpọwo unu ndị ezi omume n’aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nakwa site ná mmụọ nke Chineke anyị.” (1 Ndị Kọrint 6:9-11) Pita dekwara ihe yiri nke ahụ banyere ndị hapụrụ àgwà ọjọọ ndị dị otú ahụ. Dị ka Ndị Kraịst, ha nile mere ezigbo mgbanwe.—1 Pita 4:3, 4.
Mgbalị A Na-etinye n’Ihe Bara Uru
Pọl mere ihe atụ nke mkpebi ya siri ike na otú o si lekwasị nnọọ anya n’ịchụso ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ, na-asị: “Otú m si eti ọkpọ bụ ka m wee ghara ịdị na-eti ikuku.” (1 Ndị Kọrint 9:26) Olee otú onye na-eti ọkpọ ga-esi na-eti ọkpọ? Akwụkwọ bụ́ The Life of the Greeks and Romans na-aza, sị: “Ọ bụghị nanị ike ọkpụkpụ aka ka a chọrọ, kamakwa ileru anya iji chọpụta ebe onye ya na ya na-eti ọkpọ na-adịghị ike. Ụzọ akọ e si eti ọkpọ nke a mụtara n’ụlọ akwụkwọ ndị mgba na ịdị ngwa itikarị onye ya na ya na-eti ọkpọ dịkwa mkpa.”
Anụ ahụ́ anyị na-ezughị okè bụ otu n’ime ndị anyị na ha na-akụ ọkpọ. Ànyị achọpụtawo ebe anyị “na-adịghị ike”? Ànyị dị njikere ịhụ onwe anyị dị ka ndị ọzọ si ahụ anyị—karịsịa dị ka Setan pụrụ isi hụ anyị? Nke ahụ chọrọ mmadụ iji ezi obi na-enyocha onwe ya na inwe ọchịchọ ime mgbanwe. Mmadụ pụrụ iduhie onwe ya n’ụzọ dị mfe. (Jems 1:22) Lee ka o si dị mfe ime ka àgwà amamihe na-adịghị na ya anyị kpara yie ihe ziri ezi! (1 Samuel 15:13-15, 20, 21) Nke ahụ dị ka ‘iti ikuku’ ọkpọ.
N’ụbọchị ikpeazụ ndị a, ndị chọrọ ime ihe na-atọ Jehova ụtọ ma nweta ndụ ekwesịghị ịla azụ n’ime nhọrọ n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ, n’etiti nzukọ Chineke na ụwa a rụrụ arụ. Ha aghaghị izere ịdị na-aṅagharị aṅagharị, bụrụ ndị ‘nwere uche abụọ, ndị na-adịghị akwụsi ike n’ụzọ ha nile.’ (Jems 1:8) Ha ekwesịghị itinye mgbalị n’ịchụso ihe ndị na-enweghị isi. Mgbe mmadụ gbasoro ụzọ ndụ a doro anya na nke chọrọ mkpebi siri ike, ọ ga-enwe obi ụtọ ‘ịga n’ihu ya ga-apụtakwa ìhè nye mmadụ nile.’—1 Timoti 4:15.
Ee, ọsọ Ndị Kraịst na-aga n’ihu. Jehova—Onye Ọzụzụ Ukwu anyị—ji ịhụnanya na-enye ntụziaka na nkwado dị mkpa iji tachie obi ma nwee mmeri n’ikpeazụ. (Aịsaịa 48:17) Dị ka ndị na-eme egwuregwu n’oge ochie, ọ dị anyị mkpa inye onwe anyị ọzụzụ, inwe njide onwe onye, na itinye uche n’ọgụ okwukwe anyị na-alụ. Anyị ga-enweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu maka mgbalị ndị anyị na-etinye n’ihe ndị bara uru.—Ndị Hibru 11:6.
[Igbe dị na peeji nke 31]
‘Tee Ya Mmanụ’
Ọ bụ onye ote mmanụ na-arụ otu n’ime ọrụ so n’ọzụzụ a na-enye onye na-eme egwuregwu na Gris oge ochie. Ọrụ ya na-abụ ite ndị na-aga inwe mmega ahụ́ mmanụ n’ahụ́. Ndị na-enye ọzụzụ “chọpụtara na iji nkà ahịọ aka n’uru ahụ́ tupu e nyewe ọzụzụ na-aba uru, nakwa na iji nlezianya ahịọ ya n’ụzọ dị nro na-enye aka eme ka ahụ́ kụjụọ ma dị onye na-eme egwuregwu nke nweworo ọzụzụ ruo ogologo oge, mma,” ka akwụkwọ bụ́ The Olympic Games in Ancient Greece na-ekwu.
Dị nnọọ ka ite mmanụ nkịtị n’ahụ́ pụrụ ịkụjụ ahụ́, ma na-agwọ agwọ, iji Okwu Chineke na-eme ihe n’ebe Onye Kraịst “na-eme egwuregwu” nke ike gwụworo nọ pụrụ ịgbazi ya, kasie ya obi, ma gwọọ ya. N’ihi ya, n’okpuru nduzi Jehova, e nyere ndị okenye ọgbakọ ndụmọdụ ikpe ekpere n’isi onye dị otú ahụ, “na-ete ya mmanụ n’aha Jehova” n’ụzọ ihe atụ, bụ́ ihe dị mkpa a ga-eme iji mee ka mmadụ gbakee n’ụzọ ime mmụọ.—Jems 5:13-15; Abụ Ọma 141:5.
[Foto dị na peeji nke 31]
Mgbe ha chụsịrị àjà, ndị na-eme egwuregwu na-aṅụ iyi na ha enwetawo ọzụzụ ruo ọnwa iri
[Ebe E Si Nweta Foto]
Musée du Louvre, Paris
[Foto dị na peeji nke 29]
Copyright British Museum