Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Ntorobịa Bụ́ Ndị Hụrụ Eziokwu ahụ n’Anya

Ndị Ntorobịa Bụ́ Ndị Hụrụ Eziokwu ahụ n’Anya

Ndị Ntorobịa Bụ́ Ndị Hụrụ Eziokwu ahụ n’Anya

“GỊNỊ ka okorobịa ga-eji mee ka ụzọ ya dị ọcha?” ka otu onye Hibru bụ́ ode abụ jụrụ ọtụtụ puku afọ gara aga. (Abụ Ọma 119:9) Ajụjụ a ka dị irè taa n’ihi na ndị na-eto eto na-eche ọtụtụ nsogbu ihu n’ụwa. Inwe mmekọahụ aghara aghara emewo ka ọtụtụ ndị na-eto eto nọrọ n’ihe ize ndụ nke ibute ọrịa AIDS, ihe dị ka ọkara nke ndị buteworo ọrịa ọjọọ a nọ n’agbata afọ 15 na 24. Ịṅụ ọgwụ ọjọọ na-akpatakwa ọtụtụ nsogbu, na-anapụ ndị na-eto eto ndụ ha n’ike. Egwú rụrụ arụ; ihe nkiri sinima ndị a na-egosi ihe ike na omume rụrụ arụ, ihe omume TV, na ihe nkiri vidio; na ihe na-akpali agụụ mmekọahụ a na-egosi n’Intanet, na-enwe mmetụta ọjọọ n’ahụ́ ndị na-eto eto. N’ihi ya, ajụjụ ahụ ode abụ ahụ jụrụ dị nnọọ n’obi nke ọtụtụ ndị nne na nna na ndị ntorobịa taa.

Ode abụ ahụ nyere azịza a maka ajụjụ ya: “Ọ bụ n’ilezi ya anya dị ka okwu Gị si dị.” N’ezie, Okwu Chineke, bụ́ Bible, bu ntụziaka ndị mara mma maka ndị na-eto eto, sitekwa n’ịgbaso ya, ọtụtụ ndị ntorobịa na-enwe ihe ịga nke ọma ná ndụ. (Abụ Ọma 119:105) Ka anyị nyochaa ihe atụ ụfọdụ nke ndị ntorobịa hụrụ Chineke n’anya bụ́ ndị na-agbalịsi ike ịnọgide na-akwụsi ike n’ụzọ ime mmụọ n’ụwa nke na-achọ ihe ụtọ na nke hụrụ ihe onwunwe n’anya.

Ha Na-enwe Ekele Maka Nduzi nke Ndị Mụrụ Ha

Jacob Emmanuel bụ ọsụ ụzọ oge nile ruo afọ ụfọdụ tupu ya amalite ije ozi n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Mexico. O ji ekele na-echeta otú mmasị o nwere n’ozi Chineke si malite: “Nne na nna m bụ ndị bụ́ isi kpaliri m, ọ bụ ezie na ụfọdụ ụmụnna ime mmụọ m nwere ahụmahụ bụ́ ndị m metere enyi anọwokwa na-enyere m nnọọ aka. Ha kpaliri m inwe mmasị n’ọrụ nkwusa ahụ. Nwayọọ nwayọọ ha duziri m n’okporo ụzọ nke ziri ezi; ọ dịbeghị mgbe ọ dịrị m ka ha rụgidere m arụgide.”

David, bụ́ onye jewororị ozi oge nile ruo ọtụtụ afọ, na-echeta otú obi si dị ya ụtọ na ndị mụrụ ya malitere ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche mgbe ya na nwanne ya nwoke ka dị obere. Mgbe nna ya nwụrụ, nne ya nọgidere n’ozi ọsụ ụzọ pụrụ iche. O lekọtara ha tụkwasị n’ikwusa ozi ọma ahụ. “Ọ dịghị mgbe ọ bụla ha manyere m ịbụ ọsụ ụzọ oge nile,” ka David na-ekwu, “ma ịsụ ụzọ tọrọ anyị ụtọ nke ukwuu dị ka ezinụlọ nke na mkpakọrịta na gburugburu ebe obibi anyị kpaliri m ime otu ihe ahụ.” Banyere mkpa nduzi na nlekọta dị mma sitere n’aka ndị nne na nna dị, David na-asị: “Kwa abalị, mama anyị na-agụrụ anyị akụkọ ndị sitere n’akwụkwọ bụ́ Site Na Paradais Etufuru Rue Paradais Enweghachiri. * Otú o si kọọrọ anyị ha nyeere anyị aka inwe mmasị iri nri ime mmụọ.”

Iji Nzukọ Akpọrọ Ihe

Ọ na-esiri ụfọdụ ndị ntorobịa ike iji nzukọ Ndị Kraịst akpọrọ ihe. Ha na-aga ha n’ihi na nne ha na nna ha na-akpọrọ ha aga. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ha anọgide na-aga nzukọ, ka oge na-aga, ha pụrụ imesị nwee mmasị ná nzukọ. Tụlee ihe banyere Alfredo, bụ́ onye malitere ije ozi oge nile mgbe ọ dị afọ 11. Ọ na-ekweta na mgbe ya dị afọ ise, ya gbalịrị ịhapụ nzukọ n’ihi na ọ na-eme ka ụra na-atụ ya ma ndị mụrụ ya adịghị ekwe ka o hie ụra mgbe nzukọ na-aga n’ihu. Ọ na-echeta, sị: “Ka m na-etolite, nke nta nke nta, abịara m nwekwuo mmasị ná nzukọ, karịsịa mgbe m mụtasịrị ka e si agụ na ka e si ede ihe n’ihi na ọ bụ mgbe ahụ ka m malitere ịza ajụjụ n’okwu nke aka m.”

Cintia, bụ́ nwa agbọghọ dị afọ 17 nke na-eje ozi dị ka ọsụ ụzọ oge nile, na-ekwu otú mkpakọrịta dị mma si kere òkè bụ́ isi na ya ịzụlite ịhụnanya maka ozi Chineke. Ọ na-ekwu, sị: “Iso ụmụnna na-enwe mmekọrịta dị mma na ịgachi nzukọ anya emewo ka ndị enyi m bụ́ ndị ụwa na ihe omume ndị na-amasị ndị na-eto eto, dị ka ịga egwú disko, ghara ịdị na-agụ m agụụ. Ige ntị n’azịza na ahụmahụ dị iche iche ná nzukọ emewo ka m nwee ọchịchọ nke inye Jehova ihe nile m nwere, echekwara m na ihe kasị mma m nwere bụ oge ntorobịa m. N’ihi ya, ekpebiri m iji ya jeere ya ozi.”

Otú ọ dị, ọ na-ekweta, sị: “E nwere oge, tupu e mee m baptizim, mgbe ọ na-adịrị m mfe ịhapụ nzukọ, na-eji ihe omume a ga-eme n’ụlọ ma ọ bụ ihe omume ndị ọzọ a na-eme n’ụlọ akwụkwọ emere ihe ngọpụ. Ahapụrụ m ịga nzukọ ọtụtụ ugboro, nke a malitekwara imetụta m n’ụzọ ime mmụọ. Amalitere m iso otu nwa okorobịa na-adịghị amụ Bible na-akpakọrịta. Site n’enyemaka Jehova, edoziri m ihe n’oge.”

Mkpebi Onwe Onye

Mgbe a jụrụ Pablo, bụ́ onye ntorobịa ọzọ na-ejere Jehova ozi oge nile, ihe o chere na ọ bụ isi ihe dị mkpa n’ịzụlite ịhụnanya maka eziokwu nke Okwu Chineke, o kwuru, sị: “Echere m na e nwere ihe abụọ: inwechi ọmụmụ ihe onwe onye anya na ịnụ ọkụ n’obi maka ọrụ nkwusa. Ana m ekele ndị mụrụ m maka ịkụziri m eziokwu banyere Jehova, echekwara m na nke a bụ ihe kasị mma ha pụrụ inye m. Otú ọ dị, ọ dị m mkpa ịghọta n’onwe m ihe mere m ji hụ Jehova n’anya. N’ihi ya, ọ dị mkpa ịma ‘ịdị obosara na ịdị omimi’ nke eziokwu Bible. Ọ bụ nanị n’ụzọ dị otú a ka Okwu Jehova ga-esi na-agụ anyị agụụ, bụ́ nke ga-eme ka ‘ọ na-ere anyị ọkụ n’obi’ ịgwa ndị ọzọ banyere ya. Ịnụ ọkụ n’obi dị otú ahụ anyị nwere maka ọrụ nkwusa ga-eme ka anyị nọgide na-enwe ekele maka eziokwu ahụ.”—Ndị Efesọs 3:18; Jeremaịa 20:9.

Jacob Emmanuel, nke a kpọtụrụ aha na mbụ, na-echetakwa mkpa ọ dị mmadụ iji aka ya họrọ ijere Jehova ozi. Ọ na-ekwu na ndị mụrụ ya adịghị mgbe ha manyere ya ịbụ onye e mere baptizim. “Ekweere m na nke a abụwo ihe kasị mma n’ihi na ana m ahụ ihe ndị dị mma ọ na-arụpụta. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị na-eto eto mụ na ha kpakọrịtara nnọọ kpebiri ịbụ ndị e mere baptizim otu oge. Ọ bụ ezie na nke ahụ dị mma, m pụrụ ịhụ na ụfọdụ mere ya ná mkpali, n’oge na-adịghịkwa anya nke ahụ gasịrị, ịnụ ọkụ n’obi ha maka ọrụ Alaeze jụrụ oyi. N’ọnọdụ nke m, ndị mụrụ m arụgideghị m ime mkpebi ịrara onwe m nye Jehova. Ọ bụ mkpebi m mere n’onwe m.”

Òkè Ọgbakọ Na-ekere

Ụfọdụ ndị na-eto eto amụtawo eziokwu nke Okwu Chineke n’onwe ha, n’enwetaghị enyemaka nke ndị mụrụ ha. N’ọnọdụ dị otú ahụ, ọ bụ ihe ịma aka n’ezie ịmụta ime ihe ziri ezi na ịnọgide na-eme ya.

Noé na-echeta otú eziokwu ahụ baruuru ya uru. Site mgbe ọ dị nnọọ obere, ọ na-ewekarị iwe ma na-eme ihe ike. Mgbe ọ malitere ịmụ Bible mgbe ọ dị afọ 14, omume ya malitere ịgbanwe, bụ́ nke ndị mụrụ ya, bụ́ ndị na-enweghị mmasị na Bible n’oge ahụ, nwere ekele dị ukwuu maka ya. Ka Noé na-enwe ọganihu ime mmụọ, ọ chọrọ iji ndụ ya jeere Chineke ozi n’ụzọ zuru ezu karị. Ọ bụ onye ozi oge nile ugbu a.

N’ụzọ yiri nke ahụ, Alejandro malitere inwe mmasị n’eziokwu nke Ndị Kraịst mgbe ọ dị nnọọ obere, ọ bụ ezie na ndị mụrụ ya enweghị mmasị na ya. N’ikwupụta ekele o nwere maka eziokwu ahụ, ọ na-asị: “A zụlitere m n’ezinụlọ na-ekpe Katọlik kemgbe gboo. Ma dị nnọọ ka ndị Kọmunist anọgidere m na-ajụsi ike ikwere na Chineke, ebe ọ bụ na chọọchị azaghị m ajụjụ ndị nọworo na-enye m nsogbu n’obi kemgbe m dị nnọọ obere. Nzukọ Jehova nyeere m aka inweta ihe ọmụma banyere Chineke. Ọ zọpụtara ndụ m n’ụzọ nkịtị n’ihi na ọ bụrụ na amụghị m Bible, eleghị anya, agaara m etinyewo aka n’omume rụrụ arụ, n’ịṅụ oké mmanya, ma ọ bụ n’ịṅụ ọgwụ ọjọọ. Apụrụ m ọbụna isonyewo n’òtù nnupụisi ụfọdụ, bụ́ nke gaara arụpụta ihe ndị dị mwute.”

Olee otú onye ntorobịa pụrụ isi nọgide na-achọ eziokwu ahụ ma rapagidesie ike na ya n’enwetaghị nkwado nke ndị mụrụ ya? N’ụzọ doro anya, ndị okenye na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ga-ekere òkè dị nnọọ oké mkpa. Noé na-echeta, sị: “Ọ dịghị mgbe ọ bụla owu mara m, ebe ọ bụ na Jehova na-anọ m nso mgbe nile. Ọzọkwa, enwetawo m nkwado nke ọtụtụ ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị na-ahụ n’anya bụ́ ndị ghọworo ndị nna m, ndị nne m, na ụmụnne m n’ụzọ ime mmụọ.” Ọ na-eje ozi ugbu a na Betel ma jiri oge ya na-eje ozi Chineke. N’otu aka ahụ, Alejandro na-akọ, sị: “Otu ihe nke m ga na-enwe ekele maka ya mgbe nile bụ na enwewo m ngọzi nke ịnọ n’ọgbakọ nke e nwere òtù ndị okenye na-egosi mmasị ịhụnanya n’ebe m nọ. Enwere m ekele karịsịa n’ihi na mgbe m malitere ịmụ Bible, bụ́ mgbe m dị afọ 16, enwekwara m ahụ́ erughị ala nke ọtụtụ ndị ntorobịa na-enwe. Ọ dịghị mgbe ezinụlọ ndị nọ n’ọgbakọ gbahapụrụ m. Ọ dịghị mgbe a na-enweghị onye na-anabata m nke ọma, ọ bụghị nanị ka m bịa n’ụlọ ya ma soro ya rie nri, kama ka anyị kpaa nkata sitere n’obi.” Alejandro anọwo na-eje ozi oge nile ugbu a ruo ihe karịrị afọ 13.

Ụfọdụ ndị na-eche na okpukpe bụ nanị maka ndị agadi. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị na-eto eto amụtawo eziokwu Bible mgbe ha dị obere ma bịa hụ Jehova n’anya ma nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye ya. A pụrụ iji okwu Devid nke e dekọrọ n’Abụ Ọma 110:3 mee ihe n’ebe ndị ntorobịa a nọ: “Ndị gị bụ onyinye afọ ofufo n’ụbọchị usuu ndị agha gị; n’ịma mma nile nke ịdị nsọ, n’afọ nke ụtụtụ; Gị nwe igirigi, bụ́ ụmụ okorobịa gị.”

Ọ bụ ihe ịma aka nye ndị na-eto eto ịmụta eziokwu ahụ na ịnọgidesi ike na ya. Lee ihe na-enye ọṅụ ọ bụ ịhụ na ọtụtụ na-anọ nnọọ nzukọ Jehova nso, na-agachi nzukọ anya, ma na-eji ịdị uchu na-amụ Bible. Site n’ime otú ahụ, ha enwewo ike ịzụlite ezi ịhụnanya maka Okwu Chineke na ozi ya!—Abụ Ọma 119:15, 16.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara na 1958; a dịghịzi ebipụta ya.