Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nkasi Obi n’Oge Nsogbu

Nkasi Obi n’Oge Nsogbu

Nkasi Obi n’Oge Nsogbu

AKỤKỌ ndị a na-anụ taa adịghị akasi obi ma ọlị. Otu onye dere, sị: “Ihe ndị na-eme ugbu a dị nnọọ njọ nke na ọtụtụ mgbe anyị apụghị ikpebi ma obi ọ ga-aka anyị ikiri akụkọ ụwa n’elekere isii ma ọ bụ na ọ gaghị aka anyị.” Ụwa jupụtara n’agha, ihe omume ndị na-eyi egwu, nhụjuanya, mpụ, na ọrịa—ihe ọjọọ ndị pụrụ imetụta anyị n’oge na-adịghị anya ma ọ bụrụdị na ha emetụtabeghị anyị.

Bible buru amụma n’ụzọ ziri ezi banyere ọnọdụ a. N’ịkọwa oge anyị, Jizọs kwuru na a ga-enwe oké agha, ọrịa na-efe efe, ụkọ nri, na ala ọma jijiji. (Luk 21:10, 11) N’ụzọ yiri nke ahụ, Pọl onyeozi dere banyere “oge pụrụ iche nke siri ike obibi,” bụ́ mgbe ndị mmadụ ga-abụ ndị na-eme ihe ike, ndị hụrụ ego n’anya, na ndị na-enweghị ịhụnanya maka ezi ihe. Ọ kpọrọ oge ahụ ‘ụbọchị ikpeazụ.’—2 Timoti 3:1-5.

Ya mere, n’ịkọwa ọnọdụ dị n’ụwa, ihe ndị a na-akọ n’akụkọ ụwa yitewere ihe Bible buru n’amụma. Ma, ọ bụ nanị na nke ahụ ka ha yiri. Bible na-enye echiche nke akụkọ ụwa na-adịghị enye. Site n’Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ, anyị pụrụ ịghọta, ọ bụghị nanị ihe mere ihe ọjọọ ji baa ụba, kamakwa, ihe ọdịnihu ga-abụ.

Otú Chineke Si Ele Ajọ Omume Anya

Bible na-akọwa otú Chineke si ele ọnọdụ ndị na-akpata obi erughị ala n’oge anyị anya. Ọ bụ ezie na o bu ụzọ hụ nsogbu ndị dị ugbu a, ọ kwadoghị ha ma ọ bụkwanụ zube ikwe ka ha dịruo mgbe ebighị ebi. “Chineke bụ ịhụnanya,” ka Jọn onyeozi dere. (1 Jọn 4:8) Jehova na-enwe nchegbu miri emi banyere ndị mmadụ ma na-akpọ ihe ọjọọ nile asị. N’ụzọ ziri nnọọ ezi, anyị pụrụ ịgakwuru Chineke maka nkasi obi, ebe ọ bụ na ọ dị mma ma nwee ọmịiko, nweekwa ike na ọchịchọ ikpochapụ ihe ọjọọ n’ụwa. Ode abụ ahụ dere, sị: “[Eze Chineke họpụtara] ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere, ọ bụkwa mkpụrụ obi ndị ogbenye ka ọ ga-azọpụta. Ọ ga-esi n’aka nzọgbu na n’aka ime ihe ike gbapụta mkpụrụ obi ha; ọbara ha ga-adịkwa oké ọnụ ahịa n’anya ya.”—Abụ Ọma 72:12-14.

Ị̀ na-emetere ndị na-ata ahụhụ ebere? Eleghị anya ị na-eme otú ahụ. Inwe mmetụta maka ndị ọzọ bụ àgwà Jehova kenyere n’ime anyị, n’ihi na e kere anyị n’onyinyo ya. (Jenesis 1:26, 27) N’ihi ya, anyị pụrụ inwe obi ike na nhụjuanya nke ụmụ mmadụ na-emetụ Jehova n’ahụ́. Jizọs, bụ́ onye maara nnọọ Jehova nke ọma karịa ka onye ọ bụla ọzọ maara ya, kụziri na Jehova nwere mmasị dị ukwuu n’ebe anyị nọ ma nwee nnọọ obi ọmịiko.—Matiu 10:29, 31.

Ihe ndị e kere eke n’onwe ha na-agba akaebe na Chineke na-eche banyere ụmụ mmadụ. Jizọs kwuru na Chineke “na-eme ka anyanwụ ya na-awakwasị ndị ọjọọ na ndị ọma, na-emekwa ka mmiri na-ezokwasị ndị ezi omume na ndị ajọ omume.” (Matiu 5:45) Pọl onyeozi gwara ndị nọ n’obodo Listra, sị: “[Chineke ahapụghị] onwe ya n’enweghị ihe àmà, ebe o mere ihe ọma, na-enye unu mmiri ozuzo site n’eluigwe na oge mkpụrụ ji amị, na-emejupụta obi unu n’ihe oriri na ezi obi ụtọ.”—Ọrụ 14:17.

Ònye Ka Ụta Dịịrị?

Ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na Pọl gwakwara ndị Listra, sị: “N’ọgbọ ndị gara aga, [Chineke] kwere ka ndị mba ọzọ nile nọgide na-eje ije n’ụzọ ha.” N’ihi ya, ọ bụ mba nile—ma ọ bụ ndị mmadụ n’onwe ha—ka ihe ka ukwuu ná nsogbu ndị ha nọ na ya si nnọọ n’aka. Ọ bụghị Chineke ka ụta dịịrị.—Ọrụ 14:16.

N’ihi gịnị ka Jehova ji kwere ka ihe ọjọọ na-eme? Ọ̀ ga-eme ihe ma ọlị banyere ya? A pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a nanị n’Okwu Chineke. Nke ahụ bụ n’ihi na azịza ya metụtara otu onye ọzọ bụ́ mmụọ, metụtakwa otu ihe iseokwu nke o welitere n’ógbè a na-adịghị ahụ anya nke ndị bụ́ mmụọ.

[Foto ndị dị na peeji nke 4]

Ụmụ mmadụ na-enwe mmetụta maka ibe ha. Ọ̀ bụ Chineke bụ onye nhụjuanya nke ụmụ mmadụ na-adịghị emetụ n’ahụ́?

[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 2]

IHU AKWỤKWỌ: Ụgbọ agha: FOTO UN 158181/J. Isaac; ala ọma jijiji: San Hong R-C Picture Company

[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 3]

N’elu aka ekpe, Croatia: FOTO UN 159208/S. Whitehouse; nwata agụụ na-agụgbu: FOTO UN 146150 NKE O. MONSEN SERE