Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Zụlite Nrubeisi Ka Ọgwụgwụ Na-eru Nso

Zụlite Nrubeisi Ka Ọgwụgwụ Na-eru Nso

Zụlite Nrubeisi Ka Ọgwụgwụ Na-eru Nso

“Ọ bụ [Shaịlo] ga-enwe ịṅa ntị [“nrubeisi,” NW]ndị dị iche iche.”—JENESIS 49:10.

1. (a) N’oge gara aga, gịnị ka nrubeisi nye Jehova na-apụtakarị? (b) Olee amụma Jekọb buru banyere nrubeisi?

MGBE mgbe, nrubeisi nye Jehova apụtawo nrubeisi nye ndị nnọchiteanya ya. Ndị a agụnyewo ndị mmụọ ozi, ndị nna ochie, ndị ikpe, ndị nchụàjà, ndị amụma, na ndị eze. Ọbụna a kpọrọ ocheeze nke ndị eze Izrel ocheeze Jehova. (1 Ihe E Mere 29:23) Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, ọtụtụ n’ime ndị ọchịchị Izrel nupụụrụ Chineke isi, na-ewetara onwe ha na ndị ha chịrị ọdachi. Ma Jehova ahapụghị ndị na-eguzosi ike n’ihe nye ya n’enweghị olileanya; ọ kasiri ha obi site n’ikwe ha nkwa iguzobe eze nke a na-apụghị imerụ emerụ, bụ́ onye obi ga-adị ndị ezi omume ụtọ irubere isi. (Aịsaịa 9:6, 7) Nna ochie nọ n’ọnụ ọnwụ bụ́ Jekọb buru amụma banyere onye ọchịchị a a gaje inwe n’ọdịnihu, na-asị: “Mkpanaka eze agaghị esi n’ebe Juda nọ wezụga onwe ya, mkpanaka onye na-enye ụkpụrụ agaghị esikwa n’etiti ụkwụ ya abụọ wezụga onwe ya, ruo mgbe Shaịlo ga-abịa; ọ bụkwa ya ga-enwe ịṅa ntị ndị dị iche iche.”—Jenesis 49:10.

2. Gịnị ka “Shaịlo” pụtara, oleekwa ndị ọ ga-achị?

2 “Shaịlo” bụ okwu Hibru nke pụtara “Onye Ọ Bụ nke Ya,” ma ọ bụ “Onye Ọ Dịịrị.” Ee, Shaịlo agaghị eketa ihe dị ala karịa ikike ịchịisi, bụ́ nke mkpanaka eze na-anọchi anya ya, na ike inye iwu, bụ́ nke mkpanaka onye na-enye ụkpụrụ na-anọchi anya ya. Ọzọkwa, ọ bụghị nanị ụmụ Jekọb ka ọ ga-achị, kama “ndị” nile. Nke a kwekọrọ ná nkwa Jehova kwere Ebreham: “Mkpụrụ gị ga-enwetakwa ọnụ ụzọ ámá nke ndị iro ya; ọ bụkwa ná mkpụrụ gị ka mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha.” (Jenesis 22:17, 18) Jehova mere ka a mata “mkpụrụ” a na 29 O.A. mgbe o ji mmụọ nsọ tee Jizọs onye Nazaret mmanụ.—Luk 3:21-23, 34; Ndị Galeshia 3:16.

Alaeze Mbụ nke Jizọs

3. Ịchịisi dị aṅaa ka Jizọs natara mgbe ọ rịgooro n’eluigwe?

3 Mgbe Jizọs rịgooro n’eluigwe, ọ maliteghị ịchị ndị bi n’ụwa ozugbo ahụ. (Abụ Ọma 110:1) Otú ọ dị, ọ natara “alaeze” nke nwere ndị ọ na-achị bụ́ ndị na-erubere ya isi. Pọl onyeozi mere ka a mara alaeze ahụ mgbe o dere, sị: “[Chineke] gbapụtara anyị [Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ] n’ikike nke ọchịchịrị ma wega anyị n’alaeze nke Ọkpara nke ịhụnanya ya.” (Ndị Kọlọsi 1:13) Nnapụta a malitere na Pentikọst 33 O.A. mgbe a wụsara ụmụazụ Jizọs na-ekwesị ntụkwasị obi mmụọ nsọ.—Ọrụ 2:1-4; 1 Pita 2:9.

4. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ndị na-eso ụzọ Jizọs n’oge mbụ si gosipụta nrubeisi ha, oleekwa otú Jizọs si kọwaa ha dị ka otu ìgwè?

4 Dị ka “ndị nnọchiteanya nọ n’ọnọdụ Kraịst,” ndị na-eso ụzọ e ji mmụọ nsọ tee mmanụ ji nrubeisi malite ịchịkọta ndị ọzọ bụ́ ‘ndị ga-eso bụrụ ụmụ amaala’ n’alaeze ime mmụọ ahụ. (2 Ndị Kọrint 5:20; Ndị Efesọs 2:19; Ọrụ 1:8) Tụkwasị na nke ahụ, ndị a aghaghị ịnọgide na-abụ ndị “dị n’otu n’ụzọ kwekọrọ ekwekọ n’otu uche na n’otu ụzọ iche echiche” iji bụrụ ndị Eze ha bụ́ Jizọs Kraịst ga-anakwere. (1 Ndị Kọrint 1:10) Dị ka otu ìgwè, ha mejupụtara “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche,” ma ọ bụ òtù onye na-elekọta ụlọ nke na-ekwesị ntụkwasị obi.—Matiu 24:45; Luk 12:42.

Ndị A Gọziri Maka Irubere ‘Onye Na-elekọta Ụlọ’ Chineke Isi

5. Site n’oge ochie, olee otú Jehova siworo zie ndị ya ihe?

5 Jehova enyewo ndị ya ndị ozizi mgbe nile. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị Juu sisịrị Babilọn lọta, ọ bụghị nanị na Ezra na ndị ikom ndị ọzọ ruru eru gụọrọ ndị ahụ Iwu Chineke, kama ha ‘gụpụtara iwu ahụ nke ọma,’ ‘mee ka a mata isi ya ma ghọta ọgụgụ’ nke Okwu Chineke.—Nehemaịa 8:8.

6, 7. Olee otú òtù ohu ahụ siworo nye nri ime mmụọ n’oge ya site n’aka Òtù Na-achị Isi ya, n’ihi gịnịkwa ka ido onwe onye n’okpuru òtù ohu ahụ ji kwesị ekwesị?

6 Na narị afọ mbụ, mgbe okwu banyere obibi úgwù bilitere na 49 O.A., òtù na-achị isi nke òtù ohu ahụ n’oge mbụ ahụ ji ekpere tụlee okwu ahụ ma ruo nkwubi okwu dabeere n’Akwụkwọ Nsọ. Mgbe ha ji akwụkwọ ozi kpọsaa ihe ha kpebiri, ọgbakọ dị iche iche rubere isi ná ntụziaka e nyere ma nweta ngọzi Chineke n’ụba. (Ọrụ 15:6-15, 22-29; 16:4, 5) N’otu aka ahụ n’oge a, ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi esiwo n’aka Òtù Na-achị Isi ya kọwaa okwu ndị dị mkpa dị ka nnọpụiche Ndị Kraịst, ịdị nsọ nke ọbara, na iji ọgwụ ọjọọ na ụtaba eme ihe. (Aịsaịa 2:4; Ọrụ 21:25; 2 Ndị Kọrint 7:1) Jehova gọziri ndị ya maka nrubeisi ha nye Okwu ya na ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi.

7 Site n’ido onwe ha n’okpuru òtù ohu ahụ, ndị Chineke na-egosikwa na ha na-edo onwe ha n’okpuru Onye Nwe ya, bụ́ Jizọs Kraịst. Ido onwe onye n’okpuru dị otú ahụ adịwo mkpa n’oge a karị n’ihi ikike e nyekwuru Jizọs, dị ka e kwuru n’amụma Jekọb buru mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ.

Shaịlo Aghọọ Onye O Ruuru Ịchị Ụwa

8. Olee otú e si mụbaa ikike Kraịst, ọ̀ bụkwa ole mgbe?

8 Amụma Jekọb na-ekwu na Shaịlo “ga-enwe ịṅa ntị [“nrubeisi,” NW] ndị dị iche iche.” N’ụzọ doro anya, ọ bụghị nanị Izrel ime mmụọ ka Kraịst ga-achị. Olee ndị ọzọ ọ ga-achị? Mkpughe 11:15 na-aza, sị: “Alaeze nke ụwa aghọwo alaeze nke Onyenwe anyị na nke Kraịst ya, ọ ga-achịkwa dị ka eze ruo mgbe nile ebighị ebi.” Bible na-ekpughe na Jizọs natara ikike ahụ n’ọgwụgwụ nke “oge asaa” ahụ e buru n’amụma—“oge a kara aka nke ndị mba ọzọ”—na 1914. * (Daniel 4:16, 17; Luk 21:24) N’afọ ahụ, “ọnụnọ” a na-adịghị ahụ anya nke Kraịst dị ka Eze bụ́ Mezaịa malitere, dịkwa ka oge ya maka ‘inwe ike n’ahụ́ mmadụ n’etiti ndị iro ya’ malitere.—Matiu 24:3; Abụ Ọma 110:2.

9. Gịnị ka Jizọs mere mgbe ọ natara Alaeze ya, mmetụta dịkwa aṅaa na-apụtachaghị ìhè ka nke a nwere n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ, karịsịa n’ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ?

9 Ihe mbụ Jizọs mere mgbe ọ natasịrị ike ọchịchị bụ ịchụtu onye bụ́ nnupụisi n’onwe ya—Setan—tinyere ndị mmụọ ọjọọ ya “n’ụwa.” Kemgbe ahụ, ndị ajọ mmụọ a akpataworo ihe a kpọrọ mmadụ ọdachi a na-ahụtụbeghị ụdị ya, tinyekwara ime ka e nwee gburugburu ebe na-eme ka irubere Jehova isi bụrụ ihe ịma aka. (Mkpughe 12:7-12; 2 Timoti 3:1-5) N’ezie, ndị Setan lekwasịrị anya n’ụzọ bụ́ isi n’agha ime mmụọ ya bụ ndị Jehova e tere mmanụ, “bụ́ ndị na-edebe ihe ndị Chineke nyere n’iwu, ndị nwekwara ọrụ ịgba àmà banyere Jizọs,” na ndị ibe ha bụ́ “atụrụ ọzọ” ahụ.—Mkpughe 12:17; Jọn 10:16.

10. Mmezu nke amụma ndị dị aṅaa nke Bible na-eme ka e jide n’aka na Setan ga-akụrịrị afọ n’ala n’agha ọ na-alụso ezi Ndị Kraịst?

10 Otú ọ dị, Setan ga-akụrịrị afọ n’ala n’ihi na ihe a bụ ‘ụbọchị Onyenwe anyị,’ ọ dịghịkwa ihe pụrụ igbochi Jizọs ‘inwezu mmeri ya.’ (Mkpughe 1:10; 6:2) Dị ka ihe atụ, ọ ga-ejide n’aka na a kara onye ikpeazụ mejupụtara 144,000 nke Izrel ime mmụọ akara. Ọ ga-echebekwa “oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-enweghị ike ịgụta ọnụ, ndị si ná mba na ebo na ndị na asụsụ nile pụta.” (Mkpughe 7:1-4, 9, 14-16) Otú ọ dị, n’adịghị ka ndị ibe ha e tere mmanụ, ndị a ga-aghọ ndị na-erube isi Jizọs ga-achị n’ụwa. (Daniel 7:13, 14) Mpụta ha n’ụwa agbawalarị àmà gbara ọkpụrụkpụ na Shaịlo bụ Onye Ọchịchị n’ezie ‘n’alaeze nke ụwa.’—Mkpughe 11:15.

Ugbu A Bụ Oge ‘Irube Isi n’Ozi Ọma Ahụ’

11, 12. (a) Olee nanị ndị ga-alanahụ ọgwụgwụ nke usoro ihe dị ugbu a? (b) Olee àgwà ndị na-anabata “mmụọ nke ụwa” na-akpa?

11 Ndị nile chọrọ ndụ ebighị ebi aghaghị ịmụta nrubeisi, n’ihi na Bible na-ekwu n’ụzọ doro anya na “ndị na-amaghị Chineke na ndị na-adịghị erube isi n’ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs” agaghị alanahụ ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ Chineke. (2 Ndị Tesalonaịka 1:8) Otú ọ dị, ajọ ọnọdụ e nwere ugbu a na mmụọ nke nnupụisi ya megide iwu na ụkpụrụ Bible na-eme ka irube isi n’ozi ọma ahụ bụrụ ihe ịma aka.

12 Bible na-akọwa mmụọ a nke inupụrụ Chineke isi dị ka “mmụọ nke ụwa.” (1 Ndị Kọrint 2:12) N’ịkọwa mmetụta ọ na-enwe n’ahụ́ ndị mmadụ, Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst narị afọ mbụ nọ n’Efesọs akwụkwọ, na-asị: “Unu jere ije na ha n’otu mgbe dị ka usoro ihe nke ụwa a si dị, dị ka onye na-achị ikike nke ikuku ahụ si dị, bụ́ mmụọ nke na-arụ ọrụ ugbu a n’ime ụmụ nnupụisi. Ee, n’etiti ha ka anyị nile n’otu mgbe mere omume n’ikwekọ n’ọchịchọ anụ ahụ́ anyị, na-eme ihe ndị anụ ahụ́ na echiche chọrọ, anyị bụkwa ụmụ ọnụma site n’ọmụmụ ọbụna dị ka ndị ọzọ.”—Ndị Efesọs 2:2, 3.

13. Olee otú Ndị Kraịst pụrụ isi guzogide mmụọ nke ụwa n’ụzọ dị irè, oleekwa ihe ndị bara uru ga-esi na ya pụta?

13 N’ụzọ na-enye obi ụtọ, Ndị Kraịst bụ́ ndị Efesọs anọgideghị na-abụ ndị ohu nke mmụọ nnupụisi ahụ. Kama nke ahụ, ha ghọrọ ụmụ Chineke na-erube isi site n’ido onwe ha n’okpuru mmụọ ya na ịghọrọ ọmarịcha mkpụrụ ya bara ụba. (Ndị Galeshia 5:22, 23) N’otu aka ahụ taa, mmụọ Chineke—ikike kasị ike n’eluigwe na ala—na-enyere ọtụtụ nde mmadụ aka ịghọ ndị na-erubere Jehova isi, ihe si na ya apụta bụ na ha pụrụ inwe “obi ike zuru ezu n’olileanya ahụ ruo ọgwụgwụ.”—Ndị Hibru 6:11; Zekaraịa 4:6.

14. Olee otú Jizọs si mee ka Ndị Kraịst nile bi n’ụbọchị ikpeazụ mata ihe ụfọdụ ga-ele nrubeisi ha ule?

14 Burukwa n’uche na Shaịlo ahụ kwụsi nnọọ ike n’azụ anyị, bụ́ onye ya na Nna ya na-agaghị ekwe ka onye iro ọ bụla—mmụọ ọjọọ ma ọ bụ mmadụ—lee nrubeisi anyị ule gabiga ihe anyị pụrụ ịnagide. (1 Ndị Kọrint 10:13) N’ezie, iji nyere anyị aka n’agha ime mmụọ anyị, Jizọs kọwara ụfọdụ nsogbu ndị anyị gaje iche ihu n’ụbọchị ikpeazụ ndị a. O ji akwụkwọ ozi asaa, bụ́ nke o ji ọhụụ gosi Jọn onyeozi, mee ya. (Mkpughe 1:10, 11) Jide n’aka na ha nwere ndụmọdụ dị oké mkpa nye Ndị Kraịst laa azụ n’oge ahụ, ma, ha kasị metụta ‘ụbọchị Onyenwe anyị,’ nke malitere kemgbe 1914. N’ihi ya, lee ka o si kwesị ekwesị ka anyị ṅaa ntị n’ozi ndị a! *

Zere Enweghị Mmasị, Omume Rụrụ Arụ, Ịhụ Ihe Onwunwe n’Anya

15. N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji nọrọ na nche megide nsogbu ahụ e nwere n’ọgbakọ dị n’Efesọs, oleekwa otú anyị pụrụ isi mee ya? (2 Pita 1:5-8)

15 Ọ bụ ọgbakọ dị n’Efesọs ka Jizọs degaara akwụkwọ ozi mbụ ya. Mgbe ọ jasịrị ọgbakọ ahụ mma maka ntachi obi ya, Jizọs sịrị: “Ka o sina dị, enwere m ihe a megide gị, na ị hapụwo ịhụnanya ahụ i nwere na mbụ.” (Mkpughe 2:1-4) Taa, ụfọdụ ndị bụbu Ndị Kraịst na-anụ ọkụ n’obi enweghịzi ịhụnanya na-ekpo ọkụ ha nweburu n’ebe Chineke nọ. Enweghị ịhụnanya dị otú ahụ pụrụ imebi mmekọrịta mmadụ na Chineke, a ghaghịkwa ilebara ya anya ngwa ngwa. Olee otú a pụrụ isi mee ka ịhụnanya dị otú ahụ birighachi ọkụ? Ọ bụ site n’ịmụchi Bible anya, ịgachi nzukọ anya, ekpere, na ntụgharị uche. (1 Jọn 5:3) N’eziokwu, nke a na-achọ “oké mgbalị,” ma o ruru mgbalị e tinyere na ya n’ezie. (2 Pita 1:5-8) Ọ bụrụ na nnyocha i ji obi ọcha nyochaa onwe gị na-ekpughe na ịhụnanya gị ajụọla oyi, mgbe ahụ, dozie ọnọdụ ahụ ngwa ngwa, n’irube isi n’agbamume Jizọs, bụ́: “Cheta ihe i siworo na ya daa, chegharịakwa ma mee ihe ndị ị na-eme na mbụ.”—Mkpughe 2:5.

16. Olee mmetụta ndị dị ize ndụ n’ụzọ ime mmụọ e nwere n’ọgbakọ ndị dị na Pagamọm na Taịataịra, n’ihi gịnịkwa ka ihe Jizọs gwara ha ji kwesị ekwesị taa?

16 A jara Ndị Kraịst nọ na Pagamọm na Taịataịra mma maka iguzosi ike n’ezi ihe, ntachi obi, na ịnụ ọkụ n’obi ha. (Mkpughe 2:12, 13, 18, 19) Ma, ụfọdụ ndị na-egosipụta mmụọ ọjọọ nke Belam na Jezibel, bụ́ ndị ji mmekọahụ rụrụ arụ na ofufe Bel merụọ ụmụ Izrel oge ochie, nọ na-enwe mmetụta n’ahụ́ ha. (Ọnụ Ọgụgụ 31:16; 1 Ndị Eze 16:30, 31; Mkpughe 2:14, 16, 20-23) Ma gịnị banyere oge anyị—‘ụbọchị Onyenwe anyị’? À na-ahụ otu mmetụta ọjọọ ahụ? Ee, n’ihi na omume rụrụ arụ bụ n’ezie ihe kasị akpata nchụpụ n’ọgbakọ n’etiti ndị Chineke. N’ihi ya, lee ka o si dị mkpa ka anyị zere iso ndị nile—n’ime ọgbakọ na n’èzí—na-emebi omume ọma na-akpakọrịta! (1 Ndị Kọrint 5:9-11; 15:33) Ndị chọrọ ịbụ ndị na-erube isi Shaịlo ga-achị aghaghịkwa izere ntụrụndụ ndị a na-enyo enyo nakwa ihe ndị e biri n’akwụkwọ na ndị dị n’Intanet bụ́ ndị na-akpali agụụ mmekọahụ.—Emọs 5:15; Matiu 5:28, 29.

17. Olee otú echiche na àgwà ndị nọ na Sadis na Leodisia si dị iche n’otú Jizọs si hụ ọnọdụ ime mmụọ ha?

17 E wezụga mmadụ ole na ole, a jaghị ọgbakọ dị na Sadis mma ma ọlị. O nwere “aha,” ma ọ bụ ọdịdị nke ịbụ ihe dị ndụ, ma enweghị mmasị n’ụzọ ime mmụọ ejidewo ya nke na, n’ebe Jizọs nọ, ọ “nwụrụ anwụ.” Nrubeisi ya nye ozi ọma ahụ bụ nanị iji mezuo iwu. Lee amamikpe nke ahụ bụ! (Mkpughe 3:1-3) Ọgbakọ dị na Leodisia nọkwa n’ọnọdụ yiri nke ahụ. O ji ihe onwunwe tuo ọnụ, na-asị, “Abara m ọgaranya,” ma n’ebe Kraịst nọ, ọ nọ ná “nhụsianya, bụrụkwa onye e kwesịrị imere ebere nakwa onye dara ogbenye na onye kpuru ìsì na onye gba ọtọ.”—Mkpughe 3:14-17.

18. Olee otú mmadụ pụrụ isi zere ịdị ṅara ṅara n’ụzọ ime mmụọ n’anya Chineke?

18 Taa, ụfọdụ Ndị Kraịst kwesịburu ntụkwasị obi adabawokwa n’otu ụdị nnupụisi ahụ. Ikekwe ha ekwewo ka mmụọ nke ụwa mee ka ha ghara inwekwa echiche nke ịdị ngwa ná ndụ ha, si otú ahụ na-azụlite àgwà ịdị ṅara ṅara n’ụzọ ime mmụọ n’ebe ọmụmụ Bible, ekpere, nzukọ Ndị Kraịst, na ozi ahụ dị. (2 Pita 3:3, 4, 11, 12) Lee ka o si dị mkpa ka ndị dị otú ahụ na-erubere Kraịst isi site n’ịchụso akụ̀ ime mmụọ—ee, “zụta n’aka [Kraịst] ọlaedo e ji ọkụ nụchaa”! (Mkpughe 3:18) Ezigbo akụ̀ dị otú ahụ na-agụnye ‘ịba ọgaranya n’ezi ọrụ, imesapụ aka, ịdị njikere ikerịta ihe.’ Site n’ịchụso akụ̀ ndị a dị oké ọnụ ahịa n’ezie, anyị ga ‘na-atọrọ onwe anyị ezi ntọala maka ọdịnihu n’ụzọ nwere nchebe, ka anyị wee jidesie aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.’—1 Timoti 6:17-19.

Ndị A Jara Mma Maka Nrubeisi Ha

19. Okwu ịja mma na nke agbamume ndị dị aṅaa ka Jizọs gwara Ndị Kraịst nọ na Smụana na Filadelfia?

19 Ọgbakọ ndị dị na Smụana na Filadelfia guzopụrụ iche dị ka ihe nlereanya n’irube isi, n’ihi na Jizọs abaghịrị ha mba n’akwụkwọ ozi o degaara ha. Ọ gwara ndị nọ na Smụana, sị: “Amaara m mkpagbu na ịda ogbenye gị—ma ị bara ọgaranya.” (Mkpughe 2:9) Lee ka ha si dị iche ná ndị nọ na Leodisia bụ́ ndị ji akụ̀ na ụba ụwa tuo ọnụ ma bụrụ n’ezie ndị dara ogbenye! N’ezie, obi adịghị Ekwensu ụtọ ịhụ ka mmadụ ọ bụla na-ekwesị ntụkwasị obi ma na-erube isi nye Kraịst. N’ihi ya, Jizọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Atụla egwu banyere ihe ndị ị na-aga ịta ahụhụ ha. Lee! Ekwensu ga-anọgide na-atụba ụfọdụ n’ime unu n’ụlọ mkpọrọ ka e wee lee unu ule n’ụzọ zuru ezu, ka unu wee nweekwa mkpagbu ruo ụbọchị iri. Gosipụta na ị na-ekwesị ntụkwasị obi ọbụna ruo ọnwụ, m ga-enyekwa gị okpueze bụ́ ndụ.” (Mkpughe 2:10) N’ụzọ yiri nke ahụ, Jizọs jara ndị nọ na Filadelfia mma, na-asị: “I debekwara okwu m [ma ọ bụ, i rubekwaara m isi], ị gọnarịghịkwa aha m. Ana m abịa ọsọ ọsọ. Nọgide na-ejidesi ihe i nwere ike, ka onye ọ bụla wee ghara iwere okpueze gị.”—Mkpughe 3:7, 8, 11.

20. Olee otú ọtụtụ nde mmadụ taa siworo na-edebe okwu Jizọs, n’agbanyeghịkwa ọnọdụ ndị dị aṅaa?

20 “N’ụbọchị Onyenwe anyị,” bụ́ nke malitere na 1914, ihe fọdụrụ na-ekwesị ntụkwasị obi na ndị ibe ha bụ́ atụrụ ọzọ, bụ́ ndị dị ọtụtụ nde ugbu a, edebewokwa okwu Jizọs site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi na site n’ijidesi iguzosi ike n’ezi ihe ha ike. Dị ka ụmụnna ha ndị narị afọ mbụ, ụfọdụ ndị atawo ahụhụ n’ihi nrubeisi ha nye Kraịst, ọbụna na-abụ ndị a tụbara n’ụlọ mkpọrọ na n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche. Ndị ọzọ edebewo okwu Jizọs site n’ịnọgide ‘na-elegide anya otu ebe,’ n’agbanyeghị na akụ̀ na ụba na anyaukwu gbara ha gburugburu. (Matiu 6:22, 23) Ee, n’ebe nile na n’ọnọdụ nile, ezi Ndị Kraịst, site ná nrubeisi ha, na-anọgide na-eme ka obi Jehova ṅụrịa.—Ilu 27:11.

21. (a) Ibu ọrụ ime mmụọ dị aṅaa ka òtù ohu ahụ ga-anọgide na-arụzu? (b) Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị chọrọ ịdị na-erubere Shaịlo isi n’ezie?

21 Ka anyị na-abịaru oké mkpagbu ahụ nso, “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” ka kpebisiri ike ịnọgide na-erubere Nna ya ukwu, bụ́ Kraịst, isi. Nke a na-agụnye ịkwadebere ezinụlọ Chineke nri ime mmụọ n’oge ya. Ya mere, ka anyị nọgide na-enwe ekele maka nzukọ ọchịchị Jehova bụ́ nke dị ebube na ihe ndị ọ na-enye. N’ụzọ dị otú a, anyị na-egosi na anyị na-edo onwe anyị n’okpuru Shaịlo, bụ́ onye ga-eji ndụ ebighị ebi kwụghachi ndị nile na-erube isi n’okpuru ọchịchị ya ụgwọ.—Matiu 24:45-47; 25:40; Jọn 5:22-24.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Maka nkọwa nke “oge asaa” ahụ, lee isi nke 10 nke akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 14 Maka ntụle zuru ezu nke akwụkwọ ozi asaa nile ahụ, biko lee akwụkwọ bụ́ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, nke Ndịàmà Jehova bipụtara, malite na peeji nke 33.

Ị̀ Na-echeta?

• Ọrụ dị aṅaa ka Jizọs gaje ịrụ dị ka Jekọb buru n’amụma mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ?

• Olee otú anyị si anakwere Jizọs dị ka Shaịlo, mmụọ dịkwa aṅaa ka anyị na-aghaghị izere?

• Ndụmọdụ dị aṅaa dị irè n’oge anyị dị n’akwụkwọ ozi ndị ahụ e degaara ọgbakọ asaa nke Mkpughe?

• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ isi ṅomie ndị nọ n’ọgbakọ ndị dị na Smụana na Filadelfia oge ochie?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Jehova na-agọzi ndị ya maka irubere “onye ahụ na-elekọta ụlọ” nke na-ekwesị ntụkwasị obi isi

[Foto dị na peeji nke 19]

Mmetụta Setan na-eme ka irubere Chineke isi bụrụ ihe ịma aka

[Foto ndị dị na peeji nke 21]

Iso Jehova na-enwe mmekọrịta chiri anya na-enyere anyị aka irubere ya isi