Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịzụlite Ụmụ n’Ala Ọzọ—Ihe Ịma Aka na Ụgwọ Ọrụ Ndị Dị na Ya

Ịzụlite Ụmụ n’Ala Ọzọ—Ihe Ịma Aka na Ụgwọ Ọrụ Ndị Dị na Ya

Ịzụlite Ụmụ n’Ala Ọzọ—Ihe Ịma Aka na Ụgwọ Ọrụ Ndị Dị na Ya

ỌTỤTỤ nde mmadụ na-akwaga ala ọzọ, na-enwe olileanya nke ịmalite ndụ n’isi ná mba ọhụrụ ahụ. Ihe karịrị nde mmadụ 20 akwagala Europe ugbu a, ihe karịrị nde 26 nke ndị bi na United States bụ ndị a mụrụ n’ala ọzọ, ebe ihe karịrị pasent 21 nke ndị nile bi n’Australia bụ ndị a mụrụ ná mba ofesi. Mgbe mgbe, ezinụlọ ndị a kwagara ala ọzọ aghaghị ịgbasi mbọ ike iji mụta asụsụ ọhụrụ, ha aghaghịkwa ime mgbanwe iji kwekọọ n’ọdịbendị ọhụrụ.

Ọtụtụ mgbe, ụmụaka na-amụta asụsụ nke mba ha kwagara na ya ngwa ngwa, ha na-amalitekwa iche echiche dị ka asụsụ ọhụrụ ahụ si dị. Ọ pụrụ iwe ndị mụrụ ha oge dị ukwuu karị. Ka ụmụaka na-etolite ná mba ndị mụrụ ha na-amaghị ala na ya, nsogbu nke asụsụ pụrụ ime ka ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha nwee nsogbu ikwurịta okwu bụ́ nke na-esi ike ndozi.

Ọ bụghị nanị na asụsụ ọhụrụ ahụ na-emetụta ụzọ ụmụaka si eche echiche kama ọdịbendị nke mba ọhụrụ ahụ pụkwara ịkpa mmetụta ha na-enwe aka. Ọ pụrụ isiri ndị nne na nna ike ịghọta mmeghachi omume nke ụmụ ha. N’ihi ya, ndị nne na nna kwagara ala ọzọ bụ́ ndị na-agbalị ịzụlite ụmụ ha “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova” na-eche ihe ịma aka ndị pụrụ iche ihu.—Ndị Efesọs 6:4.

Ihe Ịma Aka nke Iru Ma n’Uche Ma n’Obi

Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst nwere ọchịchọ na ibu ọrụ nke ịkụziri ụmụ ha “asụsụ dị ọcha” nke eziokwu Bible. (Zefanaịa 3:9, NW) Ma, ọ bụrụ na ụmụaka amachaghị asụsụ ndị nne na nna ha na-asụ, ọ bụrụkwa na ndị nne na nna apụghị iji asụsụ ụmụ ha na-aghọta nke ọma kwupụta echiche ha n’ụzọ dị irè, hà ga-esi aṅaa kụnye iwu Jehova n’obi ụmụ ha? (Deuterọnọmi 6:7) Ụmụaka pụrụ ịghọta ihe ndị mụrụ ha na-ekwu, ma, ọ bụrụ na ihe a na-ekwu adịghị eru ha n’obi, ụmụaka pụrụ ịghọ ndị ọbịa n’ebe obibi ha.

Pedro na Sandra si Ebe Ndịda America kwaga Australia, ha chekwara ihe ịma aka a ihu ka ha na-azụlite ụmụ okoro abụọ ha ndị dị afọ iri na ụma. * Pedro na-ekwu, sị: “Mgbe a na-ekwu banyere ihe ime mmụọ, ọ na-agụnye obi na mmetụta uche. Ọ dị gị mkpa ikwu okwu n’ụzọ miri emi ma nwee nzube karị, n’ihi ya, ọ dị gị mkpa inwe ìgwè okwu hikwuru nne.” Sandra na-agbakwụnye, sị: “Ọ bụrụ na ụmụ anyị adịghị aghọta asụsụ obodo anyị nke ọma, ọ bụ ya bụ na ọ ga-emetụta ndụ ime mmụọ ha n’ụzọ dị njọ. Ha nwere ike ghara ịghọta eziokwu ahụ n’ụzọ miri emi, ghara ịghọta ụkpụrụ ihe ndị ha na-amụ dabeere na ha. Ọ pụrụ igbochi ha inwe nghọta ime mmụọ, ọ pụkwara imebi mmekọrịta ha na Jehova.”

Gnanapirakasam na Helen si Sri Lanka kwaga Germany ma nwee ụmụ abụọ ugbu a. Ha kwetara, sị: “Anyị chere na ọ dị oké mkpa ka ụmụ anyị na-asụ asụsụ obodo anyị ka ha na-amụ asụsụ German. Nke a dị mkpa ka ha wee nwee ike ịdị na-akọrọ anyị otú obi dị ha, ịdị na-akọrọ anyị ihe dị ha n’obi.”

Miguel na Carmen, bụ́ ndị si Uruguay kwaga Australia, na-ekwu, sị: “Ndị nne na nna nọ n’ọnọdụ anyị aghaghị ịrụsikwu ọrụ ike. Ma ọ́ bụghị na ha aghaghị ịmụta asụsụ ọhụrụ ahụ nke ọma nke na ha ga-enwe ike ịghọta na ịkọwa ihe ime mmụọ n’asụsụ ahụ, ya abụrụ na ha aghaghị ịkụziri ụmụ ha ịmụta asụsụ nne na nna ha na-asụ, nke ọma.”

Mkpebi Ezinụlọ

Otu isi ihe na-eme ka ezinụlọ ọ bụla kwagara mba ọzọ gbasie ike n’ụzọ ime mmụọ bụ ikpebi asụsụ ezinụlọ ga-eji na-eme ihe iji bụrụ ndị “mmụta Jehova.” (Aịsaịa 54:13) Ọ bụrụ na e nwere ọgbakọ ji asụsụ obodo ezinụlọ ahụ eme ihe na nso ebe ha bi, ezinụlọ ahụ pụrụ ịhọrọ isonyere ọgbakọ a. N’aka nke ọzọ, ha pụrụ ịhọrọ isonyere ọgbakọ nke ji asụsụ bụ́ isi nke mba ahụ ha kwagara na ya amụ ihe. Olee ihe ndị a ga-atụle tupu e mee mkpebi a?

Demetrios na Patroulla, bụ́ ndị si Saịprọs kwaga England ma nọrọ ebe ahụ zụlite ụmụ ise, kọwara ihe ha tụlere tupu ha emee mkpebi ha: “Ná mmalite, ezinụlọ anyị nọ n’ọgbakọ ji Grik amụ ihe. N’agbanyeghị na nke a nyeere anyị bụ́ nne na nna aka nke ukwuu, o gbochiri ụmụ anyị inwe ọganihu ime mmụọ. Ọ bụ ezie na ha nwere nghọta bụ́ isi nke asụsụ Grik, ha adịghị aghọta okwu ndị gbara ọkpụrụkpụ. Nke a pụtara ìhè n’ọganihu ime mmụọ ha dị nnọọ ala. Dị ka ezinụlọ, anyị gafere n’ọgbakọ ji Bekee amụ ihe, ụmụ anyị malitekwara ime nke ọma ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ozugbo ahụ. E wusiwo ha ike n’ụzọ ime mmụọ. Mkpebi ahụ anyị mere ịgafe n’ọgbakọ ọzọ adịghịrị anyị mfe, ma n’ọnọdụ nke anyị, ọ bụ nke amamihe dị na ya.”

Ezinụlọ ahụ ka nọgidere na-asụ asụsụ obodo ha, ha nwetakwara ụgwọ ọrụ dị ukwuu. Ụmụ ha kwuru, sị: “Ịmara ka e si asụ ihe karịrị otu asụsụ bara uru. Ọ bụ ezie na Bekee bụ asụsụ anyị maara nke ọma karị, anyị achọpụtawo na ọmụma anyị maara asụsụ Grik emewo ka anyị na ezinụlọ anyị, karịsịa anyị na nne anyị ochie na nna anyị ochie, na-enwe mmekọrịta siri ike ma chie anya. O mewokwa ka anyị na-enwekwu ọmịiko n’ebe ndị si mba ọzọ kwabata nọ, o mekwara ka obi sie anyị ike na anyị pụrụ ịmụta asụsụ ọzọ. N’ihi ya, mgbe anyị tolitekwuru, ezinụlọ anyị gafere n’ọgbakọ ji asụsụ Albanian amụ ihe, iji nyere ha aka.”

Christopher na Margarita sikwa Saịprọs kwaga England, ha zụlitekwara ụmụ atọ n’ebe ahụ. Ha họọrọ isonyere ọgbakọ ji Grik amụ ihe. Nwa ha nwoke, bụ́ Nikos, bụ́ onye na-ejezi ozi dị ka okenye n’otu ọgbakọ ji Grik amụ ihe, na-echeta, sị: “A gbara anyị ume isonyere ọgbakọ ọhụrụ ahụ ji Grik amụ ihe. Ezinụlọ anyị lere ya anya dị ka ọrụ ọchịchị Chineke nke e kenyere anyị.”

Margarita na-ekwu, sị: “Mgbe ụmụ anyị ndị nwoke abụọ dị afọ asaa na asatọ, ha debara aha ha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Dị ka ndị nne na nna, nghọta dị nta ha nwere banyere asụsụ Grik mere ka anyị nwetụ nchegbu. Otú ọ dị, ihe omume ọ bụla e kenyere ha na-abụ ọrụ dịịrị ezinụlọ anyị, anyị na-ejikwa ọtụtụ awa enyere ha aka ịkwadebe ihe omume ha.”

Nwa ha nwanyị bụ́ Joanna na-ekwu, sị: “Apụrụ m icheta mgbe papa m na-akụziri anyị Grik n’ụlọ site n’ide mkpụrụ akwụkwọ ya na bọọdụ, anyị aghaghịkwa ịmụta ya nke ọma. Ọtụtụ mmadụ na-eji ọtụtụ afọ amụ otu asụsụ, ma ebe mama m na papa m nyeere anyị aka, o weghị anyị oge dị ukwuu iji mụta asụsụ Grik.”

Ụfọdụ ezinụlọ na-esonyere ọgbakọ ji asụsụ obodo ha amụ ihe n’ihi na ndị nne na nna na-eche na iji zụlite “nghọta ime mmụọ” ma nwee ọganihu, ọ dị ha mkpa ịbụ ndị e ji asụsụ obodo ha kụziere ihe. (Ndị Kọlọsi 1:9, 10; 1 Timoti 4:13, 15) Ma ọ bụ, ezinụlọ pụrụ iwere nkà nke ịsụ asụsụ ha dị ka ihe bara uru iji nyere ndị ọzọ na-asụ otu asụsụ ahụ bụ́ ndị kwabatara ná mba ahụ aka ịmụta eziokwu ahụ.

N’aka nke ọzọ, ezinụlọ pụrụ iche na ọ ga-akara ha mma isonyere ọgbakọ nke ji asụsụ bụ́ isi nke mba ha kwagara na ya amụ ihe. (Ndị Filipaị 2:4; 1 Timoti 3:5) Mgbe onyeisi ezinụlọ sosịrị ezinụlọ ya tụlee ọnọdụ e nwere, ọ bụ ya ka ọ dị n’aka iji ekpere mee mkpebi ahụ. (Ndị Rom 14:4; 1 Ndị Kọrint 11:3; Ndị Filipaị 4:6, 7) Olee aro ndị pụrụ inyere ezinụlọ ndị a aka?

Aro Ụfọdụ Ndị Dị Irè

Pedro na Sandra, bụ́ ndị a kpọtụrụ aha na mbụ, na-ekwu, sị: “Anyị tiri iwu na ọ bụ nanị Spanish ka anyị ga na-asụ n’ebe obibi anyị iji jide n’aka na anyị echefughị asụsụ obodo anyị. Ọ bụ iwu siri ike ndebe, ebe ọ bụ na ụmụ okoro anyị maara na anyị na-aghọta asụsụ Bekee. Ma ọ bụrụ na anyị agbasoghị iwu a, ha pụrụ n’oge na-adịghị anya ichefu asụsụ Spanish.”

Miguel na Carmen, bụ́kwa ndị a kpọtụrụ aha na mbụ, na-atụ aro, sị: “Ọ bụrụ na ndị nne na nna na-eji asụsụ obodo ha eduzi ọmụmụ ihe ezinụlọ mgbe nile ma jiri ya na-eme ihe mmụta dịịrị ụbọchị kwa ụbọchị, mgbe ahụ, ụmụ ha ga-amụta ihe karịrị okwu ndị bụ́ isi n’asụsụ ahụ—ha ga-amụta ịkọwa ihe ime mmụọ n’asụsụ ahụ.”

Miguel na-atụkwa aro, sị: “Mee ka ọrụ ịgba àmà bụrụ ihe na-atọ ụtọ. Ókèala anyị na-agụnye akụkụ dị ukwuu nke obodo ukwu, anyị na-ejikwa oge dị ukwuu eji ụgbọala achọ ebe ndị na-asụ asụsụ obodo anyị bi. Anyị na-eji oge ahụ egwu egwuregwu ndị dabeere na Bible ma na-ekwu banyere ihe ndị dị mkpa. Ana m agbalị ịhazi njem ịgba àmà ndị ahụ ka anyị wee nwee ike ime ọtụtụ nletaghachi dị mma. E mesịa, ná ngwụsị ụbọchị ahụ, ụmụ anyị ga-enwewo ike inwe ma ọ dịkarịa ala otu mkparịta ụka bara uru.”

Ịnagide Ndịrịta Iche nke Ọdịbendị

Okwu Chineke na-agba ndị ntorobịa ume, sị: “Nwa m, nụrụ ịdọ aka ná ntị nke nna gị, ahapụkwala iwu nne gị.” (Ilu 1:8) Otú ọ dị, a pụrụ inwe ihe isi ike mgbe ọdịbendị dị iche na nke ụmụaka nọ na ya na-emetụta ụdị ịdọ aka ná ntị nna ha na-enye ha nakwa “iwu” nne ha.

N’ezie, ọ bụ onyeisi ezinụlọ ka ọ dịịrị ikpebi otú ọ ga-esi na-elekọta ezinụlọ ya, o kwesịghịkwa ịbụ onye ezinụlọ ndị ọzọ na-enwe mmetụta n’ahụ́ ya n’ụzọ na-enweghị isi. (Ndị Galeshia 6:4, 5) Otú o sina dị, mmekọrịta dị mma n’etiti ndị nne na nna na ụmụ ha pụrụ ime ka ọ dịkwuoro ndị nne na nna mfe ịnabata ọdịbendị ndị ọhụrụ.

Otú ọ dị, ọtụtụ n’ime ọdịbendị ma ọ bụ omume ndị jupụtara n’ala ndị mepere emepe dị ize ndụ nye ahụ́ ike ime mmụọ nke Ndị Kraịst. A na-ejikarị egwú na ntụrụndụ ndị na-ewu ewu akwalite mmekọahụ rụrụ arụ, anyaukwu, na nnupụisi. (Ndị Rom 1:26-32) Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst ekwesịghị ịhapụ ibu ọrụ ha nke ịchịkwa nhọrọ ụmụ ha na-eme n’egwú na ntụrụndụ nanị n’ihi na ọ na-esiri ha ike ịghọta asụsụ ahụ. Ha aghaghị isetịpụ ụkpụrụ nduzi ndị siri ike. Otú ọ dị, nke a pụrụ iweta ihe ịma aka.

Carmen na-ekwu, sị: “Mgbe mgbe, anyị adịghị aghọta ihe ndị a gụrụ n’egwú ụmụ anyị na-ege. Ọ pụrụ ịda ka ihe dị mma, ma, ọ bụrụ na ihe ndị a gụrụ na ya nwere ihe abụọ ha pụtara ma ọ bụ ọ bụrụ na e nwere okwu ndị rụrụ arụ e ji mara ụmụ agboro na ya, anyị agaghị ama.” Olee otú ha siworo nagide ọnọdụ a? Miguel na-ekwu, sị: “Anyị na-eji oge hiri nne akụziri ụmụ anyị banyere ihe ize ndụ dị n’egwú ndị rụrụ arụ, anyị na-agbalịkwa inyere ha aka ịhọrọ egwú ndị Jehova ga-anakwere.” Ee, ọ dị mkpa ịnọ na nche na iji ezi uche na-eme ihe iji nagide ndịrịta iche nke ọdịbendị.—Deuterọnọmi 11:18, 19; Ndị Filipaị 4:5.

Inweta Ụgwọ Ọrụ

Ịzụlite ụmụ n’ala ọzọ na-achọkwu oge na mgbalị. Ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghị ya. Ma ndị nne na nna ma ụmụ ha pụrụ inwetakwu ụgwọ ọrụ maka mgbalị ha.

Azzam na nwunye ya, bụ́ Sara, si Turkey kwaga Germany, bụ́ ebe ha nọ zụlite ụmụ atọ. Diọkpara ha na-eje ozi ugbu a n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Selters, Germany. Azzam na-ekwu, sị: “Uru dị ukwuu ụmụ anyị ritere bụ na ha pụrụ ịzụlite àgwà ndị bara nnọọ uru n’ọdịbendị abụọ ahụ.”

Antonio na Lutonadio si Angola kwaga Germany ma na-azụlite ụmụ itoolu n’ebe ahụ. Ezinụlọ ahụ na-asụ asụsụ Lingala, French, na German. Antonio na-ekwu, sị: “Inwe ike ịsụ asụsụ dị iche iche na-enyere ezinụlọ anyị aka ịgbara ndị si n’ọtụtụ mba àmà. N’ezie, nke a na-eme ka anyị na-enwe obi aṅụrị.”

Ụmụ abụọ nke otu di na nwunye bụ́ ndị Japan bụ́ ndị kwagara England chere na ọ baara ha uru dị ukwuu ịma ka e si asụ ma asụsụ Japanese ma Bekee. Ụmụaka ahụ na-eto eto na-ekwu, sị: “Ịmara asụsụ abụọ nyeere anyị aka inweta ọrụ. Anyị eritewo uru ná mgbakọ ukwu ndị e ji asụsụ Bekee duzie. N’otu oge ahụ, anyị nwere ihe ùgwù nke ije ozi n’ọgbakọ ji asụsụ Japanese amụ ihe, bụ́ ebe e nwere mkpa ka ukwuu.”

Ị Pụrụ Inwe Ihe Ịga nke Ọma

Mmadụ ibi n’etiti ndị ọdịbendị ha dị iche na nke ya wee na-azụlite ụmụ bụ ihe ịma aka ndị ohu Chineke cheworo ihu eri oge Bible. Nne na nna Mozis nwere ihe ịga nke ọma, n’agbanyeghị na a zụlitere ya n’Ijipt. (Ọpụpụ 2:9, 10) Ọtụtụ n’ime ndị Juu a dọọrọ n’agha laa Babilọn zụlitere ụmụ ndị dị njikere ịlaghachi Jeruselem iji guzobeghachi ezi ofufe.—Ezra 2:1, 2, 64-70.

N’otu aka ahụ taa, ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst pụrụ inwe ihe ịga nke ọma. Ha pụrụ inweta ụgwọ ọrụ nke ịnụ ka ụmụ ha kwuru ihe otu di na nwunye nụrụ n’ọnụ ụmụ ha: “Anyị bụ ezinụlọ na-emekọ nnọọ ihe ọnụ n’ihi nlekọta ịhụnanya papa anyị na mama anyị nyere anyị, bụ́ ndị anyị soworo na-enwe ezi nkwurịta okwu mgbe nile. Obi dị anyị ụtọ iso n’ezinụlọ ahụ zuru ụwa ọnụ nke na-ejere Jehova ozi.”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 A gbanwewo aha ụfọdụ.

[Foto dị na peeji nke 24]

Iji nanị asụsụ obodo unu na-ekwu okwu n’ebe obibi na-eme ka ụmụ unu nweta ihe ọmụma bụ́ isi nke asụsụ ahụ

[Foto dị na peeji nke 24]

Asụsụ ndị nne ochie na ndị nna ochie na ụmụ ụmụ ha na-aghọta na-eme ka nkekọ dị n’etiti ha dịgide

[Foto dị na peeji nke 25]

Iso ụmụ gị na-amụ Bible na-azụlite “nghọta ime mmụọ” ha