Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ịzụrụ ụlọ okpukpe ọzọ ma gbanwee ya ịghọ Ụlọ Nzukọ Alaeze, ọ̀ ga-abụ ngwakọta ofufe?

N’ozuzu, Ndịàmà Jehova na-ezere iso okpukpe ndị ọzọ emekọ ihe n’ụzọ dị otú ahụ. Otú ọ dị, azụmahịa dị otú ahụ nwere ike ọ gaghị abụ ngwakọta ofufe. A pụrụ nanị iwere ya dị ka azụmahịa nke weere ọnọdụ n’otu oge. Ọgbakọ Ndịàmà Jehova ahụ esoghị okpukpe ọzọ jikọọ aka iji wuo ụlọ ofufe nke ha abụọ ga-eji na-eme ihe.

Gịnị bụ ngwakọta ofufe n’anya Jehova? Tụlee ntụziaka Pọl onyeozi nyere: “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu n’ụzọ na-ekwekọghị ekwekọ. N’ihi na olee mkpakọrịta ezi omume na mmebi iwu nwere? Ma ọ bụ olee òkè ìhè na ọchịchịrị nwere? Ọzọkwa, olee nkwekọ dị n’etiti Kraịst na Belial? Ma ọ bụ olee òkè onye kwere ekwe na onye na-ekweghị ekwe nwere? Oleekwa nkwekọrịta ụlọ nsọ Chineke na arụsị nwere? . . . ‘Ya mere sinụ n’etiti ha pụọ, kewapụkwanụ onwe unu,’ ka Jehova na-asị, ‘kwụsịkwanụ ibitụ ihe na-adịghị ọcha aka’; ‘m ga-anabatakwa unu.’” (2 Ndị Kọrint 6:14-17) Gịnị ka Pọl bu n’uche n’okwu ndị bụ́ “mkpakọrịta” na “òkè”?

O doro anya na mkpakọrịta Pọl na-ekwu okwu ya na-agụnye iso ndị na-ekpere arụsị na ndị na-ekweghị ekwe na-efe ofufe ma na-emekọ ihe ime mmụọ. Ọ dọrọ ndị Kọrint aka ná ntị megide “ịdị na-eri na . . . tebụl ndị mmụọ ọjọọ.” (1 Ndị Kọrint 10:20, 21) N’ihi ya, ngwakọta ofufe bụ iso okpukpe ọzọ na-ekere òkè n’ofufe ma ọ bụ n’ihe omume ime mmụọ. (Ọpụpụ 20:5; 23:13; 34:12) Mgbe a zụrụ ụlọ òtù okpukpe ji mee ihe, e mere nke a nanị iji nweta ihe owuwu a chọrọ iji mere Ụlọ Nzukọ Alaeze. Tupu e jiri ya mere Ụlọ Nzukọ Alaeze, a na-ewepụsị ihe ọ bụla dị na ya bụ́ ndị e ji mee ihe n’ofufe ụgha. N’ịbụ nke a gbanweworo n’ụzọ dị otú a, a na-arara ya nye Jehova maka nanị ịnọ na ya na-efe ya ofufe. Ọ dịghị òkè ezi ofufe na ofufe ụgha kerịtara ma ọ bụ mkpakọrịta ha nwere.

Mgbe a na-atụle ihe ndị metụtara azụmahịa dị otú a, e kwesịrị ime ka nkwekọrịta azụmahịa a ga-eso ndị òtù nke ọzọ nwee ghara iwe oge dị ukwuu, o kwesịkwara ịbụ nanị okwu azụmahịa ka a ga-ekwu. Ndị so n’ọgbakọ Ndị Kraịst ga-eme nke ọma iburu n’uche ịdọ aka ná ntị Pọl bụ́ ịghara ‘iso ndị na-ekweghị ekwe ekekọta onwe ha n’ụzọ na-ekwekọghị ekwekọ.’ Ọ bụ ezie na anyị adịghị ewere onwe anyị dị ka ndị ka ndị na-ekpe okpukpe ọzọ elu, anyị na-ezere iso ha akpakọrịta ma ọ bụ ịbụ ndị a dọtara n’ofufe ha. *

Gịnịkwanụ banyere ọgbakọ ịdị na-akwụ ụgwọ ụlọ òtù okpukpe nwe? Ịkwụ ụgwọ ụlọ na-emekarị ka a na-enwe mkpakọrịta mgbe nile, bụ́ nke a ga-ezere. Ya bụrụgodị ịkwụ ụgwọ ụlọ dị otú ahụ maka nanị otu ihe omume, òtù ndị okenye kwesịrị ịtụle ihe ndị na-esonụ: À ga-enwe arụsị na ihe oyiyi okpukpe n’ime na n’èzí ụlọ ahụ? Olee otú ndị bi n’ógbè ahụ ga-esi lee ojiji anyị ji ihe owuwu ahụ eme ihe anya? Ọ̀ dị onye so n’ọgbakọ nke ga-enwe ihe ịsụ ngọngọ n’ihi ojiji anyị ji ụlọ a eme ihe? (Matiu 18:6; 1 Ndị Kọrint 8:7-13) Ndị okenye ga-atụle isi ihe ndị a ma mezie mkpebi n’ụzọ kwekọrọ na ya. Ha aghaghịkwa iburu akọ na uche ha na nke ọgbakọ n’ozuzu n’uche mgbe ha na-ekpebi ma à ga-azụ ma gbanwee ihe owuwu dị otú ahụ ịghọ Ụlọ Nzukọ Alaeze.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Lee Ụlọ Nche, April 15, 1999, peeji nke 28 na 29, iji mara ma ò kwesịrị ekwesị iso òtù ọ bụla Jehova na-adịghị anakwere azụkọ ahịa.

[Foto dị na peeji nke 27]

A zụrụ ụlọ a, nke bụbu ụlọ nzukọ okpukpe, ma rụzigharịa ya ịbụ Ụlọ Nzukọ Alaeze