Ndị Kraịst Hà Kwesịrị Ịdị Na-ekwo Ekworo?
Ndị Kraịst Hà Kwesịrị Ịdị Na-ekwo Ekworo?
EKWORO—ọ̀ bụ àgwà Ndị Kraịst kwesịrị ịzụlite? Dị ka Ndị Kraịst, a gbara anyị ume ‘ịchụso ịhụnanya,’ a gwakwara anyị na “ịhụnanya adịghị ekwo ekworo.” (1 Ndị Kọrint 13:4; 14:1) N’aka nke ọzọ, a gwakwara anyị na “Jehova, . . . Chineke ekworo ka Ọ bụ,” e nyekwara anyị iwu ‘ịghọ ndị na-eṅomi Chineke.’ (Ọpụpụ 34:14; Ndị Efesọs 5:1) N’ihi gịnị ka okwu ndị a ji yie ka ha na-emegiderịta onwe ha?
Ọ bụ n’ihi na okwu Hibru na Grik ndị a sụgharịrị ịbụ “ekworo” n’ime Bible nwere ọtụtụ ihe ha pụtara. Ha pụrụ inye echiche nke ihe dị mma ma ọ bụ ihe dị njọ, na-adabere n’otú e si jiri okwu ndị ahụ mee ihe. Dị ka ihe atụ, okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “ekworo” pụrụ ịpụta “ikwusi ike ka e fee ofufe a na-ekewaghị ekewa; agbachighị ịma aka nkịtị; ịnụ ọkụ n’obi; oké mmasị, ekworo [nke ezi omume ma ọ bụ nke ajọ omume]; inwe anyaụfụ.” Okwu Grik ya na ya kwekọrọ pụtara ihe ndị yiri ya. Okwu ndị a pụrụ izo aka ná mmetụta gbagọrọ agbagọ na nke na-eguzozighị eguzozi e nwere n’ebe onye a na-enyo enyo na ọ bụ onye mmegide ma ọ bụ onye e kweere na ihe na-agaziri, nọ. (Ilu 14:30) Ha pụkwara izo aka n’otu àgwà dị mma nke sitere n’aka Chineke—ịchọ ichebe onye a hụrụ n’anya pụọ ná mmerụ ahụ́.—2 Ndị Kọrint 11:2.
Onye Nlereanya Kasịnụ
Jehova setịpụrụ ihe nlereanya kasịnụ n’igosipụta ekworo kwesịrị ekwesị. Ebumnobi ya dị ọcha, ọ bụkwa nke ọchịchọ nke ime ka ndị ya ghara ịbụ ndị e merụrụ n’ụzọ ime mmụọ na n’omume, kpaliri. Banyere ndị ya nke oge ochie, bụ́ ndị e kwuru banyere ha n’ụzọ ihe atụ dị ka Zaịọn, o kwuru, sị: “Ekwoworo m Zaịọn oké ekworo, ejiwokwa m oké ọnụma kwooro ya ekworo.” (Zekaraịa 8:2) Dị nnọọ ka nna na-ahụ n’anya na-esi anọ na nche mgbe nile iji chebe ụmụ ya pụọ n’ihe mmerụ ahụ́, Jehova na-anọ na nche iji chebe ndị ohu ya pụọ n’ihe ize ndụ anụ ahụ́ na nke ime mmụọ.
Iji chebe ndị ya, Jehova nyere Okwu ya, bụ́ Bible. O nwere ọtụtụ agbamume ndị ga-eme ka ha jee ije n’ụzọ amamihe, o nwekwara ọtụtụ ihe atụ nke ndị mere otú ahụ. N’Aịsaịa 48:17, anyị na-agụ, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso.” Lee ihe nkasi obi ọ bụ ịmara na ekworo ya na-akpali ya ilekọta anyị na iche anyị nche! Ọ bụrụ na ọ dịghị ekwo ekworo n’ụzọ dị mma otú a, anyị ga-enweta ụdị mmerụ ahụ́ nile n’ihi enweghị ahụmahụ. Ekworo Jehova abụtụghị nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na-akpali.
Ya mere, oleezi ọdịiche dị n’etiti ekworo nsọpụrụ Chineke na ekworo na-ekwesịghị ekwesị? Iji chọpụta, ka anyị tụlee ihe atụ nke Miriam na nke Fineas. Rịba ama ihe kpaliri ha.
Miriam na Fineas
Miriam bụ nwanyị tọrọ Mozis na Erọn, bụ́ ndị ndú ụmụ Izrel n’oge Ọpụpụ ahụ. Ka ụmụ Izrel nọ n’ọzara, Miriam kwosoro nwanne ya nwoke bụ́ Mozis ekworo. Ihe ndekọ Bible ahụ na-agụ, sị: “Miriam na Erọn wee kwuo okwu megide Mozis n’ihi nwanyị Etiopia ahụ ọ lụtara Ọnụ Ọgụgụ 12:1-15.
. . . Ha wee sị, Ọ̀ bụ ezie na nanị Mozis ka Jehova werewooro kwuo okwu? Ọ́ bụghịkwa anyị ka O werewooro kwuo okwu?” Ihe àmà na-egosi na Miriam butere ụzọ n’ihe a e mere megide Mozis, n’ihi na ọ bụ ya, ọ bụghị Erọn, ka Jehova ji ekpenta dịruru otu izu dọọ aka ná ntị n’ihi enweghị nkwanye ùgwù ya.—Gịnị kpaliri Miriam imegide Mozis? Ọ̀ bụ nchegbu o nwere maka ezi ofufe na ọchịchọ nke ichebe ụmụ Izrel ibe ya pụọ ná mmerụ ahụ́? Ihe àmà na-egosi na ọ bụghị ya. O yiri ka Miriam o kwewo ka obi ya nwee ọchịchọ na-ekwesịghị ekwesị nke inweta ùgwù na ikike ka ukwuu. Dị ka onye amụma nwanyị n’Izrel, ndị mmadụ, karịsịa ndị inyom, na-akwanyere ya ùgwù dị ukwuu. O duru ha n’egwú nakwa n’abụ mgbe a zọpụtasịrị Izrel n’ụzọ ọrụ ebube n’Oké Osimiri Uhie. Otú ọ dị, ugbu a, ọ pụrụ ịbụwo na Miriam enwewo nchegbu na-enweghị isi na nwunye Mozis, bụ́ onye ọ na-enyo enyo na ọ na-ama ya aka, bụzi onye a ga na-enye ụfọdụ n’ime nkwanye ùgwù ndị a na-enye ya onwe ya. N’ịbụ onye ekworo nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị kpaliri, o sesoro Mozis, bụ́ onye Jehova họpụtara, okwu.—Ọpụpụ 15:1, 20, 21.
N’aka nke ọzọ, nzube Fineas ji mee ihe o mere dị iche. N’oge na-adịghị anya tupu ụmụ Izrel abanye n’Ala Nkwa ahụ, ka ha mara ụlọikwuu ha n’Ọzara Moab, ndị inyom Moab na Midian rabara ọtụtụ ndị ikom Izrel n’omume rụrụ arụ nakwa n’ikpere arụsị. Iji mee ka ọmụma ụlọikwuu ahụ dị ọcha ma mee ka ọnụma Jehova kwụsị, e nyere ndị ikpe Izrel ntụziaka igbu ndị ikom nile mehieworonụ n’ụzọ dị otú a. Iji mee omume rụrụ arụ, onyeisi nke ebo Simeon bụ́ Zimri ji anyaike kpọbata nwanyị Midian bụ́ Kọzbi n’ọmụma ụlọikwuu ahụ “n’anya nzukọ nile nke ụmụ [Izrel].” Fineas mere ihe ozugbo. N’ịbụ onye ekworo, ma ọ bụ ịnụ ọkụ n’obi, maka ofufe Jehova na ọchịchọ nke ịhụ na ọmụma ụlọikwuu ahụ nọgidere na-adị ọcha n’omume, kpaliri, o gburu ndị ahụ na-akwa iko n’ụlọikwuu ha. A jara ya mma maka “iwe ekworo ya,” ‘n’iwere ekworo Jehova kwoo ekworo.’ Ihe ahụ Fineas mere ngwa ngwa mere ka ihe otiti nke gburularị mmadụ 24,000 kwụsị, Jehova jikwa ọgbụgba ndụ nke usoro ndị nchụàjà ịdịgide n’eriri ya ruo mgbe ebighị ebi, gọzie ya.—Ọnụ Ọgụgụ 25:4-13; The New English Bible.
Olee ihe dị iche n’ekworo abụọ a e kworo? Ekworo nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị kpaliri mere Miriam ji megide nwanne ya nwoke, ebe ekworo nsọpụrụ Chineke kpaliri Fineas imezu ihe e kpere n’ikpe. E nwere oge mgbe anyị onwe anyị, dị nnọọ ka Fineas, kwesịrị inwe mmetụta nke ịbụ ndị a kpaliri ikwu echiche anyị ma ọ bụ ime ihe ụfọdụ iji gbachitere aha Jehova, ofufe ya, na ndị ya.
Ekworo Hiere Ụzọ
Otú ọ dị, ò kwere omume ikwo ekworo hiere ụzọ? Ee, o kwere omume. Otú a ka ọ dị n’ozuzu ya n’ebe ndị Juu nọ na narị afọ mbụ. Ha ji ekworo chekwaa Iwu ahụ Chineke nyere ha na ọdịnala ha. Ná mgbalị ha ichebe Iwu ahụ, ha tụpụtara imerime iwu nchịkwa na ihe mgbochi ndị ghọọrọ ndị ahụ ibu arọ. (Matiu 23:4) N’ịbụ ndị na-enweghị ike na ndị na-adịghị njikere ịghọta na Chineke ejiriwo ihe ahụ dị adị nke Iwu Mozis sere onyinyo ya dochie Iwu Mozis, ekworo ha kpaliri ha n’ụzọ na-ezighị ezi iweso ụmụazụ Jizọs Kraịst iwe n’ụzọ a na-achịkwaghị achịkwa. Pọl onyeozi, bụ́ onye jibu ekworo guzosie ike maka Iwu ahụ n’ụzọ hiere ụzọ, rụtụrụ aka na ndị na-agbachitere Iwu ahụ “nwere ịnụ ọkụ n’obi [ekworo] maka Chineke; ma ọ bụghị dị ka ezi ihe ọmụma si dị.”—Ndị Rom 10:2; Ndị Galeshia 1:14.
Ọbụna o siiri ọtụtụ n’ime ndị Juu ghọrọ Ndị Kraịst ike ịkwụsị oké ịnụ ọkụ n’obi a ha nwere maka Iwu ahụ. Mgbe Pọl mesịrị njem ozi ala ọzọ nke atọ ya, o zigaara òtù na-achị isi nke narị afọ mbụ akụkọ ozi banyere ntọghata nke ndị mba ọzọ. N’oge ahụ, ọtụtụ puku Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu nọcha ‘na-anụrụ Iwu ahụ ọkụ n’obi.’ (Ọrụ 21:20) Nke a mere ọtụtụ afọ mgbe òtù na-achị isi nyesịrị ntụziaka na iwu ejighị ndị Jentaịl bụ́ Ndị Kraịst ịbụ ndị e biri ùgwù. Okwu ndị metụtara idebe Iwu ahụ anọwo na-akpata esemokwu n’ọgbakọ. (Ọrụ 15:1, 2, 28, 29; Ndị Galeshia 4:9, 10; 5:7-12) N’ịbụ ndị na-enweghị nghọta zuru ezu banyere otú Jehova si emeso ndị ya ihe mgbe ahụ, ụfọdụ Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu siri ọnwụ ijigide echiche nke ha, na-akatọ ndị ọzọ.—Ndị Kọlọsi 2:17; Ndị Hibru 10:1.
Ya mere, anyị aghaghị izere ọnyà nke iji ekworo na-anwa ichebe echiche ma ọ bụ omume ndị anyị ji kpọrọ ihe bụ́ ndị na-adaberesighị ike n’Okwu Chineke. Anyị ga-eme nke ọma ịnakwere ìhè ọhụrụ a na-amụkwasị n’Okwu Chineke site n’usoro Jehova ji eme ihe taa.
Na-ekworo Jehova Ekworo
Otú ọ dị, ekworo nsọpụrụ Chineke nwere ọnọdụ n’ezi ofufe. Mgbe o yiri ka anyị na-enwe nchegbu na-enweghị isi banyere aha ma ọ bụ ihe ndị ruuru anyị, ekworo nsọpụrụ Chineke na-eme ka nchegbu anyị bụrụ banyere Jehova. Ọ na-akwali anyị ịchọ ohere ndị anyị ga-eji na-ekwusa eziokwu banyere ya, na-agbachitere ụzọ ya na ndị ya.
Otu onye nwe ụlọ nke nwere echiche na-ezighị ezi banyere iwu Chineke banyere ọbara katọrọ nnọọ Akiko, bụ́ onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova. Akiko ji akọ gbachitere Okwu Chineke, ọbụna na-ekwu nsogbu ndị metụtara ọgwụgwọ na nsogbu ndị ọzọ a na-enweta site ná mmịnye ọbara. N’ịbụ onye nwere oké ọchịchọ ikwu banyere Jehova, o kwuuru okwu ahụ gaa n’ihe ọ ghọtara bụ́ isi ihe mere nwanyị ahụ ji jụ—ekweghị na Onye Okike dị. Akiko sooro onye ahụ nwe ụlọ tụgharịa uche n’otú ihe ndị e kere eke si akwado ikwere na e nwere Onye Okike. Ọ bụghị nanị na mgbachite ahụ o ji anyaike mee mere ka nwanyị ahụ kwụsị inwe ajọ mbunobi kamakwa o mere ka ọ malitere nwanyị ahụ ọmụmụ Bible ebe obibi. Taa, onye ahụ nwe ụlọ nke na-ewebu iwe ọkụ bụzi onye na-eto Jehova.
Ekworo, ma ọ bụ ịnụ ọkụ n’obi kwesịrị ekwesị, maka ezi ofufe na-akpali anyị ịmụrụ anya na ịchọ ohere ndị anyị ga-eji na-ekwu banyere ma na-agbachitere ihe ndị anyị kweere n’ebe ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, n’ụlọ ahịa, na mgbe anyị na-eme njem. Dị ka ihe atụ, Midori kpebisiri ike ịgwa ndị ọrụ ibe ya ihe ndị o kweere. Otu onye ọrụ ibe ya nke dị afọ 40 na ụma kwuru na ya achọghị ka ya na Ndịàmà Jehova mekọọ ihe n’ụzọ ọ bụla. Mgbe e mesịrị, n’oge ọzọ ha nwere * nwanyị ahụ kwetakwara na ya ga-ahazi ka a mụọrọ nwa ya nwanyị akwụkwọ ahụ. A malitere ọmụmụ ihe ahụ, ma nne nwata nwanyị ahụ adịghị eso n’ọmụmụ ihe ahụ. Midori kpebiri igosi nwanyị ahụ vidio bụ́ Jehovah’s Witnesses—The Organization Behind the Name.* Nke a mere ka ọ kwụsị inwe ọtụtụ n’ime echiche na-ezighị ezi ndị o nwere. N’ịbụ onye ihe ndị ọ hụrụ kpaliri, ọ sịrị: “Achọrọ m ịdị ka Ndịàmà Jehova.” O sonyeere nwa ya nwanyị n’ịmụ Bible.
mkparịta ụka, nwanyị ahụ mere mkpesa na nwa ya nwanyị na-azụlite àgwà ọjọọ. Midori gosiri ya akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè,Ekworo nke kwesịrị ekwesị nwekwara ọnọdụ ya n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ọ na-eme ka e nwee mmụọ na-ekpo ọkụ nke dabeere n’ịhụnanya na nchegbu ma na-akpali anyị iguzogide mmetụta ndị na-emebi ihe bụ́ ndị pụrụ imerụ ụmụnna ime mmụọ anyị ahụ́, dị ka asịrị na-emebi ihe na echiche nke ndị si n’ezi ofufe dapụ. Ekworo nsọpụrụ Chineke na-akpali anyị ịkwado mkpebi ndị okenye, bụ́ ndị na-ahụ na ọ dị mkpa ịdọ ndị mere ihe ọjọọ aka ná ntị mgbe ụfọdụ. (1 Ndị Kọrint 5:11-13; 1 Timoti 5:20) N’ide banyere ekworo ọ na-ekwoso ndị kwere ekwe ibe ya nọ n’ọgbakọ Kọrint, Pọl kwuru, sị: “Eji m ekworo nke Chineke na-ekwoso unu ekworo, n’ihi na mụ onwe m ekwewo nkwa na otu di ga-alụ unu ka m wee chee unu n’ihu Kraịst ahụ dị ka nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nke a na-emerụghị emerụ.” (2 Ndị Kọrint 11:2) N’otu aka ahụ kwa, ekworo anyị na-akpali anyị ime ike anyị nile iji hụ na ndị nile nọ n’ọgbakọ nọgidere na-adị ọcha n’ozizi, n’ụzọ ime mmụọ, nakwa n’omume.
Ee, ekworo nke kwesịrị ekwesị—ekworo nsọpụrụ Chineke—na-enwe mmetụta dị mma n’ahụ́ ndị ọzọ. Ọ na-eweta ihu ọma Jehova, o kwesịkwara ịbụ otu n’ime àgwà ndị a na-ahụ n’ebe Ndị Kraịst nọ taa.—Jọn 2:17.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 20 Ndị Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Foto ndị dị na peeji nke 29]
Ọ bụ ekworo nsọpụrụ Chineke kpaliri Fineas ime ihe o mere
[Foto ndị dị na peeji nke 30]
Zere ịdaba n’ọnyà nke ekworo hiere ụzọ
[Foto ndị dị na peeji nke 31]
Ekworo nsọpụrụ Chineke na-akpali anyị iso ndị ọzọ na-ekerịta ihe anyị kweere ma jiri òtù ụmụnna anyị kpọrọ ihe