Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Oge Ịṅụrị Ọṅụ n’Ógbè Balkan

Oge Ịṅụrị Ọṅụ n’Ógbè Balkan

Oge Ịṅụrị Ọṅụ n’Ógbè Balkan

Ọ bụ na 1922. A nọ na-enwe nzukọ nke Ndị Mmụta Bible Dị Uchu, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova mgbe ahụ, n’Innsbruck, Austria. Franz Brand, bụ́ nwa okorobịa nke si Apatin nke dị na Vojvodina, Serbia, so ná ndị na-ege ntị. Ozugbo ọkà okwu kpọrọ aha Chineke, bụ́ Jehova, ìgwè na-eme ihe ike malitere ịtụ ụzụ, na-eme ka ọ ghara ikwe ya omume ikwuru okwu gaa n’ihu, nzukọ ahụ bịakwara ná njedebe. Ma, ihe Franz nụrụ nwere mmetụta dị ukwuu n’ahụ́ ya, ọ malitekwara ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ. Nke a bụ mmalite dị nta nke uto ime mmụọ na-akpali akpali e nwere n’otu n’ime mba ndị dị n’ógbè Balkan.

NYE ọtụtụ ndị taa, aha ahụ bụ́ Yugoslavia na-echetara ha agha na oké mgbukpọ. Echiche na-akpali mwute nke mgbuchapụ dị egwu, ndị gbara ọsọ ndụ na-enweghị olileanya, ụlọ ndị a lara n’iyi, na ụmụ mgbei na-ahụju anya na-abata n’uche. Ọnụ apụghị ịkọwacha oké ihe mgbu na nhụsianya nke agha nke kpara ógbè Balkan Peninsula aka ọjọọ malite na 1991 ruo 1995 kpatara, na-ebibi olileanya nile e nwere maka inweta ọganihu na obi iru ala site ná mgbalị nke ụmụ mmadụ. N’ihi agha ahụ, ndị bi n’ebe bụbu Yugoslavia na-ata ahụhụ n’ihi ihe isi ike akụ̀ na ụba na oké ịda ogbenye. *

Ebe e nwere nhụjuanya dị otú ahụ, ọ ga-esiri mmadụ ike ịtụ anya ịhụ ndị nwere obi ụtọ n’akụkụ a nke ụwa. Otú ọ dị, n’agbanyeghị na ọ pụrụ iyi ihe ịtụnanya, ndị dị otú ahụ dị adị. N’ezie, ha nwere oge nṅụrị ọṅụ pụrụ iche ka ọ na-erule ná ngwụsị nke narị afọ nke 20. Olee ihe gbasara Franz Brand, bụ́ nwa okorobịa ahụ a kpọtụrụ aha ná mmalite, n’ihe a nile?

Uto Ime Mmụọ n’Ógbè Balkan

Eziokwu ọhụrụ nke Franz Brand nụrụ kpaliri mmasị ya, o kpebikwara na ya aghaghị ịgbasa ozi ọma ahụ. Ọ chọtara ọrụ dị ka onye na-akpụ isi na Maribor, bụ́ obodo dị na Slovenia na nso ókè ya na Austria, ma malite ikwusara ndị ọ na-akpụ isi ozi ọma, bụ́ ndị na-anọdụkarị jụụ ma na-ege ntị ka a na-akpụ ha isi. N’ihi mgbalị ya, a bịara nwee ntakịrị ìgwè nke ndị nkwusa Alaeze na Maribor ná ngwụsị afọ ndị 1920. E kwuru okwu ndị dabeere na Bible n’otu ụlọ nri, bụ́ nke e mesịrị kpọọ aha kwesịrị ekwesị bụ́ Ụlọ Nri Azụ Mmiri (Ụwa Ọhụrụ) nke Novi svet.

Ka oge na-aga, ozi ọma ahụ gbasara n’ala ahụ dum. Iji “Photo-Drama of Creation” (ihe ngosi na-ewe awa asatọ nke gụnyere ihe nkiri sinima, ihe nkiri slide, na okwu ndị e kwunyere na teepu) nyere aka ná mgbasa a. Mgbe e mesịrị n’afọ ndị 1930, bụ́ mgbe a malitere ịkpagbu Ndịàmà Jehova nọ na Germany n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ, e ji ndị ọsụ ụzọ bụ́ ndị Germany si n’obodo ha gbapụ wusie Ndịàmà nọ n’Alaeze Yugoslavia ike. N’ịchụ ntụsara ahụ́ onwe onye ha n’àjà, ha mere mgbalị iru n’ebe ndị kasị dịrị n’ime ná mba a bụ́ ugwu ugwu, iji mee nkwusa. Na mbụ, o yiri ka a nabatachaghị ozi ha. Ná mmalite afọ ndị 1940, nanị ndị nkwusa 150 nyere akụkọ ozi ubi.

Na 1941, mkpagbu kpụ ọkụ ọnụ tiwapụrụ, bụ́ nke gara n’ihu ruo na 1952. Lee ihe na-enye ọṅụ ọ bụ n’ikpeazụ na September 9, 1953 mgbe, n’okpuru ọchịchị Kọmụnist nke Ọchịagha Tito, e debara aha Ndịàmà Jehova n’akwụkwọ dị ka òtù iwu kwadoro! N’afọ ahụ, e nwere mmadụ 914 na-ekwusa ozi ọma ahụ, ọnụ ọgụgụ ahụ mụbakwara n’esepụghị aka. Ka ọ na-erule na 1991, ọnụ ọgụgụ nke ndị nkwusa mụbara ruo 7,420, mmadụ 16,072 gakwara Ememe Ncheta n’afọ ahụ.

Site n’August 16 ruo 18, 1991, e nwere mgbakọ mba nile mbụ nke Ndịàmà Jehova mere ná mba a na Zagreb, Croatia. Mmadụ 14,684 si ná mba ahụ na mba ndị ọzọ gaa. Mgbakọ a a na-apụghị ichefu echefu kwadebere ndị Jehova maka ule ndị dị n’ihu. Bọs na-ebula ndị si Serbia gaa mgbakọ ahụ so n’ụgbọala ndị ikpeazụ gafere ebe a na-enyocha ndị mmadụ nke dị n’agbata Croatia na Serbia. Mgbe bọs ikpeazụ gafesịrị, e mechiri ókè ahụ, agha malitekwara.

Ndị Jehova Nwere Ihe Ndị Mere Ha Ga-eji Ṅụrịa Ọṅụ

Oge agha ahụ ghọrọ oge ule tara akpụ nye Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè Balkan. Otú o sina dị, ha nwere ihe mere ha ga-eji ṅụrịa ọṅụ n’ihi na Jehova ejiriwo mmụba dị ukwuu gọzie ndị ya n’ebe ahụ. Kemgbe 1991, ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze nọ n’ebe ndị bụbu Yugoslavia ejiriwo ihe karịrị pasent 80 mụbaa. E nwere ọnụ ọgụgụ kasị elu bụ́ 13,472 n’afọ ije ozi 2001.

Alaka ụlọ ọrụ ndị e nwere na Zagreb na Belgrade (Serbia) na-elekọtabu ọrụ Ndịàmà Jehova n’ebe nile bụbu Yugoslavia. N’ihi mmụba na mgbanwe ọchịchị, ọ bịara dị mkpa iguzobe alaka ụlọ ọrụ ndị ọhụrụ na Ljubljana (Slovenia), na Skopje (Macedonia), tụkwasị n’inweta ụlọ ọrụ ọhụrụ na Belgrade nakwa na Zagreb. Ihe dị ka mmadụ 140 na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ ndị a. Ndị ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha bụ ndị ntorobịa ma nwee nnọọ ịnụ ọkụ n’obi na ịhụnanya maka Jehova. Ọtụtụ n’ime ha so na-asụgharị akwụkwọ ndị e ji amụ Bible gaa n’asụsụ Croatian, Macedonian, Serbian, na Slovenian. Lee ihe na-enye ọṅụ ọ bụ na a na-ebipụta ihe ka n’ọnụ ọgụgụ na magazin na akwụkwọ Ndịàmà Jehova n’asụsụ ndị a n’otu oge ahụ a na-ebipụta ha n’asụsụ Bekee! Akwụkwọ ndị a na-enyere ọtụtụ ndị aka inweta nkasi obi na olileanya.

Ihe ọzọ mere e ji nwee ọṅụ bụ nkwado ọtụtụ ndị ozi oge nile si mba ndị ọzọ ji achọghị ọdịmma onwe onye nanị na-enye. E wuwo ọtụtụ ọmarịcha Ụlọ Nzukọ Alaeze n’afọ ndị na-adịbeghị anya, na-eme ka ọgbakọ dị iche iche nwekwuo ọṅụ. Otú o sina dị, ha ka na-aga inwekwu ọṅụ. Olee otú nke ahụ pụrụ isi mee?

Ọrụ Pụrụ Iche

Ọtụtụ ndị nkwusa na-echekarị sị, ‘Ọ̀ dị mgbe anyị ga-enwe New World Translation n’asụsụ anyị?’ Site n’afọ ruo n’afọ, ha na-atụsi anya ike ịnụ ka a ga-ama ọkwa nke ahụ ná mgbakọ distrikti. Ma, olee otú a pụrụ isi rụọ nnukwu ọrụ dị otú ahụ ebe ọ bụ na e guzobere ìgwè ndị nsụgharị nke asụsụ ndị a afọ ole na ole gara aga, nweekwa ndị nsụgharị dị nnọọ ole na ole?

Mgbe Òtù Na-achị Isi nyochasịrị okwu ahụ, ha kwadoro ka a gbakọọ aka rụọ ọrụ, ka ìgwè ndị nsụgharị nke asụsụ Croatian, Macedonian, na Serbian rụkọọ ọrụ ọnụ ma si otú ahụ rite uru n’ọrụ na aro nke ibe ha. Ìgwè ndị nsụgharị nke asụsụ Croatian ga-edu.

Ụbọchị Ịṅụrị Ọṅụ

Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè Balkan agatụghị echezọ July 23, 1999. A na-aga inwe usoro Mgbakọ Distrikti “Okwu Amụma Chineke” n’otu oge na Belgrade, Sarajevo (Bosnia-Herzegovina), Skopje, na Zagreb. Ruo oge ụfọdụ, e jighị n’aka ma a ga-enwe mgbakọ ahụ na Belgrade n’ihi na n’oge ndị NATO na-atụ bọmbụ n’ebe ahụ, e kweghị ka e nwee nzukọ ihu ọha ọ bụla. Lee ka ụmụnna ahụ si nwee obi ụtọ n’atụmanya nke inwe ike isoro ibe ha nọkọọ ka ọtụtụ ọnwa nke amaghị ihe ga-emenụ gasịrị! Otú ọ dị, ihe merenụ karịrị ihe ha tụrụ anya ya.

N’ehihie Friday, a mara ọkwa pụrụ iche n’ebe anọ a nọ nwee mgbakọ ahụ. Mmadụ 13,497 garanụ deere duu na-atụ anya ihe na-aga ime. Mgbe ọkà okwu mesịrị wepụta Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’asụsụ Croatian na Serbian ma gwa ndị na-ege ntị na nsụgharị nke asụsụ Macedonian nọ na-aga nke ọma, ndị na-ege ntị apụghịkwa ijide onwe ha ọzọ. Aka a kụrụ nke dasiri ụda ike ekweghị ọkà okwu machaa ọkwa ahụ. Ná mgbakọ e nwere na Sarajevo, ndị na-ege ntị, bụ́ ndị nwere nnọọ ihe ijuanya, gbara nkịtị na mberede. Ihe sochirinụ bụ aka a kụrụ ruo ogologo oge. Anya mmiri nke ọṅụ gbara ọtụtụ ndị nọ na Belgrade, e jikwa ịkụ aka ugboro ugboro mee ka ọkà okwu kwụsị ikwu okwu ugboro ugboro tupu ya amachaa ọkwa ahụ. Lee ka mmadụ nile si nnọọ nwee obi ụtọ!

Eziokwu ahụ bụ́ na Ndịàmà Jehova enwetawo ikike nke ibipụta nsụgharị Bible Croatian nakwa nke Serbian mere ka onyinye a dịrị oké ọnụ okpukpu abụọ. Ya mere, e jikọtara Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst ndị dị n’asụsụ abụọ a na ndị nke Akwụkwọ Nsọ Hibru ha n’otu mpịakọta. Ọzọkwa, e ji ma mkpụrụ akwụkwọ Roman ma nke Cyrillic bipụta Bible Serbian.

N’inwe ekele maka ngọzi na nduzi a nile ha nwetara, ndị Jehova nọ n’ógbè Balkan kwenyere n’ezie n’ihe Devid kwuru, sị: “A sị na ejee m ije na ndagwurugwu onyinyo ọnwụ, m gaghị atụ egwu ihe ọjọọ ọ bụla; n’ihi na Gị onwe gị [Jehova] nọnyeere m.” N’agbanyeghị ihe isi ike nile ha nọgidere na-eche ihu, ha kpebisiri ike ime ka ‘ọṅụ Jehova bụrụ ike ha.’—Abụ Ọma 23:4; Nehemaịa 8:10.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ihe mejupụtara ebe bụbu Yugoslavia bụ mba isii kwụụrụ onwe ha—Bosnia-Herzegovina, Croatia, Macedonia, Montenegro, Serbia, na Slovenia.

[Foto dị na peeji nke 20]

Ìgwè mbụ nke ndị nkwusa si Maribor, Slovenia, ka ha na-eme nkwusa n’ókèala dịpụrụ adịpụ