Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Setan Ọ̀ Bụ Onye A Kọrọ n’Akụkọ Ifo Ka Ọ̀ Bụ Ajọ Onye Dị Adị?

Setan Ọ̀ Bụ Onye A Kọrọ n’Akụkọ Ifo Ka Ọ̀ Bụ Ajọ Onye Dị Adị?

Setan Ọ̀ Bụ Onye A Kọrọ n’Akụkọ Ifo Ka Ọ̀ Bụ Ajọ Onye Dị Adị?

OTÚ ihe ọjọọ si malite akpaliwo mmasị ndị ụbụrụ na-aghọ nkọ eri oge ochie. Akwụkwọ bụ́ A Dictionary of the Bible, nke James Hastings dere, na-ekwu, sị: “Mgbe mmadụ malitere ịmata onwe ya, ọ chọpụtara na ọ bụ onye ikike ndị ọ na-apụghị ịchịkwa na ndị na-enwe mmetụta dị njọ ma ọ bụ na-emebi ihe, na-eche ihu.” Otu akwụkwọ ahụ na-ekwukwa, sị: “Amamihe ebumpụta ụwa kpaliri mmadụ ndị biri ndụ ná mmalite ịchọ ihe ndị kpatara ihe, ma kọwaa ikike dị iche iche na ihe ndị ọzọ a na-ahụ n’ihe okike dị ka ihe dịịrị onwe onye.”

Dị ka ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme si kwuo, ọ pụrụ ịbụ na a malitere ikwere n’ịdị adị nke chi ndị bụ́ mmụọ ọjọọ na ndị ajọ mmụọ, ná mmalite akụkọ ihe mere eme nke Mesọpotemia. Ndị Babilọn oge ochie kweere na ọ bụ Nergal, bụ́ chi na-eme ihe ike nke a maara dị ka “onye na-akpọ ọkụ,” na-elekọta ụwa ndị nwụrụ anwụ, ma ọ bụ “ala nke a na-adịghị esi na ya alọghachi.” Ha na-atụkwa ndị mmụọ ọjọọ egwu, bụ́ ndị ha na-anwa iji okwu majik eme ka obi jụrụ. N’akụkọ ifo ndị Ijipt, Set bụ chi nke ihe ọjọọ, bụ́ nke “a na-egosipụta dị ka chi nwere ọdịdị anụ ọhịa dị egwu nke nwere imi dị gịrịgịrị ma gbaa ngọ, ntị ogologo, na ọdụ siri ike ma gbaa mkpị.”—Larousse Encyclopedia of Mythology.

Ọ bụ ezie na ndị Gris na ndị Rom nwere chi ndị na-eme ihe ọma na ndị na-eme ihe ọjọọ, ha enweghị chi ọ bụla e ji nanị ime ihe ọjọọ mara. Ndị ọkà ihe ọmụma ha kụziri na e nwere ụkpụrụ abụọ ndị na-emegiderịta onwe ha. Empedocles kwuru na ha bụ Ịhụnanya na Enweghị Nkwekọ. Plato kwuru na ụwa nwere “Mkpụrụ Obi” abụọ, otu na-akpata ihe ọma, ebe nke ọzọ na-akpata ihe ọjọọ. Dị ka Georges Minois si kwuo n’akwụkwọ ya bụ́ Le Diable (Ekwensu), “okpukpe ndị ọgọ mmụọ nke [Ndị Gris na Rom] oge ochie amaghị banyere Ekwensu.”

N’Iran, ndị òtù Zoroaster kụziri na chi kasịnụ bụ́ Ahura Mazda, ma ọ bụ Ormazd, kere Angra Mainyu, ma ọ bụ Ahriman, bụ́ onye họọrọ ime ihe ọjọọ ma si otú ahụ ghọọ Mmụọ Na-ebibi Ihe, ma ọ bụ Onye Mbibi.

N’okpukpe ndị Juu, a kọwara Setan n’ụzọ dị mfe dị ka Onye Iro Chineke nke wetara mmehie. Ma mgbe ọtụtụ narị afọ gasịrị, a bịara jiri echiche ndị na-ekpere arụsị gwagbuo ya. Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Judaica na-ekwu, sị: “E nwewo oké mgbanwe . . . ka ọ na-erule na narị afọ ndị ikpeazụ T.O.A. N’oge a, okpukpe [ndị Juu] . . . nakweere ọtụtụ ihe e ji mara nkwenkwe nke ụkpụrụ abụọ ndị na-emegiderịta onwe ha bụ́ nke na-ekwu na e nwere ike ihe ọjọọ na aghụghọ ndị dị ike bụ́ ndị kwụ n’otu akụkụ ma na-emegide Chineke na ike nke ezi ihe na eziokwu n’eluigwe na n’ụwa. O yiri ka e si n’okpukpe ndị Peasia nweta echiche a.” Akwụkwọ bụ́ The Concise Jewish Encyclopedia na-ekwu, sị: “E mere ka nchebe pụọ n’aka ndị m[mụọ ọjọọ] kwe omume site n’ịgbaso ihe e nyere n’iwu nakwa site n’iji ọtụmọkpọ eme ihe.”

Nkà Mmụta Okpukpe nke Ndị Kraịst Si n’Ezi Ofufe Dapụ

Ọbụna dị ka okpukpe ndị Juu si nakwere echiche na-adabereghị na Bible banyere Setan na ndị mmụọ ọjọọ, Ndị Kraịst si n’ezi ofufe dapụ kọwakwuru echiche ndị na-adabereghị n’Akwụkwọ Nsọ banyere ha. Akwụkwọ bụ́ The Anchor Bible Dictionary na-ekwu, sị: “Otu n’ime echiche ndị gabigara nnọọ ókè e nwere na nkà mmụta okpukpe oge ochie bụ na Chineke gbapụtara ndị ya site n’ịkwụ Setan ụgwọ ịtọhapụ ha.” Ọ bụ Irenaeus (narị afọ nke abụọ O.A.) welitere echiche a. Origen (narị afọ nke atọ O.A.) kọwakwuru ya, bụ́ onye kwuru na “ekwensu bịara nwere ụmụ mmadụ dị ka iwu si chọọ,” onye wekwaara “ọnwụ Kraịst . . . dị ka ihe mgbapụta a kwụrụ ekwensu.”—History of Dogma, nke Adolf Harnack dere.

Dị ka akwụkwọ bụ́ The Catholic Encyclopedia si kwuo, “ruo ihe dị ka otu puku afọ [echiche bụ́ na a kwụrụ Ekwensu ihe mgbapụta ahụ] keere òkè dị ukwuu n’akụkọ ihe mere eme nke nkà mmụta okpukpe,” ọ nọgidekwara bụrụ otu n’ime ihe ndị chọọchị kweere. Ndị Nna Chọọchị ndị ọzọ, gụnyere Augustine (narị afọ nke anọ ruo nke ise O.A.), nakweere echiche bụ́ na a kwụrụ Setan ihe mgbapụta ahụ. N’ikpeazụ, ka ọ na-erule narị afọ nke 12 O.A., ndị ọkà mmụta okpukpe Katọlik bụ́ Anselm na Abelard bịara ruo ná nkwubi okwu bụ́ na ọ bụghị Setan ka a chụọrọ àjà Kraịst kama na ọ bụ Chineke.

Nkwenkwe Ụgha nke Oge Ụwa Na-emepechabeghị Anya

Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ na kansụl Chọọchị Katọlik nọgidere na-agbachi nnọọ nkịtị n’okwu banyere Setan, na 1215 O.A., Kansụl Lateran nke Anọ wepụtara ihe akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia kpọrọ “nkwupụta okwukwe siri ike.” Nkwupụta nke 1 na-ekwu, sị: “Chineke kere ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ndị ọzọ dị ka ndị ọma, ma ha ji aka ha ghọọ ndị ọjọọ.” Ọ na-agbakwụnye na ha na-agbasi mbọ ike ịnwa ihe a kpọrọ mmadụ. Echiche nke ikpeazụ a mere ka obi ghara iru ọtụtụ mmadụ ala n’Oge Ụwa Na-emepechabeghị Anya. Ọ bụ Setan kpatara ihe ọ bụla yiri ihe na-adịghị emekebe, dị ka ọrịa a na-amaghị isi ya, ọnwụ mberede, ma ọ bụ ihe ọkụkụ emeghị nke ọma. Na 1233 O.A., Popu Gregory nke Itoolu nyere iwu dịgasị iche iche megide ndị jụrụ okwukwe, gụnyere nke megidere ndị kweere na Lusifa, bụ́ ndị e weere na ha na-efe Ekwensu.

Nkwenkwe bụ́ na Ekwensu ma ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ ya pụrụ ibi n’ime mmadụ mere ka a malite ịtụ ọtụtụ ụjọ na-enweghị isi—oké ụjọ ịbụ onye a ga-akọ ọgwụ na onye a ga-ata amoosu. Site na narị afọ nke 13 ruo 17, ụjọ ndị amoosu gbasara ngwa ngwa n’ebe nile na Europe ma ruo n’ebe ndị si Europe kwaga Ebe Ugwu America nọ. Ọbụna ndị Protestant na-eme mgbanwe bụ́ Martin Luther na John Calvin kwadoro ịchụ nta ndị amoosu. Na Europe, ụlọikpe Njụta Okwukwe na ụlọikpe nkịtị kpere ikpe amoosu ndị dabeere nanị na kepu kepu a nụrụ ma ọ bụ n’ebubo obi ọjọọ. E jikarị mmekpọ ọnụ mee ka ndị aka ha dị ọcha kwuo na “ikpe mara ha.”

A pụrụ ịma ndị dara iwu ikpe ọnwụ ma ọ́ bụghị site n’ịkpọ ha ọkụ ọ bụrụ, dị ka e mere n’England na Scotland, site n’ịkwụgbu ha akwụgbu. A bịa n’ọnụ ọgụgụ ndị e gburu, akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-ekwu, sị: “Dị ka ụfọdụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme si kwuo, site na 1484 ruo 1782, chọọchị Ndị Kraịst gburu ihe dị ka ndị inyom 300,000 n’ihi ịta amoosu.” Ọ bụrụ na ọ bụ Setan kpatara ọdachi a mere n’oge ụwa na-emepechabeghị anya, olee ndị o ji mere ngwá ọrụ—ọ̀ bụ ndị ahụ e gburu ka ọ̀ bụ ndị ahụ kpagburu ha bụ́ ndị na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè?

Ihe E Kwere Ma Ọ Bụ Ihe A Na-ekweghị n’Oge A

Na narị afọ nke 18, echiche nke mmadụ, bụ́ nke a maara dị ka Mmepe Anya, jupụtara ebe nile. Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica na-ekwu, sị: “Nkà ihe ọmụma na nkà mmụta okpukpe nke oge Mmepeanya ahụ gbalịsiri ike ime ka Ndị Kraịst wepụ ekwensu n’uche ha dị ka onye a kọrọ n’akụkọ ifo nke Oge Ụwa Na-emepechabeghị Anya.” Chọọchị Roman Katọlik mere ihe banyere nke a ma mesighachi ya ike na Kansụl Vatican nke Mbụ (1869-1870) na ya kweere na Setan bụ́ Ekwensu dị adị, na-ekwupụtaghachi nkwenkwe a n’ụzọ na-esichaghị ike na Kansụl Vatican nke Abụọ (1962-1965).

N’ụzọ kwekọrọ n’iwu ya, dị ka akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia si kweta, “iwu ji Chọọchị ikwere na ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ dị.” Otú ọ dị, Théo, bụ́ akwụkwọ ọkọwa okwu French nke okpukpe Katọlik, na-ekweta na “ọtụtụ Ndị Kraịst taa adịghị ekwe ikwu na ọ bụ ekwensu na-akpata ihe ọjọọ ndị a na-eme n’ụwa.” N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ndị ọkà mmụta okpukpe Katọlik anọwo na-eji nlezianya elebara ọnọdụ a anya, na-ekwenyetụrụ ma nkwenkwe chọọchị Katọlik nakweere ma echiche e nwere n’oge a. “Nkà mmụta okpukpe Ndị Kraịst nke ikwere ihe masịrị onye,” ka akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica na-ekwu, “yiri ka ọ na-ewere ihe Bible na-ekwu banyere Setan dị ka ‘echiche ihe atụ’ nke a na-ekwesịghị iwere n’ụzọ nkịtị—dị ka ụzọ isi jiri akụkọ ifo na-anwa ịkọwa ịdị adị nke ihe ọjọọ dị n’eluigwe na ala nakwa otú o ruru.” Banyere ndị Protestant, otu akwụkwọ ahụ na-ekwu, sị: “Okpukpe Protestant nke na-ekwere ihe masịrị ya n’oge a yiri ka ọ na-arụ ụka na ọ dịghị mkpa ikwere na e nwere ekwensu nke bụ́ onye.” Ma ezi Ndị Kraịst hà kwesịrị iwere ihe Bible na-ekwu banyere Setan dị ka nanị “echiche ihe atụ”?

Ihe Akwụkwọ Nsọ Na-akụzi

Nkà ihe ọmụma na nkà mmụta okpukpe nke mmadụ enyebeghị nkọwa dị mma banyere otú ihe ọjọọ si malite karịa nke ahụ e nyere na Bible. Ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere Setan bụ isi ihe na-eme ka a ghọta otú ihe ọjọọ na nhụjuanya nke mmadụ si malite, nakwa ihe mere ihe ike ndị kasị njọ a pụrụ ichetụ n’echiche ji na-akawanye njọ kwa afọ.

Ụfọdụ pụrụ ịjụ, sị: ‘Ọ bụrụ na Chineke bụ ezi Onye Okike nke na-ahụ n’anya, olee otú ọ ga-esi kee ajọ mmụọ dị ka Setan?’ Bible na-atụpụta ụkpụrụ bụ́ na ihe nile Jehova Chineke rụrụ zuru okè nakwa na o nyere ihe nile o kere eke nwere ọgụgụ isi nnwere onwe ime nhọrọ. (Deuterọnọmi 30:19; 32:4; Joshua 24:15; 1 Ndị Eze 18:21) N’ihi ya, ọ ghaghị ịbụwo na e kere mmụọ ahụ ghọrọ Setan dị ka onye zuru okè, ọ ghaghịkwa ịbụwo ya ji aka ya họrọ isi n’ụzọ nke eziokwu na ezi omume kpapụ.—Jọn 8:44; Jems 1:14, 15.

N’ọtụtụ ụzọ, omume nnupụisi Setan yiri nke “eze Taịa,” bụ́ onye e ji uri kọwaa dị ka ‘onye mazuru mma’ na ‘onye zuru okè n’ụzọ ya nile site n’ụbọchị e kere ya, ruo mgbe a hụrụ ajọ omume n’ime ya.’ (Ezikiel 28:11-19) Setan amaghị ịbụ ọkaaka ma ọ bụ ịbụ Onye Okike nke Jehova aka. Setan ọ̀ ga-esi aṅaa mee otú ahụ, ebe ọ bụ na ọ bụ Chineke kere ya? Otú ọ dị, Setan mara ụzọ Jehova si egosipụta ọbụbụeze ya aka. N’ogige Iden, Setan nyere echiche na Chineke na-anapụ mmadụ abụọ mbụ ahụ ihe ruuru ha, bụ́kwa ihe ọdịmma ha dabeere na ya. (Jenesis 3:1-5) O nwere ihe ịga nke ọma n’ime ka Adam na Iv nupụrụ ọbụbụeze ezi omume nke Jehova isi, na-ewetara onwe ha na ụmụ ha mmehie na ọnwụ. (Jenesis 3:6-19; Ndị Rom 5:12) N’ụzọ dị otú ahụ, Bible na-egosi na Setan bụ onye bụ́ isi kpatara nhụjuanya nke mmadụ.

Oge ụfọdụ tupu Iju Mmiri ahụ, ndị mmụọ ozi ndị ọzọ sonyeere Setan ná nnupụisi ya. Ha nwoghatara ahụ́ mmadụ iji mejuo ọchịchọ ha nke iso ụmụ ndị inyom nke mmadụ nwee mmekọahụ. (Jenesis 6:1-4) N’oge Iju Mmiri ahụ, ndị mmụọ ozi a nupụrụ isi laghachiri n’ógbè ndị bụ́ mmụọ ma ọ bụghị ‘n’ọnọdụ mbụ’ ha nke iso Chineke nọrọ n’eluigwe. (Jud 6) E wedara ha n’ọnọdụ nke oké ọchịchịrị ime mmụọ. (1 Pita 3:19, 20; 2 Pita 2:4) Ha ghọrọ ndị mmụọ ọjọọ, ha anọghịzi na-eje ozi n’okpuru ọbụbụeze Jehova kama ha doro onwe ha n’okpuru Setan. Ọ bụ ezie na ihe àmà na-egosi na ha apụghị inwogha onwe ha ọzọ, ndị mmụọ ọjọọ ka pụrụ ịkpa ike dị egwu n’uche nakwa ná ndụ ụmụ mmadụ, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na ọ bụ ha na-akpata ọtụtụ ihe ike ndị anyị na-ahụ taa.—Matiu 12:43-45; Luk 8:27-33.

Njedebe nke Ịchịisi Setan Dị Nso

O doro anya na ndị ajọ mmụọ nọ n’ọrụ n’ụwa taa. Jọn onyeozi dere, sị: “Ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.”—1 Jọn 5:19.

Otú ọ dị, amụma Bible ndị mezuworonụ na-egosi na Ekwensu na-eme ka nhụjuanya e nwere n’ụwa na-akawanye njọ n’ihi na ọ maara na ọ bụ nanị “oge dị mkpirikpi” fọdụụrụ ya iji kpaa ike tupu e jichie ya. (Mkpughe 12:7-12; 20:1-3) Njedebe nke ịchịisi Setan ga-eme ka e nwee ụwa ọhụrụ ezi omume, bụ́ ebe anya mmiri, ọnwụ, na ihe mgbu ‘na-agaghị adị ọzọ.’ Mgbe ahụ, uche Chineke ‘ga-eme n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.’—Mkpughe 21:1-4; Matiu 6:10.

[Foto ndị dị na peeji nke 4]

Ndị Babilọn kweere na Nergal (n’isi isi aka ekpe), bụ́ chi na-eme ihe ike; Plato (n’aka ekpe) kweere na e nwere “Mkpụrụ Obi” abụọ ndị na-emegiderịta onwe ha

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Cylinder: Musée du Louvre, Paris; Plato: National Archaeological Museum, Atens, Gris

[Foto ndị dị na peeji nke 5]

Irenaeus, Origen, na Augustine kụziri na ọ bụ Ekwensu ka a kwụrụ ihe mgbapụta ahụ

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Origen: Culver Pictures; Augustine: Site n’akwụkwọ bụ́ Great Men and Famous Women

[Foto dị na peeji nke 6]

Egwu a tụrụ ndị amoosu mere ka e gbuo ọtụtụ narị puku mmadụ

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’akwụkwọ bụ́ Bildersaal deutscher Geschichte