Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụlọ Nzukọ Alaeze Gheere Oghe Nye Onye Ọ Bụla

Ụlọ Nzukọ Alaeze Gheere Oghe Nye Onye Ọ Bụla

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Ụlọ Nzukọ Alaeze Gheere Oghe Nye Onye Ọ Bụla

MGBE Jizọs Kraịst na-nye ndị na-eso ụzọ ya ọzụzụ maka ozi a a na-eje maka ọha, ọ gbara ha ume ‘isi n’elu ụlọ kwusaa ya.’ (Matiu 10:27) Ee, ha ga-eje ozi Ndị Kraịst ha n’ihu ọha, n’ebe ọha na eze ga-ahụ ha. N’itinye ụkpụrụ a n’ọrụ, Ndịàmà Jehova na-arụkwa ọrụ ha n’ihu ọha. Ọrụ a Ndịàmà na-arụ n’ihu ọha enyeworo ha aka imeri mmegide na ịbụ ndị a matara nke ọma.

Ọ bụ ezie na nzukọ ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova gheere oghe nye ọha na eze, ajọ mbunobi na-eme ka ụfọdụ ndị na-ala azụ ịbanye n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Nke a bụ eziokwu na Finland. Ndị ọzọ bụ ndị ihere na-eme nnọọ ịga n’ebe ndị ha na-agatụbeghị. Mgbe e wuchara Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ ma ọ bụ rụzigharịa nke dị adị, a na-emekarị ndokwa maka ịgbape ụlọ. A pụrụ ime mgbalị pụrụ iche ịkpọ ndị agbata obi òkù ịbịa leta Ụlọ Nzukọ Alaeze ma mara banyere ọrụ Ndịàmà Jehova.

N’otu ebe, Ndịàmà mere ndokwa ịkpọsa magazin n’otu ụbọchị ahụ ha gbapere Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ ha. Ndịàmà abụọ zutere otu agadi nwoke nke kwuru na ọ na-amasị ya ịgụ magazin Ụlọ Nche na Teta! Ụmụnna ahụ gwara ya banyere mgbape ụlọ ahụ a ga-eme ma kwuo na ha ga-akpọrọ ya gaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Nwoke ahụ kwuru na obi ga-adị ya ụtọ isonyere ha. Nwunye ya, n’ịbụ onye geworo ntị ná mkparịta ụka ahụ, ji oké olu kwuo, sị, “Ahapụkwala m ma ị gawa!”

Mgbe nwoke ahụ banyere n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, o legharịrị anya ma kwuo, sị: “Ebe a adịghị eji oji ma ọlị. Oo, ebe a mara mma ma na-egbuke egbuke. A gwara m na Ụlọ Nzukọ Alaeze ga na-eji oji!” Di na nwunye ahụ nọrọ ruo oge ụfọdụ ma rịọ ka e nye ha akwụkwọ ụfọdụ n’ebe a na-ewere akwụkwọ.

Otu ọgbakọ chọrọ iji otu akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta n’ógbè ha maa ọkwa maka mgbape ụlọ n’oge ha ga-arara Ụlọ Nzukọ Alaeze ha nye. Mgbe onyeisi ụlọ ọrụ akwụkwọ akụkọ ahụ natara ozi banyere ihe omume ahụ, ọ tụrụ aro ka e dee akụkọ banyere ihe ahụ ha na-aga ime. Ụmụnna ahụ kwere, n’oge na-adịghịkwa anya ka e mesịrị, akụkọ weere ọkara peeji bụ́ nke kwuru okwu ọma banyere Ndịàmà gbara n’akwụkwọ akụkọ ahụ, na-akọ banyere ihe omume ahụ ma na-akọwa ọrụ ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ógbè ahụ na-arụ.

Mgbe e bipụtasịrị akụkọ ahụ, otu Onyeàmà meworo agadi zutere otu onye agbata obi ya bụ́ onye gwara ya, sị: “E nwere akụkọ magburu onwe ya banyere Ndịàmà Jehova nke gbara n’akwụkwọ akụkọ taa!” Nwanna nwanyị ahụ gbaara ya àmà ma mesịa nyefee ya broshuọ bụ́ Jehovah’s Witnesses in the Twentieth Century.

Tụkwasị n’ịgbazi echiche ụfọdụ na-ezighị ezi e nwere banyere Ndịàmà Jehova, ndokwa ndị dị otú ahụ e mere maka ịgbape ụlọ na usoro ihe omume nraranye n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ akpaliwo ndị nkwusa site n’ịgba ha ume ịkpọkwu ndị mmadụ òkù ịbịa nzukọ. Ee, n’ọtụtụ ala, gụnyere Finland, ndị mmadụ amatawo na Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova gheere oghe nye onye ọ bụla.