Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ọ̀ dị njọ ịgba chaa chaa ma ọ bụrụ na ọ bụ obere ego ka e ji agba ya?

Okwu Chineke atụleghị ịgba chaa chaa n’ụzọ zuru ezu, ma o kwuru ihe zuru ezu iji gosi na ọ dịghị ụdị ịgba chaa chaa kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible. * Dị ka ihe atụ, ọ bụ ihe e kweere n’ebe nile na ịgba chaa chaa na-akpalite anyaukwu. Eziokwu ahụ nanị bụ ihe dị mkpa ka Ndị Kraịst chebara echiche, ebe Bible na-ekwu na “ndị anyaukwu” agaghị eketa Alaeze Chineke, ma gụnye anyaukwu n’ebe a gụnyere ikpere arụsị.—1 Ndị Kọrint 6:9, 10; Ndị Kọlọsi 3:5.

Ịgba chaa chaa na-akpalikwa mmadụ ịbụ onye onwe ya na-ebu isi na mmụọ asọmpi na-ezighị ezi, bụ́ ọchịchọ siri ike nke inwe mmeri. Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị megide ihe ndị dị otú ahụ mgbe o dere, sị: “Ka anyị ghara ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, na-akpali ịsọ mpi n’etiti onwe anyị, na-enwere ibe anyị anyaụfụ.” (Ndị Galeshia 5:26) Ọzọkwa, ịgba chaa chaa na-akpali ụfọdụ inwe nkwenkwe ụgha nke ịdabere n’isi ọma. Ndị na-agba chaa chaa na-enwe ụdị nkwenkwe ụgha dị iche iche, na-atụ anya inwe isi ọma. Ha na-echetara anyị ụmụ Izrel na-ekwesịghị ntụkwasị obi bụ́ ndị “na-edoro [chi Ihu Ọma, NW] tebụl n’usoro, ndị na-agbajuru [chi Akara Aka, NW] mmanya gwara ọgwa.”—Aịsaịa 65:11.

Ụfọdụ pụrụ iche na iji obere ego eti ebé mgbe e so ndị enyi ma ọ bu ndị ikwu na-atụ kaadị ma ọ bụ na-eti draft adịghị ihe ọzọ ọ bụ karịa ihe ntụrụndụ na-adịghị emerụ ahụ́. N’ezie, onye na-eji obere ego eti ebé nwere ike ghara ile onwe ya anya dị ka onye anyaukwu, onye onwe ya na-ebu isi, onye na-asọ mpi, ma ọ bụ onye nwere nkwenkwe ụgha. N’agbanyeghị nke ahụ, mmetụta dị aṅaa ka ịgba chaa chaa ya pụrụ inwe n’ahụ́ ndị ya na ha na-agba chaa chaa? Ụfọdụ ndị ịgba chaa chaa riri ahụ́ malitere ya site n’iji obere ego na-eti ebé ‘nanị iji kporie ndụ.’ (Luk 16:10) Ihe yiri ihe e ji egbu oge nke na-adịghị emerụ ahụ́ bịara ghọọrọ ha ọnyà.

Nke ahụ bụ eziokwu karịsịa n’ebe ụmụaka nọ. Ọtụtụ ụmụaka enwewo obi ụtọ ịbụ ndị riri ebé ndị ha ji obere ego tie, ha abụrụwokwa ndị a nwara ọnwụnwa iji nnukwu ego eti ebé. (1 Timoti 6:10) Nnyocha e mere ruo ogologo oge nke Kansụl Arizona Na-ahụ Maka Iri Ahụ́ nke Ịgba Chaa Chaa bipụtara na United States kwadoro na ọtụtụ ndị ịgba chaa chaa riri ahụ́ malitere ịgba ya mgbe ha ka bụ ụmụaka “site n’iji obere ego eti ebé n’egwuregwu ma ọ bụ mgbe ha na ndị enyi ma ọ bụ ndị ikwu ha na-atụ kaadị.” Akụkọ ọzọ na-ekwu na “ụmụaka na-amalite ịgba chaa chaa n’ebe obibi, ọtụtụ mgbe, mgbe ha na ndị òtù ezinụlọ na ndị enyi ha na-atụ kaadị.” Akụkọ ahụ na-agbakwụnye na “pasent iri atọ nke ụmụaka na-agba chaa chaa malitere ime otú ahụ tupu ha eruo afọ iri na otu.” Ọtụtụ ndị dị afọ iri na ụma na-agba chaa chaa na-eji ime mpụ ma ọ bụ omume rụrụ arụ enweta ego ha ji akwado ihe riworo ha ahụ́, dị ka akwụkwọ bụ́ Why Do People Gamble Too Much—Pathological and Problem Gambling, na-ekwu. Lee ihe dị mwute na-esi n’ihe pụrụ iyiwo na mbụ ka ọ dịghị emerụ ahụ́, pụta!

Ebe ọ bụ na anyị na-ebi n’ụwa nke e nwerela ọtụtụ ọnyà na ọnwụnwa na ya, n’ihi gịnị ka anyị ga-eji na-ekpughepụ onwe anyị nye ọzọ n’ụzọ na-enweghị isi? (Ilu 27:12) Ịgba chaa chaa—ma ụmụaka ha nọ ya ma ọ bụ na ha anọghị ya, ma e ji obere ego agba ya ma ọ bu nnukwu ego—na-etinye ọnọdụ ime mmụọ n’ihe ize ndụ, e kwesịkwara izere ya. Ọ ga-aka mma ka Ndị Kraịst na-eji iti draft ma ọ bụ ịtụ kaadị emere ihe ntụrụndụ na-edetu ihe ha nwetara edetu ma ọ bụ na-atụ ha nanị iji kporie ndụ, n’agụkọghị onye meririnụ. Ndị Kraịst maara ihe bụ́ ndị na-eche banyere ọnọdụ ime mmụọ ha nakwa nke ndị enyi na ndị ezinụlọ ha, na-ezere ịgba chaa chaa—ọbụna ndị e ji obere ego agba.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Akwụkwọ bụ́ World Book Encyclopedia na-akọwa ịgba chaa chaa dị ka “iti ebé n’ihe ga-esi n’egwuregwu, ihe omume, ma ọ bụ ihe ndabara apụta.” Ọ na-agbakwụnye na “ndị na-agba chaa chaa na-ejikarị ego eti ebé . . . n’egwuregwu ihe ndabara ndị dị ka ịgba lọtrị, ịtụ kaadị, na igwu ludo.”