Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Anyị Nọgidesiri Ike n’Ọrụ E Kenyere Anyị

Anyị Nọgidesiri Ike n’Ọrụ E Kenyere Anyị

Akụkọ Ndụ

Anyị Nọgidesiri Ike n’Ọrụ E Kenyere Anyị

DỊ KA HERMANN BRUDER SI KỌỌ

Nhọrọ a sịrị m mee dị mfe: jee ozi afọ ise n’Òtù Ndị Agha France Nọ ná Mba Ọzọ ma ọ bụ ị gaa mkpọrọ n’ụlọ mkpọrọ dị na Morocco. Ka m kọwaa otú m si banye ná nsogbu a.

A MỤRỤ m na Oppenau, Germany, na 1911, nanị afọ atọ tupu Agha Ụwa Mbụ etiwapụ. Nne na nna m, bụ́ Joseph na Frida Bruder, mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị 17. Abụ m nwa ha nke 13.

Ihe ndị mbụ m na-echeta banyere oge m bụ nwata bụ ikiri òtù egwú ndị agha ka ha na-azọrọ ije gbadaa otu nnukwu okporo ámá dị n’obodo anyị. N’ịbụ onye ụda egwú ha ji azọ ije dọọrọ mmasị ya, esooro m ndị egwú ahụ gawa n’ọdụ ụgbọ okporo ìgwè iji hụ papa m na ndị ikom ndị ọzọ yi uwe ndị agha ka ha na-abanye n’ụgbọ okporo ìgwè tupu ha apụọ. Ka ụgbọ ahụ pụrụ, ụfọdụ ndị inyom nọ n’ọdụ ụgbọ ahụ tiwere mkpu ákwá. N’oge na-adịghị anya ka nke ahụ gasịrị, ụkọchukwu anyị kwuru okwuchukwu were ogologo oge na chọọchị ma gụpụta aha ndị ikom anọ bụ́ ndị nwụrụ ka ha na-alụ agha maka ala nna ha. “Ha nọ n’eluigwe ugbu a,” ka ọ kọwara. Otu nwanyị guzo m nso tụbọrọ.

Papa m butere ọrịa ịba ahụ́ ọkụ ka ọ na-eje ozi n’ihu agha Russia. Ọ lọtara ụlọ n’akpaghịzi nnọọ ume, ihe fọkwara nke nta ka ọ bụrụ ozugbo ahụ, e nyere ya àkwà n’ụlọ ọgwụ dị n’ógbè anyị. “Gaa n’ụlọ ekpere dị n’akụkụ ebe a na-eli ozu ma gụọ Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe ugboro 50 na Ekelee M Marịa ugboro 50,” ka ụkọchukwu ahụ tụrụ aro ya. “I mechaa ya, nna gị ga-agbake.” Agbasoro m ndụmọdụ ya, ma papa m nwụrụ n’echi ya. Ọbụna nye nwa okoro dị ka m, agha ahụ bụ nnọọ ahụmahụ na-egbu mgbu.

Otú M Si Chọta Eziokwu Ahụ

O siri ike inweta ọrụ na Germany n’agbata agha abụọ ahụ. Otú ọ dị, mgbe m gụsịrị akwụkwọ na 1928, ejisiri m ike nweta ọrụ dị ka onye na-elekọta ubi na Basel, Switzerland.

Dị ka papa m, abụ m onye na-anụrụ okpukpe Katọlik ọkụ n’obi. Ihe mgbaru ọsọ m bụ ije ozi dị ka mọnk Capuchin n’India. Mgbe nwanne m nwoke bụ́ Richard, onye bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova mgbe ahụ, nụrụ atụmatụ a, o mere njem pụrụ iche bịa Switzerland iji gbalịa ime ka m gbanwee obi. Ọ dọrọ m aka ná ntị banyere ihe ize ndụ dị n’ịtụkwasị ụmụ mmadụ obi, karịsịa ndị ụkọchukwu, ma gbaa m ume ịgụ Bible na ịtụkwasị nanị Bible obi. N’agbanyeghị obi abụọ ndị m nwere, enwetara m Bible Agba Ọhụrụ ma malite ịgụ ya. Nke nta nke nta, ọ bịara doo m anya na ọtụtụ n’ime ihe ndị m kweere na ha ekwekọghị n’ozizi Bible.

Otu ụbọchị Sunday na 1933, ka m nọ n’ụlọ Richard na Germany, ọ kọwaara otu di na nwunye bụ́ Ndịàmà Jehova onye m bụ. Mgbe ha chọpụtara na m na-agụ Bible, ha nyere m otu akwụkwọ nta aha ya bụ The Crisis. * Ọ fọrọ nke nta ka o ruo etiti abalị tupu m mesịa tọgbọ akwụkwọ ahụ. Ekwenyesiri m ike na achọtawo m eziokwu ahụ!

Ndịàmà Jehova nọ na Basel nyere m mpịakọta abụọ nke Studies in the Scriptures* nakwa magazin na akwụkwọ ndị ọzọ. N’ịbụ onye ihe m na-agụ masịrị, akpọtụụrụ m ụkọchukwu nke ógbè anyị ma gwa ya ka o wepụ aha m n’akwụkwọ e ji edeba aha ndị chọọchị. Iwe were ụkọchukwu ahụ nke ukwuu, ya adọọkwa m aka ná ntị na m nọ n’ihe ize ndụ nke ịdapụ n’okwukwe. N’ezie, adapụbeghị m n’okwukwe. Na nke mbụ ya ná ndụ m, amalitewere m ịzụlite ezi okwukwe.

Ụmụnna ndị nọ na Basel na-eme atụmatụ ime njem nkwusa gafee ókè banye na France ná ngwụsị izu ahụ. Otu n’ime ụmụnna ahụ ji obiọma kọwaara m na a kpọghị m iso gaa n’ihi na o tebeghị aka m malitere isonyere ọgbakọ ahụ. N’ekweghị ka nke ahụ kụda m mmụọ, akọwara m ọchịchọ siri ike m nwere ịmalite ime nkwusa. Mgbe ya na okenye ọzọ kparịtasịrị, o kenyere m otu ókèala dị na Switzerland. N’isi ụtụtụ Sunday, eji m ịnyịnya ígwè m gbaga n’otu obodo nta dị nso na Basel, na-eji akwụkwọ 4, magazin 28, na broshuọ 20 n’akpa ozi ọma m. Ọtụtụ n’ime ndị obodo ahụ nọ na chọọchị mgbe m rutere. N’agbanyeghị nke ahụ, ka ọ na-erule elekere 11, akpa ozi ọma m tọgbọzi chakoo.

Mgbe m gwara ụmụnna na m chọrọ ka e mee m baptizim, ha sooro m nwee mkparịta ụka siri ike ma jụọ m ajụjụ iji mata ihe bụ́ echiche m banyere eziokwu ahụ. Ịnụ ọkụ n’obi na iguzosi ike n’ihe ha nye Jehova na nzukọ ya masịrị m. Ebe ọ bụ na ọ bụ oge oyi, otu nwanna nwoke mere m baptizim n’ọ́kwá ịsa ahụ́ dị n’ụlọ otu okenye. Echetara m na m nwere ọṅụ na-enweghị atụ, enwekwara m nnọọ obi ike. Nke ahụ mere na 1934.

Ịrụ Ọrụ n’Ugbo Alaeze

Na 1936, anụrụ m na Ndịàmà Jehova zụrụ ala na Switzerland. E kwupụtara m mmasị m ije ozi dị ka onye na-elekọta ubi. N’ụzọ nyere m ọṅụ, a kpọrọ m òkù ịrụ ọrụ n’Ugbo Alaeze dị na Steffisburg, nke dị ihe dị ka kilomita 30 site na Bern. Mgbe ọ bụla o kwere mee, ana m enyere ndị ọzọ aka ịrụ ọrụ ná ngalaba nke ha n’ugbo ahụ. Betel kụziiri m mkpa ọ dị inwe mmụọ imekọ ihe ọnụ.

Ihe omume kasị akpali akpali nye m n’ime afọ ndị m nọrọ na Betel bụ nleta nke Nwanna Rutherford letara ugbo ahụ na 1936. Mgbe ọ hụrụ otú tomato anyị hà na otú ahụ́ si maa mkpụrụ akụkụ anyị mma, ọ mụmụrụ ọnụ ọchị ma kwupụta afọ ojuju o nwere. Lee ka o si bụrụ nwanna nwoke anyị hụrụ n’anya!

Mgbe m jeworo ozi n’ugbo ahụ ruo nanị ihe ji nke nta karịa afọ atọ, a gụrụ otu akwụkwọ ozi sitere n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na United States n’oge a na-eri nri ụtụtụ. Akwụkwọ ozi ahụ mesiri ike ịdị ngwa nke ọrụ nkwusa ahụ ma kpọọ onye ọ bụla nke ga-achọ ije ozi dị ka ọsụ ụzọ ná mba ọzọ òkù. N’egbughị oge, ewepụtara m onwe m. E kenyere m ebe m ga-aga na May 1939—Brazil!

N’oge ahụ, m na-eje nzukọ n’Ọgbakọ Thun, nke dị nso n’Ugbo Alaeze. Kwa Sunday, otu ìgwè n’ime anyị na-aga eme nkwusa n’ugwu Alps, bụ́ nke na-ewe awa abụọ site na Thun ma e jiri ịnyịnya ígwè gaa ya. Margaritha Steiner so n’ìgwè ahụ. Otu echiche batara m n’obi na mberede: Ọ̀ bụ na Jizọs ezipụghị ndị na-eso ụzọ ya abụọ abụọ? Mgbe m kọtụụrụ Margaritha na e kenyere m ọrụ na Brazil, o kwupụtara ọchịchọ ya ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu. Anyị lụrụ na July 31, 1939.

Nkwụsịtụ A Na-atụghị Anya Ya

Ná ngwụsị August 1939, anyị ji ụgbọ mmiri si Le Havre, France, na-aga Santos, Brazil. E werechaala ọnụ ụlọ ụgbọ ahụ ndị bụ maka mmadụ abụọ, n’ihi ya anyị aghaghị ịnọ n’ọnụ ụlọ dị iche iche. Ka anyị na-aga, anyị nụrụ akụkọ na Great Britain na France akpọsawo agha megide Germany. Ìgwè ndị Germany dị mmadụ 30 so na-eme njem ahụ malitere ikwe ukwe ito mba nke Germany. Nke a were onyeisi ụgbọ mmiri ahụ oké iwe nke na ọ gbanwere ebe ọ na-aga ma kwụsị na Safi, Morocco. E nyere ndị njem ji akwụkwọ gosiri na ha si Germany minit ise ịrịtu. Anyị so na ha.

E jichiri anyị ruo otu ụbọchị n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii ma mesịa kponye anyị na bọs ochie na-esighị ike, ma kpọga anyị n’ụlọ mkpọrọ dị na Marrakech, ihe dị ka kilomita 140 site n’ebe ahụ. Oge ihe isi ike sochiri. Ndị mmadụ karịrị akarị n’ọnụ ụlọ nga anyị, ọ gbakwara ọchịchịrị. Ebe anyị na-aga mposi—otu olulu e gwuru n’ala ọnụ ụlọ nga ahụ—na-asụchi asụchi mgbe nile. E nyere onye ọ bụla n’ime anyị akpa ruru unyi iji na-ehi ụra, n’abalị kwa, òké na-ata anyị n’afọ ụkwụ. A na-eji kom kom tara nchara ekenye anyị nri ugboro abụọ n’ụbọchị.

Otu onye agha kọwaara m na a ga-atọhapụ m ma ọ bụrụ na m kwenye ije ozi ruo afọ ise n’Òtù Ndị Agha France Nọ ná Mba Ọzọ. Ọjụjụ m jụrụ mere ka a tụkpuo m ruo awa 24 n’ebe a pụrụ nnọọ ịkọwa dị ka olulu gbara ọchịchịrị. Eji m ihe ka ukwuu n’oge a nile na-ekpe ekpere.

Mgbe ụbọchị asatọ gasịrị, ndị isi ụlọ mkpọrọ ahụ kwere ka m hụ Margaritha ọzọ. Ọ tara nnọọ ahụ́, ma na-ebe ákwá n’ekweghị ngụgụ. Emere m ihe nile m pụrụ ime iji gbaa ya ume. A gbara anyị ajụjụ ọnụ ma jiri ụgbọ okporo ígwè bufee anyị Casablanca, bụ́ ebe a nọ tọhapụ Margaritha. A kpọgara m n’ogige ụlọ mkpọrọ dị na Port Lyautey (Kenitra ugbu a), ihe dị ka kilomita 180 site na Casablanca. Onye nnọchianya Switzerland tụụrụ Margaritha aro ka ọ laghachi Switzerland, ma o ji iguzosi ike n’ihe jụ ịhapụ m lawa. N’ọnwa abụọ m nọrọ na Port Lyautey, o mere njem kwa ụbọchị site na Casablanca bịa ileta m na iwetara m nri.

Otu afọ tupu mgbe ahụ, Ndịàmà Jehova wepụtara akwụkwọ aha ya bụ Kreuzzug gegen das Christentum (Agha Ntụte Megide Iso Ụzọ Kraịst) iji dọrọ uche ọha mmadụ gaa n’aka Ndịàmà na-adịghị etinye n’ọchịchị Nazi. Mgbe m nọ n’ogige ụlọ mkpọrọ, alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Bern degaara ndị ọchịchị France akwụkwọ, na-etinye otu akwụkwọ ahụ ná mgbalị igosi na anyị abụghị ndị Nazi. Margaritha rụkwara ọrụ kwesịrị ịja mma n’ileta ndị ọchịchị ma na-agbalị ime ka ha kweta na aka anyị dị ọcha. N’ikpeazụ, ná ngwụsị afọ 1939, anyị natara ikike ịhapụ Morocco.

Ọ bụ mgbe anyị gawakwara Brazil ọzọ ka anyị matara na ụgbọ agha okpuru mmiri nke ndị Germany na-awakpo ụzọ ụgbọ mmiri n’Atlantic nakwa na anyị bụ ndị bụ́ isi e lekwasịrị anya. Ọ bụ ezie na ụgbọ anyị, bụ́ Jamaique, bụ nke ndị ahịa, a kwụnyere égbè n’ihu na n’azụ ya. N’oge ehihie, onyeisi ụgbọ mmiri ahụ na-agba rịgọ rịgọ, ma nọgide na-agbapụ mgbọ. N’abalị, anyị na-agbanyụcha ọkụ ka ndị Germany ghara ịhụ anyị. Lee ka anyị si nwee ahụ́ efe mgbe anyị ruru n’ọdụ ụgbọ mmiri dị na Santos, Brazil, na February 6, 1940, ka ọnwa ise gasịrị kemgbe anyị hapụrụ Europe!

Ịlaghachi n’Ụlọ Mkpọrọ

Ebe mbụ e kenyere anyị ọrụ ime nkwusa bụ na Montenegro, bụ́ otu obodo nke dị na steeti dị n’ebe ndịda Brazil bụ́ Rio Grande do Sul. Ihe àmà gosiri na a gwawo ndị isi chọọchị banyere mbịarute anyị. Mgbe anyị meworo nkwusa ruo nanị awa abụọ, ndị uwe ojii jidere anyị ma jichie rekọdụ phonograph ndị anyị bu, bụ́ ndị e kwunyere okwu Bible na ha, akwụkwọ anyị nile, na ọbụna akpa ozi ọma anyị e ji akpụkpọ anụ mee bụ́ ndị anyị zụtara na Morocco. Otu onye ụkọchukwu na otu onye minista na-asụ German cheere anyị n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii. Ha gere ntị ka onyeisi ndị uwe ojii bu gramophone anyị kpọọ otu n’ime okwu Nwanna Rutherford ndị e kwunyere na ya, bụ́ nke o jichiworo. Nwanna Rutherford kpọrọ nnọọ okwu aha! Mgbe a bịara n’ebe kwuru banyere Vatican, ụkọchukwu ahụ were iwe ọkụ ma pụọ.

N’ihi arịrịọ bishọp nke Santa Maria rịọrọ, ndị uwe ojii kpọgara anyị Pôrto Alegre, bụ́ isi obodo ahụ. N’oge na-adịghị anya, a tọhapụrụ Margaritha, ya agaakwa chọọ enyemaka nke onye nnọchianya Switzerland. Onye nnọchianya ahụ tụụrụ ya aro ka ọ laghachi Switzerland. Ọ jụkwara ọzọ ịhapụ m. Margaritha abụwo onye ibe na-eguzosi nnọọ ike n’ihe mgbe nile. Ụbọchị 30 ka e mesịrị, a gbara m ajụjụ ọnụ ma tọhapụ m. Ndị uwe ojii chere anyị nhọrọ a n’ihu: sinụ na steeti a pụọ n’ime ụbọchị iri ma ọ bụ “unu echee aka ghọrọ nsogbu.” N’ihi aro nke isi ụlọ ọrụ tụrụ, anyị gawara Rio de Janeiro.

“Biko Gụọ Ihe E Dere na Kaadị A”

Lee ka anyị si nwee ọṅụ n’agbanyeghị nnabata a na-adịghị mma anyị nwetara n’ubi Brazil! E kwuwerị, anyị ka dị ndụ, akpa anyị jupụtakwara ọzọ n’akwụkwọ, anyị nwekwara Rio de Janeiro nile ime nkwusa na ya. Ma olee otú anyị ga-esi eme nkwusa ebe anyị na-amachaghị asụsụ Portuguese? Ọ bụ site n’iji akwụkwọ ịgba àmà eme ihe. “Por favor, leia este cartão” (“Biko gụọ ihe e dere na kaadị a”) bụ okwu Portuguese mbụ anyị mụtara iji eme ihe n’ọrụ nkwusa. Leekwa ka kaadị ahụ si weta ihe ịga nke ọma! N’ime otu ọnwa, anyị nyefere ihe karịrị 1,000 akwụkwọ. Ọtụtụ ndị natara akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Bible mesịrị nakweere eziokwu ahụ. N’ikwu eziokwu, akwụkwọ anyị gbara àmà dị nnọọ irè karịa ka anyị pụrụ ịgbawo. Nke a mere ka m ghọtakwuo mkpa ọ dị ime ka ndị nwere mmasị nweta akwụkwọ anyị.

N’oge ahụ, Rio de Janeiro bụ isi obodo Brazil, a nabatakwara ozi ọma anyị nke ọma karịsịa n’ụlọ ọrụ gọọmenti. Enwere m ihe ùgwù nke ịgbara minista okwu ego dị n’aka na minista na-ahụ maka ndị agha àmà. N’oge ndị a, ahụrụ m ihe àmà doro anya na mmụọ Jehova nọ n’ọrụ.

N’otu oge, mgbe m na-eme nkwusa n’otu nnukwu ámá dị n’etiti Rio, abanyere m n’Obí Okwu Ikpe. N’ụzọ ụfọdụ, ahụrụ m onwe m n’ime ụlọ ndị ikom yi efe ojii gbara m gburugburu, n’ihe yiri ka ọ bụ ememe olili ozu. Ejekwuuru m otu nwa amadị jiri ejiji dị mma ma nye ya kaadị ịgba àmà m. Ọ bụghị ememe olili ozu. N’ezie, emewo m ka okwu ikpe nọ na-aga n’ihu kwụsịtụ, ọ bụkwa ọkàikpe ka m na-agwa okwu. Ọ chịrị ọchị ma feere ndị nche aka ka ha ghara ime m ihe ọ bụla. O ji obiọma nara otu akwụkwọ bụ́ Children * ma nye onyinye afọ ofufo. Ka m na-apụ, otu n’ime ndị nche tụụrụ m aka n’otu ihe e dere n’ụzọ a na-ahụ nke ọma n’ibo ụzọ: Proibida a entrada de pessoas estranhas (A chọghị ndị ọbịa).

Ubi ọzọ na-amị mkpụrụ bụ ọdụ ụgbọ mmiri. N’otu oge, ezutere m otu onye na-akwọ ụgbọ mmiri bụ́ onye natara akwụkwọ tupu ya alaghachi n’oké osimiri. Mgbe e mesịrị, anyị zutere ya ná mgbakọ. Ezinụlọ ya nile anatawo eziokwu ahụ, ya onwe ya na-enwekwa ezigbo ọganihu. Nke ahụ nyere anyị obi ụtọ dị ukwuu.

Otú ọ dị, ọ bụghị ihe nile gara nke ọma. Akwụkwọ ikike anyị ịnọ ọnwa isii gwụrụ, anyị tụwakwara anya ịbụ ndị a ga-agbara ụgbọ nwa mkpi. Mgbe anyị degasịịrị isi ụlọ ọrụ akwụkwọ banyere ọnọdụ anyị, anyị natara akwụkwọ ozi na-egosipụta ịhụnanya site n’aka Nwanna Rutherford, na-agba anyị ume ịnọgidesi ike ma na-atụrụ anyị aro otú anyị ga-esi gaa n’ihu. Ọchịchọ anyị bụ ịnọgide na Brazil, sitekwa n’enyemaka nke otu ọkàiwu, anyị mesịrị nweta akwụkwọ ikike nke ịnọ n’alaghị ala na 1945.

Ọrụ Were Ogologo Oge

Otú ọ dị, tupu nke ahụ, anyị mụrụ nwa anyị bụ́ Jonathan na 1941, mụọ Ruth na 1943, mụọkwa Esther na 1945. Iji gboo mkpa nke ezinụlọ anyị na-ebuwanye ibu, aghaghị m ịrụ ọrụ ego. Margaritha nọgidere n’ozi oge nile ruo mgbe a mụrụ nwa anyị nke atọ.

Site ná mmalite, anyị rụkọrọ ọrụ ọnụ dị ka ezinụlọ n’ọrụ nkwusa ahụ n’ámá obodo, n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè, n’okporo ámá, nakwa n’ógbè azụmahịa. Kwa abalị Saturday, anyị na-ekesa Ụlọ Nche na Teta! dị ka ezinụlọ, oge ndị a bụkwa nnọọ oge obi ụtọ.

N’ụlọ, nwata nke ọ bụla nwere ọrụ ọ na-arụ kwa ụbọchị. Ọ bụ Jonathan nwe ihichasị stovu na kichin. Ndị nke nwanyị na-ehichasị friji, na-aza èzí, ma na-ehichasị akpụkpọ ụkwụ anyị. Nke a nyeere ha aka ịmụta ịhazi ihe na ibute ụzọ n’ime ihe. Taa, ụmụ anyị bụ ndị na-arụsi ọrụ ike, na-elekọta ebe obibi na ihe onwunwe ha nke ọma, bụ́ nke na-enye mụ na Margaritha obi ụtọ dị ukwuu.

Anyị tụkwara anya ka ụmụ anyị na-akpa àgwà dị mma ná nzukọ. Tupu ihe omume amalite, ha na-aṅụ otu iko mmiri ma jee nyụọ mamịrị. N’oge nzukọ, Jonathan na-anọdụ n’aka ekpe m, Ruth n’aka nri m, Margaritha esote ya, Esther anọrọ n’aka nri Margaritha. Nke a nyeere ha aka ige ntị ma rie nri ime mmụọ site na mgbe ha bụ ụmụaka.

Jehova agọziwo mgbalị anyị. Ụmụ anyị nile nọgidere jiri ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi ma jiri ọṅụ na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ. Jonathan na-eje ozi ugbu a dị ka okenye n’Ọgbakọ Novo Méier, dị na Rio de Janeiro.

Ka ọ na-erule 1970, ụmụ anyị nile alụwo di na nwunye ma hapụ ụlọ, n’ihi ya, mụ na Margaritha kpebiri ịkwaga n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu iji jee ozi. Ebe mbụ anyị kwụsịrị bụ na Poços de Caldas, dị na Minas Gerais State, bụ́ nke nwere ntakịrị ìgwè nke ndị nkwusa Alaeze dị mmadụ 19 mgbe ahụ. O juru m anya mgbe m hụrụ ebe ha na-enwe nzukọ—ụlọ dị n’okpuru ala nke na-enweghị windo, ọ dịkwa nnọọ mkpa ka a rụzie ya arụzie. Ozugbo ahụ, anyị malitere ịchọ Ụlọ Nzukọ Alaeze kwesịrị ekwesị karị, n’oge na-adịghịkwa anya, anyị chọtara otu ụlọ mara mma nke dị n’ebe dị nnọọ mma. Lee ka nke ahụ si kpata mgbanwe! Afọ anọ na ọkara ka nke ahụ gasịrị, ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa mụbara ruo 155. Na 1989, anyị kwagara Araruama, nke dị na Rio de Janeiro, bụ́ ebe anyị jere ozi ruo afọ itoolu. N’oge a, anyị hụrụ ka e guzobere ọgbakọ ọhụrụ abụọ.

A Kwụghachi Anyị Ụgwọ n’Ihi Ịnọgidesi Ike n’Ebe E Kenyere Anyị Ọrụ

Na 1998, nsogbu ahụ́ ike na ọchịchọ ịnọ ụmụ anyị nso dugara anyị n’ịkwaga São Gonçalo, Rio de Janeiro. Aka m na-eje ozi n’ebe ahụ dị ka okenye ọgbakọ. Anyị na-eme ike anyị ikerechi òkè anya n’ọrụ nkwusa. Margaritha na-enwe mmasị ịgbara ndị mmadụ àmà n’otu nnukwu ụlọ ahịa dị anyị nso, ọgbakọ ejiwokwa obiọma wepụtara anyị ókèala ụfọdụ n’ebe dị nso n’ebe obibi anyị, bụ́ nke na-eme ka ọ dịrị anyị mfe ime nkwusa dị ka ahụ́ ike anyị kwere anyị.

Ugbu a, mụ na Margaritha abụwo ndị ohu Jehova raara onwe ha nye ruo ihe karịrị afọ 60. Anyị achọpụtawo n’onwe anyị na “ọchịchị ma ọ bụ ihe ndị dị ugbu a ma ọ bụ ihe ndị gaje ịbịa ma ọ bụ ike ma ọ bụ ịdị elu ma ọ bụ ịdị omimi ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e kere eke agaghị enwe ike ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke nke dị n’ime Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.” (Ndị Rom 8:38, 39) Leekwa ihe na-enye ọṅụ ọ bụworo ịhụ nchịkọbata nke “atụrụ ọzọ” ahụ, bụ́ ndị nwere olileanya magburu onwe ya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa zuru okè, nke ihe ndị mara mma Chineke kere ga-ejupụta! (Jọn 10:1) Mgbe anyị rutere na Rio de Janeiro na 1940, e nwere nanị otu ọgbakọ na ndị nkwusa 28 na ya. Taa, e nwere ihe dị ka ọgbakọ 250 na ihe karịrị ndị nkwusa Alaeze 20,000 n’ebe ahụ.

E nwere mgbe anyị gaara alaghachikwuru ezinụlọ anyị na Europe. Ma ọ bụ na Brazil ebe a ka Jehova kenyere anyị ọrụ. Lee ka anyị si nwee obi ụtọ na anyị anọgidesiwo ike na ya!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara ma a dịghịzi ebipụta ya.

^ par. 33 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara ma a dịghịzi ebipụta ya.

[Foto dị na peeji nke 21]

Ka anyị nọ n’Ugbo Alaeze, Steffisburg, Switzerland, ná ngwụsị afọ ndị 1930 (anọ m n’isi isi aka ekpe)

[Foto dị na peeji nke 23]

Obere oge tupu agbamakwụkwọ anyị, na 1939

[Foto dị na peeji nke 23]

Casablanca n’afọ ndị 1940

[Foto dị na peeji nke 23]

Ime nkwusa dị ka ezinụlọ

[Foto dị na peeji nke 24]

Ikerechi òkè anya n’ozi taa