Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere O Ji Esi Nnọọ Ike Ịrịọ Mgbaghara?

Gịnị Mere O Ji Esi Nnọọ Ike Ịrịọ Mgbaghara?

Gịnị Mere O Ji Esi Nnọọ Ike Ịrịọ Mgbaghara?

NA July 2000, Òtù Ome Iwu nke California State nke dị na United States tụpụtara iwu nke ga-eme ka ndị mmadụ ghara iburu ihe dị na ya ma ọ bụrụ na ha egosipụta obi ebere n’ebe onye e merụrụ ahụ́ n’ihe ọghọm nke ha onwe ha so nwee, nọ. N’ihi gịnị ka e ji tụpụta iwu ahụ? A chọpụtara na mgbe ihe ọghọm kpatara mmerụ ahụ́ ma ọ bụ mebie ihe, ndị mmadụ adịkarịghị ekwe arịọ mgbaghara ka e wee ghara iwere ya n’ụlọikpe na ha kwetara na ikpe mara ha. N’aka nke ọzọ, ndị chere na e kwesịrị ịrịọ ha mgbaghara ozugbo pụrụ iwe iwe, obere ihe ọghọm pụkwara ịghọ ezigbo esemokwu.

N’ezie, ọ dịghị mkpa ịrịọ mgbaghara maka ihe ọghọm ị na-akpataghị. A pụkwara inwe oge mgbe ihe amamihe dị na ya ime bụ ịkpachara anya banyere ihe ị na-ekwu. Otu ilu oge ochie na-asị: “N’ọtụtụ okwu njehie adịghị akwụsị: ma onye na-egbochi egbugbere ọnụ ya abụọ bụ onye nwere uche.” (Ilu 10:19; 27:12) N’agbanyeghị nke ahụ, ị pụrụ igosipụta obi nwanne ma nye aka.

Otú ọ dị, ọ́ bụghị eziokwu na ọtụtụ ndị akwụsịwo ịrịọ mgbaghara, ọbụna mgbe ọ na-emetụtaghị okwu ikpe? N’ebe obibi, nwunye pụrụ ịkwa arịrị, sị, ‘Di m adịghị arịọ mgbaghara ma ọlị maka ihe ọ bụla.’ N’ebe ọrụ, onyeisi ọrụ pụrụ ime mkpesa, sị, ‘Ndị ọrụ m adịghị ekweta mmejọ ha, ọ na-esikwara ha nnọọ ike ịsị ndo.’ N’ụlọ akwụkwọ, onye nkụzi pụrụ ime mkpesa sị, ‘A zụghị ụmụaka ịsị ewela iwe.’

Otu ihe mere mmadụ ji ala azụ ịrịọ mgbaghara pụrụ ịbụ ụjọ nke ịbụ onye a jụrụ. N’inwe nchegbu na a gaghị atụpụrụ ya ọnụ, o nwere ike ghara ikwupụta otú ọ dị ya n’ezie. N’eziokwu, onye ahụ e mejọrọ pụrụ ịdị na-eze onye ahụ mejọrọ ya eze, na-eme ka idozi okwu sie nnọọ ike.

Echebaraghị mmetụta nke ndị ọzọ echiche pụrụ ịbụ ihe ọzọ mere ụfọdụ ndị na-ejighị arịọ mgbaghara. Ha pụrụ iche, sị, ‘Ịrịọ mgbaghara agaghị emezi ihe m mebiworo.’ Ọzọkwa, ndị ọzọ adịghị ekwe asị ndo n’ihi ihe ndị pụrụ isi na ya pụta. Ha na-eche, sị, ‘À ga-asị na ikpe mara m ma sị m kwụọ ụgwọ?’ Otú ọ dị, ihe kasị egbochi ndị mmadụ ikweta mmejọ ha bụ mpako. Onye dị nnọọ mpako ịsị “ndo” pụdịrị ikwubi, sị, ‘Achọghị m imenye onwe m ihere site n’ikweta mmejọ m. Nke ahụ ga-ewetu m ala.’

N’agbanyeghị ihe ọ bụla kpatara ya, ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ịrịọ mgbaghara. Ma ọ̀ dị mkpa n’ezie ịrịọ mgbaghara? Olee uru ndị dị n’ịrịọ mgbaghara?

[Foto dị na peeji nke 3]

“A zụghị ụmụaka ịsị ewela iwe”

[Foto dị na peeji nke 3]

“Ndị ọrụ m adịghị ekweta mmejọ ha”

[Foto dị na peeji nke 3]

“Di m adịghị arịọ mgbaghara ma ọlị”