Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Nọgidenụ Na-eme Omume Dị Mma N’etiti Mba Nile”

“Nọgidenụ Na-eme Omume Dị Mma N’etiti Mba Nile”

“Nọgidenụ Na-eme Omume Dị Mma N’etiti Mba Nile”

“Sọpụrụnụ ụdị mmadụ ọ bụla, nweenụ ịhụnanya maka òtù ụmụnna dum.”—1 PITA 2:17.

1, 2. (a) Gịnị ka onye nta akụkọ nke otu akwụkwọ akụkọ kwuru banyere Ndịàmà Jehova? (b) N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova ji agbalịsi ike ịnọgide na-agbaso ụkpụrụ omume dị elu?

ỌTỤTỤ afọ gara aga, onye nta akụkọ nke otu akwụkwọ akụkọ n’Amarillo, Texas, U.S.A., gara chọọchị dị iche iche dị n’ógbè ahụ ma kọọ ihe ndị ọ chọpụtara. Otu ìgwè dị nnọọ iche n’anya ya. O kwuru, sị: “Ruo afọ atọ, agara m mgbakọ Ndịàmà Jehova nke a na-enwe kwa afọ n’Amarillo Civic Center. Ka mụ na ha nọkọrọ, ahụtụbeghị m ka otu onye n’ime ha sere siga, kwụpee karama biya, ma ọ bụ kwuo okwu rere ure. Ha bụ ìgwè mmadụ nwere omume enyi bụ́ ndị kasị adị ọcha, kasị akpa ezi àgwà, kasị eji ejiji dị mma m zutetụworo.” Ugboro ugboro, e bipụtawo ihe ndị yiri nke ahụ e kwuru banyere Ndịàmà Jehova. N’ihi gịnị ka ndị na-ekwenyeghị n’ihe Ndịàmà Jehova kweere jikarị aja ha mma?

2 A na-ajakarị ndị Chineke mma n’ihi omume ọma ha. Ọ bụ ezie na ụkpụrụ omume n’ozuzu ya na-ada ada, Ndịàmà Jehova na-ele ụkpụrụ omume dị elu anya dị ka ibu ọrụ, akụkụ nke ofufe ha. Ha maara na omume ha na-emetụta Jehova na ụmụnna ha bụ́ Ndị Kraịst nakwa na omume ọma ha na-eme ka ndị ọzọ nwee ike ịnakwere eziokwu ahụ ha na-ekwusa. (Jọn 15:8; Taịtọs 2:7, 8) Ya mere, ka anyị hụ otú anyị pụrụ isi nọgide na-eme omume dị mma ma si otú ahụ nọgide na-akwalite aha ọma nke Jehova na Ndịàmà ya na otú anyị si erite uru site n’ime nke ahụ.

Ezinụlọ Ndị Kraịst

3. Gịnị ka ọ dị mkpa ka e chebe ezinụlọ Ndị Kraịst pụọ na ha?

3 Tụlee ihe banyere omume anyị n’ime ezinụlọ. Akwụkwọ bụ́ Die Neuen Inquisitoren: Religionsfreiheit und Glaubensneid (Ndị Njụta Okwukwe Ọhụrụ: Nnwere Onwe Okpukpe na Ekworo Okpukpe), nke Gerhard Besier na Erwin K. Scheuch dere, na-ekwu, sị: “Nye [Ndịàmà Jehova] ezinụlọ bụ ihe a ga-echebe karịsịa.” Okwu ahụ bụ eziokwu, taa kwa, e nwere ọtụtụ ihe ndị ọ dị mkpa ka e chebe ezinụlọ pụọ na ha. E nwere ụmụaka ndị “na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi” na ndị toworo eto bụ́ ndị “na-enweghị obi mmadụ” ma ọ bụ ndị “na-enweghị njide onwe onye.” (2 Timoti 3:2, 3) Ezinụlọ bụ ebe di ma ọ bụ nwunye na-alụrịta ọgụ, ndị nne na nna na-emegbu ma ọ bụ na-eleghara ụmụ ha anya, ụmụaka na-enupụkwa isi, na-etinye aka n’ịṅụ ọgwụ ọjọọ na n’omume rụrụ arụ, ma ọ bụkwanụ na-esi n’ebe obibi ha agbapụ. Ihe a nile bụ n’ihi mmetụta na-ebibi ihe nke ‘mmụọ nke ụwa.’ (Ndị Efesọs 2:1, 2) Ọ dị anyị mkpa ichebe ezinụlọ anyị pụọ ná mmụọ ahụ. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụ site n’ịṅa ntị na ndụmọdụ na ntụziaka Jehova na-enye ndị òtù ezinụlọ.

4. Ibu ọrụ dị aṅaa ka ndị òtù ezinụlọ Ndị Kraịst nwere n’ebe ibe ha nọ?

4 Ndị di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst na-aghọta na ha nwere ọrụ dịịrị ha ịrụrụ ibe ha n’ụzọ mmetụta uche, n’ụzọ ime mmụọ, na n’ụzọ anụ ahụ́. (1 Ndị Kọrint 7:3-5; Ndị Efesọs 5:21-23; 1 Pita 3:7) Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst nwere ibu ọrụ dị arọ n’ebe ụmụ ha nọ. (Ilu 22:6; 2 Ndị Kọrint 12:14; Ndị Efesọs 6:4) Ka ụmụaka ndị nọ n’ezinụlọ Ndị Kraịst na-etolitekwu, ha na-amụta na ha onwe ha nwekwara ibu ọrụ. (Ilu 1:8, 9; 23:22; Ndị Efesọs 6:1; 1 Timoti 5:3, 4, 8) Imezu ibu ọrụ ezinụlọ na-achọ mgbalị, mkpebi siri ike, na mmụọ nke ịhụnanya na ịchụ onwe onye n’àjà. Otú ọ dị, ruo ókè ndị nile so n’ezinụlọ na-eburu ibu ọrụ Chineke nyere ha, ruo ókè ahụ ka ha na-abụrụ ibe ha na ọgbakọ ngọzi. Nke ka mkpa bụ na ha na-asọpụrụ Onye Malitere ezinụlọ, bụ́ Jehova Chineke.—Jenesis 1:27, 28; Ndị Efesọs 3:15.

Òtù Ụmụnna Ndị Kraịst

5. Ngọzi ndị dị aṅaa ka anyị na-enweta site n’iso Ndị Kraịst ibe anyị na-akpakọrịta?

5 Dị ka Ndị Kraịst, anyị nwekwara ibu ọrụ n’ebe ndị kwere ekwe ibe anyị nọ n’ọgbakọ nọ, nakwa n’ụzọ bụ́ isi, n’ebe ndị mejupụtara ‘òtù ụmụnna nile nọ n’ụwa’ nọ. (1 Pita 5:9) Mmekọrịta anyị na ọgbakọ dị mkpa maka ahụ́ ike ime mmụọ anyị. Mgbe anyị so Ndị Kraịst ibe anyị na-akpakọrịta, anyị na-anụ ụtọ mkpakọrịta ha na-agba ume nakwa nri ime mmụọ na-edozi ahụ́ site n’aka “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45-47) Ọ bụrụ na anyị enwee nsogbu, anyị pụrụ ịgakwuru ụmụnna anyị maka ndụmọdụ dị mma bụ́ ndị dabeere n’ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ. (Ilu 17:17; Eklisiastis 4:9; Jems 5:13-18) Mgbe anyị nọ ná mkpa, ụmụnna anyị adịghị agbahapụ anyị. Lee ngọzi ọ bụ ịbụ akụkụ nke nzukọ Chineke!

6. Olee otú Pọl si gosi na anyị nwere ibu ọrụ n’ebe ndị ọzọ bụ́ Ndị Kraịst nọ?

6 Otú ọ dị, anyị anọghị n’ọgbakọ nanị iji nara anara; anyị nọkwa ebe ahụ iji na-enye enye. N’ezie, Jizọs sịrị: “A na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Pọl onyeozi mere ka mmụọ inye ihe pụta ìhè mgbe o dere, sị: “Ka anyị jidesie nkwupụta ihu ọha nke olileanya anyị ike n’amaghị jijiji, n’ihi na onye ahụ nke kwere nkwa na-ekwesị ntụkwasị obi. Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ, ghara ịdị na-ahapụ nzukọ nke anyị onwe anyị, dị ka ọ bụ omenala ụfọdụ ndị, kama ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume, na-emekwa otú ahụ karị ka unu na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.”—Ndị Hibru 10:23-25.

7, 8. Olee otú anyị si egosipụta àgwà inye ihe ma n’ime ọgbakọ anyị ma n’ebe Ndị Kraịst nọ n’ala ndị ọzọ nọ?

7 N’ime ọgbakọ, anyị na-eme ‘nkwupụta nke olileanya anyị’ mgbe anyị na-aza ajụjụ ná nzukọ ma ọ bụ na-ekere òkè n’ụzọ ndị ọzọ n’usoro ihe omume ahụ. Mgbalị ndị a anyị na-eme na-agba ụmụnna anyị ume n’ezie. Anyị na-agbakwa ha ume site ná mkparịta ụka anyị na ha na-enwe tupu a malite nzukọ na mgbe a gbasara. Ọ bụ mgbe ahụ ka anyị pụrụ iwusi ndị na-adịghị ike ike, gụgụọ ndị dara mbà, ma kasie ndị ọrịa obi. (1 Ndị Tesalonaịka 5:14) Ezi Ndị Kraịst na-emesapụ aka n’ụdị inye ihe ahụ, nke mere ọtụtụ ndị bịara nzukọ anyị na nke mbụ ya ji abụ ndị ịhụnanya ha hụrụ n’etiti anyị na-akpali mmasị ha.—Abụ Ọma 37:21; Jọn 15:12; 1 Ndị Kọrint 14:25.

8 Ma, ọ bụghị nanị ndị nọ n’ọgbakọ anyị ka anyị na-egosi ịhụnanya n’ebe ha nọ. Anyị na-egosipụta ya n’ebe òtù ụmụnna anyị nile nọ n’ụwa nọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ya mere e ji nwee igbe Onyinye Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ọ bụla. Ụlọ Nzukọ Alaeze nke anyị pụrụ ịdị mma, ma anyị maara na ọtụtụ puku Ndị Kraịst ibe anyị nọ ná mba ndị ọzọ enweghị ebe kwesịrị ekwesị ha na-ezukọ. Mgbe anyị tinyere ego n’igbe Onyinye Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, anyị na-egosipụta ịhụnanya anyị nwere n’ebe ndị dị otú ahụ nọ n’agbanyeghị na anyị nwere ike ghara ịma ha n’onwe anyị.

9. Olee isi ihe mere Ndịàmà Jehova ji hụ ibe ha n’anya?

9 Gịnị mere Ndịàmà Jehova ji hụ ibe ha n’anya? Ọ bụ n’ihi na Jizọs nyere ha iwu ime otú ahụ. (Jọn 15:17) Ịhụnanya ha nwere n’ebe ibe ha nọ bụkwa ihe àmà na-egosi na mmụọ Chineke na-arụ ọrụ n’ahụ́ ha dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu nakwa dị ka otu ìgwè. Ịhụnanya so ná “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.” (Ndị Galeshia 5:22, 23) Ka Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, na-aga nzukọ Ndị Kraịst, ma na-ekpeku Chineke ekpere mgbe nile, ịhụnanya na-aghọ ihe na-adịghị esiri ha ike ngosipụta n’agbanyeghị na ha bi n’ụwa ebe ‘ịhụnanya nke ndị ka n’ọnụ ọgụgụ jụworo oyi.’—Matiu 24:12.

Imeso Ụwa Ihe

10. Ibu ọrụ dị aṅaa ka anyị nwere n’ebe ụwa a dị?

10 Aha Pọl kpọtụrụ “nkwupụta ihu ọha nke olileanya anyị” na-echetara anyị ibu ọrụ ọzọ. Nkwupụta ihu ọha a na-agụnye ọrụ nke ikwusara ndị na-abụbeghị ụmụnna Ndị Kraịst anyị ozi ọma. (Matiu 24:14; 28:19, 20; Ndị Rom 10:9, 10, 13-15) Ọrụ nkwusa dị otú ahụ bụkwa inye ihe. Ikere òkè na ya na-achọ oge, ume, ime nkwadebe, ọzụzụ, na mmadụ iji ihe onwunwe ya mee ihe. N’agbanyeghị nke ahụ, Pọl dekwara, sị: “Eji m ma ndị Grik ma Ndị Ala Ọzọ, ma ndị maara ihe ma ndị na-amaghị ihe ụgwọ: ya mere enwere m ọchịchọ siri ike ịkpọsakwara unu ozi ọma n’ebe ahụ na Rom.” (Ndị Rom 1:14, 15) Dị ka Pọl, ka anyị ghara ịdị aka ntagide ka anyị na-akwụ “ụgwọ” a anyị ji.

11. Olee ụkpụrụ abụọ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị na-achịkwa mmekọrịta anyị na ụwa, ma otú o sina dị, gịnị ka anyị na-aghọta?

11 Ànyị nwere ibu ọrụ ndị ọzọ n’ebe ndị na-abụghị ndị kwere ekwe ibe anyị nọ? Eenụ. N’ezie, anyị na-aghọta na “ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Anyị maara na Jizọs kwuru banyere ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ha abụghị akụkụ nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị akụkụ nke ụwa.” Ma, anyị bi n’ụwa, na-akpata ihe anyị na-eri na ya, na-eritekwa uru n’ihe ndị ọ na-enye. (Jọn 17:11, 15, 16) N’ihi ya, anyị nwere ibu ọrụ n’ụwa a. Gịnị ka ha bụ? Pita onyeozi zara ajụjụ ahụ. N’oge na-adịghị anya tupu e bibie Jeruselem, o degaara Ndị Kraịst nọ n’Asia Minor akwụkwọ ozi, otu akụkụ ihe odide nke akwụkwọ ozi ahụ na-enyekwara anyị aka iso ụwa na-enwe mmekọrịta kwesịrị ekwesị.

12. N’ụzọ dị aṅaa ka Ndị Kraịst si bụrụ “ndị ala ọzọ na ndị na-ebi nwa oge,” n’ihi ya kwa, gịnị ka ha kwesịrị ịhapụ?

12 Iji malitegodị, Pita kwuru, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, ana m agba unu ume dị ka ndị ala ọzọ na ndị na-ebi nwa oge ka unu nọgide na-esepụ aka n’ọchịchọ anụ ahụ́, nke bụ kpọmkwem ihe ndị na-alụ ọgụ megide mkpụrụ obi.” (1 Pita 2:11) Ezi Ndị Kraịst bụ, n’ụzọ ime mmụọ, “ndị ala ọzọ na ndị na-ebi nwa oge” n’ihi na ihe bụ́ isi ha lekwasịrị anya na ya ná ndụ bụ olileanya nke ndụ ebighị ebi—ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ ga-enweta nke ha n’eluigwe, “atụrụ ọzọ” ahụ ga-enweta nke ha n’ụwa paradaịs nke a ga-enwe n’ọdịnihu. (Jọn 10:16; Ndị Filipaị 3:20, 21; Ndị Hibru 11:13; Mkpughe 7:9, 14-17) Otú ọ dị, olee ihe ndị bụ́ ọchịchọ anụ ahụ́? Ha na-agụnye ihe ndị dị ka ọchịchọ ịba ọgaranya, ọchịchọ ịbụ onye a ma ama, ọchịchọ mmekọahụ rụrụ arụ, na ọchịchọ ndị a kọwara dị ka “anyaụfụ” na “anyaukwu.”—Ndị Kọlọsi 3:5; 1 Timoti 6:4, 9; 1 Jọn 2:15, 16.

13. Olee otú ọchịchọ anụ ahụ́ si ‘alụ ọgụ megide mkpụrụ obi’ anyị?

13 Ọchịchọ ndị dị otú ahụ “na-alụ ọgụ megide mkpụrụ obi” anyị n’ezie. Ha na-emebi mmekọrịta anyị na Chineke ma si otú ahụ na-etinye olileanya anyị dị ka Ndị Kraịst (“mkpụrụ obi,” ma ọ bụ ndụ anyị) n’ihe ize ndụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị na-azụlite mmasị n’ebe ihe ndị rụrụ arụ dị, ànyị pụrụ isi aṅaa nyefee onwe anyị “dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke Chineke na-anara nke ọma”? Ọ bụrụ na anyị adaba n’ọnyà nke ịhụ ihe onwunwe n’anya, ànyị sị aṅaa ‘anọgide na-ebu ụzọ achọ alaeze ahụ’? (Ndị Rom 12:1, 2; Matiu 6:33; 1 Timoti 6:17-19) Ụzọ ka mma bụ ịgbaso ihe nlereanya Mozis, gbakụta ihe ụra dị iche iche nke ụwa azụ, ma debe ozi Jehova n’ọnọdụ mbụ ná ndụ anyị. (Matiu 6:19, 20; Ndị Hibru 11:24-26) Nke ahụ bụ otu isi ihe dị mkpa n’iso ụwa na-enwe mmekọrịta kwesịrị ekwesị.

“Nọgidenụ Na-eme Omume Dị Mma”

14. N’ihi gịnị ka anyị, dị ka Ndị Kraịst, ji agbalịsi ike ịnọgide na-eme omume dị mma?

14 A na-ahụ ụkpụrụ nduzi ọzọ dị mkpa n’ihe ọzọ Pita kwuru: “Nọgidenụ na-eme omume dị mma n’etiti mba nile, ka, ha n’ihe ndị ahụ ha na-ekwugide ùnu na ha dị ka unu bụ ndị ajọ omume, wee nye Chineke otuto n’ụbọchị nleta ya n’ihi ọrụ ọma unu nke ha ji anya ha na-ahụ.” (1 Pita 2:12) Dị ka Ndị Kraịst, anyị na-agbalịsi ike isetịpụ ezi ihe nlereanya. N’ụlọ akwụkwọ, anyị na-agụsi akwụkwọ ike. N’ebe e were anyị n’ọrụ, anyị na-agba mbọ ma na-eme ihe n’eziokwu—ọbụna ma ọ bụrụ na onye were anyị n’ọrụ enweghị ezi uche. N’ezinụlọ kewara ekewa, di ma ọ bụ nwunye nke kwere ekwe na-eme mgbalị pụrụ iche iji na-agbaso ụkpụrụ Ndị Kraịst. Ọ naghị adị mfe mgbe nile, ma anyị maara na omume ọma anyị na-atọ Jehova ụtọ ma na-enwe mmetụta dị mma mgbe mgbe n’ebe ndị na-abụghị Ndịàmà nọ.—1 Pita 2:18-20; 3:1.

15. Olee otú anyị si mara na a na-ahụ ụkpụrụ omume dị elu nke Ndịàmà Jehova n’ebe nile?

15 A na-ahụ ihe ịga nke ọma Ndịàmà Jehova na-enwe n’ịnọgide na-agbaso ụkpụrụ kwesịrị nṅomi n’ihe ndị a na-ekwu banyere ha bụ́ ndị e bipụtaworo n’afọ ndị gafeworonụ. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ akụkọ bụ́ Il Tempo nke Ịtali kọrọ, sị: “Ndị ha na Ndịàmà Jehova na-arụkọ ọrụ na-akọwa ha dị ka ndị ọrụ na-eme ihe n’eziokwu, ndị kwenyesiri nnọọ ike na nkwenkwe ha nke na ọ pụrụ iyi ka ọ̀ na-echu ha ụra; otú o sina dị, ha kwesịrị ka a kwanyere ha ùgwù maka iguzosi ike n’ezi ihe ha n’omume.” Akwụkwọ akụkọ bụ́ Herald nke Buenos Aires, Argentina, kwuru, sị: “Ruo ọtụtụ afọ, Ndịàmà Jehova egosipụtawo onwe ha ịbụ ụmụ amaala na-arụsị ọrụ ike, ndị isi jụrụ oyi, ndị na-adịghị eme oké mmefu, ndị na-atụkwa egwu Chineke.” Onye Russia bụ́ ọkà mmụta bụ́ Sergei Ivanenko kwuru, sị: “A maara Ndịàmà Jehova n’ụwa nile dị ka ndị na-edebezu iwu nakwa maka àgwà ha nke ịtụzu ụtụ isi ha.” Onye na-elekọta otu ihe owuwu Ndịàmà Jehova nọ mee mgbakọ na Zimbabwe kwuru, sị: “Ahụrụ m ụfọdụ Ndịàmà ka ha na-atụtụ akwụkwọ ndị a tụsara n’ala ma na-ehicha ụlọ mposi. Ebe ahụ dị ọcha karịa otú ọ dị mgbe ha bịara. Ụmụaka unu ndị dị afọ iri na ụma ji ụkpụrụ eme ihe. Ọ dị m ka ya bụrụ nanị Ndịàmà Jehova jupụtara n’ụwa nile.”

Ido Onwe Onye n’Okpuru nke Ndị Kraịst

16. Mmekọrịta dị aṅaa ka anyị na ndị ọchịchị ụwa nwere, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

16 Pita kwukwara banyere mmekọrịta anyị na ndị ọchịchị ụwa. Ọ sịrị: “N’ihi Onyenwe anyị, doonụ onwe unu n’okpuru ihe nile mmadụ kere: ma ọ bụ nye eze dị ka onye ka elu ma ọ bụ nye ndị ọchịchị dị ka ndị o zitere inye ndị ajọ omume ntaramahụhụ ma jaa ndị na-eme ihe ọma mma. N’ihi na otú ahụ ka Chineke chọrọ ya, na site n’ime ihe ọma unu ga-enwe ike ikechi ọnụ nke okwu nzuzu nke ndị na-enweghị ezi uche.” (1 Pita 2:13-15) Anyị na-enwe ekele maka uru ndị anyị na-erite site n’ọchịchị ndị dị n’usoro, n’ịbụkwa ndị okwu Pita na-eduzi, anyị na-erube isi n’iwu ya ma na-atụ ụtụ isi anyị. Ọ bụ ezie na anyị maara banyere ikike Chineke nyere gọọmenti ịta ndị dara iwu ahụhụ, isi ihe mere anyị ji edo onwe anyị n’okpuru ndị ọchịchị ụwa bụ “n’ihi Onyenwe anyị.” Ọ bụ uche Chineke. Ọzọkwa, anyị adịghị achọ iwetara aha Jehova nkọcha site n’ịbụ ndị a tara ahụhụ n’ihi imebi iwu.—Ndị Rom 13:1, 4-7; Taịtọs 3:1; 1 Pita 3:17.

17. Mgbe “ndị na-enweghị ezi uche” na-emegide anyị, gịnị ka obi pụrụ isi anyị ike banyere ya?

17 N’ụzọ dị mwute, ụfọdụ “ndị na-enweghị ezi uche” nọ n’ọchịchị na-akpagbu ma ọ bụ na-emegide anyị n’ụzọ ndị ọzọ—dị ka site n’ịkwalite mkpọsa iji mebie aha anyị. Ma, mgbe oge Jehova ruru, a na-agbakarị ụgha ha n’anwụ, a na-ekechikwa ọnụ nke “okwu nzuzu” ha n’ụzọ dị irè. Omume e ji mara anyị dị ka Ndị Kraịst na-agbara onwe ya akaebe. Ọ bụ ya mere ndị ọrụ gọọmenti na-eme ihe n’eziokwu jikarị aja anyị mma dị ka ndị na-arụ ọrụ ọma.—Ndị Rom 13:3; Taịtọs 2:7, 8.

Ndị Ohu Chineke

18. Dị ka Ndị Kraịst, ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ isi zere iji ike anyị na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi?

18 Pita dọziri aka ná ntị, sị: “Dịnụ ka ndị nweere onwe ha, ma na-ejidekwanụ nnwere onwe unu, ọ bụghị dị ka ihe mkpuchi maka ihe ọjọọ, kama dị ka ndị ohu Chineke.” (1 Pita 2:16; Ndị Galeshia 5:13) Taa, ihe ọmụma anyị nwere banyere eziokwu Bible na-eme ka anyị nwere onwe anyị pụọ n’ozizi dị iche iche nke okpukpe ụgha. (Jọn 8:32) Ọzọkwa, anyị nweere onwe anyị ime nhọrọ, anyị pụkwara ime nhọrọ. Ma, anyị adịghị eji nnwere onwe anyị eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Mgbe anyị na-ahọrọ ndị anyị na ha ga na-akpakọrịta, uwe, ejiji, ntụrụndụ—ọbụna ihe oriri na ihe ọṅụṅụ—anyị na-echeta na ezi Ndị Kraịst bụ ndị ohu Chineke, ọ bụghị ndị na-eme ihe na-atọ onwe ha ụtọ. Anyị na-ahọrọ ijere Jehova ozi kama ịbụ ndị ohu nke ọchịchọ anụ ahụ́ anyị ma ọ bụ nke ihe ndị na-ewu ewu n’ụwa.—Ndị Galeshia 5:24; 2 Timoti 2:22; Taịtọs 2:11, 12.

19-21. (a) Olee otú anyị si ele ndị nọ n’ọkwá ọchịchị anya? (b) Olee otú ụfọdụ ndị siworo gosi “ịhụnanya maka òtù ụmụnna dum”? (ch) Olee ibu ọrụ kasị mkpa anyị nwere?

19 Pita gara n’ihu ikwu, sị: “Sọpụrụnụ ụdị mmadụ ọ bụla, nweenụ ịhụnanya maka òtù ụmụnna dum, tụọnụ egwu Chineke, nweenụ nsọpụrụ maka eze unu.” (1 Pita 2:17) Ebe ọ bụ na Jehova Chineke kwere ka ụmụ mmadụ nọrọ n’ọkwá ọchịchị dịgasị iche iche, anyị na-enye mmadụ ndị dị otú ahụ nsọpụrụ kwesịrị ekwesị. Ọbụna anyị na-ekpe ekpere banyere ha, ka ha wee kwe ka anyị jee ozi anyị n’udo nakwa ná nsọpụrụ Chineke. (1 Timoti 2:1-4) Otú ọ dị, n’otu mgbe ahụ, anyị na-enwe “ịhụnanya maka òtù ụmụnna dum.” Anyị na-eme ihe ga-abara ụmụnna anyị bụ́ Ndị Kraịst uru mgbe nile, ọ bụghị ihe ga-emerụ ha ahụ́.

20 Dị ka ihe atụ, mgbe ihe ike agbụrụ tisasịrị otu mba dị n’Africa, omume Ndị Kraịst nke Ndịàmà Jehova pụtara ìhè. Akwụkwọ akụkọ bụ́ Reformierte Presse nke Switzerland kọrọ, sị: “Na 1995, Òtù Na-ahụ Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ n’Africa . . . bịara nwee ike igosi na chọọchị nile, ma e wezụga Ndịàmà Jehova, keere òkè” n’agha ahụ. Mgbe akụkọ banyere ọdachi ahụ ruru mba ndị ọzọ, Ndịàmà Jehova nọ na Europe zigaara ụmụnna ha na ndị ọzọ nọ n’ala ahụ nsogbu dị na ya ihe oriri na ọgwụ. (Ndị Galeshia 6:10) Ha ṅara ntị n’okwu ndị dị n’Ilu 3:27: “Egbochila ezi ihe ná ndị ọ dịịrị, mgbe ọ dịịrị ike aka gị ime ya.”

21 Otú ọ dị, e nwere ibu ọrụ dị mkpa karịa nsọpụrụ anyị ji ndị ọchịchị ụwa n’ụgwọ na ọbụna karịa ịhụnanya anyị ji ụmụnna anyị n’ụgwọ. Olee nke ọ bụ? Pita kwuru, sị: “Tụọnụ egwu Chineke.” Anyị ji Jehova ụgwọ karịrị nnọọ nke anyị ji mmadụ ọ bụla. Olee otú nke ahụ si bụrụ eziokwu? Oleekwa otú anyị pụrụ isi mee ka ibu ọrụ anyị nwere n’ebe Chineke nọ na ụgwọ anyị ji ndị ọchịchị ụwa nọrọ n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị? A ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.

Ị̀ Na-echeta?

• Olee ibu ọrụ Ndị Kraịst nwere n’ime ezinụlọ?

• Olee otú anyị pụrụ isi na-egosi àgwà nke inye ihe n’ime ọgbakọ?

• Olee ibu ọrụ anyị nwere n’ebe ụwa a dị?

• Olee ụfọdụ n’ime uru ndị anyị na-erite site n’ịnọgide na-agbaso ụkpụrụ omume dị elu?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 9]

Olee otú ezinụlọ Ndị Kraịst pụrụ isi bụrụ ebe a na-esi enweta ọṅụ dị ukwuu?

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Gịnị mere Ndịàmà Jehova ji hụ ibe ha n’anya?

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Ànyị pụrụ igosi ụmụnna anyị ịhụnanya ọbụna ma ọ bụrụ na anyị amaghị ha n’onwe anyị?