Ndị Kraịst Bụ́ Ndị Na-anọpụ Iche n’Ụbọchị Ikpeazụ
Ndị Kraịst Bụ́ Ndị Na-anọpụ Iche n’Ụbọchị Ikpeazụ
“Ha abụghị akụkụ nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị akụkụ nke ụwa.”—JỌN 17:16.
1, 2. Gịnị ka Jizọs kwuru banyere mmekọrịta dị n’etiti ụmụazụ ya na ụwa, ajụjụ ndị dịkwa aṅaa ka okwu ya na-ewelite?
N’ABALỊ ikpeazụ ọ dịrị ndụ dị ka mmadụ zuru okè, Jizọs kpere ogologo ekpere ka ndị na-eso ụzọ ya nọ na-ege ntị. Ka ọ na-ekpe ekpere ahụ, o kwuru otu ihe nke na-akọwa ụdị ndụ ezi Ndị Kraịst nile ga-ebi. N’ikwu banyere ụmụazụ ya, ọ sịrị: “Enyewo m ha okwu gị, ma ụwa akpọwo ha asị, n’ihi na ha abụghị akụkụ nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị akụkụ nke ụwa. M na-arịọ gị arịrịọ, ọ bụghị ka ị kpọpụ ha n’ụwa, kama ka i chee ha nche n’ihi ajọ onye ahụ. Ha abụghị akụkụ nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị akụkụ nke ụwa.”—Jọn 17:14-16.
2 Jizọs kwuru ugboro abụọ na ụmụazụ ya agaghị abụ akụkụ nke ụwa. Ọzọkwa, na nnọpụiche ga-akpata nsogbu—ụwa ga-akpọ ha asị. Ma, ọ dịghị mkpa ka obi mapụ Ndị Kraịst; Jehova ga-eche ha nche. (Ilu 18:10; Matiu 24:9, 13) N’iburu ihe Jizọs kwuru n’uche, anyị pụrụ ịjụ, sị: ‘N’ihi gịnị ka ezi Ndị Kraịst na-ejighị bụrụ akụkụ nke ụwa? Gịnị ka abụghị akụkụ nke ụwa pụtara? Ọ bụrụ na ụwa kpọrọ Ndị Kraịst asị, olee otú ha si ele ụwa anya? Karịsịa, olee otú ha si ele ọchịchị ndị dị n’ụwa anya?’ Azịza Akwụkwọ Nsọ nyere banyere ajụjụ ndị a dị mkpa n’ihi na ha metụtara anyị nile.
“Anyị Sitere na Chineke”
3. (a) Olee ihe ndị na-eme ka anyị dị iche n’ụwa? (b) Olee ihe àmà na-egosi na ụwa “dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ”?
3 Mmekọrịta chiri anya nke anyị na Jehova bụ otu ihe mere anyị na-ejighị bụrụ akụkụ nke ụwa. Jọn onyeozi dere, sị: “Anyị maara na anyị sitere na Chineke, ma ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Ihe Jọn kwuru banyere ụwa bụ eziokwu doro anya. Agha, mpụ, mmekpọ ọnụ, mmegbu, emeghị ihe n’eziokwu, na omume rụrụ arụ ndị jupụtara ebe nile taa bụ ihe àmà na-egosi mmetụta Setan, ọ bụghị nke Chineke. (Jọn 12:31; 2 Ndị Kọrint 4:4; Ndị Efesọs 6:12) Mgbe mmadụ ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ọ gaghị eme omume ndị dị otú ahụ ma ọ bụ nakwere ha, nke ahụ na-emekwa ka ọ ghara ịbụ akụkụ nke ụwa.—Ndị Rom 12:2; 13:12-14; 1 Ndị Kọrint 6:9-11; 1 Jọn 3:10-12.
4. Ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị si egosi na anyị bụ nke Jehova?
4 Jọn kwuru na Ndị Kraịst “sitere na Chineke,” n’ụzọ dị iche n’ebe ụwa dị. Ọ bụ Jehova nwe ndị nile raara onwe ha nye ya. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ọ bụrụ na anyị na-adị ndụ, anyị na-adị ndụ maka Jehova, ọ bụrụkwa na anyị na-anwụ anwụ, anyị na-anwụ maka Jehova. Ya mere, ma ànyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị bụ nke Jehova.” (Ndị Rom 14:8; Abụ Ọma 116:15) Ebe anyị bụ nke Jehova, anyị na-efe ya ofufe a na-ekewaghị ekewa. (Ọpụpụ 20:4-6) N’ihi ya, ezi Onye Kraịst adịghị emikpu onwe ya n’ịchụso ihe nke ụwa. N’agbanyeghịkwa na ọ na-akwanyere ihe nnọchianya nke mba ùgwù, ọ dịghị efe ha ofufe, ma n’omume ma n’obi ya. N’ezie, ọ dịghị efe ndị a ma ama na-eme ihe egwuregwu ma ọ bụ arụsị ndị ọzọ nke oge a ofufe. N’ezie, ọ na-akwanyere ikike ndị ọzọ nwere ime otú masịrị ha ùgwù, ma ọ na-efe nanị Onye Okike. (Matiu 4:10; Mkpughe 19:10) Nke a na-emekwa ka ọ nọpụ iche n’ụwa.
“Alaeze M Abụghị Akụkụ nke Ụwa A”
5, 6. Olee otú ido onwe anyị n’okpuru Alaeze Chineke si eme ka anyị nọpụ iche n’ụwa?
5 Ndị Kraịst bụ ụmụazụ Kraịst Jizọs na ndị Alaeze Chineke na-achị, bụ́ nke na-emekwa ka ha ghara ịbụ akụkụ nke ụwa. Mgbe a na-ekpe Jizọs ikpe n’ihu Pọntịọs Paịlet, ọ sịrị: “Alaeze m abụghị akụkụ nke ụwa a. A sị na alaeze m bụ akụkụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara alụ ọgụ ka a ghara inyefe m n’aka ndị Juu. Ma, dị ka ihe si dịrị, alaeze m esiteghị n’ebe a.” (Jọn 18:36) Alaeze ahụ bụ ihe a ga-eji doo aha Jehova nsọ, gosi na ọ bụ ya ka o ruuru ịbụ eze, ma hụ na uche ya na-eme n’ụwa dị ka ọ na-eme n’eluigwe. (Matiu 6:9, 10) N’oge nile Jizọs jere ozi, o kwusara ozi ọma nke Alaeze ahụ, o kwukwara na ụmụazụ ya ga-ekwusa ya ruo kpọmkwem n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a. (Matiu 4:23; 24:14) Na 1914, e mezuru okwu amụma ndị dị ná Mkpughe 11:15: “Alaeze nke ụwa aghọwo alaeze nke Onyenwe anyị na nke Kraịst ya, ọ ga-achịkwa dị ka eze ruo mgbe nile ebighị ebi.” Otu ụbọchị n’isi nso, Alaeze eluigwe ahụ ga-abụ nanị ọchịchị ga na-achị ihe a kpọrọ mmadụ. (Daniel 2:44) E nwere mgbe ọ ga-eru, a ga-amanye ọbụna ndị ọchịchị ụwa ikweta na ọ na-achị achị.—Abụ Ọma 2:6-12.
6 N’iburu ihe a nile n’uche, ezi Ndị Kraịst taa bụ ndị Alaeze Chineke na-achị, ha na-agbasokwa ndụmọdụ Jizọs nke ‘ịnọgide buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke.’ (Matiu 6:33) Nke ahụ adịghị eme ka ha ghara ịdị na-eguzosi ike n’ihe nye mba ha bi na ya, ma ọ na-eme ka ha na-anọpụ iche n’ụwa n’ụzọ ime mmụọ. Ọrụ bụ́ isi Ndị Kraịst na-arụ taa, dị ka ha rụrụ na narị afọ mbụ, bụ ‘ịgba àmà nke ọma banyere alaeze Chineke.’ (Ọrụ 28:23) Ọ dịghị ọchịchị ọ bụla nke mmadụ nke nwere ikike igbochi ọrụ ahụ Chineke nyere.
7. N’ihi gịnị ka ezi Ndị Kraịst ji anọpụ iche, oleekwa otú ha siworo gosi nke a?
7 N’ikwekọ na ha ịbụ nke Jehova nakwa na ha ịbụ ụmụazụ Jizọs na ndị Alaeze Chineke na-achị, Ndịàmà Jehova anọgidewo na-anọpụ iche n’agha obodo na nke mba na mba ndị a lụrụ n’ime narị afọ nke 20 na nke 21. Ha adụnyebeghịrị akụkụ nke ọ bụla úkwù, ha ebulibeghị ngwá agha megide onye ọ bụla, ha agbasabeghịkwa echiche n’ihi ihe ọ bụla metụtara ihe nke ụwa. N’igosipụta okwukwe ha n’ụzọ dị ịrịba ama n’agbanyeghị mmegide ndị yiri ka ha karịrị ha ike, ha agbasowo ụkpụrụ ahụ e kwupụtaara ndị ọchịchị Nazi nke Germany na 1934, sị: “Anyị enweghị mmasị na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, kama anyị raara onwe anyị kpam kpam nye alaeze Chineke nke dị n’aka Kraịst bụ́ Eze ya. Anyị agaghị emerụ mmadụ ọ bụla ahụ́. Ọ ga-amasị anyị ibi n’udo na imere mmadụ nile ihe ọma ruo ókè anyị nweruru ohere maka ya.”
Ndị Nnọchiteanya na Ndị Ozi Maka Kraịst
8, 9. N’ụzọ dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova taa si bụrụ ndị nnọchiteanya na ndị ozi, oleekwa otú nke a si emetụta mmekọrịta nke ha na mba dị iche iche?
8 Pọl kọwara onwe ya na Ndị Kraịst ibe ya e tere mmanụ dị ka “ndị nnọchiteanya nọ n’ọnọdụ Kraịst, dị ka à ga-asị na Chineke na-arịọsi arịrịọ ike site n’ọnụ anyị.” (2 Ndị Kọrint 5:20; Ndị Efesọs 6:20) Kemgbe 1914, a pụrụ ikwu n’ụzọ kwesịrị ekwesị na Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ bụ ndị nnọchiteanya maka Alaeze Chineke, bụ́ nke ha bụ “ụmụ” ya. (Matiu 13:38; Ndị Filipaị 3:20; Mkpughe 5:9, 10) Ọzọkwa, Jehova esiwo ná mba nile nweta “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ,” bụ́ Ndị Kraịst nwere olileanya ibi n’ụwa, iji kwado ụmụ ya e tere mmanụ n’ọrụ nnọchiteanya ha. (Mkpughe 7:9; Jọn 10:16) A pụrụ ịkpọ “atụrụ ọzọ” a “ndị ozi” nke Alaeze Chineke.
9 Onye nnọchiteanya na ndị ọrụ ya adịghị etinye aka n’ihe omume nke mba ha na-eje ozi na ya. N’ụzọ yiri nke ahụ, Ndị Kraịst na-anọgide na-anọpụ iche na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke mba dị iche iche nke ụwa. Ha adịghị adụnyere mba, ebo, òtù ọha, ma ọ bụ nke akụ̀ na ụba ọ bụla úkwù ma ọ bụkwanụ na-emegide ya. (Ọrụ 10:34, 35) Kama nke ahụ, ha “na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ nile nọ.” (Ndị Galeshia 6:10) Nnọpụiche nke Ndịàmà Jehova na-apụta na ọ dịghị onye pụrụ ịjụ ozi ha n’ụzọ ziri ezi site n’ịzọrọ na ha kwụnyeere akụkụ nke ọzọ nke esemokwu agbụrụ, nke mba, ma ọ bụ nke ebo.
Ndị E Ji Ịhụnanya Amata
10. Olee otú ịhụnanya dịruru ná mkpa nye Onye Kraịst?
10 Tụkwasị n’ihe ndị e kwuru n’elu, Ndị Jọn 13:35) Ịhụnanya ụmụnna bụ otu isi ihe na-eme ka mmadụ bụrụ Onye Kraịst. (1 Jọn 3:14) Mmekọrịta dị n’etiti Onye Kraịst na ibe ya na-esi ike, ebe ọ bụ na o nwere njikọ n’ebe mmekọrịta ya na Jehova na Jizọs nọ. Ọ bụghị nanị ndị nọ n’ọgbakọ ya ka ọ ga-ahụ n’anya. Ọ ga-ahụ ‘òtù ụmụnna ya nile nọ n’ụwa’ n’anya.—1 Pita 5:9.
Kraịst na-anọpụ iche n’ihe omume ụwa n’ihi mmekọrịta nke ha na Ndị Kraịst ndị ọzọ. Jizọs gwara ụmụazụ ya, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (11. Olee otú ịhụnanya Ndịàmà Jehova nwere n’ebe ibe ha nọ siworo metụta omume ha?
11 Taa, Ndịàmà Jehova na-egosipụta ịhụnanya ụmụnna ha site n’imezu ihe ndị e kwuru n’Aịsaịa 2:4: “Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.” N’ịbụ ndị Jehova ziri ihe, ezi Ndị Kraịst so Chineke na ibe ha na-adị n’udo. (Aịsaịa 54:13) Ebe ọ bụ na ha hụrụ Chineke na ụmụnna ha n’anya, ọ ga-abụ ihe ha na-agaghị echetụ n’echiche bụ́ ibuli ngwá agha megide Ndị Kraịst ibe ha—ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ—nọ n’ala ọzọ. Udo na ịdị n’otu ha bụ akụkụ dị oké mkpa nke ofufe ha, ihe na-egosipụta na ha nwere mmụọ Chineke n’ezie. (Abụ Ọma 133:1; Maịka 2:12; Matiu 22:37-39; Ndị Kọlọsi 3:14) Ha ‘na-achọsi udo ike, na-agbasokwa ya,’ na-amara na “anya abụọ nke Jehova dị n’ahụ́ ndị ezi omume.”—Abụ Ọma 34:14, 15.
Otú Ndị Kraịst Si Ele Ụwa Anya
12. Àgwà dị aṅaa Jehova nwere n’ebe ndị nọ n’ụwa nọ ka Ndịàmà Jehova na-eṅomi, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa?
12 Jehova amawo ụwa a ikpe, ma o kpebeghị mmadụ nile nọ n’ụwa ikpe n’otu n’otu. Ọ ga-esi n’aka Jizọs mee ya mgbe oge Ya ruru. (Abụ Ọma 67:3, 4; Matiu 25:31-46; 2 Pita 3:10) Ka ọ dịgodị, ọ na-egosi ihe a kpọrọ mmadụ ịhụnanya dị ukwuu. O nyere ọbụna Ọkpara ọ mụrụ nanị ya ka mmadụ nile wee nwee ohere nke inweta ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:16) Dị ka Ndị Kraịst, anyị na-eṅomi ịhụnanya Chineke site n’ịgwa ndị ọzọ banyere ndokwa Chineke mere maka nzọpụta, ọbụna ma a sị na a na-akatọ mgbalị anyị ọtụtụ mgbe.
13. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ndị ọchịchị ụwa anya?
13 Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ndị ọchịchị ụwa anya? Pọl zara ajụjụ ahụ mgbe o dere, sị: “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ikike ndị ka elu, n’ihi na ikike ọ bụla adịghị ma ọ́ bụghị site na Chineke; Chineke debere ikike ndị dị adị n’ọkwá ha ndị ka ala.” (Ndị Rom 13:1, 2) Ndị mmadụ nọ n’ọkwá ọchịchị ndị “ka ala” (ndị ka ibe ha ma ọ bụ dị ala karịa ibe ha, ma bụrụ ndị dị ala mgbe nile karịa nke Jehova) n’ihi na Onye Pụrụ Ime Ihe Nile kwere ka ha nọrọ na ya. Onye Kraịst na-edo onwe ya n’okpuru ndị ọchịchị ụwa n’ihi na nke ahụ so ná nrubeisi ya nye Jehova. Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na ihe Chineke chọrọ na ihe ọchịchị ụmụ mmadụ chọrọ emegide onwe ha?
Iwu Chineke na nke Siza
14, 15. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka Daniel si nwee ike izere nsogbu n’ihe banyere nrubeisi? (b) Nguzo dị aṅaa ka ndị Hibru atọ ahụ weere mgbe ha na-apụghị izere nsogbu n’ihe metụtara nrubeisi?
14 Daniel na ndị enyi ya atọ setịpụrụ ezi ihe nlereanya n’ime ka ido onwe onye n’okpuru ọchịchị ụmụ mmadụ na ido onwe onye n’okpuru ọchịchị Chineke nọrọ n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị. Mgbe ụmụ okorobịa anọ ahụ bụ́ ndị Hibru nọ ná ndọrọ n’agha na Babilọn, ha rubere isi n’iwu nke ala ahụ, a họkwaara ha ngwa ngwa maka ọzụzụ pụrụ iche. Daniel, n’ịchọpụta na ọzụzụ ahụ ga-eduga ma eleghị anya n’imebi Iwu Jehova, sooro ndị isi okwu ahụ dị n’aka kwurịta ya. N’ihi ya, e mere ndokwa pụrụ iche iji kwanyere akọ na uche nke ndị Hibru anọ ahụ ùgwù. (Daniel 1:8-17) Ndịàmà Jehova na-agbaso ihe nlereanya Daniel mgbe ha ji akọ na-akọwara ndị ọchịchị ihe bụ́ echiche ha iji zere nsogbu ndị na-enweghị isi.
15 Otú ọ dị, n’otu oge mgbe nke ahụ gasịrị, ha apụghị izere nsogbu n’ihe metụtara ido onwe onye n’okpuru. Eze Babilọn guzobere nnukwu arụsị n’ala dị larịị nke Dura ma nye ndị isi ọchịchị, gụnyere ndị na-achị ala a na-achị achị, iwu ịgbakọta maka ịrara ya nye. Ka ọ na-erule n’oge ahụ, a họpụtawo ndị enyi Daniel atọ ịbụ ndị na-achị ala a na-achị achị nke Babilọn, n’ihi ya, iwu ahụ metụtara ha. N’otu oge ka ihe omume ahụ nọ na-aga n’ihu, ndị nile gbakọtaranụ gaje ịkpọ isiala nye ihe oyiyi ahụ. Ma ndị Hibru ahụ maara na nke a ga-emegide iwu Chineke. (Deuterọnọmi 5:8-10) N’ihi ya, mgbe mmadụ nile kpọrọ isiala, ha nọgidere na-eguzo ọtọ. Site n’inupụ isi n’iwu eze ahụ, ha tinyere onwe ha n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị e ji obi ọjọọ gbuo, ọ bụkwa nanị site n’ụzọ ọrụ ebube ka a zọpụtara ndụ ha; ma ha họọrọ itinye ndụ ha n’ihe ize ndụ nke ịnwụ kama inupụrụ Jehova isi.—Daniel 2:49–3:29.
16, 17. Olee otú ndịozi si meghachi omume mgbe e nyere ha iwu ịkwụsị ime nkwusa, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
16 Na narị afọ mbụ, a kpọrọ ndịozi Jizọs Kraịst n’ihu ndị ndú ndị Juu nọ na Jeruselem ma nye ha iwu ịkwụsị ime nkwusa n’aha Jizọs. Olee otú ha si meghachi omume? Jizọs enyewo ha ọrụ ime ndị nọ ná mba nile, nke ga-agụnye Judia, ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ. Ọ gwawokwa ha ka ha bụrụ ndị àmà ya na Jeruselem nakwa n’ebe ndị ọzọ n’ụwa. (Matiu 28:19, 20; Ọrụ 1:8) Ndịozi ahụ maara na iwu Jizọs bụ uche Chineke maka ha. (Jọn 5:30; 8:28) N’ihi ya, ha kwuru, sị: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.”—Ọrụ 4:19, 20; 5:29.
17 Ndịozi ahụ anọghị na-enupụ isi. (Ilu 24:21) Otú ọ dị, mgbe ndị ọchịchị bụ́ mmadụ machibidoro ha iwu ime uche Chineke, nanị ihe ha pụrụ ikwu bụ: ‘Anyị aghaghị irubere Chineke isi, ọ bụghị mmadụ.’ Jizọs kwuru na anyị kwesịrị ‘ịkwụghachi Siza ihe nke Siza, ma kwụghachi Chineke ihe nke Chineke.’ (Mak 12:17) Ọ bụrụ na anyị enupụ isi n’iwu Chineke n’ihi na mmadụ gwara anyị mee otú ahụ, anyị na-enye mmadụ ihe bụ́ nke Chineke. Kama nke ahụ, anyị na-akwụghachi Siza ihe nile anyị ji ya n’ụgwọ, ma anyị na-aghọta na Jehova nwere ikike kasị ukwuu. Ọ bụ Eze Eluigwe na Ala, Onye Okike, Isi Iyi nke ikike.—Mkpughe 4:11.
Anyị Ga-eguzosi Ike
18, 19. Nguzo dị aṅaa magburu onwe ya ka ọtụtụ n’ime ụmụnna anyị werewooro, oleekwa otú anyị pụrụ isi gbasoo ihe nlereanya ha?
18 Ka ọ dị ugbu a, ihe ka ukwuu n’ọchịchị nke ụwa na-aghọta nnọpụiche nke Ndịàmà Jehova, anyị na-enwekwa ekele maka nke ahụ. Otú ọ dị, n’ala ụfọdụ, Ndịàmà enwetawo mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ. N’ime narị afọ nke 20 nile ruokwa n’oge a, ụfọdụ n’ime ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị agbalịsiwo ike nke ukwuu, ‘n’ịlụ ezi ọgụ nke okwukwe’ n’ụzọ ime mmụọ.—1 Timoti 6:12.
19 Ànyị pụrụ isi aṅaa guzosie ike dị ka ha? Nke mbụ, anyị na-echeta na anyị aghaghị ịtụ anya mmegide. O kwesịghị ime ka anyị kụja ma ọ bụ ọbụna tụọ anyị n’anya mgbe anyị nwetara ya. Pọl dọrọ Timoti aka ná ntị, sị: “A ga-akpagbukwa ndị nile na-achọ ibi ndụ ná nsọpụrụ Chineke ná mmekọrịta nke ha na Kraịst Jizọs.” (2 Timoti 3:12; 1 Pita 4:12) N’ụwa ebe mmetụta Setan juru, gịnị ga-eme ka anyị ghara inweta mmegide? (Mkpughe 12:17) Ọ bụrụhaala na anyị na-ekwesị ntụkwasị obi, a ga-enwe mgbe nile, ụfọdụ ndị ‘ọ na-eju anya, ha ga na-agakwa n’ihu na-ekwujọ anyị.’—1 Pita 4:4.
20. Eziokwu dị aṅaa na-emesi obi ike ka a na-echetara anyị?
20 Nke abụọ, anyị kwenyesiri ike na Jehova na ndị mmụọ ozi ya ga-akwado anyị. Dị ka Ịlaịsha nke oge ochie si kwuo, “ndị anyị na ha nọ dị ọtụtụ karịa ndị ha na ha nọ.” (2 Ndị Eze 6:16; Abụ Ọma 34:7) Ọ pụrụ ịbụ na Jehova nwere ezi ihe mere o ji kwere ka nrụgide sitere n’aka ndị mmegide dịgide ruo oge ụfọdụ. Otú o sina dị, ọ ga-enye anyị ume dị anyị mkpa iji tachie obi mgbe nile. (Aịsaịa 41:9, 10) E gbuwo ụfọdụ, ma nke ahụ adịghị amapụ anyị obi. Jizọs kwuru, sị: “Unu atụkwala egwu ndị na-egbu ahụ́ ma ha enweghị ike igbu mkpụrụ obi; kama na-atụnụ egwu onye ahụ nke pụrụ ibibi ma mkpụrụ obi ma ahụ́ n’ime Gehena.” (Matiu 10:16-23, 28) Anyị bụ nanị “ndị na-ebi nwa oge” n’usoro ihe a. Anyị ji oge anyị nọ ebe a eme ihe iji “jidesie aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie,” bụ́ ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ Chineke. (1 Pita 2:11; 1 Timoti 6:19) Ọ dịghị mmadụ ọ bụla nke pụrụ ịnapụ anyị ụgwọ ọrụ ahụ ma ọ bụrụhaala na anyị anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke.
21. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche mgbe nile?
21 N’ihi ya, ka anyị na-echeta mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa anyị na Jehova Chineke nwere. Ka anyị jiri ngọzi nke ịbụ ụmụazụ Kraịst na ndị Alaeze ahụ ga-achị na-akpọrọ ihe mgbe nile. Ka anyị jiri obi anyị dum na-ahụ ụmụnna anyị n’anya, ka ịhụnanya ha na-egosi anyị na-atọkwa anyị ụtọ mgbe nile. Karịsịa, ka anyị ṅaa ntị n’okwu ọbụ abụ ahụ, bụ́: “Na-ele anya Jehova: dị ike, ka obi gị nweekwa ume; ee, na-ele anya Jehova.” (Abụ Ọma 27:14; Aịsaịa 54:17) Mgbe ahụ, anyị, dị ka imerime Ndị Kraịst bu anyị ụzọ, ga-eguzosi ike na-enwe olileanya e ji n’aka—Ndị Kraịst ji ikwesị ntụkwasị obi na-anọpụ iche bụ́ ndị na-abụghị akụkụ nke ụwa.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
• Olee otú mmekọrịta anyị na Jehova si eme ka anyị nọpụ iche n’ụwa a?
• Dị ka ndị Alaeze Chineke na-achị, olee otú anyị si anọpụ iche n’ụwa a?
• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe ụmụnna anyị nọ si eme ka anyị nọpụ iche n’ụwa?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 15]
Olee otú anyị ido onwe anyị n’okpuru Alaeze Chineke si emetụta mmekọrịta anyị na ụwa?
[Foto dị na peeji nke 16]
Onye Hutu na onye Tutsi ka ha ji obi ụtọ na-arụkọ ọrụ
[Foto dị na peeji nke 17]
Ụmụnna Ndị Kraịst bụ́ onye Juu na onye Arab
[Foto dị na peeji nke 17]
Ndị Kraịst bụ́ ndị Serbia, Bosnia, na Croatia ka ha na-enwe obi ụtọ ná mkpakọrịta nke ha na ibe ha
[Foto dị na peeji nke 18]
Olee ụzọ anyị kwesịrị ịgbaso mgbe ndị ọchịchị nyere anyị iwu imebi iwu Chineke?