Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Na-akwado Ezi Ofufe—N’oge ahụ na n’Oge A

Ndị Na-akwado Ezi Ofufe—N’oge ahụ na n’Oge A

Ndị Na-akwado Ezi Ofufe—N’oge ahụ na n’Oge A

Ì CHETARA aha otu nwoke nke beere obodo Jeruselem oge ochie ákwá? ‘Jizọs,’ ka ị pụrụ ikwu—n’ezie, Jizọs mekwara otú ahụ. (Luk 19:28, 41) Otú ọ dị, ọtụtụ narị afọ tupu Jizọs ejegharịa n’ụwa, ohu Chineke ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi bekwaara Jeruselem ákwá n’otu aka ahụ. Aha ya bụ Nehemaịa.—Nehemaịa 1:3, 4.

Olee ihe mere Nehemaịa ji nwee nnọọ mwute nke na o beere Jeruselem ákwá? Gịnị ka o mere maka ọdịmma nke obodo ahụ na ndị bi n’ime ya? Gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya ya? Iji zaa ha, ka anyị tụlee ihe ụfọdụ mere n’ụbọchị ya.

Nwoke Nwere Mmetụta Ma Na-arụsi Ọrụ Ike

A họpụtara Nehemaịa ịbụ onye ọchịchị Jeruselem, ma tupu mgbe ahụ, ọ bụ onye nọ n’ọkwá dị elu n’obí eze Peasia nke dị n’obodo Shushan. Ma, ndụ ntụsara ahụ́ o biri ebelataghị nchegbu o nwere maka ọdịmma nke ụmụnne ya bụ́ ndị Juu bi na Jeruselem dị anya. N’ezie, ihe mbụ o mere mgbe ndị Juu e si Jeruselem zite bịara Shushan bụ “[ịjụ] ha ajụjụ banyere ndị Juu, bụ́ ndị mgbapụ, nke fọdụrụ site ná ndọta n’agha, na ajụjụ banyere Jeruselem.” (Nehemaịa 1:2) Mgbe ndị ọbịa ahụ gwara ya na ndị Jeruselem nọ “n’ọnọdụ ọjọọ” nakwa na ‘e tipusịrị’ mgbidi obodo ahụ, Nehemaịa ‘nọdụrụ ala, kwaa ákwá, ruo újú ụbọchị ụfọdụ.’ Mgbe nke ahụ gasịrị, o kwupụtara mwute o nwere n’ekpere sitere n’ala ala obi o kpegaara Jehova. (Nehemaịa 1:3-11) Gịnị mere Nehemaịa ji nwee nnọọ mwute? Ọ bụ n’ihi na Jeruselem bụ ebe ofufe Jehova hiwere isi n’ụwa, e legharawokwa ya anya. (1 Ndị Eze 11:36) Ọzọkwa, ọnọdụ ọjọọ obodo ahụ nọ na ya bụ ihe na-egosipụta ọnọdụ ọjọọ ndị bi na ya nọ n’ụzọ ime mmụọ.—Nehemaịa 1:6, 7.

Nchegbu Nehemaịa nwere maka Jeruselem na ọmịiko o nwere n’ebe ndị Juu bi na ya nọ kpaliri ya iwepụta onwe ya ijere ha ozi. Ozugbo eze Peasia nyere Nehemaịa ohere ịhapụ ọrụ, ọ malitere ịkwadebe maka njem dị anya ịga Jeruselem. (Nehemaịa 2:5, 6) Ọ chọrọ inye ume, oge, na nkà ya iji kwado ọrụ ahụ dị mkpa nke ịrụzi ihe ndị mebirinụ. N’ime ụbọchị ole na ole ọ lọghachiri, o meelarị ndokwa ime ka mgbidi dum nke Jeruselem dị ike.—Nehemaịa 2:11-18.

Nehemaịa kere nnukwu ọrụ nke ime ka mgbidi ahụ dị ike n’etiti ezinụlọ dị iche iche, bụ́ ndị rụkọchara ọrụ ọnụ. * E kenyere nke ọ bụla n’ime ihe karịrị ìgwè 40 dịgasị iche iche ime ka otu ‘iberibe a tụrụ atụ’ nke mgbidi ahụ dị ike. Gịnị si na ya pụta? Ebe e nwere ọtụtụ ndị ọrụ—gụnyere ndị nne na nna na ụmụ ha—nyere oge na ume ọrụ ha, ha bịara nwee ike ịrụcha ọrụ yiri ihe karịrị ha ike. (Nehemaịa 3:11, 12, 19, 20) N’ime ọnwa abụọ ha rụsiri ọrụ ike, ha mere ka mgbidi ahụ dum dị ike! Nehemaịa dere na a manyere ọbụna ndị megidere ọrụ ahụ ikweta na “e sitere n’aka Chineke anyị jee ozi a.”—Nehemaịa 6:15, 16.

Ihe Nlereanya A Ga-echeta

Nehemaịa nyere ihe karịrị oge na nkà ime nhazi ya. O jikwa ihe onwunwe ya kwado ezi ofufe. O ji ego ya zụtaghachi ụmụnne ya bụ́ ndị Juu e renyere n’ịbụ ohu. O binyere ndị mmadụ ego n’anaghị ọmụrụ nwa. Ọ dịghị mgbe ọ bụla o “bogburu” ndị Juu n’ibu site n’ịmanye ha ịdị na-akwụ ya ụgwọ ọnwa dị ka onye na-achị achị, bụ́ ihe ruuru ya. Kama nke ahụ, o ghewere ụlọ ya oghe maka inye ‘otu narị ndị ikom na iri ise, ha na ndị na-abịakwute ya site ná mba ndị dị ha gburugburu’ ihe oriri. Kwa ụbọchị, ọ na-egburu ndị ọbịa ya ‘otu ehi na atụrụ isii a họpụtara ahọpụta na ụmụ nnụnụ.’ Tụkwasị na nke ahụ, otu ugboro n’ime ụbọchị iri ọ bụla, ọ na-edoziri ha “mmanya vaịn nile ọ bụla n’ụba”—ọ bụ ya na-akwụ ụgwọ ha nile.—Nehemaịa 5:8, 10, 14-18.

Lee ihe nlereanya pụtara ìhè nke mmesapụ aka Nehemaịa setịpụụrụ ndị ohu Chineke nile n’oge ahụ na n’oge a! Ohu Chineke a nwere obi ike ji mmesapụ aka na ọchịchọ obi ya jiri ihe onwunwe ya kwado ndị ọrụ ahụ iji mee ka ezi ofufe gaa n’ihu. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọ pụrụ ịrịọ Jehova, sị: “Chineke m, [cheta] ihe nile nke m meworo n’ihi ndị nke a, imere m ezi ihe.” (Nehemaịa 5:19) N’ezie, Jehova ga-eme nke ahụ kpọmkwem.—Ndị Hibru 6:10.

A Na-agbaso Ihe Nlereanya Nehemaịa Taa

Ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ ịhụ na, n’ụzọ yiri nke ahụ, ndị Jehova taa na-egosipụta mmetụta ịhụnanya, àgwà nke ịdị njikere ịrụ ọrụ, na àgwà nke ịchụ onwe onye n’àjà maka ezi ofufe. Mgbe anyị nụrụ na ihe na-esiri ndị kwere ekwe ibe anyị ike, anyị na-enwe nchegbu dị ukwuu banyere ọdịmma ha. (Ndị Rom 12:15) Dị ka Nehemaịa, anyị na-echigharịkwuru Jehova n’ekpere iji kwado ụmụnna nke okwukwe anyị bụ́ ndị nọ ná nsogbu, na-arịọ ya, sị: “Biko, ka ntị Gị na-aṅa ntị n’ekpere ohu Gị, na n’ekpere ndị ohu Gị, ndị ọ na-atọ ụtọ ịtụ egwu aha Gị.”—Nehemaịa 1:11; Ndị Kọlọsi 4:2.

Otú ọ dị, nchegbu anyị na-enwe maka ọdịmma ime mmụọ na nke anụ ahụ́ nke ụmụnna anyị bụ́ Ndị Kraịst na maka ime ka ezi ofufe gaa n’ihu adịghị akwali anyị igosipụta nanị mmetụta. Ọ na-akpalikwa anyị ime ihe. Ịhụnanya na-akpali ndị ọnọdụ ha kwere ime ya ịhapụ ndụ dị ntụsara ahụ́ ha na-ebi n’obodo ha ma, dị ka Nehemaịa, kwaga n’ebe ndị ọzọ iji nyere ndị nọ ná mkpa aka. N’ịbụ ndị na-adịghị enwe nkụda mmụọ n’ihi ọnọdụ ibi ndụ nke na-adịchaghị ntụsara ahụ́ ha pụrụ iche ihu n’akụkụ ụfọdụ nke ụwa, ndị ọrụ afọ ofufo dị otú ahụ na-enye nkwado iji hụ na ezi ofufe na-aga n’ihu n’ebe ahụ, na-eso ụmụnna ha Ndị Kraịst na-ejekọ ozi ọnụ. Mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà nke ha na-egosipụta bụ ihe kwesịrị ịja mma n’ezie.

Ime Òkè Anyị n’Ógbè Anyị

N’ụzọ kwere nghọta, ihe ka ọtụtụ n’ime anyị enweghị ike ịkwaga n’ebe ndị ọzọ. Anyị na-akwado ezi ofufe n’ógbè anyị. E gosipụtakwara nke a n’akwụkwọ Nehemaịa. Rịba ama ihe Nehemaịa kọwakwuru banyere ụfọdụ n’ime ezinụlọ ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị keere òkè n’ọrụ ime ka mgbidi ahụ dị ike. O dere, sị: “Jedaịa nwa Harumaf mere ka mgbidi dị ike, bụ́ ná ncherịta ihu ụlọ ya . . . Benjamin na Hashub mere ka mgbidi dị ike ná ncherịta ihu ụlọ ha. N’iso ha ka Azaraịa nwa Maaseia nwa Ananaịa mere ka mgbidi dị ike n’akụkụ ụlọ ya.” (Nehemaịa 3:10, 23, 28-30, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Ndị ikom ahụ na ezinụlọ ha tụnyere ụtụ dị ukwuu n’ime ka ezi ofufe gaa n’ihu site n’ime òkè ha n’ọrụ ime ka mgbidi ahụ dị ike n’akụkụ ụlọ ha.

Taa, ọtụtụ n’ime anyị na-akwado ezi ofufe n’ógbè anyị n’ụzọ dịgasị iche iche. Anyị na-ekere òkè n’ọrụ iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, ọrụ enyemaka n’oge e nwere ọdachi nakwa, nke kasị mkpa, n’ọrụ nkwusa Alaeze. Tụkwasị na nke ahụ, ma ànyị nwere ike ikere òkè n’onwe anyị n’ọrụ ihe owuwu ma ọ bụ nke enyemaka ma ọ bụ na anyị enweghị, anyị nile na-enwe ọchịchọ sitere n’obi nke iji ihe onwunwe anyị na-akwado ezi ofufe, dị nnọọ ka Nehemaịa ji mmesapụ aka mee n’oge ya.—Lee igbe bụ́ “Ihe Ndị E Ji Amata Onyinye Afọ Ofufo.”

Inweta ego dị mkpa iji hụ na ọrụ obibi akwụkwọ anyị nke na-ebuwanye ibu, ọrụ enyemaka, na ọtụtụ ọrụ ndị ọzọ anyị na-arụ gburugburu ụwa na-aga n’ihu, pụrụ iyi ihe karịrị anyị ike mgbe ụfọdụ. Otú ọ dị, cheta na ọrụ nke ime ka nnukwu mgbidi Jeruselem dị ike yikwara ihe karịrị mmadụ ike. (Nehemaịa 4:10) Ma, n’ihi na e kere ọrụ ahụ eke n’etiti ezinụlọ ndị dị njikere ịrụ ọrụ, a rụchara ya. N’otu aka ahụ taa, anyị ga-anọgide na-enweta ihe ndị dị mkpa iji rụọ ọrụ anyị zuru ụwa ọnụ ma ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime anyị anọgide na-ekere òkè n’akụkụ ụfọdụ nke ọrụ ahụ.

Igbe bụ́ “Ụzọ Ụfọdụ Ndị Si Ahọrọ Inye Ihe” na-egosi ụzọ dị iche iche a pụrụ isi jiri ego na-akwado ọrụ Alaeze ahụ. N’afọ gara aga, ọtụtụ n’etiti ndị Chineke nyere nkwado dị otú ahụ, ọ ga-amasịkwa Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova iji ohere a kelee ndị nile obi ha kpaliri iso nye onyinye afọ ofufo a. Karịsịa, anyị na-ekele Jehova maka ngọzi bara ụba ọ na-agọzi mgbalị ndị ya ji obi ha nile na-eme iji kwalite ezi ofufe n’ụwa nile. Ee, mgbe anyị tụgharịrị uche n’otú aka Jehova siworo duzie anyị n’ọtụtụ afọ ndị gafeworonụ, a na-akpali anyị ikwughachi ihe Nehemaịa kwuru, bụ́ onye ji ekele kwuo, sị: “Aka Chineke m . . . dị mma n’ahụ́ m.”—Nehemaịa 2:18.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Nehemaịa 3:5 na-ekwu na ụfọdụ ndị Juu a ma ama, “ndị dị ebube,” jụrụ iso rụọ ọrụ ahụ, a gụnyeghịkwa ha. Ndị na-arụ ụdị ọrụ dịgasị iche iche—ndị nchụàjà, ndị na-anụcha ọlaedo, ndị na-agwa ude, ndị isi, ndị na-azụ ahịa—kwadochara ọrụ ahụ.—Amaokwu nke 1, 8, 9, 32.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 28, 29]

Ụzọ Ụfọdụ Ndị Si Ahọrọ Inye Ihe

ONYINYE NDỊ A NA-ENYE MAKA ỌRỤ ZURU ỤWA ỌNỤ

Ọtụtụ ndị na-ewepụta, ma ọ bụ mawapụta, ego iche nke ha na-etinye n’igbe onyinye ndị ahụ a mapawara akwụkwọ e dere “Contributions for the Worldwide Work—Matthew 24:14” (“Onyinye Maka Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ—Matiu 24:14”).

Kwa ọnwa, ọgbakọ dị iche iche na-ezije ego ndị a n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova ma ọ bụ n’alaka ụlọ ọrụ dị n’ógbè ha. A pụrụ iziga onyinye ego afọ ofufo kpọmkwem na Treasurer’s Office, Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, 25 Columbia Heights, Brooklyn, New York 11201-2483, ma ọ bụ n’alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba unu. A pụkwara inye ọla ma ọ bụ ihe ndị ọzọ bara uru. E kwesịrị izitekọta onyinye ndị a na akwụkwọ ozi dị mkpirikpi nke na-akọwa na ha bụ onyinye.

ONYINYE NKE A PỤRỤ ỊNARAGHACHI

A pụrụ inye onyinye ego n’okpuru ndokwa pụrụ iche nke na a pụrụ inyeghachi ya onye ahụ nyere ya ma ọ bụrụ na o nwee mkpa. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, biko kpọtụrụ Treasurer’s Office n’adres e dere n’elu.

ATỤMATỤ ỌRỤ EBERE

Tinyere inye onyinye kpam kpam na onyinye ego ndị a pụrụ ịnaraghachi, e nwere ụzọ ndị ọzọ nke inye ihe iji baara ozi Alaeze uru n’ụwa nile. Ndị a gụnyere:

Inshọransị: A pụrụ idenye aha Watch Tower Society dị ka ndị a ga-akwụ ụgwọ ma ọ bụrụ na onye dejupụtara akwụkwọ inshọransị anwụọ ma ọ bụ n’atụmatụ ego a na-erite ma a laa ezumike nká.

Ihe Ndekọ Ego Ụlọ Akụ̀: A pụrụ ime ndokwa ka ihe ndekọ ego ụlọ akụ̀, satifiketi ndebe ego, ma ọ bụ ihe ndekọ ego ezumike nká nke ndị mmadụ n’otu n’otu dịrị ná ntụkwasị obi n’aka ma ọ bụ bụrụ nke a ga-akwụnye Watch Tower Society mgbe onye debere ya nwụrụ, n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ụlọ akụ̀ dị ná mba ahụ na-agbaso.

Ihe Ndị Nọchiri Anya Ego: A pụrụ inye Watch Tower Society ihe ndị nọchiri anya ego dị ka onyinye kpam kpam.

Ala na Ụlọ: A pụrụ inye Watch Tower Society ala na ụlọ nke a pụrụ ire ere site n’inye ya dị ka onyinye kpam kpam ma ọ bụ site n’inye onye ahụ nyere ya ohere nke ịnọgide na-ebi n’ebe ahụ n’oge nile ọ dị ndụ. Mee ka alaka ụlọ ọrụ dị ná mba unu mara tupu ị na-edenye ala na ụlọ ọ bụla n’aha ya.

Ike Ekpe na Atụmatụ Ego: A pụrụ idenyere Watch Tower Society ihe onwunwe ma ọ bụ ego n’akwụkwọ ike ekpe nke e dere n’ụzọ iwu kwadoro, ma ọ bụ a pụrụ ịkpọ Watch Tower Society aha dị ka ndị ga-erite uru ná ndokwa atụmatụ ego. Atụmatụ ego e mere ka ọ baara òtù okpukpe uru pụrụ ime ka e sepụtụrụ mmadụ ego n’ụtụ isi ọ ga-akwụ.

Dị ka okwu ahụ bụ́ “atụmatụ ọrụ ebere” na-enye echiche ya, ụdị onyinye ndị a chọrọ nnọọ ime atụmatụ ụfọdụ n’aka onye ahụ na-enye onyinye. Iji nyere ndị na-achọ inye aka n’ọrụ zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova site n’ụdị ụfọdụ nke atụmatụ ọrụ ebere aka, a kwadebewo otu broshuọ dị n’asụsụ Bekee na Spanish a kpọrọ Charitable Planning to Benefit Kingdom Service Worldwide (Atụmatụ Ọrụ Ebere Iji Baara Ozi Alaeze Uru n’Ụwa Nile). E dere broshuọ ahụ ná nzaghachi nye ọtụtụ ajụjụ ndị a jụrụ banyere onyinye, ike ekpe, na atụmatụ ego. O nwekwara n’ime ya ihe ọmụma ndị ọzọ bara uru metụtara ime atụmatụ ala na ụlọ, ego, na ụtụ isi. Ọ na-enye ndị mmadụ ihe ọmụma banyere ụzọ dịgasị iche iche a pụrụ isi nye onyinye ma ọ́ bụghị ugbu a, ọ bụrụ site n’ikenye ya n’ekpe maka mgbe ha nwụrụ. A pụrụ inweta broshuọ a site n’ịrịọ maka ya kpọmkwem site n’aka Ọfịs Atụmatụ Ọrụ Ebere.

Mgbe ha gụsịrị broshuọ ahụ ma soro ndị na-arụ ọrụ n’Ọfịs Atụmatụ Ọrụ Ebere kparịta ụka, ọtụtụ ndị enwewo ike ịkwado Ndịàmà Jehova n’ụwa nile ma n’otu mgbe ahụ, mụbaa ihe a na-esepụrụ ha n’ụtụ isi n’ihi ime otú ahụ. E kwesịrị ime ka Ọfịs Atụmatụ Ọrụ Ebere mara banyere akwụkwọ ndị bara uru metụtara nke ọ bụla ná ndokwa ndị a ma nweta otu akwụkwọ ahụ. Ọ bụrụ na i nwere mmasị na nke ọ bụla n’ime ndokwa atụmatụ ọrụ ebere ndị a, i kwesịrị ịkpọtụrụ Ọfịs Atụmatụ Ọrụ Ebere, n’akwụkwọ ozi ma ọ bụ na telifon, n’adres e dere n’okpuru ma ọ bụ n’ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke na-elekọta mba gị.

Charitable Planning Office

Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania

100 Watchtower Drive

Patterson, New York 12563-9204

Telifon: (845) 306-0707

[Igbe dị na peeji nke 30]

Ihe Ndị E Ji Amata Onyinye Afọ Ofufo

N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Kọrint, Pọl onyeozi kwuru ihe atọ dị ịrịba ama e ji amata onyinye afọ ofufo. (1) Mgbe ọ na-ede banyere ịnakọta ego, Pọl nyere ntụziaka, sị: “Kwa ụbọchị mbụ n’ime izu, ka onye ọ bụla n’ime unu n’ụlọ nke ya wepụta ihe iche.” (1 Ndị Kọrint 16:2) N’ihi ya, ọ dị mkpa ime ndokwa maka inye ihe tupu oge a ga-enye ya eruo, ọ dịkwa mkpa ka e mee ya n’usoro. (2) Pọl dekwara na onye ọ bụla kwesịrị inye ihe “n’ịkwekọ n’ihe ọ na-akpata.” (1 Ndị Kọrint 16:2b, New International Version) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, onye chọrọ iso na-enye onyinye afọ ofufo pụrụ ime otú ahụ n’ụzọ kwekọrọ n’ihe o nwere. Ọ bụrụgodị na ihe Onye Kraịst na-akpata pere mpe, Jehova na-ewere obere ego ọ pụrụ inye n’ihi ya dị ka ihe bara uru. (Luk 21:1-4) (3) Pọl dekwara, sị: “Ka onye ọ bụla na-eme dị nnọọ ka o kpebiworo n’obi ya, ọ bụghị n’enweghị ọchịchọ ime ihe ma ọ bụ ná mmanye, n’ihi na Chineke hụrụ onye na-eji mgbasapụ ihu na-enye ihe n’anya.” (2 Ndị Kọrint 9:7) Ezi Ndị Kraịst na-eji obi ha—mgbasapụ ihu—enye ihe.

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Nehemaịa bụ nwoke nwere mmetụta ma na-arụsi ọrụ ike

[Foto ndị dị na peeji nke 30]

Onyinye afọ ofufo na-akwado ọrụ obibi akwụkwọ, ọrụ enyemaka, ọrụ iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, na ọrụ ndị ọzọ bara uru a na-arụ gburugburu ụwa