Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ọ̀ bụ iwu na a ga-emezurịrị nkwa ndị e kwere Chineke?

N’Akwụkwọ Nsọ, ikwe Chineke nkwa bụ mmadụ ịgwa ya na ya ga-emere ya ihe, achụrụ ya àjà, ejere ya ozi ma ọ bụ banye n’ọnọdụ ụfọdụ, ma ọ bụkwanụ na ya ga-ezere ihe ụfọdụ na-emegideghị iwu n’onwe ha. N’ime Bible, e nwere ihe ndekọ nke nkwa ndị e kwere Chineke bụ́ ndị dabeere n’ihe ụfọdụ n’echiche nke bụ́ na a ga-emezu ha ma ọ bụrụ na Chineke eburu ụzọ mee ihe. Dị ka ihe atụ, Hana, bụ́ nne Samuel onye amụma, “[kwere] nkwa, sị, Jehova nke usuu nile nke ndị agha, . . . ọ bụrụ na I cheta m, ghara ichezọ ohu Gị nwanyị, wee nye ohu Gị nwanyị nwa nwoke, m ga-enyekwa ya Jehova ụbọchị ndụ ya nile, agụba agaghị agakwa n’elu isi ya.” (1 Samuel 1:11) Bible na-akọwakwa nkwa e kwere Chineke dị ka nke e ji ọchịchọ obi eme. Ruo ókè ha aṅaa ka iwu ji mmadụ imezu nkwa o kwere Chineke?

“Mgbe ị na-ekwe Chineke nkwa,” ka Eze Solomọn nke Izrel oge ochie na-ekwu, “alala azụ n’ịkwụghachi ya.” Ọ na-agbakwụnye, sị: “Ihe ị na-ekwe ná nkwa, kwụghachi ya. Ọ dị mma ka ị ghara ikwe nkwa, karịa ikwe nkwa ma ị dịghị akwụghachi.” (Eklisiastis 5:4, 5) Iwu ahụ e si n’aka Mozis nye Izrel na-ekwu, sị: “Mgbe ị ga-ekwe Jehova, bụ́ Chineke gị, nkwa, alala azụ n’ịkwụghachi ya: n’ihi na Jehova, bụ́ Chineke gị, aghaghị ịjụ ase ya n’aka gị; ọ ga-abụkwa mmehie n’ime gị.” (Deuterọnọmi 23:21) N’ụzọ doro anya, ikwe Chineke nkwa bụ ihe a ga-eji kpọrọ ihe. E kwesịrị inwe ezi ihe mere e ji kwe ya, onye na-ekwekwa ya ekwesịghị inwe obi abụọ ma ọ̀ ga-emezuli ihe ọ bụla o kwere ná nkwa. Ma ọ́ bụghị ya, ọ ka mma na o kweghị nkwa ahụ. Otú ọ dị, ọ̀ bụ nkwa nile ka iwu ji onye kwere ya imezu ozugbo o kwere ya?

Gịnị ma ọ bụrụ na nkwa e kwere chọrọ na a ga-eme ihe e mesịrị mata na o kwekọghị n’uche Chineke? Gịnị ma ọ bụrụ na ọ bụ nkwa nke ga-ejikọta omume rụrụ arụ na ezi ofufe n’ụzọ ụfọdụ? (Deuterọnọmi 23:18) N’ụzọ doro anya, iwu ejighị mmadụ imezu nkwa dị otú ahụ. Ọzọkwa, n’okpuru Iwu Mozis, nna nwanyị ma ọ bụ di ya pụrụ ịkagbu nkwa nwanyị ahụ kwere.—Ọnụ Ọgụgụ 30:3-15.

Tụleekwa ihe banyere onye kweworo Chineke nkwa ịnọgide n’alụghị di ma ọ bụ nwunye ma hụzie onwe ya n’ọnọdụ amaghị ihe a ga-eme. Nkwa o kwere etinyewo ya n’ọnọdụ ọ na-eche na ịchọ imezu ya ga-eme ka o mebie ụkpụrụ Chineke banyere omume ọma. Ò kwesịrị ịdị na-agbalịsi ike imezu nkwa ya? Ọ́ gaghị akara ya mma ichebe onwe ya pụọ n’ịbụ onye ikpe omume rụrụ arụ mara site n’ịhapụ imezu nkwa ahụ kama itinye onwe ya n’ọnọdụ ga-eme ka ọ chọwa ebere Chineke ma rịọwa mgbaghara? Ọ bụ nanị ya pụrụ ime mkpebi n’okwu a. Ọ dịghị mmadụ ọzọ pụrụ imere ya mkpebi ahụ.

Gịnị ma ọ bụrụ na mmadụ kwere Chineke nkwa ma mesịa chọpụta na ya kwere ya n’echeghị ya eche? Ọ̀ ka kwesịrị ịgbalị imezu nkwa ahụ? Ọ dịghịrị Jefta mfe imezu nkwa o kwere Chineke, ma o mezuru ya n’ihi akọ na uche ya. (Ndị Ikpe 11:30-40) Mmadụ emezughị nkwa o kwere Chineke pụrụ ime ka Chineke ‘wee iwe’ megide onye ahụ ma mebie ihe onye ahụ mezuworo. (Eklisiastis 5:6) Mmadụ ejighị ihe metụtara imezu nkwa o kwere Chineke kpọrọ ihe pụrụ ime ka ihu ọma Chineke funahụ ya.

Jizọs Kraịst kwuru, sị: “Nanị ka Ee unu kwuru bụrụ Ee, Ee e unu abụrụ Ee e; n’ihi na ihe karịrị ndị a sitere n’aka ajọ onye ahụ.” (Matiu 5:37) Onye Kraịst aghaghị inwe nchegbu ọ bụghị nanị banyere imezu nkwa o kwere Chineke kamakwa banyere imezu okwu ya nile—ndị ọ gwara Chineke na ndị ọ gwara ụmụ mmadụ. Gịnị ma ọ bụrụ na ọ hụta onwe ya n’ọnọdụ tara akpụ nke ịbụ onye sooro onye ọzọ banye ná nkwekọrịta yiri ka ọ̀ dị mma na mbụ ma mgbe o lerukwuru ya anya, ya achọpụta na ọ bụ nke ezi uche na-adịghị na ya? O kwesịghị ile okwu dị otú ahụ anya dị ka ihe na-adịghị ihe ọ bụ. Ma n’ihi iji ezi obi kwurịta banyere ya, onye nke ọzọ ahụ pụrụ ikpebi ịtọhapụ ya n’ibu ọrụ ahụ.—Abụ Ọma 15:4; Ilu 6:2, 3.

A bịa n’ihe banyere ikwe Chineke nkwa na ihe ndị ọzọ, gịnị kwesịrị ịbụ nchegbu anyị bụ́ isi? Ka anyị na-achọ mgbe nile ịnọgide soro Jehova Chineke na-enwe ezi mmekọrịta.

[Foto ndị dị na peeji nke 30, 31]

Hana alaghị azụ n’imezu nkwa ya

[Foto ndị dị na peeji nke 30, 31]

Jefta mezuru nkwa o kwere Chineke n’agbanyeghị na o siiri ya ike imezu ya