Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebe Ndị A Na-anọ Efe Ofufe—Hà Dị Anyị Mkpa?

Ebe Ndị A Na-anọ Efe Ofufe—Hà Dị Anyị Mkpa?

Ebe Ndị A Na-anọ Efe Ofufe—Hà Dị Anyị Mkpa?

‘Ọtụtụ puku ndị njem ala nsọ bụ́ ndị yi uwe mara mma, ndị si n’akụkụ dị iche iche nke mba a, ìgwè ndị India a na-akụrụ nkwa ka ha na-agba ụdị egwú a sị na a gbara tupu ndị Spen emerie akụkụ ụfọdụ nke Ebe Ndịda America, na ndị ji okpukpe kpọrọ ihe bụ́ ndị ji ikpere na-egbu ha mgbu si n’etiti ìgwè mmadụ na-aga n’ihu ihe oyiyi ahụ, jupụtara n’ihu paseji na n’okporo ámá ndị dị gburugburu ụlọ chọọchị basilika ahụ.’

OTÚ ahụ ka akwụkwọ akụkọ bụ́ El Economista si kọwaa otu oké ìgwè mmadụ na December 2001. N’oge ahụ, ihe dị ka nde mmadụ atọ gara n’ụlọ chọọchị basilika dị na Mexico City iji gosipụta okwukwe ha nwere na Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke nke Guadalupe. Ọtụtụ ndị nleta na-agakwa n’ihe owuwu okpukpe ndị ọzọ, dị ka chọọchị St. Peter’s Basilica dị na Rom.

Ọ na-adị ọtụtụ ndị chọrọ ife Chineke ka ụlọ okpukpe ọ̀ bụ ebe pụrụ iche nke e kwesịrị iji akpọrọ ihe. “Chọọchị bụụrụ m ebe m pụrụ ịnọ bịaruo Chukwu nso,” ka Maria onye si Brazil kwuru. “Ọ bụ ebe dị nsọ. Ekweere m na ịga chọọchị na-eme ka mkpụrụ obi dị ọcha nakwa na ọ bụ mmehie ịghara ịga Mas na ime nkwupụta njọ kwa Sunday.” Consuelo si Mexico na-akọ, sị: “Chọọchị na-eme ka m nwee mkpali miri emi; eji m ya kpọrọ ihe nke ukwuu. M nọrọ na ya, ọ na-adị m ka m nọ n’eluigwe.”

Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị ji chọọchị kpọrọ ihe nke ukwuu, ndị ọzọ na-enwe obi abụọ banyere mkpa ha dị dị ka ebe ndị a na-anọ efe ofufe. N’ikwu banyere ọnụ ọgụgụ dị nta nke ndị na-aga chọọchị, Peter Sibert, bụ́ ụkọchukwu Katọlik n’England, na-ekwu, sị: “[Ndị mmadụ] na-ahọrọ ihe omume okpukpe masịrị ha. Ọtụtụ ndị n’ime chọọchị Katọlik bụ ndị kataworo ahụ́, ha na-ebikwa ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ha kweere—ma ndị na-eto eto anaghị eji ya akpọrọ ihe.” Otu akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta na London bụ́ Daily Telegraph nke November 20, 1998, kwuru, sị: “Kemgbe 1979, e mechiwo ihe dị ka chọọchị 1,500 n’England bụ́ nke karịrị chọọchị 495 e guzobere na chọọchị 150 ndị a rụzigharịrị.”

Na 1997, akwụkwọ akụkọ bụ́ Süddeutsche Zeitung nke Munich, Germany, kọrọ, sị: “E jizi ụlọ chọọchị emere ụlọ sinima na ụlọ obibi: Ndị kwere ekwe adịghịzi aga ụka, e jizi ụlọ ofufe emere ihe ọzọ. . . . A na-emezi ihe ghọrọlarị omenala na Netherlands ma ọ bụ n’England na Germany.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Mmadụ pụrụ ịhụ ka e rere ihe dị ka ụlọ chọọchị 30 ma ọ bụ 40 a ma ama na Germany n’ime afọ ole na ole gara aga.”

Ụlọ okpukpe hà dị mkpa n’ezie iji fee Chineke ofufe? Ụlọ chọọchị ndị a chọbigara mma ókè hà nwere mmalite ha n’Akwụkwọ Nsọ? Olee ụdị ụlọ ndị e jiworo mee ihe maka ofufe nke ezi Chineke dị ndụ? Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site na ha banyere mkpa ebe ndị a na-anọ efe ofufe dị nakwa banyere ihe e kwesịrị ịnọ na ha na-eme?