Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nọgidenụ Na-eje Ozi n’Otu Ubu

Nọgidenụ Na-eje Ozi n’Otu Ubu

Nọgidenụ Na-eje Ozi n’Otu Ubu

“M ga-emere ndị nile dị iche iche mgbanwe gaa n’asụsụ dị ọcha, ka ha nile wee kpọkuo aha Jehova, ka ha fee ya n’otu ubu.”—ZEFANAỊA 3:9, NW.

1. Gịnị na-eme ná mmezu nke Zefanaịa 3:9?

ANA-ASỤ ihe dị ka asụsụ 6,000 ugbu a n’ụwa nile. E wezụga ha, e nwere olumba, ma ọ bụ asụsụ ógbè dịgasị iche iche. Otú ọ dị, Ọ bụrụgodị na ndị mmadụ na-asụ asụsụ ndị dịrịta nnọọ iche dị ka Arabic na Zulu, Chineke emewo ihe dị nnọọ ịrịba ama. O mewo ka o kwe ụmụ mmadụ nọ n’ebe nile omume ịmụta na ịsụ nanị otu asụsụ dị ọcha. Nke a na-eme ná mmezu nke nkwa e kwere site n’ọnụ Zefanaịa onye amụma: “M [Jehova Chineke] ga-emere ndị nile dị iche iche mgbanwe gaa n’asụsụ dị ọcha [n’ụzọ nkịtị, “egbugbere ọnụ dị ọcha,” Bible Nsọ nke Union Version], ka ha nile wee kpọkuo aha Jehova, ka ha wee fee ya n’otu ubu.”—Zefanaịa 3:9, NW.

2. Gịnị bụ ‘asụsụ ahụ dị ọcha,’ gịnịkwa ka o meworo ka o kwe omume?

2 ‘Asụsụ ahụ dị ọcha’ bụ eziokwu nke Chineke bụ́ nke a na-achọta n’Okwu ya bụ́ Bible. Karịsịa, ọ bụ eziokwu banyere Alaeze Chineke, bụ́ nke ga-edo aha Jehova nsọ, gosipụta oruru o ruuru ya ịchị achị, ma wetara ihe a kpọrọ mmadụ ngọzi. (Matiu 6:9, 10) Dị ka nanị asụsụ dị ọcha n’ụzọ ime mmụọ n’ụwa, ndị sitere ná mba na agbụrụ nile na-asụ asụsụ ahụ dị ọcha. Ọ na-enyere ha aka ijere Jehova ozi “n’otu ubu.” N’ụzọ dị otú a, ha na-ejere ya ozi n’ịdị n’otu, ma ọ bụ “n’otu nkwekọrịta.”—The New English Bible.

E Nweghị Ọnọdụ Maka Ile Mmadụ Anya n’Ihu

3. Gịnị na-enyere anyị aka ijere Jehova ozi n’ịdị n’otu?

3 Dị ka Ndị Kraịst, anyị nwere ekele na anyị na-emekọrịta ihe n’agbanyeghị na anyị na-asụ ọtụtụ asụsụ. Ọ bụ ezie na anyị na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ n’ọtụtụ asụsụ ụmụ mmadụ na-asụ, anyị na-ejere Chineke ozi n’ịdị n’otu. (Abụ Ọma 133:1) Nke a kwere omume n’ihi na, n’ebe ọ bụla anyị bi n’ụwa, anyị na-asụ otu asụsụ dị ọcha nke na-ewetara Jehova otuto.

4. N’ihi gịnị ka ile mmadụ anya n’ihu na-agatụghị eji dịrị n’etiti ndị Chineke?

4 Ile mmadụ anya n’ihu agatụghị adị n’etiti ndị Chineke. Pita onyeozi mere ka nke ahụ doo anya mgbe o mere nkwusa n’ụlọ ọchịagha bụ́ onye Jentaịl bụ́ Kọniliọs na 36 O.A., a kpalikwara Pita ikwu, sị: “N’ezie, ana m aghọta na Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anara nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35) Ebe nke ahụ bụ eziokwu, ọgbakọ Ndị Kraịst abụghị ebe a ga na-ele mmadụ anya n’ihu, ebe a ga na-arọ òtù, ma ọ bụ ebe a ga na-emelara mmadụ ihe.

5. N’ihi gịnị ka o ji dị njọ iso na-akpalite ịrọ òtù n’ọgbakọ?

5 Otu nwa akwụkwọ kọleji kwuru banyere ọgịga ọ gara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, sị: “Dị ka ọ na-adịkarị, chọọchị dị iche iche na-anabata ndị si n’otu agbụrụ. . . . Ndịàmà Jehova nile na-anọkọ ọnụ, ọ bụghịkwa n’òtù dị iche iche.” Otú ọ dị, ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ dị na Kọrint oge ochie nọ na-arọ òtù. Site n’isi otú ahụ na-akpata nkewa, ha nọ na-emegide ọrụ nke mmụọ nsọ Chineke na-arụ, n’ihi na ọ na-akwalite ịdị n’otu na udo. (Ndị Galeshia 5:22) Ọ bụrụ na anyị akpalite ịrọ òtù n’ọgbakọ, anyị ga na-eme ihe megidere idu ndú nke mmụọ nsọ. N’ihi ya, ka anyị buru n’uche okwu Pọl onyeozi gwara ndị Kọrint: “M na-agba unu ume, ụmụnna m, site n’aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, ka unu nile na-ekwu otu ihe, ka a gharakwa inwe nkewa n’etiti unu, kama ka e mee ka unu dị n’otu n’ụzọ kwekọrọ ekwekọ n’otu uche na n’otu ụzọ iche echiche.” (1 Ndị Kọrint 1:10) Pọl kwusikwara okwu ike banyere ịdị n’otu n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Efesọs.—Ndị Efesọs 4:1-6, 16.

6, 7. Ndụmọdụ dị aṅaa ka Jems nyere banyere imelara mmadụ ihe, oleekwa otú a pụrụ isi tinye ihe o kwuru n’ọrụ?

6 A nọwo na-achọ mgbe nile ka Ndị Kraịst ghara ịdị na-ele mmadụ anya n’ihu. (Ndị Rom 2:11) Ebe ọ bụ na ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ na narị afọ mbụ nọ na-emelara ndị ọgaranya ihe, onye na-eso ụzọ bụ́ Jems dere, sị: “Ụmụnna m, unu ejighị imelara mmadụ ihe na-enwe okwukwe n’Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, bụ́ ebube anyị, ka ùnu ji? N’ihi na, ọ bụrụ na nwoke nke gbajuru ọla e ji ọlaedo mee ná mkpịsị aka ya, nke yikwa ákwà mara mma abata ná nnọkọ unu, ma onye ogbenye nke yi ákwà ruru unyi abatakwa, ma unu elee onye ahụ yi ákwà mara mma anya ọma wee sị: ‘Nọdụ n’oche a dị n’ebe a mara mma,’ unu ewee sị onye ogbenye ahụ: ‘Guzoro ọtọ,’ ma ọ bụ: ‘Nọdụ n’oche ahụ dị n’ebe ahụ n’okpuru ihe mgbakwasị ụkwụ m,’ unu nwere ịkpa ókè n’etiti onwe unu, unu aghọwokwa ndị ikpe na-eme ajọ mkpebi, ọ́ bụghị ya?”—Jems 2:1-4.

7 Ọ bụrụ na ndị na-ekweghị ekwe bara ọgaranya bụ́ ndị gba mgbaaka ọlaedo ma yiri uwe ndị mara mma na ndị ogbenye na-ekweghị ekwe yi uwe ruru unyi abata ná nzukọ Ndị Kraịst, a na-emeso ndị bara ọgaranya ihe n’ụzọ pụrụ iche. A na-enye ha oche ‘n’ebe mara mma,’ ebe a na-agwa ndị ogbenye ka ha guzoro ọtọ ma ọ bụ nọdụ ọdụ n’ala n’ụkwụ mmadụ. Ma Chineke mere ndokwa maka àjà mgbapụta Jizọs maka ndị ọgaranya na ndị ogbenye n’eleghị onye ọ bụla anya n’ihu. (Job 34:19; 2 Ndị Kọrint 5:14) Ya mere, ọ bụrụ na anyị gaje ime ihe ga-atọ Jehova ụtọ ma na-ejere ya ozi n’otu ubu, anyị agaghị na-emelara mmadụ ihe ma ọ bụ ‘na-enwe mmasị n’ihe ndị mmadụ bụ n’ihi uru nke aka anyị.’—Jud 4, 16.

Zere Ntamu

8. Gịnị mere ụmụ Izrel n’ihi ntamu ha tamuru?

8 Iji nọgide na-adị n’otu ma nọgidekwa na-enwe ihu ọma Chineke, anyị aghaghị ịṅa ntị na ndụmọdụ Pọl bụ́: “Nọgidenụ na-eme ihe nile n’enweghị ntamu.” (Ndị Filipaị 2:14, 15) Ndị Izrel na-enweghị okwukwe bụ́ ndị a tọhapụrụ n’agbụ n’Ijipt tamuru ntamu megide Mozis na Erọn ma si otú ahụ tamuo ntamu megide ọbụna Jehova Chineke. N’ihi ya, ndị ikom nile gbara afọ 20 gawa n’ihu, ma e wezụga Jọshụa na Keleb bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi na ndị Livaị, abanyeghị n’Ala Nkwa ahụ kama ha nwụrụ n’oge Izrel ji ụkwụ mee njem were afọ 40 n’ọzara. (Ọnụ Ọgụgụ 14:2, 3, 26-30; 1 Ndị Kọrint 10:10) Lee ọdachi dakwasịrị ha n’ihi ịtamu ntamu!

9. Gịnị mere Miriam n’ihi ntamu ọ tamuru?

9 Nke a na-egosi ihe pụrụ ime mba na-atamu ntamu. Gịnị banyere mmadụ ndị na-atamu ntamu? Nwanne nwanyị Mozis, bụ́ Miriam, na nwanne ya nwoke bụ́ Erọn, tamuru ntamu, sị: “Ọ̀ bụ ezie na nanị Mozis ka Jehova werewooro kwuo okwu? Ọ́ bụghịkwa anyị ka O werewooro kwuo okwu?” Ihe ndekọ ahụ na-agbakwụnye, sị: “Jehova wee nụ ya.” (Ọnụ Ọgụgụ 12:1, 2) Gịnị si na ya pụta? Chineke wedara Miriam ala, bụ́ onye ihe àmà na-egosi na ọ bụ ya bu mkpesa ahụ n’isi. N’ụzọ dị aṅaa? Site na ya ịbụ onye e tiri ekpenta na onye a manyere ịnọ ụbọchị asaa n’azụ ọmụma ụlọikwuu ruo mgbe e mere ka ọ dị ọcha.—Ọnụ Ọgụgụ 12:9-15.

10, 11. Gịnị ka ntamu a na-achịkwaghị achịkwa pụrụ ịkpata? Nye ihe atụ.

10 Ịtamu ntamu abụghị nanị ime mkpesa banyere ihe ụfọdụ e mejọrọ. Ndị na-atamukarị ntamu na-echegbubiga onwe ha ókè banyere mmetụta na ọnọdụ ha, na-adọrọ uche gaa n’ebe onwe ha nọ kama ịbụ n’ebe Chineke nọ. Ọ bụrụ na a chịkwaghị ya, ọ na-akpata nkewa n’etiti ụmụnna ime mmụọ ma na-egbochi mgbalị ha na-eme ijere Jehova ozi n’otu ubu. Nke a bụ n’ihi na ndị ntamu na-eme mkpesa mgbe nile, obi abụọ adịghịkwa ya na ha na-atụ anya ka ndị ọzọ kwenyere ha.

11 Dị ka ihe atụ, mmadụ pụrụ ịkatọ ụzọ otu okenye si eme ihe omume n’ọgbakọ ma ọ bụ na-arụ ọrụ e kenyere ya. Ọ bụrụ na anyị egee onye mkpesa ahụ ntị, anyị pụrụ ịmalite iche echiche dị ka ya. Tupu a kụnye mkpụrụ obi abụọ ahụ n’obi anyị, ọ pụrụ ịbụwo na ihe ndị nwanna ahụ na-eme adịghị enye anyị nsogbu n’obi, ma ugbu a, ha na-emezi otú ahụ. N’ikpeazụ, ọ dịghị ihe okenye ahụ mere nke ga-ezi ezi n’anya anyị, anyị onwe anyị pụkwara ịmalite ime mkpesa banyere ya. Àgwà dị otú a ekwesịghị ekwesị n’ọgbakọ ndị Jehova.

12. Mmetụta dị aṅaa ka ịtamu ntamu pụrụ inwe ná mmekọrịta anyị na Chineke?

12 Ịtamu ntamu megide ndị ọrụ ha bụ ịzụ ìgwè atụrụ Chineke pụrụ iduga n’ikwujọ ha. Ntamu dị otú ahụ ma ọ bụ ịkpọ ha iyi iji mebie aha ha pụrụ imetụta mmekọrịta anyị na Jehova n’ụzọ dị njọ. (Ọpụpụ 22:28) Ndị na-ekwujọ mmadụ n’enweghị nchegharị agaghị eketa Alaeze Chineke. (1 Ndị Kọrint 5:11; 6:10) Jud onye na-eso ụzọ dere banyere ndị ntamu bụ́ ndị “na-eleda ịbụisi anya, na-ekwujọkwa ndị dị ebube,” ma ọ bụ ndị nwere ibu ọrụ n’ọgbakọ. (Jud 8) Ndị ntamu dị otú ahụ enweghị nnwapụta Jehova, anyị na-ejikwa amamihe ezere ụzọ ndụ ọjọọ ha.

13. Gịnị mere na ọ bụghị mkpesa nile dị njọ?

13 N’eziokwu, ọ bụghị mkpesa nile na-ewute Chineke. O legharaghị ‘mkpu e tiri’ banyere Sọdọm na Gọmọra anya, kama o bibiri ajọ obodo ndị ahụ. (Jenesis 18:20, 21; 19:24, 25) Na Jeruselem, obere oge ka Pentikọst 33 O.A., gasịrị, “ndị Juu na-asụ Grik malitere ịtamu ntamu megide ndị Juu na-asụ Hibru, n’ihi na a na-eleghara ndị inyom ha di ha nwụrụ anya ná nkesa a na-eme kwa ụbọchị.” N’ihi ya, “mmadụ iri na abụọ ahụ” doziri ọnọdụ ahụ site n’ịhọpụta “ndị ikom asaa a gbaara ezi àmà” maka ‘ọrụ ahụ dị mkpa’ nke ikesa ihe oriri. (Ọrụ 6:1-6) Ndị okenye nke oge a agaghị ‘na-ekwuchipụ ntị ha ịnụ’ mkpesa ziri ezi. (Ilu 21:13) Kama ịdị na-akatọ ndị kwere ekwe ibe ha, ndị okenye kwesịrị ịbụ ndị na-agba ume na ndị na-ewuli elu.—1 Ndị Kọrint 8:1.

14. Iji zere ịtamu ntamu, àgwà dị aṅaa dị mkpa karịsịa?

14 Ọ dị anyị nile mkpa izere ịtamu ntamu, n’ihi na mmụọ nke ime mkpesa ezighị ezi n’ụzọ ime mmụọ. Àgwà dị otú ahụ ga-akpaghasị ịdị n’otu anyị. Kama nke ahụ, ka anyị na-ekwe mgbe nile ka mmụọ nsọ na-amịpụta ịhụnanya n’ime anyị. (Ndị Galeshia 5:22) Ime ihe kwekọrọ ‘n’iwu nke eze bụ́ ịhụnanya’ ga-enyere anyị aka ịnọgide na-ejere Jehova ozi n’otu ubu.—Jems 2:8; 1 Ndị Kọrint 13:4-8; 1 Pita 4:8.

Nọrọ na Nche Megide Ikwutọ Mmadụ

15. Olee otú ị pụrụ isi kọwaa ọdịiche dị n’etiti asịrị na nkwutọ?

15 Ebe ọ bụ na ntamu pụrụ iduga n’ịgba asịrị na-emerụ ahụ́, anyị aghaghị ilezi anya banyere ihe anyị na-ekwu. Ịgba asịrị bụ ikwu okwu na-abaghị uru banyere ndị mmadụ na ihe ndị dịịrị ha. Otú ọ dị, nkwutọ bụ akụkọ ụgha a kọrọ iji mebie aha ọma nke onye ọzọ. Okwu dị otú ahụ bụ nke jọgburu onwe ya na nke na-adịghị enye Chineke nsọpụrụ. N’ihi ya, Chineke gwara ụmụ Izrel, sị: “Ejegharịla n’etiti ụmụnna gị dị ka onye na-agba àmà ọjọọ.”—Levitikọs 19:16.

16. Gịnị ka Pọl kwuru banyere ụfọdụ ndị asịrị, oleekwa otú ndụmọdụ ya kwesịrị isi metụta anyị?

16 Ebe ọ bụ na ikwu okwu na-abaghị uru pụrụ iduga n’ikwutọ mmadụ, Pọl baara ụfọdụ ndị asịrị mba n’ụzọ siri ike. Mgbe o kwusịrị banyere ndị inyom di ha nwụrụ bụ́ ndị ruru eru ka ọgbakọ nyere ha aka, o kwuru banyere ndị inyom di ha nwụrụ bụ́ ndị mụtara “ịnọ nkịtị, na-epiogharị n’ụlọ dị iche iche; ee, ọ bụghị nanị ịnọ nkịtị, kamakwa bụrụ ndị asịrị na ndị na-etinye ọnụ n’ihe ndị gbasara ndị ọzọ, na-ekwu banyere ihe ndị ha na-ekwesịghị ikwu.” (1 Timoti 5:11-15) Ọ bụrụ na nwanyị bụ́ Onye Kraịst achọpụta na ya amachaghị ụdị okwu pụrụ iduga n’ikwutọ mmadụ, ọ ga-eme nke ọma ịṅa ntị na ndụmọdụ Pọl nke ‘ịbụ onye ji ihe akpọrọ ihe, ọ bụghị onye nkwutọ.’ (1 Timoti 3:11) Ndị ikom bụ́ Ndị Kraịst aghaghịkwa ịnọ na nche megide asịrị na-emerụ ahụ́.—Ilu 10:19.

Kwụsị Ikpe Ikpe!

17, 18. (a) Gịnị ka Jizọs kwuru banyere ikpe ụmụnna anyị ikpe? (b) Olee otú anyị pụrụ isi tinye okwu Jizọs banyere ikpe ndị ọzọ ikpe n’ọrụ?

17 Ọ bụrụgodị na anyị adịghị ekwutọ onye ọ bụla, anyị pụrụ ime mgbalị siri ike izere ịdị na-ekpe ndị ọzọ ikpe. Jizọs katọrọ mmụọ dị otú ahụ mgbe ọ sịrị: “Kwụsịnụ ikpe ikpe ka e wee ghara ikpe unu ikpe; n’ihi na ihe unu ji ekpe ikpe, ya ka a ga-eji kpee unu ikpe; ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke unu jikwa atụ ihe, ya ka ha ga-eji tụọrọ unu ihe. Gịnịzi mere i ji ele irighiri ahịhịa nke dị n’anya nwanna gị, ma i chebaraghị ntụhie dị n’anya nke gị echiche? Ma ọ bụ olee otú ị pụrụ isi sị nwanna gị, ‘Kwe ka m wepụ irighiri ahịhịa n’anya gị’; mgbe, lee! ntụhie dị n’anya nke gị? Onye ihu abụọ! Buru ụzọ wepụ ntụhie dị n’anya nke gị, mgbe ahụkwa ị ga-ahụ nke ọma otú ị ga-esi wepụ irighiri ahịhịa n’anya nwanna gị.”—Matiu 7:1-5.

18 Anyị ekwesịghị ịnwa anwa chọọ iwepụ nanị “irighiri ahịhịa” n’anya nwanna anyị iji nyere ya aka mgbe “ntụhie” ihe atụ na-egbochi ikike anyị nwere ikpe ikpe ziri ezi. N’ezie, ọ bụrụ na anyị aghọta nnọọ otú Chineke nweruru obi ebere, anyị agaghị achọ ikpe ụmụnna ime mmụọ anyị ndị nwoke na ndị nwanyị ikpe. Olee otú anyị pụrụ isi nwee ike ịghọta ha nke ọma dị ka Nna anyị nke eluigwe si aghọta ha? Ka a sịkwa ihe mere Jizọs ji dọọ anyị aka ná ntị ‘ịkwụsị ikpe ikpe ka a ghara ikpe anyị ikpe’! Iji ezi obi nyochaa ezughị okè nke anyị kwesịrị igbochi anyị ikpe ikpe Chineke ga-ele anya dị ka nke ajọ omume.

Ndị Na-adịghị Ike Ma Bụrụ Ndị Kwesịrị Nsọpụrụ

19. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ndị kwere ekwe ibe anyị anya?

19 Ọ bụrụ na anyị kpebisiri ike isoro ndị kwere ekwe ibe anyị na-ejere Chineke ozi n’otu ubu, ọ bụghị nanị na anyị ga-ezere ịdị na-ekpe ndị ọzọ ikpe. Anyị ga na-ebute ụzọ n’inye ha nsọpụrụ. (Ndị Rom 12:10) N’ezie, anyị ga na-achọ ọdịmma ha, ọ bụghị nke anyị, anyị ga na-ejikwa ọṅụ na-arụ ọrụ ndị dị ala n’ihi ha. (Jọn 13:12-17; 1 Ndị Kọrint 10:24) Olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-enwe ezigbo mmụọ dị otú ahụ? Ọ bụ site n’iburu n’uche na onye ọ bụla kwere ekwe dị oké ọnụ ahịa nye Jehova nakwa na anyị dị ibe anyị mkpa, dị nnọọ ka akụkụ ọ bụla nke ahụ́ mmadụ dabeere ná ndị ọzọ.—1 Ndị Kọrint 12:14-27.

20, 21. Gịnị ka okwu ndị dị na 2 Timoti 2:20, 21 pụtara nye anyị?

20 N’eziokwu, Ndị Kraịst bụ arịa ndị na-esighị ike e ji ụrọ mee bụ́ ndị e nyere akụ̀ dị ebube bụ́ ozi ahụ. (2 Ndị Kọrint 4:7) Ọ bụrụ na anyị gaje ịrụzu ọrụ a dị nsọ iji wetara Jehova otuto, anyị aghaghị ịnọgide bụrụ ndị nwere aha ọma n’ihu ya na Ọkpara ya. Ọ bụ nanị site n’ịnọgide na-adị ọcha n’omume na n’ụzọ ime mmụọ ka anyị pụrụ ịnọgide na-abụ arịa kwesịrị nsọpụrụ maka Chineke iji anyị na-eme ihe. Banyere nke a, Pọl dere, sị: “N’ime ụlọ buru ibu, e nwere arịa dị iche iche, ọ bụghị nanị nke ọlaedo na ọlaọcha kamakwa nke osisi na nke ụrọ, ụfọdụ bụkwa maka nzube kwesịrị nsọpụrụ ma ndị ọzọ bụ maka nzube nsọpụrụ na-adịghị na ya. Ya mere, ọ bụrụ na onye ọ bụla ezere ndị nke ikpeazụ ahụ, ọ ga-abụ arịa bụ maka nzube kwesịrị nsọpụrụ, nke e doro nsọ, nke baara onye nwe ya uru, nke a kwadebere maka ezi ọrụ ọ bụla.”—2 Timoti 2:20, 21.

21 Ndị na-adịghị akpa àgwà n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ndị Chineke chọrọ n’aka ha bụ ‘arịa ndị na-ekwesịghị nsọpụrụ.’ Otú ọ dị, site n’ịchụso ụzọ ndụ nke na-enye Chineke nsọpụrụ, anyị ga-abụ ‘arịa ndị bụ́ maka nzube kwesịrị nsọpụrụ, ndị e doro nsọ, ma ọ bụ doo iche, maka ije ozi Jehova, ndị a kwadebekwara maka ezi ọrụ ọ bụla.’ N’ihi ya, anyị pụziri ịjụ onwe anyị, sị: ‘Àbụ m “arịa kwesịrị nsọpụrụ”? Àna m enwe mmetụta dị mma n’ahụ́ ndị kwere ekwe ibe m? Àbụ m onye òtù ọgbakọ nke na-eso ndị mụ na ha na-efekọ ofufe arụkọ ọrụ n’otu ubu?’

Nọgidenụ Na-eje Ozi n’Otu Ubu

22. Gịnị ka a pụrụ iji ọgbakọ Ndị Kraịst tụnyere?

22 Ọgbakọ Ndị Kraịst bụ ndokwa yiri ezinụlọ. A na-enwe ọnọdụ dị mma, ebe ịhụnanya dị, na ebe onye ọ bụla na-enyere ibe ya aka n’ezinụlọ mgbe ndị nile nọ na ya bụ ndị na-efe Jehova ofufe. Ihe mejupụta ezinụlọ pụrụ ịbụ ndị nwere àgwà dịrịtara iche, ma onye ọ bụla nwere ọnọdụ kwesịrị nsọpụrụ. Otú ahụ ka ọ dị n’ọgbakọ. Ọ bụ ezie na anyị nile dịrịtara iche—anyị ezughịkwa okè—Chineke adọtawo anyị n’ebe ya onwe ya nọ site n’aka Kraịst. (Jọn 6:44; 14:6) Jehova na Jizọs hụrụ anyị n’anya, dịkwa ka ezinụlọ dị n’otu, ọ dị anyị mkpa n’ezie ịhụrịta ibe anyị n’anya.—1 Jọn 4:7-11.

23. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta ma kpebisie ike ịdị na-eme?

23 Ọgbakọ Ndị Kraịst nke yiri ezinụlọ bụkwa ebe anyị kwesịrị ịtụ anya ịchọta iguzosi ike n’ihe. Pọl onyeozi dere, sị: “N’ebe nile, achọrọ m ka ụmụ nwoke nọgide na-ekpe ekpere, na-eweli aka na-eguzosi ike n’ihe, n’abụghị n’ọnụma na nrụrịta ụka.” (1 Timoti 2:8) Pọl si otú a jikọta iguzosi ike n’ihe na ikpe ekpere n’ihu ọha “n’ebe nile” Ndị Kraịst zukọtara. Ọ bụ nanị ndị ikom na-eguzosi ike n’ihe kwesịrị idu ọgbakọ n’ekpere ihu ọha. N’ezie, Chineke na-atụ anya ka anyị nile na-eguzosi ike n’ihe nye ya nakwa nye ibe anyị. (Eklisiastis 12:13, 14) N’ihi ya, ka anyị kpebisie ike ịdị na-arụkọ ọrụ n’ịdị n’otu, dị ka akụkụ dị iche iche nke ahụ́ mmadụ. Ka anyị na-ejekọkwa ozi ọnụ dị ka ndị so n’ezinụlọ nke ndị na-efe Jehova ofufe. Karịsịa, ka anyị cheta na anyị dị ibe anyị mkpa nakwa na anyị ga-enweta nnwapụta na ngọzi Chineke ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-ejere Jehova ozi n’otu ubu.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Gịnị na-eme ka ndị Jehova nwee ike ijere ya ozi n’otu ubu?

• N’ihi gịnị ka Ndị Kraịst ji ezere ile mmadụ anya n’ihu?

• Gịnị ka ị ga-ekwu na ọ dị njọ banyere ịtamu ntamu?

• N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịdị na-asọpụrụ ndị kwere ekwe ibe anyị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 15]

Pita ghọtara na “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu”

[Foto dị na peeji nke 16]

Ị̀ maara ihe mere Chineke ji weda Miriam ala?

[Foto dị na peeji nke 18]

Ndị Kraịst na-eguzosi ike n’ihe na-eji ọṅụ ejere Jehova ozi n’otu ubu